Ndi Nne na nna na Ụmụ
Nnukwu atụmatụ nke ańụrị nke Nna anyị nke Eluigwe na-agwa unu onye unu bụ na ebumnuche nke ndụ gị
Ezi ụmụnne m nwanyị, ụdị ijuanya inwe nkeji ọgbakọ zuruọha nke a dị ọhụrụ nke ụmụnwanyị nke Nzukọ-nsọ gbara afọ asatọ ma karịa. Anyị anụwo ozi nkwalite mụọ ndi sitere n’aka ụmụnne nwanyị ndi ndu na Onye-isi Henry B. Eyring. Mụ na Onye-isi Eyring nwere mmasị ịrụ-ọrụ n’okpuru ntụzi-aka nke Onye-isi Russell M. Nelson, ma anyị na-atụanya maka ozi amụma ya.
I.
Ụmụ bụ onyinye anyị kacha mma sitere na Chineke—mmụba anyị nke ebigh-ebi. Ma anyị bi n’oge mgbe ọtụtụ ụmụnwanyị achọghị iso na-ọmụmụ na ọzụzụ ụmụ. Ọtụtụ ntoroọbịa tozuru n’egbuoge alụlụ di na nwunye ruo mgbe mkpa niile nke ụwa bịara na mmezu. Afọ-etiti a na-agba nke alụm di na nwunye ndi-otu Nzukọ-nsọ ejiriwo ihe karịrị afọ abụọ balite, ma ọnụ-ọgụgụ nke ọmụmụ nke ndi otu Nzukọ-nsọ n’ada ada. Obodo United States na ụfọdụ mba ndi ọzọ n’ahụta ọdịnihu nke oke ụmụ ole ma ole n’etozu ntoroọbịa ikwado ọnụ-ọgụgụ nke okenye lara ezumike nka. Ọmụmụ karịrị pecent 40 n’ime mba United States ka amụrụ n’aka nne n’alụghị dị. Ụmụ ndi ahụ n’adabakarị n’ajọ-ihe. Ihe ndi a nke ọbụla n’emekarị n’arụ ọrụ megide atụmatụ nke nzọpụta dị nsọ nke Nna.
II.
Ụmụnwanyị Ndi-nsọ Ụbọchị Ikpe-azụ a ghọtara na ịbụ onye nne bụ mkpa ha kacha dị elu, ọńụ ha kacha. Onye-isi-nduzi Gordon B. Hinckley kwuru: “Ụmụnwanyị n’ihe kacha n’ahụta mmezu ha kacha ibe ya, ańụrị ha kacha n’ime ebe obibi na ezi-na-ụlọ. Chineke kụrụ n’ime ụmụnwanyị ihe dị nsọ nke n’egosipụta onwe ya n’ike dị jụụ, n’ime ịdị-ọcha, n’ime udo, n’ime ịma-mma, n’ime agwa-ọma, n’ime eziokwu, n’ime ịhụnanya. Ma agwa ndi a niile dị ịrịba ama na-achọta ngosipụta ha ziri-ezi na nke juru afọ karịa n’ime ịbụ-nne.”
Ọ gara n’ihu: “Ọrụ kacha ibe ya nke nwanyị ọbụla ga-emeli ga-abụ n’ilekọta na ikuzi na ibi-ndụ na ịgba-ume na ịzụ ụmụ ya n’ezi-omume na eziokwu. Enweghị ihe ọzọ nke eji atụrụ nke ahụ, n’agbanyeghị ihe ọ na-eme.”
Ndi nne, ụmụnne nwanyị m hụrụ n’anya, anyị hụrụ unu n’anya maka ndi unu bụ na ihe ndi unu na-emere anyị niile.
N’ime ozi 2015 ya dị mkpa nke isi-okwu ya bụ “Arịrịọ nye Ụmụnne m nwanyị,” Onye-isi Russell M. Nelson kwuru:
“Ala-eze nke Chineke adịghị ma o nweghị ike izu-oke ma enweghị ụmụnwanyị ndi na-agba-ndụ dị nsọ ma emesịa debe ha, ụmụnwanyị ndi nwere ike ikwu okwu jiri ike na ikikere nke Chineke!
