Ụkpụrụ niile nke Nkwusa-ozi-ọma, Ọktoba 2018
Ịchọta Enyemaka iji Nyere Ndi-ọzọ Aka
Kedu otu anyị ga-esi agụnye ndi ọzọ mgbe anyị chọrọ enyemaka n’ime mgbalị anyị ikwusa-ozi-ọma? Sọrọ n’ime ajụjụ-ọnụ nkwusa-ozi-ọma na nzukọ kansụl niile nke Sọnde mbụ.
Mgbe ọrịa sclerosis dobere Katty n’ime oche ndi ngọrọ, ọ chọpụtara na o nwere mkpa enyemaka abalị ọbụla isite na oche ya dinara na akwá ya. Ọrụ ahụ dịịrị nnukwu nke otu onye-otu ọbụla. Ya mere kworum ndi okenye nyere ndụmọdụ gbasara ọnọdụ ya ma kpebie ime usoro iji nyere ya aka mgbede ọbụla.1
Dịka anyị na-abịa mata mkpa niile na ike niile nke ndi ahụ anyị n’ejere ozi, anyị nwere ike chọta na anyị chọrọ enyem aka imetazu mkpa ha niile. Ajụjụ-ọnụ nkwusa-ozi-ọma niile na nzukọ kansul Sọnde-mbụ niile bụ ohere abụọ eji akpa nkata otu esi agụnye ndi ọzọ n’ụzọ ziri ezi.
Ajụjụ-ọnụ Nkwusa-ozi-ọma
Ajụjụ-ọnụ n’ime otu ụzọ n’ụzọ anọ ndia niile n’etiti ụmụnne ndi nwanyị nkwusa-ozi-ọma na ndi-isi Otu-Enyem-aka ma ọbụ ụmụnne ndi nwoke nkwusa-ozi-ọma na ndi-isi kworum ndi okenye bụ nanị ụdị aziza anyị na-enye gbasara ndi anyị na-ekwusara ozi-ọma. Ajụjụ-ọnụ ahụ bụ otu ohere nnọọ n’ime otu ụzọ n’ụzọ anọ ọbụla iji (1) nwee ndụmọdụ gbasara ike, mkpa, na aka-mgba niile nke ezi-na-ụlọ na mmadụ ndi ekenyere; (2) mata ihe bụ mkpa nke kworum, Otu-Enyem-aka, ma ọbụ kansụl ngalaba-ukwu nwere ike inye aka maka ya; na (3) mụta site n’aka ndi ndu niile ma nwete mgba-ume n’ime mgbalị nkwusa-ozi-ọma.
Onye-isi kworum ndi okenye na onye-isi Otu-Enyem-aka n’ezi-ozi mkpa ndi dị mkpa n’aka bishọp n’onwe ya ma ga-anata ndụmọdụ na ntụzi-aka site n’aka ya.
I nwere ike ịchọta ozi gbasara ajụjụ-ọnụ nkwusa-ozi-ọma na ministering.lds.org.
Ime Ajụjụ-ọnụ Nkwusa-ozi-ọma Nwe Nzube
N’ikwado nkwupụta nke Onye-isi Russell M. Nelson na usoro nkwusa-ozi-ọma ga-abụ ebe njikọ ebe ihe gbasara Nzukọ-nsọ ga anọ, Okenye Gary E. Stevenson nke Kworum Ndi-Ozi Iri-na-abụọ kuziri, “Nghọta nke uche ya … nwere ike echepụta ya dịka otu dị mma esi kuziere ụmụnne ndi nwoke na ụmụnne ndi nwanyị nkwusa-ozi-ọma ma tinye n’ọrụ n’ime ajụjụ-ọnụ nkwusa-ozi-ọma.”2
Ihe ise maka ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị nkwusa-ozi-ọma:
-
Gaa n’ajụjụ-ọnụ ahụ na-ịchọ ndụmọdụ. Dịrị na njikere ịmụta.
-
Dịrị na njikere ịkparịta ụka mkpa niile nke I nwere ike ịchọ enyem-aka mezuo.
-
Tinye uche gị niile n’elu ike na ume niile nke mmadụ ahụ, n’abụghị nanị na mkpa.
-
Nwee ndụmọdụ gabasara ihe mpụta nke ga egosi na nkwụsa-ozi-ọma gị gara nke ọma.
-
Kpọtụrụ ndi-isi inwe ndụmọdụ n’etiti ajụjụ-ọnụ n’otu ụzọ n’ụzọ anọ dịka ejiri chọọ.
Ihe ise maka ndi ndu:
-
Ajụjụ-ọnụ ekwesighị ito ogologo, kama hazie oge ga-ezu iji gaa nleta n’ebe ga-ekwe maka mkparita-ụka bara-uru.
-
Jiri ohere ahụ kwusaa-ozi-ọma nye nwanne nwoke ma ọbụ nwanne nwanyị nkwusa-ozi-ọma
-
Ajụkwala ajụjụ nke n’enye mmetụta ka I n’agụ ọnụ-ọgụgụ ugboro ole I gara nleta ma ọ bụ ka ọ bụrụ na I gawo leta onye ahụ (“I merenụ nkwusa-ozi-ọma gị eme?”) Jụọ ajụjụ nke n’enyekwu nkwado omume ndi achoro (“Kedụ mmetụ I nweteworo dịka I kpeworo ekpere maka ezi-na-ụlọ ahụ? Gịnị mere mgbe I mere ihe n’ihi mmetụ ndi ahụ?”).
