Ụkpụrụ niile nke Nkwusa-ozi-ọma, Jun 2018
Ihe Ise Ezi-Onye-na-ege Ntị Na-eme
Ige-ntị n’ezie ga-enyere gị aka imata otu esi emezu mkpa niile nke ime-mmụọ na nke anụ-ahụ nke ndi-ọzọ dịka Onye-nzọpụta ga-esi eme.
Okenye Jeffrey R. Holland nke Kworum Ndi-Ozi Iri-na-abụọ kwuru: “Elemanya ọbụna ihe dị mkpa karịa ikwu-okwu bụ ige-ntị. … Ọbụrụ na anyị jiri ịhụnanya gee ntị, anyị agaghị esegbu onwe anyị ihe anyị ga-ekwu. A ga-enye anyị ya—site n’aka Mụọ Nsọ.”1
Ige-ntị bụ aka-ọrụ anyị nwere ike ịmụta. Ige-ntị n’egosi ịhụnanya anyị maka ndi ọzọ, n’enye aka irupụta adị-na-mma siri ike, ma kpọkuo Mụọ-Nsọ iji onyinye nke nghọta igọzi anyị iji nyere anyị aka ghọta mkpa ndi-ọzọ.2 Ndia bụ ụzọ ise ndi anyị nwere ike imetazi otu anyị si ege ntị.
1. Nye Ha Oghere
Ọtụtụ ndi mmadụ chọrọ oghere ha ga-eji achịkọta echiche ha tupu ikwu okwu. Nye ha oghere iji chee echiche ma tupu na mgbe ha kwuchara ihe (lee Jemis 1:19). Nani n’ihi ha ekwusiwo okwu apụtaghị na ha ekwuwo ihe niile ha kwesịrị ikwu. Atụla egwu maka ekwughị-okwu (lee Job 2:11–3:1 na Alma 18:14–16).
2. Gee Ntị
Anyị na-eche echiche ngwangwa karịa otu ndi ọzọ si ekwu okwu. Guzogide ọnwụnwa ahụ ịmabanye mkpebi okwu ma ọ bụ iche echiche n’ihu maka ihe I ga-ekwu mgbe ha mechara (lee Ilu 18:13). Kama, gee ntị buru n’obi ịghọta. Aziza gị ga-adi mma karịa n’ihi ọ ga-abịa site na nghọta dị ukwu karịa.
3. Doo anya
Atụla egwu iju ajụjụ ndi na-edo anya na-ihe I na-aghọtaghị (lee Mak 9:32). Ido-anya na-ebelata nghọtaghe ma gosi mmasi gị na ihe ndi ekwuworo.
4. Tụgharịa uche
Sugharịa ihe I nụrụ na otu I si ghọta ndi ọzọ inwe mmetụta. Nke a n’enyere ha aka imata ma aghọtawo ha ma nye ha oghere ido-anya.
5. Chọta Ọnọdụ Ha-otu
I nwere ike ikwereghị n’ihe niile ekwuru, mana kwere n’ihe I nwere ike na-akọwagheghị mmetụta nke onwe gị. Ịdị nnabata na-enyeaka iwepụ nchegbu na nzere onwe (lee Matiu 5:25).
Onye-isi Russell M. Nelson kuziri na anyị kwesịrị ịmụta ige ntị, ma gee ntị ịmụta site n’aka ndi ọzọ n’otu n’otu.”3 Dịka ị na ege ntị jiri ebumnuche nke mmụta gbasara ndi ọzọ, ị ga-anọ n’ọnọdụ ka mma ịghọta mkpa ha ma nụta mkpalite niile gbasara otu I nwere ike ilekọta maka ndi ahụ nọ gị gburu gburu dịka Onye-nzọpụta ga-eme.
Ige-ntị Dị Ịhụnanya
Otu akụkọ sitere n’aka Okenye Holland na-akọwa ike nke ige-ntị:
“Enyị m Troy Russell nyapụtara ụgbọ trọkụ pikọpụ ya nwayọ nwayọ site na garaji ya. … O metụrụ ya dịka taya nke azụ ya gbara n’elu mkpu mkpu. … Ọ pụtara nanị ịchọpụta na ọmaricha nwa ya nwoke dị afọ itolu, Austen, ka o makpuru ihu ala n’akụkụ ụzọ. … Austen alawo.
“Na-adighị ike ihi-ụra, na-adighị ike ịchọta udo, obi gbawara Troy. … Mana na-ime oge obi mgbawa ahụ ka …Jọn Manning biara. …
Amaghị m n’eziokwu ihe mere Jọn na onye nsiso nta ya jiri bịa nleta ahụ n’ebe obibi Russell. … Ihe m maara bụ na oge udummiri gara aga Nwanne nwoke Manning gbadara ala ma bulite Troy Russell elu site na ihe ike ahụ mere n’ụzọ ahụ dịka nnọọ ka ọ naara ekulite obere Austen n’onwe ya. Dịka … nwanne nwoke dị n’ime ozi-ọma o kwesiri ịbụ, Jọn naanị were nlekọta na ndozi nke ọkwa nchu-aja maka Troy Russell. O bidoro site n’ikwu, ‘Troy, Austen chọrọ ka I guzoro n’ụkwụ gị ọzọ—tinyekwa n’ogige basketball—ya mere a ga m abịa ụtụtụ ọbụla mgbe ọ kụrụ 5:15 a.m. Dịrị na njikere. …’
“Achọrọghị m ị ga,’ Troy gwara m mgbe emesiri, ‘n’ihi anaara m akpọrọ Austen aga. … Mana Jọn siri ọnwụ, ya mere mụ a gaa. Site na ụbọchi nke mbụ gawa, anyị kwuru okwu—ma ọ bụ kama ekwuru m okwu ma Jọn egee ntị. … Na mbụ o siri ike, mana ka oge gara amatara m na achọtawo m ike nke m n’ọdịdị nke Jọn Manning, onye hụrụ m n’anya ma geere m ntị tụtụ anyanwụ emesịa pụta ọzọ n’ime ndụ m.’”4
© 2018 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. All rights reserved. Ebipụtara na USA. Asụsụ Bekee akwadoro: 6/17 Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/17 Ntụgharị nke Ministering Principles, June 2018. Igbo 97925 593