2018
Dụọ Ndụmọdụ maka Mkpa Ha
Septemba 2018


ministering

Ụkpụrụ niile nke Nkwusa-ozi-ọma, Septemba 2018

Dụọ Ndụmọdụ maka Mkpa Ha

I kwesighị ime nkea nanị gị. Idụ ndụmọdụ nwere ike iwete enyemaka I chọrọ iji nyere ndi ọzọ aka.

Chineke akpọkuwo gị ikwusara otu mmadụ ma ọ bụ ezi-na-ụlọ n’ime ngalaba-ukwu gị ma ọ bụ ngalaba-nta gị otu mkpa ha dị. Olee otu I si achọpụta ihe mkpa ndi ahụ bụ? Ụkpụrụ nke ndụmọdụ, nke bụworo ebe nlekwasị anya n’ime Nzukọ-nsọ, bụ ihe dị mkpa.

Mgbe ekwuchara ihe anyị nwere ike itule ịdụ ndụmọdụ maka ya, anyị ga-eme nyocha:

  1. Dụọ ndụmọdụ gị na Nna nke Eluigwe.

  2. Ịdụ ndụmọdụ gị na otu-onye na ezi-na-ụlọ e kenyere.

  3. Ịdụ ndụmọdụ anyị na onye nsiso anyị.

  4. Na ịdụ ndụmọdụ gị na ndi ọzọ e kenyere nye otu mmadụ ma ọ bụ ezi-na-ụlọ ahụ.

Ịdụ ndụmọdụ anyị na ndi ndu anyị dị kwa oke mkpa. Isiokwu Ụkpụrụ niile nke Nkwusa ozi-ọma nke na-abịa n’ihu n’ime Liahona ga-enyocha ịdụ ndụmọdụ anyị na ndi ndu na kwa oke na ọrụ nke ajụjụ-ọnụ nkwusa ozi-ọma n’ime usoro ahụ.

Ihe anyị na-adụ ndụmọdụ maka ya

Ighọta ihe ndi achọrọ dị oke mkpa maka nkwusa ozi-ọma nye onye ọbụla na ibe ya. Mana kedụ ụdị ọdịdị mkpa ndi ahụ na-adi, ma e nwere ihe karịrị mkpa nke anyị nwere ike ịchọpụta?

Mkpa nwere ike ịbịa site n’ọtụtụ ọdịdị. Ndi anyị n’ejere ozi nwere ike na-enwe ịma-aka-mgba nke n’emetụ n’obi, gbasara ego, nke anụ ahụ, nke agụm akwụkwọ, na ndi ọzọ. Ụfọdụ mkpa dị elu karịa ndi ọzọ. Ụfọdụ ka aga enye anyị ngwa ọrụ iji nye aka; ndi ọzọ nwere ike ịchọ ka anyị denye aha anyị inye aka n’onwe anyị. N’ime mgbalị anyị inye aka belata mkpa nke ụwa, echefukwala na ọkpụkpọ oku anyị ikwusa ozi-ọma gunyekọtara inyere ndi ọzọ aka gaa n’ihu n’ụzọ nke ọgbụgba-ndụ, na-akwado ma na-anata emume-nsọ ọkwa-nchu-aja niile dị mkpa maka mbuli-elu.

Na-mgbakwunye n’ịdụ-ọdụ gbasara mkpa nke otu mmadụ ma ọbụ ezi-na-ụlọ, anyị kwesiri ịchọ mmụta ike ha. Kedụ ihe ha na-achọghị enyem-aka maka ya? Kedụ ikike na onyinye ndi ha nwere nke nwere ike igọzi ndi ọzọ? Olee otu ha siri tozuo n’ụzọ pụrụ iche iji nye aka rulite ala-eze nke Chineke? Ike nke otu mmadụ nwere ike ịdị mkpa ịghọta dịka mkpa ya nwoke ma ọbụ nwanyị.

