2019
Otu esi Ekwupụta Ịgba ama n’ụzọ Ọdịdị ya Kacha dị mma
Mach 2018


ministering

Ụkpụrụ niile nke ije-ozi Nlekọta, Maachi 2019

Otu esi Ekwupụta Ịgba ama n’ụzọ Ọdịdị ya Kacha dị mma

Ije-ozi nlekọta bụ ibuli. Ịdị mfe nke ije-ozi nlekọta nwere ike ịmụba ohere anyị ikwupụta ịgba ama n’ụzọ nke iwu na nke nkịtị.

Anyị agbawo ndụ I “guzo dịka ndị aka ebe nke Chineke n’oge niile na n’ihe niile, na n’ebe niile” (Mosaịa 18:9). Ikwupụta ịgba ama anyị bụ otu akụkụ nke iguzo dịka ndị aka-ebe ma ọ bụ ụzọ dị ike eji akpọku Mụọ Nsọ imetụ obi mmadụ aka ma gbanwe ndụ ha.

“Ịgba ama—ezi ịgba ama, nke sitere na Mụọ ma Mụọ Nsọ akwado ya—na agbanwe ndụ,” ka Onye-isi M. Russell Ballard, Onye nnọchite Onye isi nke Kworum ndị Ozi Iri na abụọ kwuru.1

Mana ikwupụta ịgba ama anyị nwere ike na-atụ egwu ma ọbụ edoghị ụfọdụ n’ime anyị anya. Nke ahụ nwere ike ịbụ n’ihi anyị n’eche ikwu ịgba ama anyị dịka ihe anyị na-eme na nzukọ nke ibu-ọnụ na ịgba ama ma ọbụ mgbe anyị n’akuzị ihe. N’ime ọnọdụ iwu ndi ahụ anyị mgbe na mgbe n’eji ụfọdụ mkpụrụ okwu na ahịrị okwu ndị nke bịara dịzie ka ọdabaghị n’ụzọ mkparịta ụka nkịtị. Ikwupụta ịgba ama ndị anyị nwere ike bụrụzie ngọzi na-abịakarị mgbe niile n’ime ndụ anyị na ndụ nke ndị ọzọ mgbe anyị ghọtara ịdị mfe nkwupụta ihe anyị kwenyere na ya n’ọnọdụ ụbọchi niile

. Nke-a bụ ụfọdụ ntụnye-uche iji nyere gị aka malite.

Mee ya ka ọ dị Mfe

Ọ dịghị mkpa iji ahịrị okwu “ọ ga amasị m ịgba ama m,” bido ịgba ama ma ọ dịghị mkpa iji “n’aha nke Jizọs Kraịst, amen” mechie ya. Ịgba ama bụ nkọwapụta nke ihe anyị kwenyere na ihe anyị maara bụ ezi okwu. Ya mere ị ga nleta n’ebe onye agbata obi gị na striit gbasara otu nsogbu ọ naara enwe ma kwuo, “A ma m na Chineke na-aza ekpere,” nwere ike dịrị ezigbo ike dịka ịgba ama ọbụla ekwupụtara n’ime ụlọ nzukọ nsọ. Ike ya anaghị esite n’oke asụsụ abịa; ọ na-abịa site na Mụọ Nsọ ikwado eziokwu (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 100:7–8).

Kwee ka Mkparịta ụka ahụ Dabanye n’Ọdịdị ya

Ọ bụrụ na anyị dịrị njikere ikesa, enwere ohere ndị nọ anyị n’akụkụ nke ga adaba ịgba ama n’ime mkparịta ụka nke ụbọchi niile. Maka ọmụmatụ:

  • Otu mmadụ ajụọ gị gbasara mmechi izu ụka gị. “Ọ dịrị ebube,” gị azaghachị. “Nzukọ nsọ bụụrụ ihe m chọrọ.”