“Taa, … anyị chọrọ ụmụnwanyị ndi mara otu esi eme ka ihe ndi dị mkpa mee site n’okwukwe ha na ndi nwere obi igbachitere ndụ anụ-ahụ na ezi-na-ụlọ nọ n’ime ụwa juru n’ime njọ. Anyị chọrọ ụmụnwanyị ndi dị uchu n’ichigharị ụmụ nke Chineke n’ụzọ ọgbụgba-ndụ gaa n’ụzọ mbuli-elu; ụmụnwanyị ndi maara otu esi anata mkpughe nke onwe, ndi ghọtara ike na udo nke onyinye dị nsọ nke tempụl; ụmụnwanyị ndi maara otu esi akpọku ike niile nke eluigwe iji chekwa ma gbaa ụmụ na ezi-na-ụlọ ume; ụmụnwanyị ndi na-akuzi n’atụghị egwu.”
Nkuzi ndi a niile na-akpali mụọ bụ nke dabere na “Ezi-na-ụlọ Ahụ: Ịma-Ọkwa nye Ụwa ahụ,” n’ime nke Nzukọ-nsọ nkea eweghachitere na-akwado ozizi na omume dị n’etiti atụmatụ nke Onye-okike tutu Ya ekepụta ụwa.
III.
Ugbua a na m agwa otu ndi dị obere karịa n’ime ọgbakọ nke a. Ezi ụmụnne nwanyị ndi obere, n’ihi mmụta gị nke ozi-ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere, ị pụrụ iche. Mmụta gị ga-enyere gị aka ịnọgide ma merie ihe isi-ike niile nke ntolite. Site na afọ obere, I sorowo n’ime ọrụ na mmemme niile nke mere gị enweta akara aka gị niile, dịka odide ihe, ikwu okwu, na nhazi ihe. I mụtawo omume dị mma, na otu esi agbanarị ọnwụnwa nke ịtụ-asị, imegide mmadụ, izu-oshi, ma ọbụ ińụ mmanya ọkụ ma ọbụ ọgwụ iwu megidere.
Ọpụrụ iche gị ka amatara n’ime otu ọmụmụ n’ime Mahadum nke North Carolina maka Nwa niile nke Amerịka na okpukpere-chi. Edemede nke otu Onye-nchọpụta Charlotte nwere isiokwu, “Mormon teens Cope Best: Study finds they top peers at handling adolescence.” Edemede nkea mechiri na-asi na “Ndi Mọmọn na-emetakacha n’ịgbanarị omume na-abaghị uru, na-eme nke ọma n’ụlọ-akwụkwọ ma na enwe agwa dị mma gbasara ọdịnihu.” Otu n’ime ndi nchọpụta n’ime ọmụmụ ahụ, onye jụrụ ọtụtụ ndi ntoroọbịa ajụjụ-ọnụ, kwuru, “N’ebe niile n’ime ihe niile anyị lebara anya na ya, enwere usoro doro anya: Ndi Mọmọn buuru ndi mbụ.”
Gịnị mere unu si n’eme nke ọma n’ime ihe isi ike nke ntolite? Ndi Iyom nta, ọ bụ n’ihi na unu ghọtara nnukwu atụmatụ ańụrị nke Nna anyị Bi N’igwe. Nke a na-agwa gị onye ị bụ na ebumnuche nke ndụ gị. Ndi ntoroọbịa nta site na nghọta ahụ bụ ndi mbụ n’idozi nsogbu na ndi mbụ n’ịhọrọ ezi ihe. Unu maara na unu nwere ike inwe enyemaka nke Onye-nwe-anyị n’imeri ihe isi ike dum nke ntolite elu.
