2020
Ije-ozi Nlekọta site na Nzukọ Oriri nsọ
Jun 2020


“Ije ozi Nlekọta site na Nzukọ Oriri nsọ,” Laịhona, Jun 2020

Foto, oyiyi
ije-ozi nlekọta

Ngosipụta ndị si n’aka Edward McGowan

Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi Nlekọta, Jun 2020

Ije-ozi Nlekọta site na Nzukọ Oriri nsọ

Nzukọ oriri nsọ n’ewete ohere ndi eji ejikọ ma jee ozi nlekọta nye ndi ọzọ.

Nzukọ oriri nsọ bụ oge maka ọzụzụ ime mụọ na ntụgharị uche nke onwe maka Onye Nzọpụta na Aja mgbaghara mmehie Ya. Dịka anyị n’eri oriri nsọ izu ụka ọbụla, anyị enwekọtawo mmụta ime mụọ ọnụ (lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 84:110). Mana ụfọdụ ndị nọ n’ime ngalaba ukwu anyị na ngalaba nta anyị n’eji ibu arọ abịa ma ọ bụ ha agaghị abịa ma ọlị.

Nke a bụ ohere ọma ole ma ole maka otu anyị nwere ike jiri awa ahụ dị nsọ ji jee ozi nlekọta nye ndi ọzọ ma mee ihe dị iche n’ime ndụ ha.

Nye aka mee ka Nzukọ Oriri nsọ Dị mma Karịa maka Ndi ị Na-ejere ozi nlekọta

Ụzọm mbụ n’ịmụta otu esi eje ozi nlekọta bụ ịmata ndị ahụ ma ọ bụ ezinaụlọ ndi ahụ na mkpa ha. A ga enwe ụzọ ndi ị nwere ike isi enye-aka mee nhụmiihe ofufe oriri nsọ ha adị mma karịa nanị site n’ịmụta ihe karịa banyere ha.

Maka Mindy, onye nne ụmụ ejima dị nta, mgbalị dị mfe nke nwanne nwanyị ije-ozi nlekọta ya mere nzukọ oriri nsọ ya adị iche nke ukwuu izuụka niile.

“N’ihi oge ọrụ nke di m, a na m akpọrọ ụmụ ejima anyị ndị nwanyị gaa nzukọ nsọ n’onwe m izuụka niile,” ka Mindy kọwara. “Ọ bụ ọrụ karịrị akarị ịgbalị ịnọta na nzukọ oriri nsọ ruo ọgwụgwụ mụ na ụmụaka abụọ nọ n’egwuregwu, mana nwanne nwanyị n’eje ozi nlekọta nye m wepụtara onwe ya inyere m aka.

“Ọ na-anọdụ ọdụ na akụkụ anyị ma nyere m aka lekọta ụmụ ejima m izu ụka ọbụla. Nanị na ọ nọ na-akụkụ m baara oke uru ma n’ezie n’eme nchegbu m ebelata n’oge ndagide na nsogbụ Echeghị m na ọ pụrụ ịmata ka omume ya siri metụ m n’oge a na ndụ m. Ọ hụtara mkpa m dị ka onye nne nta, jupụtara na nchegbu, ma ọ n’enye aka mee nzukọ nsọ adị ka ebe jupụtara n’udo na ọńụ maka anyị niile.”

Echiche eji Enyere Ndi nwere Mkpa Pụrụiche Aka

  • Nye ndi ndu kworum ndi okenye na Otu Enyem aka nkọwa banyere mkpa nke ndi otu.

  • Ndi ndu na-ahazi okwuchukwu nke nzukọ oriri nsọ iji nye aka zute mkpa nke ndi otu. Ọ bụrụ na ndi ahụ ị n’ejere ozi nlekọta nwere otu ozi nke ga-abara ha uru ma ha nụ ya, kekọrịta uche ahụ gị na ndi ndu.

