Ozi nke ndi Ịsi Nduzi nke mbụ, Onwa Nọvemba 2018
Nsoro nke ndị-Nwanyị n’ime Mkpọkọta nke Ndị-Israel.
A na m enye unu arịrịọ nke onye-amụma, ndị-nwanyị nke Nzukọ-nsọ, ịhazi ọdịnihu site na inye-aka kpọkọta Israel kposasịrị-ekposa.
Ọ bụ ihe juru-anya mụ na unu ịnọ, ezi ụmụnne m nwanyị. Ikekwa ihe mere na nso-nso a ga-enye unu uche ihe m chere gbasara unu na onyinye nịịle dị-nsọ unu nwere.
Otu ụbọchị ka m n’agwaa ndị-mmadụ okwu n’ime South America, obi bidoro ịtọ m oke-ụtọ gbasara isi-okwu m, ma na otu oge, E kwuru m, “Dịka nne nke ụmụ iri, E nwere m ike gwaa unu na…”.Ma mgbe ahụ A gara m n’ihu ikwupụ okwu m.
A ghọtaghị m na E kwuru m nne. Onye-ntụgharị-asụsụ m, cheree na ekwufiere m okwu, gbanwere mkpụrụ-okwu nne nye nna, ya mere ndị mmadụ amataghị na akpọrọ m onwem dịka nne. Kama nwunye m Wendy nụrụ ya, nwere obi-ụtọ na mmehie m.
N’ime oge ahụ, ọchịchọ nke obi m ime ihe dị-iche n’ime ụwa---dịka nanị nne n’eme—ka m gosipụtara. N’ime ọtụtụ afọ, mgbe ọbụla ajụrụ M ihe mere M ji họrọ ị bụ dọkinta, ọziza m na-abụkwa otu ihe ahụ: “Maka enweghị M ike họrọ ị bụ nne.”
Biko mata na mgbe-ọbụla M kwuru nne A naghị m ekwu nanị maka ndị-nne mụrụla ma-ọbụ kpọrọla ụmụ n’ime ụwa nke a. A na m ekwu gbasara ha nịịle ndị nke ụmụ-nwanyị toro-eto Nne na Nna Elu-igwe’anyị. Nwanyị ọbụla bụ nne maka okike ya
Ya mere n’abali a, dịka onye nna nke ụmụ iri—itolu na otu nwa-nwoke---ma dịka Onye-isi nke Nzukọ-nsọ, A na m ekpe-ekpere ka unu mata ka obi m dị ebe unu nọ--gbasara onye unu bụ na ihe ọma nịịle unu n’eme O nweghị onye ga-emeli ihe nwanyị ezi-omume nwere-ike ime. O nweghị onye nwere-ike na-arụ-ọrụ n’ime nke onye nne.
Ndị-nwoke nwere-ike ma ọtụtụ mgbe n’egosi ịhụn’anya nke Nna nke Elu-igwe na Onye-nzọpụta nye ndị-ọzọ. Kama ndị-nwanyị nwere onyinye pụrụ-iche maka ya----onyinye dị-nsọ. Unu nwere ike ịmata ihe mmadụ chọrọ—ma mgbe ha chọrọ ya. Unu na-esetịpụ-aka, kasie-obi, kuzie, ma gbaa mmadụ ume mgbe ọ dị ya mkpa.
Ndị-nwanyị n’ahụ ihe nịịle n’ụzọ dị-iche karịa ndị-nwoke, ma oo, anyị chọrọ akọ na uche unu! Okike unu na edu unu iche maka ndị-ọzọ mbụ, ịtule ihe omume anyị ọbụla g’eme ndị-ọzọ.
