2020
Ije ozi Nlekọta site na Ihe omume niile nke Nzukọ nsọ
Julaị 2020


“Ije ozi Nlekọta site na Ihe omume niile nke Nzukọ nsọ,” Liahona, Julaị 2020

Foto, oyiyi
ije ozi nlekọta

Foto nke ndịikom nta n’edozi tent site n’aka Bud Corkin; foto nke nwata nwanyị n’edozi tebụlụ site n’aka Price McFarland; ihe osise dị n’azụ sitere n’aka Getty Images

Ụkpụrụ niile nke Ije-ozi Nlekọta, Julaị 2020

Ije ozi nlekọta site na Ihe omume niile nke Nzukọ nsọ

Ndetu nke Onye ndezi: Ederede nkea ka emepụtara tupu ọrịa ọgbaghara COVID-19. Ụfọdụ nchepụta ndị sotere n’okpuru adabaghị n’oge nke nzere ọha ma ọ ga adaba otu aka nzukọ nke Nzukọ nsọ na ihe omume bidoghachịrị. Ọbụrụ na ọ dị mkpa, biko tinye n’ọrụ nchepụta ndịa niile dịka otu ntụziaka nke Nzukọ nsọ na ọchịchị ndị dị ugbua.

Otu ụzọ anyị nwere ike isi ejere ndị otu ngalaba ukwu anyị, ndị agbata obi, na ndị enyi anyị ozi bụ site na ihe omume niile nke Nzukọ nsọ. Ọbụrụgodi na i n’aghazi atụmatụ ihe omume nke metụtara mkpa niile ma ọbụ mmasị nke otu onye ị na-ejere ozi nye, m’ọbụ ị n’akpọkuo ha isoro mee ihe na ihe omume niile m’ọbụ ohere ije ozi niile maka ndị ọzọ, ihe omume na ngalaba ukwu, stek, ma ọbụna ruo ọtụtụ stek, nwere ike wete ụzọ ndị bara uru dị ụtọ iwete ịdị n’otu ma gbaa ndịotú ume.

Ihe omume niile nke Nzukọ nsọ nwekwara ike mepee ụzọ ọtụtụ ohere eji eje ozi. N’ịmaatụ, ihe omume niile nke Nzukọ nsọ nwere ike wete ohere isoro n’ọrụ ije ozi nke na-agọzi ndị ọzọ ma wulite mmekọrịta ziri ezi n’ime obodo. Ihe omume niile nke Nzukọ nsọ nwekwara ike bụrụ ohere ịkpọtụrụ ndịotú Nzukọ nsọ dara mba na ndị enyi nke okpukperechi ọzọ m’ọbụ ndị enyi n’enweghị okpukperechi ha sonyere na ya.

Itinyekọta ọtụtụ mmadụ n’ime ihe omume niile nke Nzukọ nsọ na ewete ohere nke Onyenwe anyị iji gọzie ma nye ngalaba ukwu na ngalaba nta anyị, ndị agbata obi anyị, na obodo anyị niile mgbam ume.

Iwụlite Mmekọrịta ndị Bara Uru

Oge-oyi naara abịa, ma David Dickson amaghị otu ọ ga-esi enye ndị ezi na ụlọ ya mkpomoku.

David, nwunye ya, na ụmụ ndị nwanyị abụọ kwabatara ọhụrụ na imeobodo nke Fredonia, Arizona, USA, otu oke ọzara nke ọmarịcha uhie okwute, sagebrush, na ahịhịa ndụ-ndụ gbara gburugburu.

Ebe obibi nke ezi na ụlọ Dickson kwụrụ ụgwọ ya bụ nke n’enwete mkpọmọkụ site na nkụ n’enwu ọkụ. David n’egbughị oge mụtara na ikpokọta nkụ bụụrụ nka dị mkpa n’ihi oge-oyi nke obodo Fredonia jupụtara na snow na ice.

“Enweghị m nkụ ma ọbụkwanụ chainsaw, amaghị kwanụm otu esi eji ya arụ ọru!” David ekwuo. “Amaghị m ihe m gaara eme.”

Ụfọdụ ndịotú ngalaba ukwu jụrụ David ma ezi na ụlọ ya ha nwere nkụ zuru ezu iji nọzuo oge-oyi ahụ. “Ogbughị ha oge ịmata na enweghị m,” David ekwuo. “Kworum ndị okenye n’oge n’adịghị anya kwere na ha ga-enyere m aka kpakọta nkụ. Na njupụta obi ekele, a nabatara m onyinye ha.”

David n’egbughị oge matara na njem mkpakọta nkụ nkea bụụrụ ụdịrị ọtụtụ ihe omume ngalaba ukwu atụziri nke ọma, hazie nke ọma, na nke ndị mmadụ bịara nke ọma. Otu ụtụtụ Satọde, David, kworum ndị okenye, na ndịotú ngalaba ukwu ndị ọzọ jiri karavan nke truck na ọtụtụ ụgbọ-trailer banye n’ime ugwu ahụ.

“Na otu ehihie, ekele dịịrị ngwa ọrụ ha na aka ọrụ ha, ndịotú ngalaba ukwu weteere ezi na ụlọ m ikpo osisi nke zuuru anyị oge kacha mkpa nke oge oyi abụọ,” David ekwuo. “Ọbụna karịa n’ịdị mkpa, a kuziiri m ihe niile m kwesịrị ịmara banyere ikpokọta nkụ n’onwe m. Oge m hapụrụ Fredonia, a maara m otu esi eji chainsaw eme ihe, ma enyekwara m aka na ihe omume mkpokọta nkụ ndị ọzọ nke ngalaba ukwu mụ n’enweghị ike ịgụta.”

