2020
Ije ozi nlekọta site na Atụmatụ Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa
Ọktoba 2020


“Ije ozi nlekọta site na Atụmatụ Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa,” Liahona, Ọktoba 2020

Foto, oyiyi
Ụkpụrụ niile nke Ije ozi nlekọta

Foto niile sitere n’aka Tom Garner, Isaac Darko-Acheampong, Alexander K. Boateng, na Jonas Rebicki

Ụkpụrụ niile nke Ije ozi nlekọta, Ọktoba 2020

Ije ozi nlekọta site na Atụmatụ Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa

Ikpọku ndị ọzọ itolite na ị nyere ha aka n’ụzọ ahụ bụ njirimara nke ije ozi nlekọta.

Ohere jupụtara maka ije ozi nlekọta site na atụmatụ Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa. Enwere ike ị nwere ụmụntakịrị ma ọbụ ndị ntoroọbịa nke gị onwe gị n’ebe obibi gị. Enwere ike ị bụ onye ndu n’ime atụmatụ ahụ ma ọbụ ị na-eje ozi nlekọta nye ezi na ụlọ ndị nwere ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa. Ma ọbụ enwere ike ị maara ụfọdụ ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa (nke ga-agụnyekọta anyị niile). Otu ọbụla ọnọdụ gị nwere ike ịbụ, enwere ọtụtụ ụzọ esi eji atụmatụ ahụ ma ọbụ ụkpụrụ ya niile agọzi ndụ ndị ọzọ

Ịzụlikọta Onwe anyị Ọnụ

Ihe dị n’obi Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa bụ itinye uche n’ịgbali kwa ụbọchị ịdịkarị mma dịka Onye Nzọpụta, onye jere ozi na-enweghị ntụpọ. Ọtụtụ n’ime ndị sonyeworo mee ihe na atụmatụ ahụ amụtawo na dịka ị na-agakarịnihu n’ụzọ dị iche iche na ndụ gị, ị na-aka adị ezi njikere ịnye aka ma ọbụ ijere ndị ọzọ ozi.

Mana ejiri atụmatụ Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa ahụ, ịgọzi ndị ọzọ ekwesịghị ịbụ ihe aga echere tutu ruo mgbe ị mụtaworo ihe. Omume mmụta n’onwe ya n’ewete ohere ije ozi.

Maka otu nwata nwoke a kpọrọ Prophet bi na Ghana, ihiwe ebumnobi nke atụmatụ Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa maka ị mụ otu esi apị piano buuru nnọọ isi mmalite. “Ọ bụ ebumnobi m inyekwara ndị ọzọ aka mata ihe m na-amụ,” ka Prophet na-ekwu.

Ọbụnadị na ọ bụbeghị onye nkuzi, ebumnobi ya etolitewo ruo n’ihe karịrị otu o siri chee. Ugbua enwere ụmụakwụkwọ 50 n’amụ ịkpọ piano na ụlọ nzukọ ha na Prophet. Ma onye na-akuziri Prophet na ụmụakwụkwọ 50 ndị ọzọ ahụ ihe? Alexander M. na Kelvin M., ha abụọ gbara afọ 13. “Anyị chọrọ igosi ndị ọzọ omume obiọma,” ka Kelvin na-ekwu.

Mkpụrụ ụbọchị atọ n’ime izu ụka ka ndị ntoroọbịa abụọ ahụ na-akuzi ihe ọmụmụ piano kacha mkpa n’efu nye ndị niile bịara ịmụ ihe. Enwewo uru agbakwunyere na ọmụmụ piano ahụ. Ọtụtụ ụmụakwụkwọ agwara banyere Nzukọ nsọ site na ọmụmụ piano mesịrị mụọ oziọma ma kpebie ime baptizm.

Dịka anyị n’agba mbọ imeziwanye onwe anyị, anyị nwere ike jeere ndị ọzọ ozi site n’ikpọku ha isonyere anyị.

Usoro Mmeri nke Ije ozi nlekọta

Dịka onyeisi Prịamarị na stek, Sabrina Simões Deus Augusto nke Curitiba, Brazil, ahụwo otu ihe banyere mnwulite nke onwe nke atụmatụ ahụ si gọzie ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa n’ime stek ya. Mana ọ hụwokwa ọtụtụ ụzọ esi eji ihe ọ mụtaworo banyere mnwulite nke onwe n’ọrụ ya dịka nwanne nwanyị n’eje ozi nlekọta.

“Mgbe m mụtara otu akara aka,” Nwanne nwanyị Augusto na-ekwu, “e nwere m ike jiri akara aka ahụ gọzie otu onye m n’ejere ozi nlekọta.”

Nwanne nwanyị Augusto kuziiri otu n’ime ụmụnne nwanyị ahụ nke e kenyere ya otu esi eme chọkọlet truffles. Ugbua nwanne nwanyị ahụ na-eme ma na-ere truffles ahụ iji nye aka mejuo ego nke ezi na ụlọ ya na-akpata. “Ka ọnwa ole ma ole gasịrị, enwetere m ngọzi mgbe nwanne nwanyị ọzọ kuziiri m otu esi eme achịcha mmanụ ańụ nke m nwere ike ire ere,” ka Nwanne nwanyị Augusto kwuru. “Iwulite ma mee ka ndị ọzọ mata akara aka anyị nwere ike gọzie ndụ nke onye ọbụla n’ime anyị ma mee ka mmekọrịta anyị dịka ụmụnne nwanyị na-eje ozi nlekọta dị omimi.

Bipụta