  • Otu onye gosipụtara ọmịiko mgbe ọ mụtachara gbasara otu akamgba n’ime ndụ gị: “Ọ dị m mwute nke ukwuu.” Gị azaghachi: “Imeela maka nchegbu gị. A ma m na Chineke ga enyere m aka. Ọ nọworịị ebe ahụ maka m tupu oge ugbua.”

  • Otu onye ekwuo: “echere m na ihuigwe a dị oke egwu ga agbanwe na ntabi anya,” ma ọbụ “Ụgbọ ala bọs n’ezie abịaghị ọsọsọ,” ma ọbụ “Lee okporo ụzọ nke a.” I nwere ike ịzaghachi: “A ma m n’ezie na Chineke ga enye aka ihe niile aga nke ọma.”

Kwupụta Nhumihe Gị

Anyị mgbe ụfọdụ n’ekwukọrịta gbasara aka mgba anyị niile. Mgbe otu onye gwara gị gbasara ihe ha na agabiga, I nwere ike ikwupụta oge mgbe Chineke nyeere gị aka n’ime mkpagbu gị niile ma gbaa ama na gị maara na Ọ nwere ike inyekwara ha aka. Onye-nwe-anyị kwuru na Ya na-agba anyị ume n’ime mkpa anyị niile ka “unu wee guzoro dịka ndị aka-ebe nye m ma emesịa, ma na unu ga-amata n’ezie na m, Onye-nwe Chineke, na-eleta ndị m na mkpagbu ha niile”(Mosaia 24:14). Anyị nwere ike iguzoro dịka ndị aka ebe nke Ya mgbe anyị na-agba ama maka otu O siri nyeere anyị aka n’ime mkpa niile.

Dịrị Njikere

Maka ụfọdụ n’ime anyị, ikwupụta ịgba ama anyị n’oge nke mgbe ahụ nwere ike iyi egwu. Enwere ụzọ ndị anyị nwere ike iji kwadoo n’ọdịnihu ma “diri njikere mgbe niile inye mmadụ ọbụla aziza nke na-ajụ [anyị] otu ebumnobi nke olile anya nke nọ n’ime [anyị]” (1 Pita 3:15).

Mbụ, ịdị njikere nwere ike ịpụta ile anya n’otu anyị si ebi ndụ. Anyị na-akpọku Mụọ Nsọ n’ime ndụ anyị niile ma na-agba ịgba ama nke onwe anyị ume kwa ụbọchi site na ibi ndụ eziomume? Anyị n’enye Mụọ ahụ ohere ikwusara anyị okwu ma nye anyị mkpụrụ okwu ndị anyị chọrọ site n’ekpere na ọmụmụ akwụkwọ nsọ? Dịka Onye-nwe nyere Hyrum Smith ndụmọdụ,” A chọla ka ị kwupụta okwu m kama na mbụ chọọ ka I nweta okwu m, ma mgbe ahụ a ga-atọghepụ ire gị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:21).

Nke abụọ, ịdị njikere nwere ike ịpụta ile anya n’ihu na itinye n’uche ohere I nwere ike inwe n’ụbọchị ahụ ma ọbụ n’izu ụka ahụ ikesa ịgba ama gị. I nwere ike ikwado maka ohere ndị ahụ site na-iche gbasara otu ha ga esi wee nye gị ohere ikesa ihe ikwenyere na ya.