Ihe ọzọ mere unu jiri karịcha mma bụ na unu ghọtara na unu bụ ụmụ nke Nna nke Eluigwe onye hụrụ unu n’anya. O doro m anya na unu maara nke ọma abụ anyị dị ukwuu “Ezigbo Ụmụ, Chineke Nọ Unu Nso.” Ebe a bụ amaokwu nke mbụ anyị niile bụworo ma kwenye:
Enwere ihe mmụta abụọ n’ime amaokwu ahụ: Nke mbụ, Nna anyị nke Eluigwe nọ anyị nso ma n’elegide anyị anya ụtụtụ na abalị. Chee mata ya! Chineke hụrụ anyị n’anya, Ọ nọ nso n’ebe anyị nọ, ma Ọ na-elegide anyị anya. Nke abụọ, O nwere mmasị igọzi anyị dịka anyị “n’agbalị ime ezi ihe.” Ụdị nkasi-obi n’etiti nchegbu niile na ihe isi ike anyị niile!
Ee, ndi iyom nta, unu ka agọziri ma unu dị egwu, mana unu dị ka ụmụ niile nke Nna nke Eluigwe n’ime mkpa unu ị “gbalị ime ezi ihe.”
Ebea e nwere m ike inye unu ndụmọdụ gbasara ọtụtụ ihe dị iche iche, mana a họrọwo m ikwu maka nanị abụọ.
Ndụmọdụ m nke mbụ gbasara ekwe ntị. Ihe nchọpụta ọhụrụ nke gburu gburu ụwa chọpụtara na ihe karịrị ọkara ndi ntoroọbịa dị n’ime United States kwuru na ha n’egbu ọtụtụ oge n’ekwe ntị ha. Ihe karịrị pecent 40 kwuru na ha naara echegbu onwe ha mgbe anapụrụ ha ekwe ntị ha. Nkea zuru ọnụ na ndi iyom karịa ndi itom. Ụmụnne m nwanyị nta—na ụmụnwanyị okenye—ọ ga-agọzi ndụ unu ma ọbụrụ na unu belata ndabere na ihe unu ji ekwe ntị eme.
Ndụmọdụ m nke abụọ bụ nke dị mkpa karịa. Nwe obi-ọma n’ebe ndi ọzọ nọ. Obi-ọma bụ ihe ọtụtụ ndi ntoroọbịa anyị na-eme ugbua. Ụfọdụ otu nke ndi ntoroọbịa nta n’ime ụfọdụ obodo egosiwo ụzọ ahụ nye anyị niile. Anyị enwetawo mkpali mụọ site n’omume ndị anyị n’etolite nke obi-ọma nye ndi nọ na mkpa nke ịhụnanya na enyemaka. N’ime ọtụtụ ụzọ, unu na-enye enyemaka ahụ ma n’egosipụta ịhụnanya ahụ nye otu onye na ibe ya. Ọ ga-amasị anyị ma onye niile soro ọmụmatụ unu.
N’otu aka ahụ, anyị maara na onye-iro ahụ na-anwa anyị niile inwe obi-ọjọọ, ma enwere nnọọ ọtụtụ ọmụmatụ maka nkea, ọbụna n’etiti ụmụntakịrị na ndi ntoroọbịa. Obi-ọjọọ na-adịgide bụ nke a maara site n’ọtụtụ aha, dịka iji ike emegbu mmadụ, mgbakọ otu-ọjọọ imegịde mmadụ, ma ọbụ ijikọta ọnụ ịjụ ndi ọzọ. Ọmụmatụ ndi a na-ama ama n’etinye ụfụ n’ime ụmụ-kalasị ma ndi enyi anyị. Ụmụnne m nwanyị nta, ọ bụghị ihe ụtọ nye Onye-nwe-anyị ma ọbụrụ na anyị nwe obi-ọjọọ ma ọ bụ gbaa njọ megide ndi ọzọ.
