2022
Ije ozi n’Ọkpụkpọ okù niile nke Nzukọ nsọ
Maachi 2022


“Ije ozi n’Ọkpụkpọ okù niile nke Nzukọ nsọ,” Liahona, Mar. 2022.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Maachi 2022

Ije ozi n’Ọkpụkpọ okù niile nke Nzukọ nsọ

Ndị ndu na-agwa ndị otù ka ha jee ozi n’ọrụ dị iche iche a na-akpọ “ọkpụkpọ okù.” Ọkpụkpọ okù n’enye ndị otù ohere ijere ndị ọzọ ozi ma bịaruo Chineke nso.

nwoke nọ na wheelchair na akụzi otu klasị nke Nzukọ nsọ

Foto site n’aka Devid Bowen Newton

Mgbe anyị n’eje ozi n’ọkpụkpọ okù anyị niile, anyị n’enye aka n’imezu ọrụ nke Chineke. Anyị n’akụziri ndị ọzọ banyere Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ma n’enyere ndị anyị n’akụziri ihe aka bịaru Ha nso. Anyị na-anata ọtụtụ ngọzị dị ka anyị n’eje ọzị jiri ntụkwasi obi.

Ịnata Ọkpụkpọ okù

nwa ikom nta guzoro n’ihu ndị ọgbakọ Nzukọ nsọ

Ndị ahụ n’eje ozi n’ime Nzukọ nsọ bụ ndị Chineke kpọrọ. Ndị ndu Nzukọ nsọ n’ekpe ekpere maka mkpali mmụọ ka ha mata onye a ga-agwa ka ọ jee ozi n’ọkpụkpọ okù ọbụla. Ma emesịa onye ndu ahụ agwa onye otù ka o jee ozi ma kọwaa ọrụ niile nke ọkpụkpọ okù ahụ. Ndị otù ahụ ka a ga-akwado n’ime nzukọ Nzukọ nsọ ebe ndị otù ngalaba ukwu ma ọbụ ngalaba nta ahụ ga-egosi aka ntuli elu nkwado ha. Nke a n’egosi na ha dị na njikere ịkwado onye ahụ a na-akpọ. Ma emesịa otu onye ndụ ọkwa nchụaja ga-agọzị onye otù ahụ. A na-akpọ nke a idopu iche. A ga-enye onye otù ahụ ikikere irụ ọrụ dị n’ọkpụkpọ okù ahụ ma ngọzị ndị ọzọ ga-enyere ya aka ije ọzi.

Ndị bishọp

Onye bishọp bụ onye ndu nke ngalaba ukwu. (N’ime ngalaba nta, onyeisi ngalaba nta dị ka bishọp.) Onyeisi stek na-arọpụta otu onye tozuru oke ji ọkwa nchụaja a ga-akpọ dị ka bishọp. Otu Ndịisi Mbụ na akwado ọkpụkpọ okù ahụ. Emesịa ndi otù eweliere bishọp ahụ aka nkwado ma edopụ ya iche maka ije ozi ya. Ọ ga-anata ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja, nke pụtara na ọ nwere ikikere iji duo ngalaba ukwu ahụ. Dị ka bishọp, ọ n’eje ozi ma n’edu ndị otù nke ngalaba ukwu ahụ.

Ndị Otu Ndịisi

Otu niile nke kworum nke ọkwa nchụaja niile na Otu Enyem aka, Ndị Iyom Nta, na Ụlọakwụkwọ Sọnde ka ndị otu ndịisi na-edu, na-abụkarị otu onyeisi na ndị ndụmọdụ abụọ. Ndị otù ndịisi nke kworum ndị okenye ka ndị otù ndị isi stek na-akpọ ma n’edopu iche. Ndị otù ndị bishọp na agwa ndị otù ka ha jee ozi n’ime otù ndịisi ndị ọzọ n’ime ngalaba ukwu ma dopụ ha iche. Ndị ndu niile n’ejere ndị otù kworum na ndị otù ha ozi. Ha n’elekọta mkpa niile nke ndị otù ha ma n’enyere ha aka ị nwete mmetụta ịhụnaanya nke Chineke.

 nwanyị n’ewete nri nye otu onye nne ku otu nwatakịrị n’aka.

Ọkpụkpọ okù ndị ọzọ

Ọkpụkpọ okù ndị ọzọ gụnyere ikuzi nkuzi, ịnye aka n’egwu, idebe ndekọihe niile, ịhazi ihe omume niile maka ndị ntoroọbịa ma ọ bụ ụmụntakịrị, na ije ozi n’ụzọ ndị ọzọ. Ọkpụkpọ okù ọbụla n’ime Nzukọ nsọ dị mkpa ma n’enye ndị otù ohere ijere ndị ọzọ ozi na ịjere Chineke ozi. Dị ka anyị na-arụkọ orụ ọnụ n’imejupụta ọkpụkpọ okù anyị niile, anyị na-agba ndị ọzọ ume ma n’enyere nzukọ nsọ aka itolite.