2019
Ọ bụ n’Isoghị n’Akụkụ Nkea Dị Mkpa nke Ije-ozi Nlekọta?
Ọktoba 2019


Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi Nlekọta, Ọktoba 2019

Ọ bụ n’Isoghị n’Akụkụ Nkea Dị Mkpa nke Ije-ozi Nlekọta?

Ije-ozi nlekọta bụ “ińụrịkọrịta gị na ha ndi n’ańụrị ọńụ” dịka otu ọ si bụrụkwa “ibe akwa gị na ndi n’ebe akwa” (Ndi Rom 12:15).

Foto, oyiyi
ministering

Ngosipụta site n’aka Augusto Zambonato

Mgbe anyị n’echete gbasara ije-ozi nlekọta, ọ dị mfe iche gbasara inyere ndi nọ na mkpa aka. Anyị n’ekwu gbasara ịkọ ubi nta maka ndi isimkpe, iwetere ndi nrịa nrịa nri abalị, ma ọbụ inye ndi ahụ na-adọlị ndọlị. Anyị n’echeta ndụmọdụ Pọl i “be akwa anyị na ndi na-ebe akwa,” mana anyị ọ na etinye kwa uche zuru ezu na akụkụ nke mbụ nke amaokwu ahụ—ị “ńụrị ọńụ anyị na ndi na ańụrị ọńụ”? (Ndi Rom 12:15). Ịńụrịkọta ọńụ anyị na ndi anyị n’ejere ozi nlekọta—ma nke ahụ ọ pụtara ịńụrị maka ịga nke ọma ha ma ọbụ inyere ha aka chọta ọńụ n’oge siri ike—bụ otu akụkụ dị mkpa nke ije-ozi nlekọta dịka Onye-nzọpụta ga-esi eme.

Nke a bụ echiche atọ nke nwere ike nyee aka (ma otu nke aga-agbanarị) dịka anyị n’atụkwasị uche maka ezi ihe Chineke tinyeworo na ndụ anyị.

1. Mara

Bonnie H. Cordon, Onye-isi Zuruọha NdiIyom Nta, nyeere anyị aka ịghọta na anyị kwesiri ịhụ ndi ahụ anyị n’ejere-ozi nlekọta—ịhụ n’abụghị nanị ibu-arọ na ndọli ha mana nakwa ike, akaraaka na ime-nke-ọma ha niile. O kwuru sị na anyị kwesịrị ị bụ “onye mmeri na onye ntụkwasị obi—onye maara ọnọdụ ha niile ma na akwado ha n’ime olile anya ha na ọchịchọ ha.”1

N’ime akụkọ nke atụrụ na ewu, Onye-nzọpụta kwuru na ndi ahụ a ga ahụta n’aka nri Ya ga-ajụ: “Onye-nwe-anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị n’agụrụ, ma nye gị nri? ma ọbụ akpịrị ịkpọ nkụ, ma nye gị mmiri?

“Olee mgbe anyị hụrụ gị ka onye ọbịa, ma kpọbata gị?” (Matiu 25:37–38).

“Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, isi okwu ahụ bụ hụrụ,” ka Nwanne nwanyị Cordon kwuru. “Ndi eziomume hụrụ ndi ahụ nọ na mkpa n’ihi ha nọọrọ n’ele ma na-amata. Anyị kwa nwere ike bụrụ anya n’ele ụwa n’inye aka na n’ịkasi obi, ịńụrị ọńụ na ọbụna inwe ebumnobi.”2

2. Chọta Ihe ga-akpalite obi ị Ńụrị ọńụ

Ńụrịa ọńụ n’ihi ịga-nke-ọma niile nke ukwu ma ọbụ nke nta. O nwere ike bụrụ inwete ọgwụgwọ kansa ma ọbụ mgbe mwute nkewa di na nwunye gafesịrị, inwete ọrụ ọhụrụ ma ọbụ ịchọta akpụkpa ụkwụ furu efu, ịdị ndụ otu ọnwa mgbe onye ị hụrụ n’anya nwụrụ ma ọbụ ịdị ndụ otu izu ụka n’erighị suga.