Ịdụ ndụmọdụ gị na Nna nke Eluigwe

Otu n’ime eziokwu dị n’etiti okwukwe anyị bụ na Nna nke Eluigwe n’ekwuru ụmụ Ya okwu (lee Ndepụta nke Okwukwe 1:9). Mgbe anyị natara ọrụ ọhụrụ ikwusa ozi-ọma nye otu onye, anyị kwesịrị ịnara ndụmọdụ n’aka Nna nke Eluigwe n’ekpere, na-achọ mmata na nghọta maka mkpa ha na ike ha niile. Usoro ndụmọdụ site na-ikpe ekpere kwesịrị ịga n’ihu n’ime ọrụ nkwusa ozi-ọma anyị niile.

Ịdụ ndụmọdụ anyị na Ndi-mmadụ na Ezi-na-ụlọ niile

Otu na mgbe anyị sịrị bịaruo ndi mmadụ na ezi-na-ụlọ ahụ akpọrọ anyị oku nso nwere ike dịrị iche site notu ọnọdụ sịrị dị, mana ịdụ ndụmọdụ ihu na ihu gị na mmadụ ahụ ma ọbụ ezi-na-ụlọ ahụ dị oke mkpa iwulite mmekọrịta na nghọta mkpa ha, tinyekọta otu ha si chọ enyemaka. Ụfọdụ ajụjụ nwere ike chọọ ichere tutu mmekọrịta bara uru apụta ihé. Ebe a n’enweghị otu onye n’oge ahu ga-eme nke ahụ, tulee ihe ndi na-esote:

  • Chọpụta otu na mgbe ha kachasi chọọ ka ezute ha.

  • Mụta gbasara ihe ha chọrọ na otu ha si dịrị.

  • Jiri nchepụta bịa maka otu I nwere ike I si nye aka, ma jụọ maka nchepụta nke ha.

Dịka anyị na ewulite ntụkwasị obi, tulee ikparịta ụka maka mkpa niile nke otu onye ma ọ bụ ezi-na-ụlọ. Jụọ ajụjụ dịka mkpalite Mụọ Nsọ siri dị.1 Maka ọmụmatụ:

  • Gịnị bụ aka mgba ndi ha na-ezute?

  • Gịnị bụ ebumnuche niile nke ezi-na-ụlọ ma ọbụ nke otu onye? Maka ọmụmatụ, ha chọrọ ịdị mma karịa n’ịnọgide na-eme nnọkọta ezi-na-ụlọ mgbe ọbụla, ma ọbụ dabere n’onwe karịa?

  • Kedụ otu anyị nwere ike inyere ha aka maka ebumnuche ha na ịma-aka-mgba ha niile?

  • Kedụ emume-nsọ nke ozi-ọma ndi na-eme n’ime ndụ ha? Olee otu anyị nwere ike isi nyere ha aka kwado?

Chetakwa inye enyemaka dị kwọmkwem, dịka, “Olee abalị anyị nwere ike iwetere unu nri n’ime izu-ụka nkea?” Onyinye na-adabaghị, dịka, Gwa anyị ma ọbụrụ ma enwere ihe ọbụla anyị nwere ike ime,” anaghị enye aka ma ọlị.

Ịdụ ndụmọdụ anyị na Onye-nsiso Anyị

N’ihi gị na onye nsiso gị enweghị ike ịnọkọta n’oge ọbụla mgbe unu na-ekwukọrịta gị na otu onye ahụ ma ọbụ ezi-na-ụlọ, ọ dị mkpa ichikọta ma dụkọrịta ndụmọdụ ọnụ dịka I na-achọ mkpali mụọ dịka ndi nsiso. N’ebe a bụ ụfọdụ ajụjụ itule:

  • Kedu na olee ọtụtụ mgbe ka unu ga ezi-ozi n’etiti unu dịka ndi nsiso?

  • Kedu otu unu n’otu n’otu ga esi jiri ike nke onwe unu nye-aka maka mkpa ezi-na-ụlọ ma ọbụ nke otu onye?