Dịka Onye-isi Eyring rụtụrụ aka, Ọ bụ Nne anyị Eve dị-ebube---jiri anya eji ahụ-ụzọ dị mkpa nke atụmatụ nke Nna anyị nke Elu-igwe—onye bidoro ihe anyị n’akpọ “Ọdịda.” Nchọrọ amamihe ya dị egwu na nkwado nke Adam mere ka atụmatụ nke Chineke ga n’ihu. Ha mere ka ọdị-ire na onye-ọbụla n’ime anyị biara n’ụwa, ịnata arụ, ma gosi na anyị g’ahọrọ iguzo maka Jisus Kraịst ugbua, dịka anyị mere tutu anyị nwee anụ-arụ
Ụmụnne m nwanyị m hụrụ n’anya, unu nwere onyinye na mmasị nịịle pụrụ-iche dị-nsọ. Abali a A na m a gbaa unu ume, ijiri olile-anya nịịle nke obi m, ịkpe-ekpere ị ghọta onyinye nịịle onyinye nịịle unu dị-nsọ—inye echiche, were mee ihe, ma gbasa ha mbara, karịa otu imerela. Unu ga-agbanwe ụwa dịka unu n’eme nke a.
Dịka ndị-nwanyị, unu na-akwalite-mụọ ndị-ọzọ ma dobe usoro itozu-oke nke nńomi. Ka m kọrọ unu nke ntakịrị ịma-ọkwa abụọ dị-mkpa amara na ọgbakọ zuru-ọha gara-aga. Unu, ụmụnne m nwanyị, dị mkpa maka ha.
Nke mbụ, ije-ozi nlekọta. Usoro kacha-elu maka nkwusa-ozi bụ nke Onye-nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Ka ozuru-ọha, ndị-nwanyị nọ, ma nọrọkwa usoro ahụ nso karịa ndị-nwoke mgbe-ọbụla. Mgbe ị na-ekwusa-ozi, ị na esoro mmetụta-ahụ gị nịịle inyere onye-ọzọ aka inweta nhụmihe nke ịhụn’anya nke Onye-nzọpụta Mmetụta okike ahụ ikwusa-ozi dị n’ime ndị-nwanyị ezi-omume. A ma m ndị-nwanyị n’ekpe-ekpere ụbọchị dum, “Onye ka gị chọrọ ka m nyere-aka taa?”
Tupu ịma-ọkwa nke April 2018 gbasara ụzọ ka elu na nsọ nke nchekasị maka ndị-ọzọ, ihe ụfọdụ ndị nwoke n’eme bụ ịkapụ ọrụ nkuzi-ebe-obibi ha dịka “emelaya” ma ga n’eme ihe ọzọ.
Kama mgbe gị ị ji kuzie ihe kwalitere mụọ anyị legidere anya n’ije-ozi nlekọta Thus, it was how you visit taught that inspired our upward shift to ministering.
Nke abụọ, n’ime ntụgharịkọta-uche zuru-ọha gara-aga, anyị megharịkwara kworum nịịle Ọkwa-nchụ-aja Melkizedek. Mgbe anyị n’ekpe-ekpere otu esi enyere ndị-nwoke nke nzukọ-nsọ aka imezi oke na ọrụ ha nịịle, anyị jiri nwayọ lee ụkpụrụ nke Otu Enyem-aka.
N’ime Otu Enyem-aka, ndị-nwanyị gbara afọ na ọnọdụ dị iche-iche n’ezukọ-ọnụ. Ogo ọbụla nke ndụ nwere aka-mgba nịịle pụrụ-iche, ma agbanyeghị, ebe-ahụ unu nọ, izu-ụka ọbụla, emekọrịta, n’eto ma n’akuzi ozi-ọma ahụ ọnụ, ma n’emepụta ihe dị-iche n’ime ụwa.
Ugbua, isoro ụkpụrụ unu, ndị ji Ọkwa-nchụ-aja Melkezedek bụ ndị-otu nke kworum ndị-okenye. Ndị nwoke ndị a gbara afọ site na 18 ruo 98 (ma-ọbụ karịa), nwekwara nhụmihe nịịle nke ọkwa-nchụ-aja na Nzukọ-nsọ. Ụmụnne ndị-nwoke nke a ugbua nwere-ike kee njikọta ụmụnna siwanyere-ike, mụkọta ihe ọnụ, ma gọzie ndị-ọzọ karịa.