-
Gee ntị n’ezie ma dedata ihe n’akwụkwọ.
-
Nakọrịta ndụmọdụ ọnụ. Ndi-nsiso nkwusa-ozi-ọma tozuru irite mkpughe maka ndi ahụ ekenyere ha ikwusara ozi-ọma.
Ajụjụ na ọsisa ndi gbasara Ajụjụ-ọnụ Nkwusa-ozi-ọma
Gịnị bụ ajụjụ-ọnụ nkwusa-ozi-ọma?
Ọ bụ mkparịta-ụka n’etiti ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị nkwusa-ozi-ọma na onye otu n’ime ndi-isi kworum ndi okenye ma ọbụ n’etiti ụmụnne nwanyị nkwusa ozi-ọma na onye-otu ndi-isi Otu-Enyem-aka n’ọnọdụ nke ga-ekwe ha ichọta ma nata nkwalite-mụọ sitere n’aka Mụọ Nsọ. Ya mere, ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị nkwusa-ozi-ọma nwere ike inwe nkwalite-mụọ iji lekọta, hụ n’anya, kuzie ihe, ma kasie obi n’ụzọ nke Onye-nzọpụta ahụ.
Ajụjụ-ọnụ otu-ụzọ n’ụzọ anọ ndia o kwesịrị I bụ ihe ana eme n’ihu n’ihu?
Otu o kwesịrị ana eme ya n’ihu n’ihu, mana enwekwara ike ime ya n’ekwe ntị ma ọbụ n’ikuku mgbe izute n’ihu n’ihu adighi ire. N’ozuzu, ndi nsiso abụọ ahụ ga-eso n’ajụjụ-ọnụ mgbe o kwesịrị.
Gịnị bụ ebumnobi nke ajụjụ-ọnụ nkwusa-ozi-ọma?
Ajụjụ-ọnụ nkwusa-ozi-ọma bụ oghere maka ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị inyogharị ọnọdụ nke oge ahụ, tụọ atụmatụ ọdịnihu, ma nwete enyem-aka achọrọ nye ndi mmadụ ahụ ma ọbụ ezi-na-ụlọ ndi ha n’ekwusa ozi-ọma nye. Ọ bụ ohere ikwu gbasara ihe enyem-aka ndi kworum na Otu-Enyem-aka nwere ike iwete.
Olee otu m si ejikwa okwu nzuzo ma ọbụ okwu ndi n’enwe mmetụta ọsọ ọsọ?
Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị nkwusa-ozi-ọma n’ekesa ozi nzuzo nanị n’etiti onye-isi kworum ndi okenye ma ọbụ onye-isi Otu-Enyem-aka –ma ọbụ naka bishọp n’onwe ya. Ozi nzuzo ma ọbụ ozi n’enwe mmetụta ọsọ ọsọ ekwesịghị ka ekwuo ihe gbasara ya na nzukọ kansul Sọnde-mbụ.
Nzukọ Kansụl Sọnde-mbụ
Na mgbakwunye nye ajụjụ-ọnụ nkwusa-ozi-ọma, nzukọ kansụl sọnde-mbụ bụ ụzọ ọzọ ịgụnye ndi ọzọ n’ime nkwusa-ozi-ọma. N’ime nzukọ Otu-Enyem-aka na kworum ndi okenye niile, nkwalite mụọ nwere ike ịbịara ndi nọ mgbe ana eme ihe site na Mụọ Nsọ na site na ndi ọzọ nọ n’ime otu ahụ.
Ebumnuche nke nzukọ kansụl bụ ka:
-
Dụkọrịa ndụmọdụ ọnụ gbasara oke na ọrụ niile, oghere niile, na ihe iche aka mgba niile nke dị n’etiti ha;
-
Mụta site n’echiche onye ọbụla n’ime unu na nhumiihe niile; na
-
“Tụpụta ụzọ eji etinye n’ọrụ mmetụta anatara site na Mụọ Nsọ.”3
Nzukọ kansụl karịrị mkparịta-ụka: nzukọ ndi ahụ n’edubanye anyị ime dịka ndi mmadụ ma ọbụ dịka ndi otu dịka esi kwalite anyị site na Mụọ ahụ. Ndi-otu nwere ike inwete mmetụ ọchịchọ imetazu ọrụ nke Onye-nwe n’ihi nzukọ ndia niile.
Ịkpọ-ókú Ime
“Ekpere anyị taa,” ka Okenye Jeffrey R. Holland nke Kworum nke Ndi-Ozi Iri-na-abụọ, “bụ na nwoke na nwanyị niile –na ndi nkom nta na ndi iyom nta tolitere –ga adị nranye miri emi karịa maka nlekọta sitere n’ala ala obi n’ihi onye-ọzọ na ibe ya, nke kpalirị nanị site na ịhụnanya nke Kraịst iji mee otu ahụ.”4
© 2018 site n’aka Intellectual Reserve, Inc Ikike Mbipụta nile ka e dokwara Ebipụtara na USA. Asụsụ Bekee akwadoro: 6/17 Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/17 Ntụgharị nke Ministering Principles, October 2018. Igbo. 15053 593