  • Gịnị bụ ihe ndi I mụtaworo, kedụ ahụmihe ka I nweteworo, na kedụ mmetụta I nweteworo site na oge ikpeazụ I kwuru gbasara otu mmadụ ahụ ma ọbụ ezi-na-ụlọ?

Ịdụ ndụmọdụ anyị na Ndi-ọzọ Ekenyere

O nwere ike ịdị mma site n’oge ruo n’oge ikwuru ndi ndi ekenyere ọrụ ikwusa ozi-ọma nye otu mmadụ ma ọ bụ ezi-na-ụlọ ahụ nke I na-eme.

Zie ozi iji Dozie Ịma-aka-mgba

Okenye Chi Hong (Sam) Wong nke Iri Asaa n’etinye akụkọ sitere na Mak 2 n’ime ụbọchi anyị iji gosi otu ịdụkọta ndụmọdụ ọnụ si mee ya adị ire maka mmadụ anọ ịchọpụta otu esi ahapụ otu nwoke nwere ahụmkpọnwụ ịnọ n’etiti Jizọs.

“O nwere ike ime dịka nkea,” ka Okenye Wong kwuru. Mmadụ anọ naara emejupụta otu ọrụ sitere n’aka ụkọchukwu ha iga nleta, n’ebe obibi ya, otu nwoke onye na-arịa ahụmkpọnwụ. … N’ime nzukọ otu nnyocha ngalaba-ukwu kacha nso nso, mgbe adụchara ndụmọdụ n’otu ọnụ gbasara mkpa niile dị n’ime ngalaba-ukwu, ụkọchukwu ahụ enyepụwo ọrụ ‘nnapụta’. Ndi mmadụ anọ ndia ka ekenyere inyere nwoke nkea aka. …

“[Mgbe ha rutere n’ụlọ ahụ ebe Jizọs nọ,] ime ụlọ ahụ jupụtara n’igwe mmadụ. Ha enweghị ike igabanye site n’ọnụ ụzọ. O doro m anya na ha nwara ihe niile ha nwere ike icheta, mana ha enwegh ike igafe ma ọlị. … Ha dụkọtara ndụmọdụ ọnụ maka ihe ọzọ aga eme—otu ha ga-esi kpọta nwoke ahụ n’aka Jizọs maka ọgwụgwọ. … Ha ji atụmatụ wee bịa—na-abụghị nke dị mfe, mana ha tinyere ya n’ọrụ.

“… ‘Ha kpughere elu-ụlọ ebe ọ nọ: ma mgbe ha mepeworo ya, ha budatara akwa ebe onye ọrịa nke ahụmkpọnwụ ahụ dinara’ (Mak 2:4). …

“… ‘Mgbe Jizọs hụrụ okwukwe ha, ọ siri onye ọrịa ahụmkpọnwụ ahụ, Nwa nwoke, njọ niile ka agbaghaworo gị’ (Mak 2:5).”2

Ịkpọ-ókú Ime

Okenye Dieter F. Uchtdorf nke Kworum Ndi Ozi Iri na Abụọ gbara ume si, “Dụkọrịta ndụmọdụ ọnụ, tinye ngwa ọrụ niile n’ọrụ, chọọ mkpali mụọ nke Mụọ Nsọ, jụọ Onye-nwe-anyị ajụjụ maka nkwenye Ya, ma mgbe ahụ chilie aka uwe gị ma banye n’ọrụ.

“A na m ekwe gị nkwa: ọbụrụ na I soro usoro nkea, I ga-anata odudu dị kwọmkwem maka onye, ihe, mgbe, and ebe nke iwete n’ụzọ nke Onye-nwe-anyị.”3

Hụba-ama

  1. Lee Kwusaa Ozi-ọma M: Akwụkwọ ntụzi-aka nke Ozi Mgbasa Ozi-ọma (2004), 183.

  2. Chi Hong (Sam) Wong, “Nnapụta n’ime Ịdị-otu,” Liahona, Nov. 2014, 14–15.

  3. Dieter F. Uchtdorf, “Inwete n’Ụzọ nke Onye-nwe-anyị,” Liahona, Nov. 2011, 55.