2019
Ije-ozi nlekọta Bụ Ịhụta Ndị ọzọ dịka Onye-nzọpụta Sị ahụ.
Jun 2019


Foto, oyiyi
ministering

Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi Nlekọta, Jun 2019

Ije-ozi nlekọta Bụ Ịhụta Ndị ọzọ dịka Onye-nzọpụta Sị ahụta

Jizọs gburu ọtụtụ oge Ya n’etiti ndị ahụ ahụtara dịka ndị gbara iche; Ọ hụrụ ike ọrụ ha sinachi.

N’ime mgbalị anyị ije-ozi dịka Onye-nzọpụta, e nwere ike ị gwa anyị ije-ozi nye otu onye onye gbara iche n’etiti anyị. Nkea n’ewete ohere ka anyị mụọ ma tolite.

Omenaala, agụm akwụkwọ, abụrụ, ego, afọ ole, agwa ochie na nke ugbua, ma ọbụ ịdị iche ndị ọzọ nwere ike ime ya adị mfe ikpe onye ọzọ ikpe tupu anyị amata nnọọ ha. Ikpe ikpe n’ọdịnihu nkea nọ n’etiti ịkpọasị, ma Onye-nzọpụta dọrọ aka na ntị maka ya (lee 1 Samuel 16:7; Jọn 7:24).

Anyị nwere ike leghara ọdịiche niile anya ma hụta ndị ọzọ dịka Onye-nzọpụta si ahụ? Kedụ otu anyị ga-esị mụọ ịhụ ndị ọzọ n’anya n’ihi ndị ha bụ na ndị ha nwere ike ịbụ?

Ịhụta na Inwe Ịhụnanya

Akwụkwọ nsọ n’akọ maka akụkọ ama ama nke nwata nwoke bara ụba onye jụrụ ajụjụ otu esi enwete ndụ ebigh ebi: “Mgbe ahụ Jizọs n’ịhụta ya nwere ịhụnanya na ya, ma gwa ya, Otu ihe kọrọ gị: gaa n’ụzọ gị, ree ihe ọbụla nke i nwere, ma nye ndị dara ogbenye, ma gị ga-enwe akụ n’eluigwe: ma bịa, bụrụ obe ahụ, ma soro mụ” (Mak 10:21).

Mgbe Okenye S. Mark Palmer nke Iri-asaa mụrụ akwụkwọ nsọ a afọ ole ma ole gara aga, otu akụkụ akụkọ ahụ na ntabi-anya pụtara ihé nye ya.

‘Mgbe ahụ Jizọs n’ịhụta ya nwere ịhụnanya na ya.’

“Dịka m nụrụ okwu ndị ahụ, nhọta pụtara ihé jụpụtara n’ime mụọ m nke Onye-nwe n’akwụsị ma na-ahụta nwoke nkea n’eto eto. Na-ahụta—ya pụtara ile anya nke ọma ma banyezie n’ime mụọ ya, n’amata ịdị mma ya na kwa ike ya, na kwa ịhọta mkpa ya kacha elu.

Mgbe ahụ okwu ahụ dị mfe—Jizọs hụrụ ya n’anya. O nwetere mmetụta ịhụnanya na ọmịiko dị omimi maka nwata nwoke nkea, ma n’ihi ịhụnanya nkea na site na ịhụnanya nkea, Jizọs gwara ya ihe ndị ọzọ ọ ga-eme. E chere m ihe o nwere ike ịdị ka ya nye nwata nwoke nkea ị bụ onye ụdị ịhụnanya nkea kpugidere ọbụna mgbe a gwara ya ime ihe tara oke akpụ dịka ire ihe niile o nwere ma inye ya ndị ogbenye. …

“[A jụrụ m onwe m] ‘Kedụ otu m nwere ike i si jupụta n’ịhụnanya dịka nke Kraịst ka [ndị ọzọ] nwee ike nwete mmetụta ịhụnanya nke Chineke site n’aka m ma nwee mmasị ịgbanwe?’ Kedụ otu m ga-esi na-ahụta [ndị mmadụ nọ n’akụkụ m] n’ụdị ụzọ Onyenwe sị hụta nwata nwoke ahụ bara ụba, n’ịhụta ha site ndị ha bụ n’ezie na ndị ha nwere ike ịbụ, n’abụghị nanị maka ihe ha na-eme ma ọbụ anaghị eme? Kedụ otu m g’esi dịrị dịka Onye-nzọpụta karịa?”1

Ịmụ Ịhụta Ndị Ọzọ

Ịmụ ịhụta ndị ọzọ dịka Onye-nzọpụta si eme n’ewete ngọzị bara ụba. N’ebe a bụ ụfọdụ ntụpụta nwere ike inye aka dịka anyị n’arụ ọrụ inwete ebumnuche nkea.

  • Jisie ike Maka Ha
    Gbalịa jisie ike mata ndị mmadụ karịa nanị n’ihu. Mata na imepụta mmekọrịta n’egbu oge na mgbalị ziri ezi. (Lee edemede Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi Nlekọta Ọgọst 2018 “Iwulite Mmekọrịta Bara Uru” maka enyem aka.)