Ebe a bụ otu ọmụmatụ. A maara m otu nwoke n’eto eto, onye ọsọndụ nọ ebea n’obodo Utah, onye akọrọ ọnụ maka ịdị iche, tinyekọta oge ụfọdụ ịsụ asụsụ obodo ya. Akpagburu ya n’aka otu ọjọọ nke ndi ntoroọbịa amụrụ n’ime ụba ruo mgbe ọ lụghachịrị n’ụzọ nke mere atụọ ya mkpọrọ ihe karịrị ụbọchị 70 n’ebe a naara na atụle ibula ya obodo ya. Amaghị m ihe kpasuru otu ndi ntoroọbịa nkea, ọtụtụ n’ime ha Ndi-nsọ Ụbọchị Ikpe-azụ a dịka unu, mana a na m ahụ ihe so igba-njọ ha, nhụmihe ọdachi na ihe efu nye otu n’ime ụmụ nke Chineke. Ụmụ obere agwa nke obi-ọjọọ nwere ike inwe ihe ndi na eso n’agbawa obi.
Mgbe m nụtara akụkọ ahụ, atụlerịtara m ya na ihe onye-amụma anyị, Onye-isi-nduzi Nelson, kwuru na devotional ọhụụ gburu gburu ụwa nke ndi ntoroọbịa nta. N’ịrịọ unu na ndi ntoroọbịa nta ndi ọzọ niile inye-aka n’ịchịkọta Izrel, o kwuru: “Guzopụta nụ; diri iche site n’ụwa. Mụ na gị maara na ị kwesịrị ị bụ ihé nye ụwa. Ya mere, Onye-nwe-anyị chọrọ ka ị dịrị ka, kwuo dịka, mee dịka, na yie uwe dịka ezi onye na eso ụzọ Jizọs Kraịst.”
Igwe batalịọn ndi ntoroọbịa nta Onye-isi-nduzi Nelson na-akpọku unu isonye agaghị agba njọ nye otu onye na ibe ya. Ha ga-esoro nkuzi nke Onye-nzọpụta ịsetịpụ-aka ma nwe ịhụnanya ma nabata ndi ọzọ, ọbụna ịtụgharị nti nke ọzọ mgbe anyị chere na mmadụ emejọwo anyị.
N’ozi ọgbakọ zuruọha gbasara oge mgbe amụrụ ọtụtụ n’ime unu, Onye-isi-nduzi Gordon B. Hinckley jara “ọmarịcha ndi iyom nta ndi n’agba mbo ibi ndụ oziọ-ma.” Ọ kọwara ha, nanị dịka ọ metụtara m ịkọwa unu:
“Ha adịghị aka ntagide n’ebe otu onye na ibe ya nọ. Ha na-achọ ịgba otu onye na ibe ya ume. Ha bụ ihe nrite nye ndi nne na nna ha na ebe obibi ha sitere na ya bịa. Ha n’etolite n’abanye ịbụ onye nne ma ha ga-eburu n’ime ndụ ha niile nghọta ndi ahụ nke na-akwalite ha.”
Dịka onye-ozi nke Onye-nwe-anyị, a na m asị unu ndi iyom nta, ụwa anyị chọrọ ima-mma gị na ịhụnanya gị. Dịrị obi-ọma nye otu onye na ibe ya. Jizọs kuziri anyị ịhụ otu onye na ibe ya na anya ma kpasịrị ndi ọzọ agwa dịka anyị ga-achọ ka akpasịrị anyị. Ka anyị na-agbalị inwe obi-ọma, anyị na-abịaru Ya nso na mmetụta ịhụnanya Ya.
Ezi ụmụnne m nwanyị, ọ bụrụ na unu soro mee ihe n’ụzọ ọbụla gbara njọ ma ọbụ na-abaghị uru—n’otu n’otu ma ọbụ n’igwe—dịka onye-ozi nke Onye-nwe-anyị Jizọs Kraịst n’ihi Mụọ Ya emetụwo m ikwuru unu okwu gbasara isiokwu a dị mkpa. A na m agba-ama na Jizọs Kraịst, Onye-nzọpụta anyị, onye kuziri anyị ịhụ mmadụ ibe anyị n’anya dịka O siri hụ anyị n’anya. A na m ekpe ekpere na anyị ga eme out a, n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.