Kpọọ n’ekwe ntị izi ozi ekele, ziga cadị, ma ọbụ pụọ rie nri ehihe. Site n’ikekọrịta ngọzi anyị, bie ndụ n’obi ekele, ma ńụrịa ọńụ ngọzi niile na ime nke ọma niile nke ndi ọzọ, anyị “enwe ọńụ n’ime ọńụ nke ụmụnne anyị” (Alma 30:34).

3. Hụta Aka nke Onye-nwe-anyị

Oge ụfọdụ ịńụrịkọrịta ọńụ anyị na ndi ọzọ pụtara inyere ha aka hụta ucheobi ịńụrị ọńụ—n’agbanyeghị ihe isi ike ma ọbụ ihe mara mma batara n’ime ndụ anyị. Ezi okwu dị mfe na Nna nke Eluigwe maara anyị ma dịrị njikere ibuli mụọ anyị nwere ike bụrụ ụzọ ańụrị si abịa.

I nwere ike nyere ndi ọzọ aka hụta aka nke Onye-nwe-anyị n’ime ndụ ha site n’ikwupụta otu i si huwo ya n’ime nke gị. Dịrị njikere ikwupụta otu Nna nke Eluigwe si nyeworo gị aka n’ime aka mgba gị niile. Ọgbụgba ama nkea nwere ike nyere ndi ọzọ aka mata ma nakwere otu O si nyeworo ha aka (lee Mosaịa 24:14).

4. Egbochịkwala Ike Gị Ịńụrị ọńụ

Ọ dị mwute na, anyị nwere ike gbochie ike nke onwe anyị ịńụrị ọńụ anyị na ndi ọzọ, kacha mgbe anyị chere n’obi n’ihe anyị nwere inye ezughị ezu ma ọbụ ọnọdụ anyị nọ n’ime ụwa ejughị eju. Kama ịchọta ọńụ n’ime ańụrị onye ọzọ, anyị adaba n’ime ọnya nke ntulerịta. Ma dịka Okenye Quentin L. Cook nke Kworum nke ndi Ozi Iri na abụọ kuziri: “Itulerịta ngọzi n’ezie na-achupụ ọńụ. Anyị agaghị enwe obi ekele ma nwekwa anya ukwu otu mgbe.”3

“Kedu otu anyị nwere ike si emeri ụdị ihe n’emekarị onye ọbụla na nkịtị?” ka Okenye Jeffrey R. Holland nke Kworum Ndi Ozi Iri na abụọ jụrụ. “… Anyị nwere ike gụkọọ ọtụtụ ngọzi anyị ma anyị nwere ike ikuaka maka mmete nke ndi ọzọ. Nke kacha ihe niile, anyị nwere ike ijere ndi ọzọ ozi, egwuregwu nke obi kacha mma amara iwu.”4 Kama itulerịkọta, anyị nwere ike too ndi anyị n’ejere ozi nlekọta. Jiri obi umeala kwupụta ihe masịrị gị n’ebe ha nọ ma ọbụ ndi otu ezi-na-ụlọ ha.

Dịka Pọl n’echetere anyị, anyị niile bụ ndi otu ahụ nke Kraịst, ma mgbe “otu onye otu nwetere nkwanyere ugwu, ndi otu niile ańụrịa na ya” (1 Ndi Kọrịnt 12:26). Site na enyemaka nke Nna nke Eluigwe, anyị nwere ike mara maka nhụmihe nke ndi ọzọ, nwe obi ụtọ maka ọganihu ukwu na nta, nyere ha aka ịchọta aka ọrụ nke Onye-nwe-anyị, ma merie anya ukwu ka anyị wee nwe ike ńụrịakọta n’eziokwu maka ngọzi niile, akaraka niile, na ọńụ niile ndi ọzọ.

Hụba-ama

  1. Bonnie H. Cordon, “Ịbụrụzi Onye Na-azụ Atụrụ,” Liahona, Nov. 2018, 75.

  2. Bonnie H. Cordon, “Ịbụrụzi Onye Na-azụ Atụrụ,” 75.

  3. Quentin L. Cook, “Ńụrịa ọńụ!” Ensign, Nov. 1996, 30.

  4. Jeffrey R. Holland, “Nwa Mmefu Nke Ọzọ,” Liahona, Nov. 2002, 64.

Bipụta