2022
Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi
Ọktoba 2022


“Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” Liahona,Ọkt. 2022

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Ọktoba 2022

Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi

Ndị ahụ niile meworo ọgbụgba ndụ ha na Chineke nwere ohere inwete ụdị ịhụnaanya na ebere pụrụ iche.

eserese nke Jizọs Kraịst

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, site n’aka Del Parson

N’ime ụwa a agha na asịrị agha niile dọriworo, mkpa nke eziokwu, ihe, na ịhụnaanya nke Jizọs Kraịst n’enweghị ntụpọ dị ukwuu karịa mgbe ọ bụla. Ozi ọma nke Kraịst dị ebube, ma anyị nwere ngọzi ịmụ ya ma bie ndụ dị ka iwu ya niile siri dị. Anyị na-ańụrị ọńụ n’ohere ndị anyị nwere ikesa ya—ịgba ama nke eziokwu ya niile n’ebe ọbụla anyị nọ.

E kwuwo m okwu ugboro ugboro banyere mkpa ọgbụgba ndụ nke Abraham na mkpokọta nke Israel dị. Mgbe anyị nabatara ozi ọma ma mee baptizim, anyị na-ewekwasị onwe anyị aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst. Baptizim bụ ọnụ ụzọ ama nke na-eduba ịbụ ndị so keta oke nye nkwa niile enyere mgbe gboo site naka Onyenwe anyị ruo Abraham, Aịzik, Jekọb, na ụmụ ụmụ ha.1

“Ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị ebigbị ebi”2 (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:6) na ọgbụgba ndụ nke Abraham bụcha ụdị ndị oke mkpa—ụzọ abụọ nke nkebi ahịrịokwu ọgbụgba ndụ Chineke na ndị nwoke na ndị nwanyị anụ ahụ mere n’oge dị iche iche.

Nkọwaaha ahụ ebighị ebi na-egosi na ọgbụgba ndụ nke a dịịrị adị ọbụna tupu a tụọ ntọala nke ụwa! Atụmatụ ahụ a tọgbọrọ na Nnukwu Kansul Eluigwe gunyere nghọta echere eche na-aga ebepụ anyị niile site n’ebe Chineke nọ. Ka osila dị, Chineke kwere nkwa na Ya ga-enye Onye Nzọpụta onye ga-emeri nsonazụ niile nke Ọdịda ahụ. Chineke gwara Adam mgbe e mesịrị ya baptizim:

“Gị onwe gị na-eso n’usoro ya onye nọ na-enweghị mmalite nke ụbọchị niile ma ọ bụ ọgwụgwụ nke afọ niile, site n’ebighị ebi niile ruo n’ebighị ebi niile.

“Lee, gị onwe gị bụ otu n’ime m, nwa nke Chineke; ma site otu a ka mmadụ niile ga-ghọ ụmụ m” (Mosis 6:67–68).

Adam na Iv nabatara emume nsọ nke baptizim ma malite usoro nke ịbụ otu ha na Chineke. Ha abanyewo n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ.

Mgbe mụ na gị banyekwara n’ụzọ ahụ, anyị nwere ụzọ ndụ ọhụrụ. Site otu ahụ anyị na-ekewapụta mmekọrịta anyị na Chineke nke na-enye Ya ohere ịgọzi ma gbanwee anyị. Ụzọ ọgbụgba ndụ na-edughachi anyị ruo na Ya. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Chineke merie na ndụ anyị, ọgbụgba ndụ ahụ ga-edu anyị ruo nso nso na Ya. Ọgbụgba ndụ niile ka echekubere ịdị na-ejikọta. Ha na-ekewapụta mmekọrịta adịnamma dị ebighị ebi.

