2019
Ebumnuche Nke Ga Agbanwe Ije-ozi nlekọta Anyị
Jenụwarị 2019


Foto, oyiyi
ministering

Ụkpụrụ niile nke ije-ozi Nlekọta, Jenụwarị 2019

Ebumnuche Nke Ga Agbanwe Ije-ozi nlekọta Anyị

Ebe enwere ọtụtụ ebumnuche nke ije-ozi nlekọta, mgbalị anyị kwesịrị I bụ nke eduziri site na ọchịchọ inyere ndị ọzọ aka nwete mgbanwe nke onwe miri emi ma dịrịzie dịka Onye-nzọpụta.

Mgbe anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya dịka otu Onye-nzọpụta sị ahụ, anyị na-achọ inyere ha aka dịka O sịrị nye. Dịka Ezi Onye-ọzụzụ atụrụ, Ọ bụ ọmụmatụ kacha nke ije-ozi nlekọta pụtara ihe.

N’igosi ije-ozi nlekọta anyị n’ụzọ nke Ya, ọ dị mkpa icheta na mgbalị Ya inwe ịhụnanya, ibuli, ije ozi, na ịgọzi nwebụụrụ ebumnobi kaacha dị elu karịa igbo mkpa nke oge ahụ. N’ezie Ọ maara maka mkpa ha kwa ụbọchị ma nwee ọmịiko maka ntaram ahụhụ ha nke ugbua. Ya mere Ọ gwọrọ ọrịa, nye nrị, gbaghara, ma kuzie ihe. Mana Ọ chọburu ime ọzọ karịa inye aka maka mkpa nke taa (lee Jọn 4:13-14). Ọ chọburu ka ndị ahụ nọ Ya n’akụkụ soro Ya (lee Luk 18:22; Jọn 21:22), mata Ya (lee Jọn 10:14; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:22-24), ma rute ike mmepụta ha si na chi (lee Matiu 5:48). Nke ahụ bụ eziokwu taa (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 67:13).

Enwere ụzọ dị ọtụtụ nke ukwuu anyị nwere ike isi gọzie ndị ọzọ, kama mgbe ebumnobi njedebe nke ije-ozi nlekọta bụ iji nyere ndị ọzọ aka bịa mata Onye-nzọpụta ma dịrịzie dịka Ya, anyị ga na arụ ọrụ gaa n’ihụ n’ụbọchị ahụ mgbe anyị agaghị abịa ikuziri onye agbata obi anyị imata Onye-nwe-anyị n’ihi anyị niile ga-amara Ya (lee Jeremaịa 31:34).

Ebe nlekwasị anya nke Onye nzọpụta Gafere Mkpa nke Oge ahụ

  • Ọtụtụ ndị mmadụ gbara ezi mbọ ịkpọgara Jizọs enyi ha ka agwọọ maka ọrịa ahụmkpọnwụ. Mgbe emesịrị Onye nzọpụta ahụ gwọrọ nwoke ahụ, kama Ọ nwere mmasị karịa n’ịgbaghara ya maka njọ ya (lee Luk 5:18-26).

  • Mgbe ndị mmadụ ahụ kpọtaara Onye nzọpụta ahụ nwanyị ahụ ejidere n’ịkwa iko, amaghị ikpe Ya zọrọ ndụ nke anụ ahụ ya. Mana Ọ chọkwara ịzọpụta ya n’ime mụọ, n’agwa ya “gaa ma emekwala njọ ọbụla ọzọ” (lee Jọn 8:2-11).

  • Meri na Mata zigara ozi nye Jizọs na-arịọ ka Ya bịa gwọọ enyị Ya Lazarụs. Jizọs, onye gwọworo ndị ọzọ n’ime ọtụtụ oge, gburu oge ọbịbịa Ya tutu mgbe Lazarụs nwụrụ. Jizọs maara ihe ezinaụlọ ahụ chọrọ, kama n’ikpọlite Lazarụs site n’ọnwụ, Ọ gbara ọgbụgba ama ha nwere maka ịdị nsọ Ya ume (lee Jọn 11:21-27).

