2019
Ihe Akụkọ Ekeresimesi Na-akuziri Anyị gbasara Ije-ozi Nlekọta
Disemba 2019


Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi Nlekọta, Disemba 2019

Ihe Akụkọ Ekeresimesi Na-akuziri Anyị gbasara Ije-ozi Nlekọta

Nke a bụ oge nke afọ ahụrụ n’anya. Gụọ egwu; oge Ekeresimesi n’adịghị anya ga-eru. Kọọ akụkọ ziri ezi nke ọmụmụ Jizọs, mgbe, dịka nwa, ọ bịara n’ụwa” (“Egwu Ngosi Ọmụmụ,” Akwụkwọ egwu nke Ụmụntakịrị, 52).

Foto, oyiyi
ministering

Ozi sitere na Lee Nwatụrụ nke Chineke site n’aka Walter Rane

Oge Ekeresimesi bụ oge ịtụnanya mgbe nwa atụrụ, ndi ọzụzụ atụrụ, ihe eji etinyere anụ ụlọ nri, na kpakpando na ntabi-anya n’enwe nkọwa ọhụrụ. Ha n’abụrụzi akụkụ dị mkpa n’ịkọgharị otu n’ime mmemme kachasị mkpa n’ime akụkọ nke mmadụ: ọmụmụ nke Jizọs Kraịst. Ọtụtụ ezinaụlọ n’egosipụta ọnọdụ ngosi nke ọmụmụ n’ebe obibi ha. Ndi ọzọ n’ekpebi ịgụ akụkọ nke ọmụmụ Ya ma ọbụ isoro n’ihe ngosi ịchọ mma. Dịka akụkọ niile nke Kraịst, akụkọ nke ọmụmụ Ya jupụtara na nkuzi ndi anyị nwere ike ịmụ gbasara ije-ozi nlekọta, gbasara ikekọrịta ihé Ya iji mụkee ụwa. “Akụkọ nke Ekeresimesi bụ akụkọ nke ịhụnanya,” ka Onye-isi Henry B. Eyring Onye-ndụmọdụ nke Abụọ n’ime Otu Ndi Isi Mbụ kwuru.

“… N’ime akụkọ ọmụmụ nke Kraịst, anyị nwere ike hụ ma nwete mmetụ onye Ọ bụụrụ na onye Ọ bụ. Nke ahụ n’eme ibu anyị adị mfe n’ụzọ ahụ. Ma ọ ga-eduba anyị ichefu onwe anyị ma mee ibu nke ndi ọzọ adị mfe.”1

“Enweghị ọhere dịịrị ha n’ime inn ahụ” (Luk 2:7)

Onye nlekọta inn ahụ dara mba inwete ohere maka Onye-nzọpụta, kama anyị agaghị eme ụdị njehie ahụ! Anyị nwere ike mee ohere maka Onye-nzọpụta n’ime obi anyị site na-ime ohere maka ụmụnne anyị nwoke na ụmụnne anyị nwanyị ebe okpokoro anyị, n’ime ebe obibi anyị, na n’ime ọdịnala anyị. Ọtụtụ ọdịnaala nke ezinaụlọ ka e nwere ike ime ya adị ụtọ karịa ma ọbụna nke kwesịrị ncheta site n’igụnye ndi mmadụ ọzọ. Daiana na ezinụlọ ya nwere ọdịnaala nke ikpọku otu onye ịnọnyere ha oge Ekeresimesi. Dizemba niile, ha atụle ma kpebie onye ha ga-achọ ịkpọku.2 Enwere ike ezinaụlọ gị ebido ụdị ọdịnaala ahụ. Elemaanya onye ị n’ejere ozi nlekọta ga-achọ ịnọnyere ezinaụlọ gị n’ịgụkọrịta egwu Ekeresimesi kacha mmasị ọnụ. I nwekwara ike rọpụta ohere maka otu onye n’enweghị ndi ezinaụlọ ya n’ime obodo ahụ maka nri abalị.

Kedụ ụzọ kacha mma ime mmemme nke Onye-nzọpụta karịa isoro ọmụmaatụ Ya nke nsonye. Chetakwa na Ọ na-akpọku “ndi niile ka ha bịakwute ya ma keta oke n’ịdị mma ya; ma ọdịghị onye ọ na-ajụ bụ onye na-abịakwute ya, ndị ojii na ndị ọcha, ndị oru na ndị nwe onwe ha, nwoke na nwanyị; ma ọ na-echeta ndị na-ekweghị ekwe; ma ha niile dị otu ụdị n’anya Chineke, ma ndị Juu ma ndị Jentaịlụ” (2 Nifaị 26:33). Rọpụta ohere maka otu onye ma mepụta nsonye.