  • Tulee Onwe gị
    Ńaa ntị n’ikpe ndị i nwere ike ịdị n’ekpe n’ịma ama na n’amaghị ama. Hụba ama maka echiche I nwere ike n’eche gbasara ndị ọzọ ma gbalịa ghọta ihe mere i si enwe ụdị mmetụta gbasara ha otu i si enwe ha.

  • Kwụsị Ịma-ikpe
    Mata na ọnọdụ anaghị akọwa uru mmadụ. Tinye onwe gị n’ime ọnọdụ ha ma tụlee otu ị g’esi achọ ka mmadụ hụta gị m’ọbụrụ na ị nọ n’ụdị ọnọdụ ahụ. Ikewapụ nhọrọ na agwa mmadụ site n’uru ha bara na ike ha sinachi nwere ike nyere anyị aka ịhụta ha dịka Onye-nzọpụta g’eme.

  • Kpee ekpere Ịhụ Ha n’anya
    Kpee ekpere n’aha ha oge ọbụla na maka ndidi imepụta ezi enyị na enyị. Jiri ekpere lee anya n’ije ozi gị. Enwere ọdịiche n’etiti ihe i na-eme na ihe ha chọrọ n’ezie?

Jizọs gburu oge Ya n’etiti ndị mmadụ sitere n’ebe dị iche iche nke ndụ: ndị bara ọgaranya, ndị ogbenye, ndị ọchịchị, na ndị nkịtị. Ọ bụ onye ikpe n’ezighi ezi metụrụ mgbe na mgbe site n’aka ndị ọzọ mgbe ha lekwasịrị Ya anya na ọnọdụ ogbenye Ya ma ọbụ n’adịchaghị mkpa. “Ma mgbe anyị ga-ahụ ya, enweghị mma nke anyị kwesịrị ịchọ na ya. … Akpọrọ Ya asị, ma enweghị ihe anyị jiri ya kpọrọ” (Aịzaịa 53:2-3).

Ịhụ-ụzọ dịka Kraịst

Otu nwanne nwanyị na-akọ akụkọ nkea nke ịmụ ịhụta onye agbata obi na-anya nke dịka Kraịst:

“Julia (agbanwere aha) biri n’akụkụ m ma ọ dịrị ka o nweghị ndị enyị. Ọ naara adị ka onye iwe na ọnụma juru. N’agbanyeghị nke ahụ, ekpebiri m ị bụ enyi ya. N’abụghị nnọọ enyị nkịtị, kama ezi enyị. Ekwusịrị m ya okwu mgbe ọbụla m hụrụ ya ma gosi mmasị n’ihe ọbụla ọ na-eme. Nwayọ nwayọ, ekepụtara m adịnamma nke enyị mụ na ya, n’ewete ọńụ n’ime obi m.

Otu ụbọchị, ekpebiri m ị ga nleta n’ebe obibi Julia ma jụọ ya maka mkpebi ya nke agaghị nzukọ nsọ.

“A matara m na o nweghị ndị ezinaụlọ ma ọbụ ndị ikwu nọ nso nso. Nanị nwanne ya, otu nwanne nwoke onye bi n’ebe dị anya, n’akpọtụrụ ya nanị otu ugboro n’ime otu afọ site n’ekwe ntị. Dịka m gere ntị ka ọ n’ekwupụta ọnụma ya, iwe, na ịda mba niile gbasara ezinaụlọ ya na Nzukọ nsọ, mmetụta ọmịiko na ịhụnanya doro anya maka nwanne nwanyị a jupụtara n’ime m nke ukwuu. A ghọtara mgbu ya na ịda mba ya niile. A matara nnọọ otu ndụ ya si nọrọ nanị ya. Ọ dịrị nnoo ka m nụtara ahịrị okwu dị nwayọ n’azụ m: ‘A hụkwara m ya n’anya. Hụ ya n’anya ma sọpụrụ ya.’

A nọdụrụ m ọdụ n’ege ntị ruo mgbe ọ n’enweghị ihe ọzọ ikwu. E nwetere mmetụta ịhụnanya na ọmịiko maka ya. Onye a bụ nwanne nwanyị onye n’enwebeghị mgbe ọ maara ihe ịhụnanya dịka na ndụ ya. Na ntabi anya a ghọtara ya nke ọma. Ekelere m ya maka inye m ohere ileta ya, ma agbakọrọ ya ma nye ịhụnanya na nsọpụrụ m mgbe m na ala. Ọ gaghị amata otu nleta ya si metụ m. Nna nke Eluigwe emepewo anya m ma kuziere m na m nwere ike iji ọmịiko bara ụba nwe ịhụnanya. Ekpebiri m n’onwe m n’abụghị nanị enyị ya ma ịbụkwa onye ezinaụlọ ya.”

Ọ bụ ihe ịdị nsọ ịkpọbata mmadụ n’ime ndụ onye ọzọ. Site n’ekpere, ndidi, na enyem aka sitere na Mụọ, anyị nwere ike ịmụ ime otu ahụ jiri ịhụ-ụzọ dịka Kraịst.

Lee anya

  1. S. Mark Palmer, “Then Jesus Beholding Him Loved Him,” Liahona, May 2017, 115.

Bipụta