“Oriri nsọ: Otu Ụzọ isi Cheta Onye Nzọpụta,” Liahona, Epr. 2022.
Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Eprel 2022
Oriri nsọ: Otu Ụzọ isi Cheta Onye Nzọpụta
N’abalị ahụ tutu a kpọgide ya n’obe, Jizọs Kraịst na Ndịozi Ya zukọrọ n’oge Nri Anyasị Ikpeazụ. N’ebe ahụ ka O nyere ha oriri nsọ na nke mbụ. Ọ kọwara na ọ bụ otu ụzọ ha ga-esi na-echeta Ya. Oriri nsọ bụ otu emume nso nke anyị na-anara achịcha na mmiri iji cheta Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst. Achịcha ahụ na-anọchi anya ahụ́ Kraịst, ma mmiri ahụ na-anọchi anya ọbara Ya.
Anyị na-anara oriri nsọ Sọnde ọbụla n’oge nzukọ oriri nsọ. Anyị na-agụ ukwe mgbe ndị ji ọkwa nchụaja na-agbawa achịcha ahụ n’iberibe.
Ndị ji ọkwa nchụaja ndị gbawara achịcha ahụ na-ekpe ekpere ndị pụrụ iche. Ekpere ndị a ka a na-ahụta n’ime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77, 79. Ekpere ndị ahụ na-echetara anyị ihe anyị kwere Nna nke Eluigwe na nkwa na ihe O kwere anyị na nkwa.
Ndị ọzọ ji ọkwa nchụaja na-enyefe oriri nsọ ahụ ndịòtù ngalaba ukwu ma ọbụ ngalaba nta. Dị ka anyị na-ewere oriri nsọ ahụ, anyị na-echeta Onye Nzọpụta na aja Ya maka anyị. Anyị na-ekwekwa nkwa idebe ọgbụgba-ndụ (nkwa niile) ndị anyị na Nna nke Eluigwe meworo.
Anyị na-enye nsọpụrụ mgbe a na-agọzi ma n’enyefe oriri nsọ ahụ. Ọ bụ oge maka anyị iche echiche gbasara ndụ, nkuzi, na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Anyị nwekwara ike iche echiche banyere otú anyị nwere ike isi soro ọmụmaatụ Ya.
© 2022 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. All rights reserved. E bipụtara na USA. Nnabata n’asụsụ Bekee: 6/19. Nnabata ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa ọnwa, Eprel 2022. Igbo. 18314 593