“Akwụkwọ nsọ niile: Okwu nke Chineke,” Liahona, Julịa 2022.
Ozi Liahona Kwa ọnwa, Julaị 2022
Akwụkwọ nsọ niile: Okwu nke Chineke
Akwụkwọ nsọ niile bụ akwụkwọ niile dị nsọ nke ndị dere ya na-abụkarị ndị amụma. Akwụkwọ nsọ niile na-agba ama nke Jizọs Kraịst ma na-akụzi banyere ozi ọma Ya. Akwụkwọ nsọ ndị iwu kwagidere nke Nzukọ nsọ bụ Baịbụl (nke gụnyere Agba Ochie na Agba Ọhụrụ), Akwụkwọ nke Mọmọn, Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, na Pel nke Oke Ọnụ ahịa.
Agba Ochie
Agba ochie bụ ndekọihe nke mmekọrịta niile nke Chineke ya na ndị Ya gbara ndụ n’oge ochie. Ọ gụnyere nkuzi niile nke Mosis, Joshua, Isaiah, Jeremaya, na Daniel. N’agbanyeghị n’edere ya afọ narị kwuru narị tupu ọmụmụ Jizọs Kraist, ọtụtụ ndị amụma Agba Ochie dere banyere Ya.
Agba Ọhụrụ
Agba Ọhụrụ dekọrọ ọmụmụ, ndụ anụ ahụ, nkuzi niile, na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist. Ọ gụnyekwara nkuzi niile nke Ndị Ozi na ndị ọzọ na-eso ụzọ nke Kraịst. Agba Ọhụrụ na-enyere anyị aka ịghọta otu esi ebi ndụ nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst taa.
Akwụkwọ nke Mọmọn: Ama Ọzọ nke Jizọs Kraist
Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ndekọihe nke ụfọdụ ndị dị iche iche ndị biri n’ime Amerịca mgbe ochie. Ọ gụnyere nkuzi niile nke ndị amụma, ma isi nzube ya bụ ime ka ndị mmadụ kwere na Jizọs bụ Kraịst ahụ. Onye Amụma Josef Smith tụgharịrị asụsụ ya sitere n’epekele ọla edo site n’onyinye na ike nke Chineke.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile nwere n’ime ya mkpughe niile enyere Josef Smith na ndị amụma ndị ọzọ nke ụbọchị ikpeazụ. Mkpughe ndị ahụ kọwara otu esi hazie Nzukọ nsọ nke Kraịst. Ha nwekwara n’ime ha nkuzi ozi ọma ndị dị mkpa banyere ọkwa nchụaja, emume nsọ niile nke ozi ọma, na ihe na-eme mgbe ndụ a gasịrị.
Pel nke Oke Ọnụ ahịa
Pel nke Oke Ọnụ ahịa gụnyere akwụkwọ nke Mosis na nke Ebraham, ama nke Josef Smith, na Ndepụta nke Okwukwe nke Nzukọ nsọ. Ọ gụnyekwara Josef Smith—Matiu, akụkụ ntụgharị asụsụ nke Josef Smith nke Agba Ọhụrụ.
Ị na-amụ Akwụkwọ nsọ
Ndị amụma akuziworo anyị ịmụ akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị. Ime otu a na-enyere anyị aka bawanye n’okwukwe anyị ma bịarute Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist nso. Dị ka anyị ji ekpere na-amụ akwụkwọ nsọ, Mmụọ Nsọ ga-enyere anyị aka chọta azịza niile nye ajụjụ anyị.
Ndị Amụma Oge Ugbua
Mgbe ndị amụma na ndị ozi taa n’ekwu okwu site n’ike nke Mmụọ Nsọ, okwu ha dị ka akwụkwọ nsọ. Otu ọmụmaatụ nkea bụ ọgbakọ zuru ọha. Anyị nwere ike mụọ nkuzi niile sitere n’ọgbakọ na mbipụta Liahona ndị nke Me na Novemba.
© 2022 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. All rights reserved. Ebipụtara na USA. Nnabata n’asụsụ Bekee: 6/19. Nnabata ntụgharị-asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Julaị 2022. Asụsụ. 18298 593