  • Ọ bụrụ na ị maara na otu onye nwere nkwarụ ma ọ bụ nwere nrị nke ahu anataghi n’egbochi ha irite ngọzi niile nke oriri nsọ, jụọ ha maka ihe niile na ihe ndi enwere ike ime iji melite nhụmịhe ofufe ha. Gị na ndi ndu unu kpaa nkata banyere nke a.

  • Ọ bụrụ na otu onye ị n’ejere ozi nlekọta ma ọ bụ onye ị maara ihe gbasara ya nọ n’ụlọ, na-adịgide adịgide ma ọ bụ nwa oge, jụọ bishọp gị ma e nwere ike ịnye ha oriri nsọ n’ebe obibi. I nwere ike ọbụna detuo ozi n’oge nzukọ oriri nsọ ma zigara ha na ekwentị, site na email, ma ọbụ n’ihu n’ihu.

  • Ọ bụrụ na onye ị n’eje ozi nlekọta nye nwere ụmụaka nta, ị nwere ike nye enyem aka n’oge nzukọ oriri nsọ.

  • Ọ bụrụ na ndi ị n’eje ozi nlekọta nye anaghị abịa nzukọ oriri nsọ mgbe niile, gbalịa ịghọta ma tulee ụzọ ndi i nwere ike esi nyee aka. Ọ bụrụ na ha nwere mkpa ego ụgbọ, i nwere ike ịkwọla ha n’ụgbọ ala gị. Ọ bụrụ na ha anaghị enwete nkwado site n’aka ndi ezinaụlọ ha, i nwere ike kpọkuo ha ịnọnyere gị n’oche. I nwere ike kpọọ oku pụrụ iche iji nyere ha aka nwee obi ụtọ na nnabata na nzukọ oriri nsọ.

Cheta, Obere Omume Na Enye aka Nke ọma

Ikwu ihe banyere ije ozi nlekọta, Nwanne nwanyị Jean B. Bingham, Onyeisi Zuruọha Otu Enyem aka, kuziri: “Mgbe ụfọdụ anyị n’eche na n’anyị kwesịrị ime ihe pụrụ iche ma ọ bụ ihe dị ike iji ‘gụnye’ dịka ijere ndi agbata obi anyị ozi. N’agbanyeghị obere omume nke ije ozi nwere ike nwee mmetụta dị ukwuu na ndi ọzọ—dịka kwa n’onwe anyị.”1

N’ime obere ngalaba ukwu n’ime Belgium, Evita mgbe ụfọdụ na-ewepụta onwe ya ịtụgharị asụsụ maka ndi ọbịa na ndi otu na-asụ Spanish n’oge nzukọ niile nke Nzukọ nsọ. N’otu oge, Evita ka egosiri otu onye sitere na Dominican Repụblik onye naara amụ banyere Nzukọ nsọ. Ọ matụụrụ asụsụ Bekee, mana Spanish bụụrụ asụsụ ala ya. Ya mere Evita kwere nkwa ịtụgharịrị ya n’olu nwayọ n’ime nzukọ oriri nsọ ka obi ruo ya ala karịa.

“Ntụgharị asụsụ nwere ike mgbe ụfọdụ mee Ụbọchi Izuike m esitụ ike obere,” ka Evita kwuru. “Mana ige ntị na mmetụta nke mụọ ijụ ndi ọzọ ma ọ bụrụ na ha chọrọ onye ntụgharị okwu n’ezie n’enye m ọńụ na mkpom ọkụ n’ịmara na m nwere ike inyere ha aka nwete mmetụta nke Mụọ Nsọ ma nwee obi ụtọ maka nzukọ ha niile.”

Uche ndi eji Enye aka site na Omume dị mfe

  • Kwukọrịta okwu gị na ndi ndu gị ịmata ndi ga-enwe mkpa ijere ozi n’oge nzukọ oriri nsọ. M’ọbụ ọ bụrụ na ị maara onye nwere mkpa, hụta na ndi ndu gị maara maka ha.

  • Nọrọ ọdụ nwayọ dịka ị n’eche ka nzukọ bido. Nke a ga-enwete enyem aka nye “ndi ọzọ ahụ obi ha tiwara etiwa na ndị mụọ ha n’eru uju ndị nke gbara anyị okiri kiri”2 ndi chọrọ udo nke nwere ike ịbịa site na nsọpụrụ n’ime ebe dị nsọ.