Unu chetara na June gara-aga, Nwanne-nwanyị Nelson na Mụ kwara ndị-ntorobia nke Nzukọ-nsọ okwu. Anyị kpọrọ ha ka ha soro otu nke ndị-ntorobia nke Onye-nwe-anyị iji nye aka kpokọta ndị Israel n’ụzọ abụọ nke akwa-mgbochi. Mkpokọta nke a bụ “aka-mgba kachasị, mkpa kachasi, na ọrụ kachasi nụwa taa”!1
Mkpọkọta ndị-ntorobia chọsiri ndị-nwanyị ike, maka ndị-nwanyị n’edozi ọdịnihu. Ya mere abali a, A na m enye unu arịrịọ nke onye-amụma, ndị-nwanyị nke Nzukọ-nsọ, idozi ọdịnihu site na inye-aka kpọkọta ndị-Israel gbasasịrị.
Ebee ka I nwere-ike bido?
Ka m nye ịkpọ-oku anọ:
Nke mbụ, A na m akpọ unu ka ị soro buo-ọnụ abali iri ịhapụ social media ma-ọbụ media ọzọ n’eweta uche nwere ntụpọ n’obi unu. Kpee ekpere ịmata ihe ndị ị ga-ewepụ mgbe ị n’ebu-ọnụ. Ihe ibu-ọnụ ụbọchị iri g’emere unu ga-atụ unu n’anya. Gịnị ka ị g’ahụ mgbe ịkwụsịrị ihe nke ụwa ndị ahụ n’egbu mụọ gị? E nwere ihe dị-iche na ebe unu ugbua chọrọ imefu oge na ike gị? E nwere ihe gbanwere na ndụ gị—ọbụnaghị nanị ntakịrị? A na m agwa gị ka idetuo mezuo ihe ọbụla gbanwere.
Nke abụọ, A na m asị gị gụọ Akwụkwọ nke Mọmọn site ugbua ruo ngwucha afọ. Dịka ọ n’adị ka ihe agaghị ekwe omume n’ime ndụ gị, ọbụrụ na ị ga-ekwe were nzube juru-eju nke obi , Onye-nwe-anyị genyere gị aka chọta ụzọ imezu ya. Ma, mgbe ị na-amụ ihe jiri ekpere, A na m ekwe gị nkwa na elu-igwe ga-emepere gị. Onye-nwe-anyị geji nkwalite-mụọ na mkpughe karịrị gozie gị.
Dịka ị na-agụ, A na m akwado gị ka ị detuo ama-okwu ọbụla kwuru maka Onye-nzọpụta. Mgbe ahụ, nwee obi gbasara ịkwu maka Kraịst, n’ańụrị-ọńụ n’ime Kraịst, n’ekwusa maka Kraịst unu na ezi-na-ụlọ na ndị-enyi unu nịịle.2 Unu na ha g’adịwanye Onye-nzọpụta nso site na ime nke a. Ma mgbanwe nịịle, ọbụnaghị ọrụ-ebube nịịle , ga-ebido mewa.
Ụtụtụ a amara-ọkwa gbasara usoro ọhụrụ-ịmụihe Nzukọ-nsọ kwadoro Sọnde ọbụla n’ebe-obibi. Unu, ụmụnne m nwanyị, dị mkpa nye inwe-mmeri nke nkuzi-ozi-ọma nke a dị ọhụrụ. Biko kuziere ndị ahụ ị hụrụn’anya ihe ịmụtara site n’akwụkwọ-nsọ nịịle. Kuziere ha otu esi a dabere Onye-nzọpụta maka ike ọgwụgwọ-ọrịa na mkpochapụ Ya mgbe ha mmehiere. Ma kuziere ha otu esi enweta ike ịgbaa-ume Ya ụbọchị ọbụla nke ndụ ha nịịle.