Kedụ ọmụmatụ ndị ọzọ I nwere ike ịgbakwunye n’ime nkea?

Gịnị ka Anyị Nwere Ime?

Ọ bụrụ na ebumnuche anyị inyere ndị ọzọ aka bịara dịrịzie ka nke Onye nzọpụta, ọ ga-agbanwe otu anyị si eje-ozi. Ebea bụ ụfọdụ ụzọ nghọta nkea nwere ike idu mgbalị anyị ije-ozi.

Echiche 1: Jikọta Ije-ozi na Onye-nzọpụta

Mgbalị anyị niile ime iheọma bụ nke bara uru, mana anyị nwere ike ịchọ ohere ndị ga eme ka ozi anyị pụta ihé site n’ijikọta ya na Onye nzọpụta. Na-ịma atụ, ọ bụrụ na ezinaụlọ nke I na-ejere ozi nlekọta ejighị ahụ, nri nwere ike inye aka, mana ngọsipụta ịhụnanya gị dị nwayọ nwere ike imụba site na ama gị nke ịhụnanya nke Onye nzọpụta nwere n’ebe ha nọ. Enyem aka gị n’ime yad ha ka aga anabata, mana elemaanya o nwere ike ịpụta ihe karịa na inye ngọzi nke ọkwa-nchụ-aja.

Okenye Neal L. Andersen nke Kworum Ndị Ozi Iri na abụọ kuziri: “Otu onye nwere obi ọma nwere ike inyere otu mmadụ aka imezi ụkwụ moto, kpọga ibe ya n’aka onye dọkinta, rịkọta nrị ya na onye obi jọrọ njọ, ma ọbụ mee ihu ọchị ma kelee iji gbukee ụbọchị.

“Mana onye na-erube isi nye iwu nke mbụ ga agbakwunye emume ije ozi ndịa dị mkpa.” 1

Echiche 2: Na-elekwasị anya Ụzọ nke Ọgbụgba ndụ

N’ikwusara ndị otu n’oge mbụ dịka Onye-isi nke Nzukọ nsọ, Onye-isi Russell M. Nelson kwuru, “Nọrọ n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ.” Ime na idebe ọgbụgba ndụ niile “ga-emepe ọnụ ụzọ nye ngọzi niile nke ime mụọ na ohere ọma ndị nọ nso.”2

Dịka Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, emere anyị baptizim, mee anyị onye otu, ma nata onyinye nke Mụọ Nsọ. Ndị nwoke tozuru oke na-anata ọkwa-nchụ-aja. Anyị na-aga na tempụl maka onyinye dị nsọ na ka arachikọta anyị ọnụ dịka ezinaụlọ mgbe niile. Emume nsọ nzọpụta ndị a niile na ọgbụgba ndụ ndị sonyere ha dị oke mkpa nye anyị maka idirizi ka Ya ka anyị wee nwee ike biri anyị na Ya.

Anyị nwere ike inwe ọrụ dị mkpa ime na inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ahụ dịka anyị n’enyere ha aka idebe ọgbụgba ndụ ha ma kwado ime ọgbụgba ndụ n’ọdịnihu.3 Olee otu I nwere ike isi enyere ndị mmadụ ma ọbụ ezi na-ụlọ ndị I n’ejere ozi aka inata emume nsọ ọzọ kwesịrị ha? Nke a nwere ike ịpụta inyere otu nna kwado ime nwa ya nwanyị baptizim, na-akọwa ngọzi niile nke ọgbụgba ndụ ọzọ nke a ga-eme, ma ọbụ ikesa ụzọ ndị esi enwete mmụta bara uru karịa n’imegharị ọgbụgba ndụ anyị mgbe anyị n’eri oriri nsọ.