Ịhụnaanya na Ebere Pụrụ iche

Ozugbo anyị na Chineke mere ọgbụgba ndụ, anyị na-ahapụ ọnọdụ nkiti ruo mgbe ebighị ebi. Chineke agaghị ajụ mmekọrịta Ya na ndị ahụ meworo ụdị njikọta ahụ ha na Ya. N’ezie, ndị ahụ niile ha na Chineke meworo ọgbụgba ndc nwere ohere inwete ụdị ịhụnaanya na ebere pụrụ iche. Na-asụsụ ndị Hibru, ịhụnaanya nke ọgbụgba ndụ ahụ ka a kpọrọ hesed (חֶסֶד).3

Hesed enweghị Bekee ọzọ ya na ya dabara nke ọma. Ndị ntụgharị asụsụ nke Vashọn Eze Jemes nke Baịbụl ga-abụrịrị na ha gbara mbọ otu ha si akọwa hesed na Bekee. Ọtụtụ mgbe ha họọrọ “obi ọma nke ịhụnaanya.” Nke a rụtụrụ aka nke ukwuu mana ọ bụghị nkọwa niile nke hesed. Ntụgharị asụsụ ndị ọzọ ka enyekwara, dị ka “ebere” na “ịma mma.” Hesed bụ okwu pụrụ iche na-akọwa mmekọrịta ọgbụgba ndụ nke na akụkụ abụọ ahụ ga-adịrịrị umeala ma kwesị ntụkwasị obi nye ibe ha.

Alụmdi na nwunye seleshal bụ ụdị mmekọrịta ọgbụgba ndụ ahụ. Di na nwunye na-eme ọgbụgba ndụ ha na Chineke ma nibe ha nwee nrube isi ma kwesị ntụkwasị obi nye ibe ha.

Hesed bụ ụdị ịhụnaanya na ebere pụrụ iche nke na-emetụta Chineke ma na-eme ka o rute ndị ahụ ha na Ya meworo ọgbụgba ndụ. Ma anyị na-enyeghachi site na hesed maka Ya.

di na nwunye lụrụ ọhụrụ nọ na ezi tempụl

Ozugbo mụ na gị meworo ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, mmekọrịta anyị na Ya na-adị mma karịa ka ọ dị na mbụ tupu ọgbụgba ndụ anyị. Ugbua ejikọtara anyị ọnụ.

Foto site n’aka Jerry L. Garns

N’ihi na Chineke emewo hesed maka ndị ahụ Ya na ha gbaworo ndụ, Ọ ga-ahụ ha naanya. Ọ ga-aganiihu isoro ha rụọ ọrụ ma nye ha ohere niile iji gbanwee. Ọ ga-agbaghara ha mgbe ha chegharịrị. Ma ọ bụrụ na ha kpafuo, Ọ ga-enyere ha aka chọta ụzọ ha laghachikwute Ya.

Ozugbo mụ na gị meworo ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, mmekọrịta anyị na Ya na-adị mma karịa ka ọ dị na mbụ tupu ọgbụgba ndụ anyị. Ugbua ejikọtara anyị ọnụ. N’ihi ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, Ọ gaghị ma ọlị ada mba n’ime mgbalị Ya inyere anyị aka, ma anyị agaghị ma ọlị ewerecha ndidi obi ebere Ya n’ebe anyị nọ. Onye ọbụla n’ime anyị nwere ebe pụrụ iche n’ime obi Chineke. O nwere olileanya dị elu maka anyị.

Ị maara maka ọkwa agụgụala nke Onyenwe anyị nyere Onye amụma Josef Smith. Ọ bịara site na mkpughe. Onyenwe anyị gwara Josef sị, “Nkwa nke a bụkwa nke gị, n’ihi na unu bụ nke Abraham, ma nkwa ahụ ka e mere nye Abraham” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:31).

Site ebe a, ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke a ka eweghachitere dị ka akụkụ nke nnukwu Mweghachite nke ozi ọma n’uju ya. Chee maka ya! Ọgbụgba ndụ alụmdi na nwunye e mere n’ime tempụl ka ekedoro ozugbo na ọgbụgba ndụ nke Abraham ahụ. N’ime tempụl otu di na nwunye ka edubatara na ngọzi niile nke e dokwara maka ụmụ ụmụ nke Abraham, Aịzik na Jekọb kwesịrị ntụkwasị obi.

