2019
Ụzọ Mụọ ahụ Nwere ike iji (ma Ga-esi) Nyere Gị aka Jee-ozi nlekọta
Septemba 2019


Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi Nlekọta, Septemba 2019

Ụzọ Mụọ ahụ Nwere ike iji (ma Ga-esi) Nyere Gị aka Jee-ozi nlekọta

Ọrụ ọkwa-nchụ-aja ije-ozi nlekọta, enyere ma ndi nwoke na ndi nwanyị, tinyekọtara ikike ịnata mkpughe.

Foto, oyiyi
ministering

Ngosipụta sitere na Ihe Ngosi

Ọkpụkpọ-oku nke ije-ozi nlekọta na ije-ozi na ọbụna inwe ịhụnanya dịka Onye nzọpụta si nwe nwere ike mgbe ụfọdụ dịrị ka ihe ịma aka—kacha mgbe ọ gụnyere isetipụ aka nye ndi ahụ anyị amaghị nke ọma. N’ihi enwere ụzọ ruru nde-kuru-nde eji eje-ozi nlekọta, anyị na-atụle otu anyị nwere ike isi wee mara ụzọ kacha mma isetipụ aka ruo ndi ahụ e kenyere anyị.

Anyị ekwesịghị ịnọ n’oke echiche n’ihi na mgbalị anyị ziri ezi ka MụọNsọ n’edu.

“Ọrụ ije-ozi nlekọta dị nsọ nke gị n’enye gị ikike dị nsọ nke eji anata nkwalite mụọ,” ka Nwanne nwanyị Bonnie H. Cordon, Onye-isi Zuruọha Ndi Iyom Nta kwuru. “I nwere ike ịchọ nkwalite mụọ ahụ n’obisike.”1

Mgbe anyị na-achọ ije-ozi dịka Onye-nzọpụta si jee, anyị nwere ike inwete odudu site n’aka ụdị Mmụọ ahụ duru Ya. Nkea bụ eziokwu karịcha mgbe ije-ozi, dịka ije-ozi nlekọta, nke emere n’okpuru ikike nke ọtụghe ọkwa-nchụ-aja nke bishọp. N’ebe a bụ ntụpụta isii nke ije-ozi nlekọta site n’Mụọ.

Kedu Otu M Nwere ike si Nwee Mụọ ahụ Mgbe m N’eje-ozi Nlekọta?

  • Rịọ maka Odudu. Nna nke Eluigwe chọrọ ka anyị kwusara Ya okwu site n’ekpere. Ekpere anaghị nanị eme anyị abịarụọ Ya nso, kama ọ nakwa ekwe nkwa “ngọzi nke Chineke dị na njikere inye mana emere ka ọ dabere na anyị ịrịọ maka ha.”2 “Dịka anyị n’ekpe ekpere ma na-achọ ịghọta obi ha,” ka Nwanne nwanyị Cordon kwuru, “A na m agba ama na Nna nke Eluigwe ga-edu anyị ma Mụọ Ya ga-eso anyị na-aga.”3

  • E Chekwala ka agwa gị mee ihe. Mee ihe n’onwe gị. Nwee “oke agụụ n’ịchụso” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:27), ma ị ga-ahụta na mgbalị gị niile nwere ike nwete odudu na ntolite. Ịga n’ihu maka ije-ozi na ọrụ anyị bụ otu ụzọ dị mkpa itozu maka mkpughe,” ka Onye-isi Dallin H. Oaks kwuru, Onye ndụmọdụ Mbụ n’ime Otu Ndi-isi Mbụ. “N’ihe ọmụmụ nke akwụkwọ nsọ m amatawo m na ọtụtụ mkpughe nke ụmụ nke Chineke na-abịa mgbe ha nọ n’ọrụ, ọbụghị mgbe ha nọ nkịtị n’ebe obibi ha n’eche ka Onye-nwe-anyị gwa ha ihe mbụ ha ga-eme.”4

Kedụ otu M si Amata Mkpali nke mụọ eji Eje-ozi nlekọta?

  • Were Ndụmọdụ nke Mọmọn. Anyị ekwesịghị ịnọ na-atụgharị anya ma uche ahụ ọ bụ nkwalite mụọ m’ọbụ na ọbụghị. Ọbụghị mgbe anyị nwere azịza dị mfe nke Mọmọn n’ịmata na: Ọ bụrụ na i nwere uche nke na akwalite gị ime ihe ọma na i kwere ma ọbụ inyere ndi ọzọ aka kwere n’ime Kraịst, i nwere ike mara na ọ si na Chineke (lee Moronaị 7:16).