Ụdịrị ihe omume ngalaba ukwu ndịa anaghị ewulite nanị mmekọrịta bara uru n’etiti ndịotú nke Nzukọ nsọ kama ọ nakwa ewulite mmekọrịta bara uru n’etiti ndị niile n’ime obodo.

“E chetere m otu nwanyị, n’abụghị onyeotú nke Nzukọ nsọ, onye bịara ọhụrụ na mpaghara ahụ,” David ekwuo. “O ruuru ya nke iji osisi akụpagidere n’ahụ ụlọ ebe obibi ya, suo ọkụ maka iji nye ebe obibi ya mkpomọkụ. Otu aka ahụ anyị matara mkpa ya, anyị hụrụ na o nwetere nkụ ga-ezuru ya na oge oyi ahụ. Obi juru ya n’ekele nke n’enyeghị ya ọnụ okwu.”

Mbọ ije ozi nlekọta n’ime Fredonia hụrụ na onye niile nwetere nchekwa na mkpomọkụ site na oge-oyi.

Nsetipụ aka nye Ndị ọzọ

Mgbe m n’eje ozi na mishọn dị n’ime Romania, Meg Yost na onye nsiso ya gara nleta ugboro ugboro n’ụlọ otu ezi na ụlọ ndị n’abịabeghị nzukọ nsọ n’ogologo oge. “Ezi na ụlọ Stanicas so n’etiti ndịotú isimbụ nke Nzukọ nsọ n’ime Romania,” Meg kwuru, “ma anyị hụrụ ha n’anya.”

Mgbe o ruru oge ime atụmatụ ma hazie ihe omume ngalaba nta, ndị ndu kpebiri na ngalaba nta ahụ ga-enwe “Pioneer Night.” Nkea ga-abụ mgbede ime mmemme ncheta ndị isimbụ nwere obi ike ndị gafere United States ịgaru Ndagwurugwu Salt Lake. Ọ ga-abụkwa otu ohere ịkwanyere ndị isimbụ nke Nzukọ nsọ n’ime Romania ugwú.

“Anyị chere na ọ ga-abụ nnukwu ụzọ maka ụfọdụ ndịotú ikwupụta ọgbụgba ama nke nchịgharị ha na otu ha siworo hụta ntolite nke Nzukọ nsọ n’ime Romania,” Meg ekwuo. “Anyị n’egbughị oge chere na ezi na ụlọ Stanicas kwesịrị ka ha soro. Anyị kpọkuru ha isoro, ma obi tọrọ ha ụtọ!”

N’abalị nke ihe omume ahụ, ezi na ụlọ Stanicas abịarubeghị mgbe oge zuru iji bido.

“Echiche gburu anyị na ha agaghị abịa,” Meg chetere. “Mana nanị nwa oge ahụ, ha gabatara site n’ọnụ ụzọ ahụ. Ezi na ụlọ Stanicas kwupụtara ọmarịcha ọgbụgba ama nke ozi ọma na Nzukọ nsọ. Ha nwetekwara ohere imekọrịtara ndịotú ndị ọzọ ndị ha ahụbeghị n’ogologo oge.”

Ndịotú ngalaba nta jiri obi ha ma nabata ha nke ọma. Sọnde sotere, ọ tụrụ Meg n’anya n’obi ụtọ ịhụta Nwanne nwanyị Stanicas na nzukọ nsọ.

“Mgbe ọnwa ole ma ole gasịrị m gara nleta na ngalaba nta ahụ, ọ nakwaara na-abịa!” Meg ekwuo. E chere m na ohere ikwupụta ọgbụgba ama ya na inwe mmetụta ịdị n’otu na nnabata nyeere ya aka nke ukwuu.”

Echiche 4 maka Ije ozi nlekọta site na Ihe omume niile nke Nzukọ nsọ

  • Hazie atụmatụ nke na-emezu mkpa niile: Ihe omume ndịa bụ nnukwu ụzọ iji metazie mkpa dị iche iche. Enwere ike hazie ha imezu mkpa nke ọbụla nke otu onye ma ọbụ ọtụtụ. Ha kwesịkwara imezu mkpa nke ndị soro mee ihe, ma mkpa ahụ ọ bụ maka ịmata onye na ibe ya nke ọma, mụọ karịa banyere ozi ọma, m’ọbụ nwete mmetụta nke Mmụọ.

  • Kpọkuo onye niile: Dịka ị na-ahazi atụmatụ ihe omume niile, gbaa mbọ pụrụ iche ịkpọku ndị ga-erite ihe site na-isoro mee ihe. Chetakwa ndịotú ọhụrụ, ndịotú dara mba n’okwukwe, ndị ntoroọbịa, ndị na-alụbeghị ọlụlụ, ndị mmadụ nwere nkwarụ ahụ, na ndị mmadụ okpukperechi ọzọ. Setịpụ okú ahụ ma buru n’obi ọdịmma ha nke kachasị, ma kwupụta otu ọ ga-esi masị gị na ha ga-abịa.

  • Kwalite nsonye: Ndị ahụ ị kpọrọ okú ga-enwete karịa site na ihe omume ndị ahụ ma ọbụrụ na ha nwete ohere isoro mee ihe. Otu ụzọ ikwalite nsonye bụ ikwe ka ndị mmadụ jiri onyinye ha, nka niile, na akara aka ha mee ihe n’oge ihe omume ahụ.

  • Nabata onye niile: Ọbụrụ na ndị enyi gị bịa otu ihe omume, mee ihe niile i nwere ike ime ịnabata ha. Otu aka ahụ, ọbụrụ ma gị ahụta ndị ịmaghị, mere ha enyi ma nabata kwa ha!

Bipụta