Dị ka adam mere, mụ na gị n’onwe anyị banyere n’ime ụzọ ọgbụgba ndụ n’oge baptizim. Emesịa anyị a banye na ya kpam kpam n’ime tempụl. Ngọzi niile nke ọgbụgba ndụ nke Abraham ka a na-enye n’ime tempụl niile dị nsọ. Ngọzi ndịa niile na-enye anyị ohere, mgbe ebilitere n’ọnwụ, iji “keta ocheeze niile, alaeze niile, ike niile, ala ọkpara eze niile, na ọchịchị niile, nye ‘mbuli elu na otito anyị n’ime ihe niile’ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:19].”4

N’ime okwu mmechi nke Agba Ochie, anyị na-agụ maka nkwa nke Malakaị na Elijah ga “atụgharị obi nke ndị nna nna nye ụmụ, na obi nke ụmụ nye ndị nna nna ha” (Malakaị 4:6). Na Israel mgbe gboo, ụdị nrụtụaka nye ndị nna nna gaara agụnye ndị nna Abraham, Aịzik, na Jekọb. Nkwa nke a ka e mere ya edokwuo anya mgbe anyị gụrụ vashọn dị iche nke amaokwu Moronaị nke a enomiri nye Onye amụma Josef Smith: “Ya [Elijah] ga-akụ n’obi nke ụmụ nkwa niile e mere nye ndị nna nna ahụ, na obi nke ụmụ ga-atụgharị nye ndị nna nna ha” (Josef Smith—Agụgụala 1:39). Ndị nna nna ahụ n’ezie gunyere Abraham, Aịzik, na Jekọb. (Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 27:9-10.)

oyiyi nke Jizọs Kraịst

Ndị ahụ na-eme ọgbụgba ndụ ndị dị nsọ ma na-edebe ha ka e kwere nkwa ndụ ebighị ebi na mbuli elu. Jizọs Kraịst bụ okwe nkwa nke ọgbụgba ndụ ndị ahụ.

uju sitere na Kraịst na Onye ọchịchị Nta Bara ụba, site n’aka Heinrich Hofmann

Jizọs Kraịst: Onyeisi Ọgbụgba ndụ ahụ

Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta nyere Nna ike imejupụta nkwa Ya niile o mere nye ụmụ Ya. N’ihi na Jizọs Kraịst bụ “ụzọ ahụ, eziokwu ahụ, na ndụ ahụ,” ọ pụtara na “ọ dighị onye ga-abịakwute Nna, ma ọ bụghị site na [Ya]” (Jọn 14:6). Mmejupụta nke ọgbụgba ndụ nke Abraham na-ekwe omume n’ihi Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta anyị, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Jizọs Kraịst nọ n’isi ọgbụgba ndụ nke Abraham ahụ.

Agba Ochie abụghị naanị otu akwụkwọ nke akwụkwọ nsọ; ọ bụkwa akwụkwọ nke agụgụala. I chetara ịgụ banyere alụmdi na nwunye nke Saraị na Abram. N’ihi na ha enweghị nwa, Saraị nyere nwa odibo ya, Hagar, ịbụkwa nwunye nke Abram, dị ka otu ntụzi aka nke Onyenwe anyị siri dị. Hagar mụrụ Ishmel.5 Abram hụrụ Ishmel naanya, mana ọ gaghị abụ nwa nke onye ọgbụgba ndụ ahụ ga-esite na ya emezu. (Lee Jenesis 11:29–30; 16:1, 3, 11; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:34.)

Dị ka ngọzi sitere na Chineke, ma na azịza nye okwukwe nke Sarai,6 ọ tụụrụ ime nafọ agadi ya ka e wee mezuo ọgbụgba ndụ ahụ site na nwa ya nwoke, Aịzik (lee Jenesis 17:19). A mụrụ ya niime ọgbụgba ndụ.

Chineke nyere Saraị na Abram aha ọhụrụ—Sarah na Abraham (lee Jenesis 17:5, 15). Nnyekwasị nke aha ọhụrụ ndị ahụ bidoro mmalite nke ndụ ọhụrụ na akaraka ọhụrụ maka ezi na ụlọ nke a.