Lekwasi anya n’Onye-nzọpụta na Ozizi Ya

Onye-isi Ballard kuziri, “N’agbanyeghị na-anyị nwere ike inwe ịgba ama nke ọtụtụ ihe dịka ndị otu nke Nzukọ-nsọ ahụ, enwere eziokwu ndi pụrụ iche ndị anyị kwesịrị mgbe niile ikuziri onye ọbụla na ibe ya ma kesaa.” Dịka ọmụmatụ, ọ gụpụtara: “Chineke bụ Nna anyị ma Jizọs bụ Kraịst ahụ. Atụmatụ nke nzọpụta lekwasịrị anya n’Aja mgba-ghara mmehie nke Onye Nzọpụta. Josef Smit weghachitere uju nke oziọma mgbe niile nadịgịde nke Jizọs Kraịst, ma Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ihe akaebe na ịgba ama anyị bụ eziokwu.” Dịka anyị n’ekwupụta eziokwu ndị ahụ n’emetụ n’obi, anyị n’akpọku Mụọ ahụ ịgbara anyị akaebe na ihe anyị kwuworo bụ eziokwu. Onye isi Ballard kwupụtara nkeọma na “enweghị ike ịdọghachị Mụọ ahụ mgbe ekwupụtara ịgba ama nke Kraịst n’enweghị ntupo.”2

Ọmịiko nke Onye-nzọpụta

N’ike ọgwụgwụ site na njem n’ụzọ Samerịa, Onye nzọpụta kwụsịrị izu ike n’akụkụ weelụ ma zute otu nwanyị ebe ahụ. O bidoro mkparịta ụka gbasara ịdọpụta mmiri site na weelụ ahụ. Iji ọrụ nke ahụ nwanyị ahụ n’eme ụbọchi niile nyere Jizọs ohere ịgbara ya ama maka mmiri nke ndụ na ndụ ebịghị ebi nọ maka ndị ahụ kwenyere nime Ya (lee Jọn 4:13–15, 25–26).

Ịgba ama Dị Mfe Nwere ike Ịgbanwe Ndụ

Onye-isi Russell M. Nelson ekwuwo maka otu nọọsụ onye jụrụ n’oge ahụ Dr. Nelson otu ajụjụ mgbe emesịrị otu usoro ịwa ahụ siri ike. “Gịnị mere ị dịghị ka ndị dọkịnta na-awa ahụ ndị ọzọ?” Ụfọdụ ndị dọkịnta na-awa ahụ ọ maara nwere ike bụrụ ndị n’ewe iwe n’egbụghị oge na ndi n’ekwu okwu rụrụ arụ mgbe ha n’eme ụdị usoro ahụ siri nnukwu ike.

Dr. Nelson gaara azaghachi n’ụzọ ọbụla dị ọtụtụ. Kama ọ jiri umeala zaghachi, “N’ihi na a ma m na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu.”

Aziza ya kpalitere nọọsụ ahụ na di ya ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn. Onye isi Nelson mesịrị mee nọọsụ ahụ baptism. Ọtụtụ iri afọ gasịrị, dịka ọ na-edu n’ọgbakọ stek n’ime Tennessee, USA, ka Onye Ozi echịrị ọhụrụ, Onye-isi Nelson nwere obi ụtọ izutegharị n’atụghị anya nọọsụ ahụ kwa. O kwugharịrị mgbanwe ya, nke bịara site na ịgba ama ya dị mfe na mmetụta nke Akwụkwọ nke Mọmọn, nyere aka ịgbanwe mmadụ 80 ọzọ.3

Ịkpọ-ókú Ime

Atụla egwu ikwupụta ịgba ama gị. O nwere ike ịgọzi ndị ahụ ndị I na ejere ozi nlekọta. Kedụ otu I nwere ike itinye n’ọrụ nchepụta ndịa ma ọbụ nke onwe gị iji kwusaa ịgba ama gị taa?

Hụba-ama

  1. M. Russell Ballard, “Ịgba ama Enweghị ntụpọ,” Liahona, Nov. 2004, 40.

  2. M. Russell Ballard, “Ịgba ama Enweghị ntụpọ,” 41.

  3. N’ime Jason Swensen, “Dịrị Njikere Iji Akwụkwọ nke Mọmọn Kọwaa Ịgba ama Gị, Onye isi Nelson Kwuru,” mpaghara Ọkwá nke Nzukọ nsọ nke LDS.org, Feb. 6, 2018, news.lds.org.