2022
Gịnị Bụ Nnọkọ mgbede n’Ebe obibi?
Ọgọst 2022


“Gịnị Bụ Nnọkọ mgbede n’Ebe obibi?” Liahona, Ọgọ 2022.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Ọgọst 2022

Gịnị Bụ Nnọkọ mgbede n’Ebe obibi?

nne, nna, na obere nwa nwanyị nọ ọdọ n’ezi

Nnọkọ mgbede n’ebe obibi bụ oge edokwara n’ime izu ụka maka ezi na ụlọ gị ịgbakọ. N’oge nke a, unu nwere ike “mụọ ozi ọma, gbaa ama niile ume, wulite ịdị n’otu, ma nwekọrịta ọńụ onye na ibe ya” (General Handbook: Ije ozi niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazu a, 2.2.4, ChurchofJesusChrist.org). Nnọkọ mgbede n’ebe obibi dịtụ iche maka ezi na ụlọ ọbụla. Mana mbunobi ya bụ iji oge nke a bịarụte nso nso ma rute Onyenwe anyị nso.

Nkwadobe

Chee maka otu ihe omume nke ezi na ụlọ gị na-enwe ọńụ na ya na otu isiokwu nke ozi ọma ga-amasị gị ịkpa nkata ma mụkọrịta ihe ọnụ banyere ya. Ọzọkwa, họrọ otu ụbọchị na oge n’izu ụka ọbụla mgbe ihe dị ka ma ọ bụ ndị otu ezi na ụlọ niile nwere ike izukọta. Nzukọ nsọ na-agba ndị otu ume ime nnọkọ mgbede n’ebe obibi na abalị Mọnde niile. Mana ndi ezi na ụlọ nwere ike zukọọ mgbe kachasị dị ha mma.

ezi na ụlọ na-ekpe ekpere

Ekpere

Ọtụtụ ezi na ụlọ na-eji ekpere amalite ma na-emechi nnọkọ mgbede n’ebe obibi. Nke a na-akpọbata Mmụọ Nsọ niime ebe obibi ha. Nnọkọ mgbede n’ebe obibi bụ oge kachasị mma maka ụmụntakịrị na ndị toro dimkpa ịmụ ikpe ekpere ha na otu dị nta.

Egwu

Ọtụtụ ezi na ụlọ na-enwekwa ukwe mmepe na nke mmechi. Ha na-ahọrọkarị otu ukwe sitere na akwụkwọ abụ ma ọ bụ akwụkwọ ukwe ndị Praịmarị. Nzukọ nsọ Ahụ nwere rekọọdụ ube nke abụ niile na music.ChurchofJesusChrist.org. Unu nwekwara ike lee vidioo ndị nke Ndị Otù abụ Tabernacle dị n’ime Ogige Tempụl wetere. Ikwe ukwe n’oge nnọkọ mgbede n’ebe obibi na-enyere ndị otu aka ịmụ abụ ndị a na-ekwe n’ọgbakọ.

Ihe ọmụmụ

Nzukọ nsọ nwere ọtụtụ akụrụ ngwa nwere ike inye aka na nnọkọ mgbede n’ebe obibi I nwere ike iwere nkeji ole ma ole ịgụ ma kparịta ụka n’otu edide sitere na Liahona, Friend, ma ọ bụ Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa. Nke a nwekwara ike bụrụ oge maka ile ma kparịta ụka na vidioo ndị nke Nzukọ nsọ. Ma ọ bụ unu nwere ike gụọ otu okwu sitere na ọgbakọ zuru ọha, gụọ akwụkwọ nsọ, ma ọ bụ kparịta ụka na ihe ọgụgụ nke izu ụka ahụ nọ niime Bịanụ, Soro M.

ụmụntakịrị na-eme cookies

Foto esere nke ụmụntakịrị na-eme cookies site n’aka Michelle Loynes

Ezi na ụlọ Isonye

Ụmụntakịrị nwere ike isoro mee ihe na nnọkọ mgbede n’ebe obibi. Ha nwere ike inye aka tụọ atụmatụ ihe omume, kpee ekpere, ma ọ bụ họrọ ma duo n’ukwe. Ha nwere ike ọbụla kuzie ihe ọmụmụ niile. Tupu nnọkọ mgbede n’ebe obibi, i nwere ike nyere nwa gị aka gụọ otu akụkọ dị na magazin Friend ma ọ bụ otu akụkọ akwụkwọ nsọ na-akachasị amasị ha. Nwata ahụ nwere ike mesịa kọọ akụkọ ahụ nye ezi na ụlọ dị ka ihe ọmụmụ. Ọtụtụ ụmụntakịrị nakwa enwe mmasị na mme ka akụkọ ndị dị n’akwụkwọ nsọ maka nnọkọ mgbede n’ebe obibi. Kwee ka ụmụntakịrị ndị nke togoro eto tụọ atụmatụ ihe ọmụmụ ma ọ bụ họrọ otu okwu nke ọgbakọ zuru ọha ga-amasị ha ịgụ. Mgbe ahụ mee ka ha duo na mkparịta ụka ahụ.

Ihe omume niile

Ọtụtụ ezi na ụlọ na-enwe ańụrị na-ime ihe omume niile dị ka mpaghara nke nnọkọ mgbede n’ebe obibi. Ihe omume nke ime ụlọ nwere ike gụnye ime egwuregwu, ime ọrụ aka, ma ọ bụ isikọta nri ọnụ.

Maka ihe omume nke ezi, unu nwere ike gaa njem, gaa inyi ugwu ezi na ụlọ, ma ọ bụ gwukọrịta egwuregwu ọnụ na-ezi. Chọta otu ihe omume nke ndị otu ezi na ụlọ niile nwere ike ime, ma nwekọrịtanụ ọńụ ọnụ. Unu gbochie oge ndị nke ịsọ mpi nwere ike ịchụpụ Mmụọ.

Ozi

Nnọkọ mgbede n’ebe obibi bụ nnukwu oge maka ezi na ụlọ niile ijere ndị ọzọ ozi. Unu nwere ike inyere ụfọdụ ndị agbata obi metụrụ okenye aka, kee ihe oriri n’ebe mgbaba ndị na-enweghị ebe obibi, degara ndị mgbasa ozi ọma akwụkwọ, ma ọ bụ ịtụtụkọta urughuru na urughuru, iji maa atụ.