2020
Ikekọrịta Ìhè nke Onye Nzọpụta n’Ekeresimesi
Disemba 2020


“Ikekọrịta Ìhè nke Onye Nzọpụta n’Ekeresimesi,” Liahona, Disemba 2020

Foto, oyiyi
ije-ozi nlekọta

Foto nke ọmụmụ nke Niltza Beatriz Santillan Castillo sere; foto nke onyinye sitere na Getty Images

Ụkpụrụ ndị nke Ije-ozi Nlekọta, Disemba 2020

Ikekọrịta Ìhè nke Onye Nzọpụta n’Ekeresimesi

Tụlee maka ndị ị na-eje ozi nlekọta nye. Kedụ ka ị ga-esi nyere ha aka ịbịarukwu Kraịst nso n’ekeresimesi a?

Mgbe anyị na-echeta Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst afọ niile, Ekeresimesi bụ oge mgbe anyị na-eme ememe onyinye kachasị elu e nyewororịị: “N’ihi na Chineke hụrụ uwa n’anya otú a, na o nyere ọbuná Ọkpara ọ mụrụ nání Ya” (Jọn 3:16). Dịka anyị n’eje-ozi nlekọta n’ekeresimesi, anyị nwekwara ike inye onyinye ndị nke na-enyere ndị ọzọ aka ịbịaru Onye Nzọpụta nso. Ọ bụ ihe magburu onwe ya iche na anyị onwe anyị dị ka iyipụta onyinye ahụ nke Nna nke Eluigwe nyere.

Aka M Hụrụ Onyinye ahụ n’Anya

Susan Hardy, California, USA

Mgbe m dị afọ iri na otu, onye nkụzi Sọnde Skuul mụ, Nwanne nwoke Deets, gwara klaasị anyị na ọ bụrụ na anyị ga-eburu Ndepụta nke Okwukwe n’isi ma kọwaara ya ihe ha pụtara, ọ ga-azụtara anyị òtù set Akwụkwọ Nsọ nke anyị.

Nwanne nwoke na Nwanne nwanyị Deets bụ di na nwunye nta, ka malitere ọhụrụ. Amachaghị m na Nwanne nwoke Deets ga-azụtaliri onye ọ bụla onyinye. Mana ekpebiri m na ọ bụrụ na o chere na Ndepụta nke Okwukwe dị mkpa nke iburu n’isi, m ga-ewere ihe ịma aka ahụ.

Mgbe m mechara 13 niile ahụ, oge gafere ma echefuru m maka nkwa ya.

N’oge ahụ, n’Ụbọchị Ekeresimesi, a natara m otu ihe ngwugwu nke e dere aha m n’elu ya. E mepere m ya ichọta otu set Akwụkwọ Nsọ naanị maka m, ya na otu kaadị na-agba m ume ịdị na-agụ ya mgbe niile. Nke ahụ bụ n’afọ 1972, ma ruokwa taa m ka nwere Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ. Ha dị oké ọnụ ahịa nye m.

Ọ bụghị ụgwọ nke onyinye ahụ mana obiọma o gosiri m na ịchụ àjà ọ dị njikere ịchụrụ m mere ka m nwee nnukwu agụụ ịmụ okwu Chineke. A na m agbalị isoro ọmụmaatụ nke ije-ozi nlekọta nke Nwanne nwoke Deets site n’inye ndị nọ m gburugburu onyinye bara uru, na-enwe olile anya na m nwere ike ịgọzi ndụ ndị ọzọ dị ka ọ siri gọzie nke m.

Otu Ọkpụkpọ okù iji Mee otu Akụkụ

Richard M. Romney, Utah, USA

Mgbe ndị na-eme atụmatụ nlekọta ọgbakọ Ekeresimesi anyị gwara m ka m leta otu onye otu dara mba n’okwukwe ma kpọọ ya okù ka ọ sonye na mmemme ahụ, ekwesịrị m ikwenye na ahụ mara m jijiji. E zutebuola m Darren naanị otu ugboro na mbụ, mgbe o sonyebụrụ na mmèmmè nlekọta na mbụ. O yikwasịwo otu akwa isi ọgba tum tum n’ofe egedege ihu ya. E kechiri ntutu isi ya dị ogologo na ọcha n’ụdịdị ọdụ ịnyịnya, o nwere afụ ọnụ ọcha juru eju, aka ya juputara na mgbukasịahụ.

Ugbu a, otu onyeòtù kọmitii soro m, m guzo n’ọnụ ụzọ Darren, na-eche ihe ọ ga-ekwu. Ọ gwara anyị ka anyị banye n’ime, anyị wee gwa ya ihe mere anyị ji nọrọ ebe ahụ. O kwuru sị, “Óò, ọ ga-amasị m ime nke ahụ!”