Nke atọ, hiwe usoro nke ịga temple. Nke a nwere-ike chọọ ịchụ-aja karịa n’ime ndụ gị. Itinyekwu oge n’ime temple g’enye Onye-nwe-anyị ohere ịkuziri gị otu esi enweta ike ọkwa-nchụ-aja Ya nke enyeworo unu n’ime temple Ya. Maka ndị ahụ nebighị nso na temple, A na m asị ka unu were ekpere mụọ gbasara temple nịịle n’ime akwụkwọ-nsọ nịịle na n’ime mkpụrụ-okwu nịịle nke ndị-amụma nịịle dị-ndụ. Chọọ I mata karịa, ị ghọta karịa, ị nwe-mmetụta karịa gbasara temple nịịle karịa otu imerela.
N’ime ifee-ofufe nke ụwa ndị-ntorobịa June gara-aga, E kwuru m gbasara otu nwa-nwoke onye ndụ ya gbanwere mgbe nne na nna ya jiri flip phone gbanwe smartphone ya. Nne nke nwa-nwoke a bụ agụ-nwanyị nke okwukwe. Ọ hụrụ ka ọkpara ya n’enwe nchọrọ nịịle nwere-ike ịgbochi ya ị ga mishịọn. Ọ jiri ekpere ya ga temple ịmata otu kachasị nma iji nyere ọkpara ya aka. Mgbe ahụ o mere ihe uche ya gwara ya.
Ọ sịrị: “E nwere m mmetụta nke Mụọ n’edu m ile phone nke ọkpara ya n’oge dị iche-iche ịhụ ihe ndị n’apụta. A maghị m ka esi akpọ smartphone ndị a, kama Mụọ-nsọ duru m ịmata ihe ndị m’amaghị! A ma m na Mụọ-nsọ n’enyere ndị nne na nna aka iduzi ụmụ ha. [Na mbụ] ọkpara m wesịrị m iwe. … Kama mgbe nanị ụbọchị atọ gachara, o kelere m! Ọ hụrụ ihe dị-iche.”
Omume na ịkpa-agwa nke ọkpara ya gbanwere nke ukwuu. O bidoro ịnye-aka n’ebe-obibi, nwee ọńụ karịa, ma n’ege-ntị karịa na nzukọ-nsọ. Ọ hụrụ ọrụ temple baptistery n’anya oge ọ rụrụ ya. Ma ugbua ọ na-akwado ị ga mishọn.
Oku m nke anọ, maka unu bụ ndị toro-eto, bụ ka unu banye nime Otu-Enyem-aka. A na m akwado ka unu mmụta okwu nke Otu Enyem-aka ugbua. Ọ n’akwalite mụọ. Ọ nwere-ike duo unu imepe okwu e bu m n’obi maka ndụ unu. A na m asịkwa ka unu hụ ezi-okwu nịịle n’ime ịma-ọkwa Otu Enyem-aka ebipụtara 20 afọ gara-aga.3 Nke dị ka ya nke ịma-ọkwa nke a goro na mgbidi n’ime ụlọ-ọrụ nke Otu Ndị-isi Mbụ. A na m ejupụta na ọńụ mgbe ọbụla m gụrụ ya. Ọ n’akọwa onye unu bụ na onye Onye-nwe-anyị chọrọ ka unu bụrụ n’oge nke a mgbe unu n’eme oke unu inye-aka kpokọta ndị Israel gbasasịrị
Ụmụnne m nwanyị, anyị “chọrọ unu! Anyị chọrọ ike unu, mgbanwe unu, nkwenye unu, ikike unu, idu amamihe olu unu voices.”4 Anyị enweghị-ike kpokọta Israel ma unu anọghị ya.
A hụrụ m unu n’anya ma n’ekele unu ma ugbua n’agọzi unu inwe ike hapụ ihe nke ụwa dịka unu n’enye aka n’ọrụ nke a dị-mkpa. Ịrụkọta-ọnụ anyị nwere-ike ime ihe nịịle Nna anyị nke Elu-igwe chọrọ ka anyị mee iji kwado ụwa maka Ọbịbịa nke Abụọ nke Ọkpara Ya.
Jizọs bụ Kraịst ahụ.Jizọs Kraịst Nke a bụ Nzukọ-nsọ Ya. Nke a A na m agbaa-ama n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.