Echiche 3: Kpọkuo ma Gbaa ume

Mgbe o kwesịrị, dụọ ọdụ gị na ndị I na-elekọta gbasara mgbanwe ha na mgbalị niile iji dịrị ka Kraịst karịa. Mee ka ha mara ike I na ahụta na nke na-amasị gị n’ime ha. Chọpụta ihe ha chere ha nwere ike ịdị mma ma kuo gbasara otu I nwere ike isi nyee aka. Maka ịdụkọrịta ọdụ gị na ndị I na-ejere ozi nlekọta, lee “Dụọ Ndụmọdụ maka Mkpa Ha,” Liahona, Sept. 2018, 6-9.)

Atụla egwu ịkpọku ha isoro Onye nzọpụta ma kwee Ya inyere ha aka rute ike ha si na chi. Mkpọku nke a nwere ike ịgbanwe ndụ, mgbe etinyekọtara ya na ngosipụta obisike gị n’ime ha na okwukwe gị n’ime Ya.

Ụzọ isii anyị Nwere ike Inyere Ndị ọzọ Aka Gaa N’ihu n’ebe Kraịst nọ

Ndi sotere bụ nchepụta nke ikwado ndị ọzọ ime ndụ mma na ịganihu n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ. (Lee Kwusaa Oziọma M,isi 11, maka echiche ndị ọzọ.)

  1. Kekọrịta Dịrị eziokwu ma kwusie ike mgbe I na-ekesa otu Onye nzọpụta si nyere gị aka dịka I gbaliworo ibịa Ya nso site n’ibi ndụ ụkpụrụ nke oziọma n’agbanyeghị ndọla azụ niile.

  2. Kwee nkwa ngọzị. Ndị mmadụ chọrọ ucheobi mgbanwe nke n’agụ agụụ karịa ucheobi n’achọghị mgbanwe. Ịkọwa ngọzi ndị sonyere ime ihe nwere ike iwete mkpali dị ike nke ukwuu (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:20-21).

  3. Kpọkuo. Ibi ndụ ụkpụrụ nke oziọma n’ewete ọgbụgba ama nke dị eziokwu (lee Jọn 7:17) ma dụbanye n’ime mgbanwe miri emi. 4 Mmekọrịta niile nwere ike ịgụnye nwa obere mkpọku ime otu ihe ga enyere ha aka ịga n’ihu.

  4. Tụkọrịta atụmatụ. Kedụ ihe kwesịrị ime ka ha debezie nke ọma mkpebi ha igbanwe? Olee otu I nwere ike isi nyee aka? Enwere oge ekepụtara maka ya?

  5. Ịkwado Mgbe ọ ga-adị mma, chọpụta netwọk nkwado nke ndi mmadụ ndị nwere ike inyere onye ahụ aka dịrị njikere ma mee nke ọma. Anyị niile nwere mkpa onye ndụ.

  6. Nyochaa. Tulee ọganihu mgbe na mgbe. Lekwasị anya n’atụmatụ ahụ ma mezie ya ma ọ dịrị mkpa. Nwee ndidi, adala mba, ma nwee mgbam ume. Mgbanwe nwere ike igbu oge.

Ịkpọ-ókú Ime

Tulee ụzọ mgbalị gị ije-ozi nlekọta—ma nke ukwu na nke nta—ga-esi enyere ndị ọzọ aka ime ka mgbanwe ha mie emie ma dịrịzie dịka Onye nzọpụta.

Hụba-ama

  1. Neil L. Andersen, “Ụzọ Dị nsọ Ije-ozi Nlekọta” (Brigham Young University devotional, Apr. 10, 2018), 3, speeches.byu.edu.

  2. Russell M. Nelson, “Dịka Anyị Na-Agakọrịta-ọnụ N’ihu,” Liahona, Apr. 2018, 7.

  3. Lee Henry B. Eyring, “Ụmụ-ada n’ime Ọgbụgba ndụ ahụ,” Liahona, Mee 2014, 125-28.

  4. See David A. Bednar, “Agbanwere nye Onye-nwe-anyị,” Liahona, Nov. 2012, 106–109.

Bipụta