“Ma e nweere n’ime otu obodo ahụ kwa ndi ọzụ atụrụ nọọrọ n’ime ubi ahụ, n’elekọta igwe atụrụ ahụ na-abalị” (Luk 2:8)

Ọ dabara na ndi ọzụ atụrụ ga-eso n’etiti ndi mbụ ga ekele Onye-nzọpụta amụrụ ọhụrụ. Ndi amụma ochie naara akpọ Jizọs Kraịst dịka “Ọzụ atụrụ nke Izrel” (Psalm 80:1) na “Ọzụ atụrụ nke ụwa niile” (1 Nifaị 13:41) Ma Kraịst nOnwe Ya sịrị, “A bụ m ezi ọzụ atụrụ ahụ, ma a maara m atụrụ m” (Jọn 10:14). Ịmara atụrụ anyị ma n’elekọta bụ otu akụkụ dị mkpa nke ọzụzụ atụrụ na ije-ozi nlekọta dịka Onye nzọpụta si eme.

N’etiti ọkụ niile n’egbuke egbuke na ọla ịchọ mma niile, e nwere ọtụtụ ihe ile anya n’oge Ekeresimesi. Kama elemaanya mma kacha ibe ya nke oge ahụ ka e nwere ike ịchọta mgbe anyị chetara itinye uche na ndi anyị n’ejere ozi nlekọta nye ma lekọta igwe nke anyị. Ilekọta nwere ike bụrụ ịchọpụta nri kacha masị otu onye ma ọbụ ịjụ ajụjụ gbasara atụmatụ ezumike nke otu onye. Anyị n’elekọta mgbe anyị hụtara ma mezuo mkpa nke ndi ọzọ—ma nke pụtara ihé na nke n’apụtaghị ihé.

Mgbe di Cheryl, Mick, nwụrụ na ntabi-anya, obi gbawara ya. Dịka Ekeresimesi mbụ ọ nọghị rutere nso, owu kụrụ ya. N’obi ekele, nwanne nwanyị n’eje ozi nlekọta nye ya nọ n’ebe ahụ. Shauna na di ya, Jim, kpọkuru Cheryl n’ọtụtụ njem ezumike. Ha hụtara kootu Cheryl nke meworo ochie ma kpebie ime ihe gbasara ya. Ụbọchị ole ma ole tupu Ekeresimesi, Shauna na Jim weteere Cheryl onyinye Ekeresimesi: otu kootu ọhụrụ mara mma. Ha maara maka mkpa nke anụ ahụ Cheryl maka kootu mkpom ọkụ kama nakwa mkpa mmetụta uche maka nkasị obi na nnọkọ. Ha gbalịrị mejupụta mkpa ndi ahụ otu ha nwere ike karịsịa ma gosipụta ọmụmaatụ mara mma n’otu anyị kwa nwere ike si lekọta igwe anyị.3

“Ndi ọzụ atụrụ gwara otu onye n’ibe ya, Ka anyị gaa ugbua ọbụna n’ime Bethlehem” (Luk 2:15)

“Ka anyị gaa ugbua” bụ ọkpụkpọ oku dị elu! Ndi ọzụ atụrụ enweghị mgbe ha chere na ike gwụrụ ndi enyi ha ịga ije. Ha apụghị nnọọ gawa Bethlehem n’onwe ha. Ha jiri nnukwu ọńụ gwa onye ọbụla nibe ya ma sị “Ka anyị gaa ugbua!”

Ebe ọ bụ na anyị enweghị ike ịkpọku ndi enyi anyị ịbịa hụta Onye-nzọpụta amụrụ ọhụrụ, anyị nwere ike kpọkuo ha inwete mmetụta nke mụọ Ekeresimesi (ma ọbụ mụọ nke Kraịst) site n’ije-ozi anyị na ha. Ụzọ esi emelite mụọ nke Ekeresimesi bụ iji obi sara mbara zute ndi ahụ nọ gbụrụgbụrụ anyị ma nye onwe anyị;” ka Bonnie L. Oscarson, onye bubuuru Onye-isi NdiIyom Nta Zuru Ọha kwuru.4 Chee na iji kandụl n’aka gị. Ndi ọzọ ga ahụrịrị ụzọ n’ezie ma kete oke site n’ihé sitere na kandụl gị, mana chee afọ ojuju ha nwere ike inwe m’ọbụrụ na gị jiri kandụl gị mụnye ọkụ na kandụl ha ma kwe ka ha jide ọkụ ahụ maka onwe ha.

Kraịst n’Onwe Ya kuziri na ndi ahụ n’eso Ya ga-enwe ihé nke ndụ (lee ńọn 8:12). Ije-ozi otu O si gaa bụ otu ụzọ anyị nwere ike isoro Ya ma rite ihé ekwere na nkwa. Ya mere kesaa ihé site n’ikpọku ndi ọzọ gị na ha jee ozi! Olee otu gị na ndi ị n’ejere-ozi nlekọta ga-esi jekọta ozi ọnụ? Unu nwere ike tinyekọta aka sie nri na-amasị gị karịa ma ọbụ jiri obere ihe onyinye ma ọbụ ihe ederede nye mmadụ mgbe ọ n’atụghị anya ya. Unu ga-enwekọrịta mmetụ nke ihé nke na abịa site n’isoro ọmụmaatụ ije-ozi nke Kraịst.