Ọ rụrụ ọrụ dị ịtụnanya, na-enyere aka mee ka ọrụ ahụ nwee isi maka ọtụtụ mmadụ. Obere oge mgbe e mesịrị, a gwara mụ na onye nsiso n’ije-ozi nlekọta iga ileta Darren mgbe niile. Ọ yiri mgbe niile ka obi dị ya ụtọ ịhụ anyị, ma anyị enwewokwa ụfọdụ mkparịta ụka ndị nyere obi ụtọ. E nwere m obi ekele na nkwalite mmụọ ịkpọ ya oku ka o sonye na mmemme nke otu ọrụ ngalaba ukwu dubara n’ime mmekọrịta ahụrụ n’anya.

Ije Ozi Nlekọta nye Ndị Ọzọ n’Ekeresimesi

Ndị a bụ ụfọdụ ihe ị nwere ike ime iji hụ na ndị ị na-ejere ozi nlekọta ga-amata na ị na-eche maka ha, ọkachasị n’oge nke n’afọ a.

  1. Mgbe ụfọdụ, oku ekwentị ma ọ bụ ozi ederede na-arụ ọrụ ebube. Ibido mkparịta ụka n’iji otu “Ndewo, kedu ka ị mere?” dị mfe nwere ike ime otu mgbanwe.

  2. Sonye na ememe ha mgbe ekwesiri. Ekeresimesi nwere ike ịbụ ezigbo oge iji mụta gbasara nkwenye ndị anyị nwekọrọ ọnụ. Mgbe ị na-ekekọrịta nkwenye ma na-ege ndị ọzọ ntị, ị na-emeghe ụzọ maka nghọta dị ukwuu.

  3. Kpere ha ekpere site n’aha. Rịọ Nna nke Eluigwe ka o nyere gị aka iche echiche banyere ụzọ ndị a ga-esi mee ka ha bịaruo Ọkpara Ya nso.

  4. Onyinye ndị dị mfe bụ ndị a kacha echeta ọtụtụ mgbe. Onyinye ekwesịghị ịgba agba tupu a hụ ya n’anya. Onyinye nke oge, onyinye nke ige ntị, ikekọrịta otu foto ma ọ bụ ihe ncheta—ihe ndị a niile nwere ike ịbụ onyinye nke obi.

  5. Nye onyinye nke ọgbụgba ama. Gwa ha ka ị soro ha kekọrịta ịhụnanya ha nke Onye Nzọpụta, ma gwa ha ka ha soro gị kekọrịta ịhụnanya ị nwere n’ebe Ọ nọ.

  6. Kpọọ ndị ọzọ oku ka ha bịa otu ụka Ekeresimesi. Ụfọdụ ndị chọrọ ife ofufe mana ha amaghị ebe ha ga-aga. Kpọọ ha oku ka ha soro gị fee.

  7. Were udo mejuo ụlọ ha. Mee ka ha mata na ndị mgbasa ozi ọma nwere ozi Ekeresimesi pụrụiche ha nwere ike ikekọrịta, nke ga-eweta olileanya na ịhụnanya n’obi ha.

Ije-Ozi Nlekọta Nye Mmadu niile dị ka otu Ọgbakọ

Mkpa ọgbakọ ọ bụla pụrụ iche. Ụfọdụ na-erite uru site n’ịhazi otu ihe omume ka ukwuu. Ọgbakọ ndị ọzọ pụrụ irite uru site n’ihe dị nta dị mfe. Ndị so na ime atụmatụ na ịhazi ihe omume n’eji ekpere na-atule otu ha ga-esi gboo mkpa ndị dị adị.

  • Ndị òtù sitere na stek atọ ndị ahụ dị na Paris, France, nyere aka ịkwado Ihe nye Ụwa soirée nke gụnyere otu ihe ngosi nka na otu ihe ngosi ejiji. Ha kwadebere ihe ndị enyere ndị gbara ọsọ ndụ na ndị enweghị ebe obibi.

  • Stek Charlotte North Carolina Central mere mmemme “Ekeresimesi gburugburu ụwa” maka ndị obodo, ya na otu nnọkọ ime ememe Kraịst site na nri, ngosipụta ọdịnala Ekeresimesi nke mba ụwa, egwu, arụmarụ ndokwa, na otu ọmụmụ nke ụmụaka.

  • Ndịòtù nke Stek Akụkụ Mmiri Vero Florida sonyere n’otu ncheta obodo banyere ihe kpatara anyị ji agba Ekeresimesi. E nyere ụmụ ọrụ ebere obodo ihe egwuregwu ụmụaka n’onyinye. Otu Isi ndị ukwe nke ụmụaka kwere ukwe, ma ọtụtụ ụlọ ụka nwekwara ụlọ ndò na-egosipụta ozi.

  • Stek Ndịda Jacksonville Florida gosipụtara otu mmepụta Onye Nzọpụta nke Ụwa maka obodo ahụ.

Bipụta