2022
Ọgbụgba ndụ niile Na-ejikọ Anyị na Chineke
Febụwarị 2022


Ọgbụgba ndụ niile Na-ejikọ Anyị na Chineke,” Liahona, Febụwarị 2022

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Febụwarị 2022

Ọgbụgba ndụ niile Na-ejikọ Anyị na Chineke

Ime na idebe ọgbụgba ndụ niile na-eweta ngọzi niile.

Ọgbụgba-ndụ bụ nkwa dị netiti Nna nke Eluigwe na ụmụ Ya. Ọ na-ehiwe ọnọdụ niile maka ọgbụgba ndụ niile anyị na Ya na-eme. Mgbe anyị mere ihe O kwuru, anyị na-anata ọtụtụ ngọzi. Anyị anaghị anata naanị ngọzi nelu ụwa—mgbe anyị mere ma debe ọgbụgba ndụ niile, anyị ga-alaghachi ibi anyị na Chineke na ndị ezi na ụlọ anyị neluigwe otu ụbọchị.

baptizim

Ọgbụgba ndụ niile na Emume nsọ niile

Anyị na-eme ọgbụgba ndụ noge emume nsọ ndị aghaghị ime. Anyị kwesịrị ịnata emume nsọ ndị ahụ ma rube isi na ọgbụgba ndụ ndị ahụ iji hụ na anyị laghachiri ibi anyị na Chineke. A na-eme emume nsọ niile ahụ site niike nke ọkwa nchụaja. Emume nsọ ndị ahụ gụnyere baptizim na ime onye otu, ịnata Ọkwa nchụaja Melkizedek (maka ndịikom), na emume nsọ niile anyị na-anata niime tempụl. N’oge emume nsọ, ndị otu Nzukọ nsọ na-ekwegharị nkwa niile ha kwere Chineke (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 20:77, 79)).

oriri nsọ

Ọgbụgba ndụ niile Na-enyere Anyị aka Ibi ndụ Ezi omume

N’oge baptizim, anyị na-ekwe nkwa i soro Jizọs Kraist, na-echeta Ya mgbe niile, ma debe iwu nsọ niile (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37). Chineke n’ekwe nkwa na Mmụọ Nsọ ga-enwe ike nọnyere anyị mgbe niile.

Mgbe ndịikom natara ọkwa nchụaja, ha na-ekwe nkwa ibi ndụ tozuru oke nke ike ọkwa nchụaja nke Chineke. Chineke kwere nkwa ịgọzi ha. (Lee Ozizi na Ọgbụgbandụ niile 84:33–40.)

Brazil Recife Tempụl

Ngosịpụta nke Recife Brazil Tempụl site n’aka Jems Pọrter

Ọgbụgba ndụ ndị anyị na-eme niime Tempụl

Mgbe ndị otu natara onyinye dị nsọ ha niime tempụl, ha na-ekwe nkwa ibi ndụ ezi omume ma chụọ aja maka ozi ọma. A na-ekwe ha nkwa ike sitere na Chineke (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:32; 109:22).

N’oge nrachi na tempụl, di na nwunye na-eme ọlụlụ maka ebighị ebi ma kwe nkwa ikwesị ntụkwasị obi nye onwe ha na nye Chineke. Chineke na-ekwe nkwa na ha nwere ike ịlọghachikwute Ya ma biri dị ka ezi na ụlọ ruo ebighị ebi. (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 132:19-20.)

ndị mgbasa ozi ọma

Anyị Bụ Ndị Ha na Chineke Gbara ndụ

Ndị ahụ sonyere Nzụkọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a na-abụ ndị ha na Chineke gbara ndụ. Ha nakwa erite ngọzi niile na oke na ọrụ niile nke ọgbụgba ndụ nke Abraham (lee Ndị Galeshịa 3:27-29). Ị bụ akụkụ ndị ọgbụgba ndụ nke Chineke pụtara na anyị ga-enyere onye na ibe ya aka mgbe anyị na-abịakwute Kraịst nso. Ọ pụtakwara na anyị ga na-arụ ọrụ ị kwadosị ike Nzukọ nsọ nke Chineke n’elu ụwa. Mgbe anyị n’edobe ọgbụgba ndụ anyị niile, anyị nwere ike inweta ike na ume site n’aka Chineke.