“Ọdịda Ahụ Bụ Akụkụ Atụmatụ nke Chineke,” Liahona, Jenụwarị 2022
Ozi Liahona Kwa ọnwa, Jenụwarị 2022
Ọdịda Ahụ Bụ Akụkụ Atụmatụ nke Chineke
N’ihi Ọdịda ahụ, anyị nwere ike ị bịa n’ụwa ma nwee ike otu ụbọchi laghachi ibinyere Nna anyị n’eluigwe.
Nime Ubi Iden ahụ, Chineke nyere Adam na Iv iwu ịghara iri mkpụrụ osisi nke osisi nke mmata ezi ihe na ajọọ ihe. Ma Ọ gwara ha, “I nwere ike ị họrọ n’onwe gị, … mana, cheta na Mụ onwe m machibidoro ya” (Moses 3:17). Setan nwara Iv ọnwụnwa iri mkpụrụ osisi nke osisi ahụ. Ọ gwara ya, “Ị ga-adị dị ka ndị bụ chikwu, ịmara ezi ihe na ajọọ ihe” (Moses 4:11). O riri mkpụrụ osisi ahụ ma mesịa nyetụ ya Adam. Chineke chụpụrụ ha na Ubi Iden ahụ.
Ọdịda Ahụ
Mgbe Adam na Iv hapụrụ Ubi Iden, ha anọghịkwa nihu Chineke ọzọ. Nkewa nke a site na Chineke ka a kpọrọ ọnwụ nke ime mmụọ. Ịhapụ ubi ahụ pụtakwara na Adam na Iv ghọziri mmadụ anụ ahụ ma si otu ahụ pụrụ ịnwụ anwụ. Ọbụna na Adam na Iv anọghịzikwa n’ihu Chineke ma ugbua bụzi mmadụ anụ ahụ, ha nwere ańụrị na olileanya mgbe ha hụrụ na ha nwere ike ịganiihu (lee Moses 5:10-11). “Adam dara ka ụmụ mmadụ wee dịrị; ma ụmụ mmadụ dị, ka ha wee nwee ọn̄ụ.”(2 Nefi 2:25).
Oge nke Mnwale
Mgbe a mụrụ anyị, anyị bi iche site n’ebe Chineke nọ, dịkwa ka Adam na Iv mere mgbe Ọdịda ahụ gasịrị. Setan na-anwa anyị ọnwụnwa ime nhọrọ ndị dị njọ. Ọnwụnwa ndị a n’ekwe ka a nwalee anyị ma họrọ n’etiti ihe ziri ezi na ihe n’ezighị ezi (lee Alma 12:24). Oge ọbụla anyị mere njọ ma echegharịghị, mkpafu site n’ebe Nna nke Eluigwe nọ na-agakwu niihu. Mana ọ bụrụ na anyị echegharịa, anyị na-aka abịaru nso n’ebe Nna anyị bi n’Eluigwe nọ.
Ọnwụ nke Anụ Ahụ
E kere ụwa maka anyị (lee 1 Nefi 17:36). Ọdịda ahụ mere ya ekwe omume maka Adam na Iv idebe iwu nsọ nke Chineke maka ịmụ ụmụ, ime ka anyị bịa n’ụwa n’anụ ahụ. Ahụ anyị otu ụbọchi ga-anwụ, mana mmụọ anyị ga-aganiihu ịdị ndụ. Ahụ anyị na mmụọ anyị ka a ga-ejikọta ọzọ mgbe anyị bilitere n’ọnwụ.
A zọpụtara site n’aka Jizọs Kraist
Site n’ike aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist, anyị nwere ike merie ọnwụ nke anụ ahụ na nke ime mmụọ. N’ihi na Kraịst bilitere n’ọnwụ, onye niile a mụrụ n’elu ụwa a ga-ebilite n’ọnwụ ma bie ndụ ruo ebighị ebi. Ma n’ihi na Kraịst tara ahụhụ maka mmehie anyị, anyị nwere ike ichegharị ma nwete mgbaghara ka anyị wee nwee ike bie ọzọ anyị na Nna anyị bi n’Eluigwe.
© 2021 by Intellectual Reserve, Inc. All rights reserved. E bipụtara na USA. Nnabata n’asụsụ Bekee: 6/19. Nnabata ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Jenụwarị 2022. Igbo. 18295 593