Ha gwara ndi nọ n’obodo ihe nke ahụ a gwara ha gbasara nwa ahụ” (Luk 2:17)

Ọ dị mfe iche oke ọńụ nke dị n’etiti ndi ọzụ atụrụ dịka ha n’ekwesa ozi ahụ mara mma nke ọmụmụ Kraịst n’etiti ọtụtụ mmadụ ha nwere ike. Nkwupụta sitere n’aka ndi mụọ ozi, Mesaịa ebụrụ amụma maka abịawo! Ọ bịara ebe a! N’ezie, ikwusa ozi ahụ dị mma nke Onye-nzọpụta bụ nnukwu isi-okwu nke akụkọ Ngosi nke ọmụmụ. Ndi mụọ ozi gụrụ egwu. Kpakpando ahụ gosiri ụzọ. Ma ndi ọzụ atụrụ mere ndi obodo amara.

Anyị nwere ike tinyekọta ọlụ anyị n’akụkọ nke Ekeresimesi site n’ikwusa ozi ahụ dị mma na ịgba ama maka Onye nzọpụta. “Dịka unu nwere ohere ịnọchite anya Onye-nzọpụta n’ime mgbalị ije-ozi nlekọta gị, jụọ onwe gị, ‘Olee otu m g’esi kekọrịta ihé nke ozi-ọma nye otu onye a ma ọbụ ezinaụlọ a?’” ka Nwanne nwanyị Jean B. Bingham, Onye-isi Zuruọha Otu Enyem aka kuziri. “Gịnị ka Mụọ ahụ n’akpalite m ime?”5

N’ebe a bụ ụfọdụ ntụpụta ole ma ole nke ị ga-atụle dịka ị na-achọ ịmata otu ị g’esi kekọrịta ọgbụgba ama gị nke Onye-nzọpụta na oziọma Ya:

  • Chọta akwụkwọ nsọ nke n’akwado mmetụta gị gbasara Onye-nzọpụta ma ọbụ nke na-egosipụta ihe mere i jiri enwe obi ekele nye Ya. Kesaa ya gị na ndi ị n’eje ozi nlekọta nye.

  • Ziga ozi ekwe ntị ma ọbụ ozi soshal midia etinyere vidio Ekeresimesi. E nwere ụfọdụ ndi nke mara nnukwu mma na ChurchofJesusChrist.org!

  • Gwa otu enyi gbasara ihe ncheta pụrụ iche ma ọbụ ọdịnala nke n’echetere gị maka Kraịst.

Nwe okwukwe na Mụọ Nsọ ga-agbara gị aka ebe nke eziokwu nke ọgbụgba ama gị, dịka otu O sị gbaa aka ebe nye Simeon na Anna na Jizọs amụrụ ọhụrụ bụụrụ Onye-nzọpụta ahụ (lee Luk 2:26,38).

“Ikwanye ugwu ziri ezi nye ọbịbịa [Jizọs Kraịst] n’ime ụwa, anyị garịrị eme dịka O siri mee ma jiri ọmịiko na ebere zute ndi mmadụ ibe anyị,” ka Okenye Dieter F. Uchtdorf nke Kworum nke Ndi Ozi Iri na Abụọ. “Nkea ka anyị nwere ike ime kwa ụbọchị, site n’okwu ọnụ na omume. Kwe ka nkea bụrụ ọdịnaala Ekeresimesi anyị, n’agbanyeghị ebe anyị nọ—ịdịrị obiọma karịa, dịrị mgbaghara karịa, ghara ikpe ikpe, dịrị obi ekele karịa, ma dịrị nyepụ aka karịa n’ikekọrịta ụba anyị anyị na ndi nọ na mkpa.”6

Hụba-ama

  1. Dieter F. Uchtdorf, “Gbakasịa Crumbs Gị” (Ofufe Ekeresimesi Ndi Isi Mbụ, Dec. 6, 2009), broadcasts.ChurchofJesusChrist.org.

  2. Lee Daiana Melina Albornoz Díaz, “Ikesa Ekeresimesi,” Lịahona, Dec. 2007, 17.

  3. Lee Cheryl Boyle, “Ọ Gaara Ewetere Gị Ya,” Ensign, Dec. 2001, 57.

  4. Bonnie L. Oscarson, “Ekeresimesi Bụ Ịhụnaanya Kraịst” (Ofufe Ekeresimesi Ndi Isi Mbụ, Dec. 7, 2014), broadcasts.ChurchofJesusChrist.org.

  5. Jean B. Bingham, “Ije-ozi nlekọta dịka Onye-nzọpụta si Eme,” Liahona, May 2018, 104.

  6. Dieter F. Uchtdorf, “Gbakasịa Crumbs Gị” (Ofufe Ekeresimesi Ndi Isi Mbụ, Dec. 3, 2017), broadcasts.ChurchofJesusChrist.org.

Bipụta