  • E Sogbula gbasara ya. “Nanị wụba n’ime puulụ ma gwuo mmiri,” ka Okenye Jeffrey R. Holland nke Kworum nke Ndi-Ozi Iri na Abụọ kwuru. “Gakwuru ndi nọ na mkpa. Adakwala ngwọrọ na-eche ma ị ga-eme nkea ka ọ bụ nke ọzọ. Ọ bụrụ na anyị soro ụkpụrụ ndi dị mkpa nke akuziworo, nọrọ n’ụzọ nke ọtụghe ọkwa-nchụ-aja, ma na-achọ Mụọ Nsọ idu anyị, anyị agaghị ada.”5

Kedụ Ụzọ Kachasị mma isi Soro Mkpali nke mụọ?

  • Ozugbo. Nwanne nwanyị Susan Bednar (nwunye Okenye David A. Bednar nke Kworum Ndi-Ozi Iri na Abụọ) bụ otu ọmụmatụ dị ukwuu n’isoro nkpali nke mụọ. Mgbe ọ kpesịrị ekpere “maka anya nke mụọ ịhụta ndi ahụ nwere mkpa,” ọ legharịrị anya n’ọgbakọ ma mgbe ụfọdụ ọ “ga-enwete mmetụta mụọ ịga nleta ma ọbụ kpọọ otu onye n’ekwe ntị,” ka Okenye Bednar kwupụtara. “Ma mgbe Nwanne nwanyị Bednar nwetere ụdị mmetụta ahụ, ọ na-aza ma rube isi ngwa ngwa. Ọ na-adịkarị otu ahụ na dịka ekwuru ‘amen’ n’ekpere mmechi, ọ ga-ekwusịrị onye ntoroọbịa okwu ma ọbụ gbakụọ otu nwanne nwanyị ma ọbụ, mgbe ọ garuru n’ebe obibi, o were ekwe ntị ozugbo ma kpọọ n’ekwe ntị.”6

  • Obisike. Egwu nke ịjụ na mmetụta nke ihere, erughị eru, ma ọbụ ịbụ ihe mgbakasị ahụ nwere ike igbochi anyị site n’isoro mkpali nke mụọ iji jee-ozi nlekọta. “N’oge dị iche iche na n’ụzọ dị iche iche, anyị niile n’eche na anyị erughị eru, amachaghị ihe, elemanya ezughị oke,” ka Okenye Gerrit W. Gong nke Kworum nke Ndi-Ozi Iri na Abụọ kwuru. “Ma-na n’ime mgbalị anyị jupụtara n’okwukwe ịhụ Chineke n’anya na ije-ozi nye ndi agbata-obi anyị, anyị nwere ike nwete mmetụta ịhụnanya nke Chineke na mmetụta dị mkpa maka ndụ ha na nke anyị n’ụzọ dị ọhụrụ na nke dị nsọ karịa.”7

    Otu nwanne nwoke kwupụtara otu o si adọla azụ igakwuru di otu nwanyị onye nwara igbu onwe ya. Mana o mesịrị kpọọ di ahụ ịbịa nri ehihie. “Mgbe m kwuru, ‘Nwunye gị nwara igbu onwe ya. Nke ahụ ga-abụrịrị ihe karịrị gị. Ị chọrọ ikwu gbasara ya?’ o bepụtara akwa,” o kwupụtara. “Anyị kparịtara ụka dị mma ma baa ime ma nwete adịnamma na ntụkwasị obi n’etiti ọkara n’ebughị ibu.”8

Hụba-ama

  1. Bonnie H. Cordon, “Ịbụrụzi Onye Na-azụ Atụrụ,” Liahona, Nov. 2018, 76.

  2. Bible Dictionary, “Ekpere.”

  3. Bonnie H. Cordon, “Ịbụrụzi Onye Na-azụ Atụrụ,” 76.

  4. Dallin H. Oaks, “N’Oge nke Onwe Ya, N’Ụzọ nke Onwe Ya,” Liahona, Aug. 2013, 24.

  5. Jeffrey R. Holland, “The Ministry of Reconciliation,” Liahona, Nov. 2018, 77.

  6. David A. Bednar, “Quick to Observe,” Liahona, Dec. 2006, 17.

  7. Gerrit W. Gong, “Our Campfire of Faith,” Liahona, Nov. 2018, 42.

  8. Bonnie H. Cordon, “Ịbụrụzi Onye Na-azụ Atụrụ,” 76.

Bipụta