  • Na Sọnde ibu ọnụ, tulee ịrara nye ibu ọnụ gị na ekpere gị maka onye i n’eje ozi nlekọta nye onye nwere ike inwe mkpa nkasị obi.

  • Kpe ekpere ịmata ma enwere onye nwere ike irite site na gị ịnọdụ n’akụkụ ma ọbụ nọdụ ha nso n’oge nzukọ oriri nsọ ma ọbụ n’enwere ụzọ ndi ọzọ i nwere ike isi nye aka.

Nzukọ Oriri nsọ Nwere ike bụrụ Ebe Nnabata maka Onye Niile

Onyeisi Joseph Fielding Smith (1876–1972) kuziri, “Nzukọ oriri nsọ bụ nke kachasị ịdị nsọ, kachasị nsọ, nke nzukọ niile nke Nzukọ nsọ.”3 N’ọnọdụ ọbụla, ọ dị mkpa ihụta na ndi niile na-abịa nzukọ oriri nsọ nwere mmetụ nnabata ma rie nri ime mmụọ—kacha nke ndi otu ọhụrụ ma ọbụ ndi otu ndi n’abịabeghị kemgbe.

Merania sitere na New South Wales, Australia, mere otu nwanyị enyi onye naara amụ ihe banyere Nzukọ nsọ n’ime ngalaba ukwu ya. “Ọ bụrụwo otu n’ime ndi ezi enyi ugbua,” Merania ekwuo. “A na m enwe mmasị ịnọdụ n’akụkụ ya n’ime nzukọ oriri nsọ izu ụka niile, ma a na m ajụ mgbe niile otu o si eme na ma ọbụ na enwere ihe ọbụla m nwere ike ime inyere ya aka.” Mgbe nwa oge gasịrị, emere enyi Merania baptizm. Mgbalị nke ndi otu ngalaba ukwu, nakwa otu ebe nzukọ oriri nsọ ahụ si nwee nnabata nye ya, nyere nnukwu aka na mkpebi ya.

Uche maka Ije-ozi nlekọta nye Ndi otu Na-alọghachị ma ọbụ Ndi ọhụrụ

  • Mgbe ị na-aga ikwu okwu n’ime nzukọ oriri nsọ, i nwere ike kpọkuo ndi enyi, ezinaụlọ, na ndi ọzọ ịbịa nụrụ ozi gị.

  • I nwere ike chọọ ma nabata ndi nọọrọ nanị ha ma ọbụ ndi nwere ike inwe mkpa enyem aka. Jụọ ma i nwere ike ịnọdụ n’akụkụ ha ma ọbụ kpọkuo ha ịnọdụ n’akụkụ gị.

  • Mgbe nzukọ mechịrị, i nwere ike kpọkuo ndi i n’ejere ozi nlekọta na ndi ọzọ maka ihe omume Nzukọ nsọ na-abịa abịa, ịga tempụl, ma ọbụ mmemme ọha.

  • Ọ bụrụ na onye ị n’eje-ozi nlekọta na-abịa nzukọ oriri nsọ mana ọ bịabeghị kemgbe, i nwere ike jụọ ha ma ha nwere ajụjụ banyere ihe a kuziri. Gwa ha na ha nwere ike ịbịakwute gị ọbụrụ na enwere okwu, akụkọ, ma ọbụ ururu ozizi ha aghọtaghị. Unu nwere ike chọkọta azịza ọnụ ọbụrụ na ọ dị mkpa.

Hụba-ama

  1. Jean B. Bingham, “Ije-ozi nlekọta dịka Onye-nzọpụta si Eme,” Liahona, Mee 2018, 104.

  2. Jeffrey R. Holland, “Lee Nwa atụrụ nke Chineke,” Liahona, Mee 2019, 46.

  3. Joseph Fielding Smith, in Conference Report, Oct. 1929, 60–61.

Bipụta