Abraham hụrụ ma Ishmel ma Aịzik naanya. Chineke gwara Abraham na Ishmel ka a ga-amụba ma ghọọ oke mba. (lee Jenesis 17:20). N’otu aka ahụ kwa, Chineke mere ya e doo anya na ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ ka a ga-ehiwe site na Aịzik (lee Jenesis 17:19).

Ndị niile nabatara ozi ọma na-aghọ akụkụ nke agbụrụ Abraham. N’ime akwụkwọ Ndị Galeshịa anyị na-agụ:

N’ihi na ka ha ra bụ unu ndị meworo baptizim n’ime Kraịst eyikwasiwo Kraịst.

“… Unu niile bụ otu n’ime Jizọs Kraịst.

“Ma ọ bụrụ na unu bụ ndi nke Kraịst, mgbe ahụ unu ga-abụ mkpụrụ nke Abraham, na ndị nketa oke dị ka nkwa ahụ siri dị” (Ndị Galeshịa 3:27–29).

Site otu a, anyị nwere ike ghọọ ndị nketa oke nye ọgbụgba ndụ ahụ ma ọ bụ site na ọmụmụ ma ọ bụ site na nkuchi.

ndị dị iche iche gbakọtara maka ofufe nke baptizim.

Ozugbo anyị na Chineke mere ọgbụgba ndụ, anyị na-ahapụ ọnọdụ nkiti ruo mgbe ebighị ebi. Chineke agaghị ajụ mmekọrịta Ya na ndị ahụ meworo ụdị njikọta ahụ ha na Ya.

Aịzik na Jekọb nwa Rebaka ka a mụrụ n’ime ọgbụgba ndụ. Na mgbakwunye, ọ họọrọ ịbanye site na nkwenye nke onwe ya. Dị ka ị maara, aha Jekọb ka agbanwere ịbụ Israel (lee Jenesis 32:28), nke pụtara “kwe ka Chineke merie” ma ọ bụ “onye nke so Chineke e meri.”7

N’ime Ọpụpụ anyị na-agụta na “Chineke chetara ọgbụgba ndụ ya na Abraham, na Aịzik, nakwa Jekọb” (Ọpụpụ 2:24). Chineke gwara ụmụ Israel, “Ọ bụrụ na unu ga-erube isi nye olu m n’ezie, ma debe ọgbụgba ndụ m, mgbe ahụ unu ga-abụ ihe onwunwe pụrụ iche nye m” (Ọpụpụ 19:5).

Nkebi ahịrịokwu ahụ “ihe onwunwe pụrụ iche” ka e sitere na Hibru segullah tụgharịa asụsụ ya, nke pụtara ihe onwunwe bara oke uru—“ihe onwunwe.”8

Akwụkwọ nke Ditronomi na-akọdaru ala mkpa ọgbụgba ndụ ahụ dị. Ndị ozi nke Agba Ọhụrụ maara maka ọgbụgba ndụ nke a. Mgbe Pita gwọsiworo onye ngwọrọ nọ na nzọụkwụ tempụl, ọ kuziiri ndị na-ele anya ihe banyere Jizọs. Pita kwuru, “Chineke nke Abraham, na nke Aịzik, na nke Jekọb, Chineke nke ndị nna nna anyị ha, ebuliwo Ọkpara Ya Jizọs” (Ọrụ ndị ozi 3:13).

Pita mechiri ozi ya site na-ịgwa ndị ọgbakọ ya okwu, “Unu bụ ụmụ ndị amụma, ma ndi nke ọgbụgba ndụ nke Chineke na ndị nna nna anyị ha mere, na-asị Abraham, Ma site na mkpụrụ gị ka ebo niile nke ụwa ga-enwe ngọzi” (Ọrụ ndị ozi). Pita mere ya e doo ha anya na akụkụ ozi nke Kraịst bụ imejupụta ọgbụgba ndụ nke Chineke.

Onyenwe anyị nyere ndị Amerịka mgbe gboo okwu chukwu yiri nke a. Ebe ahụ, Kraịst bilitere n’ọnwụ gwara ndị ahụ ndị ha bụ n’ezie. O kwuru:

“Unu bụ ụmụ ndị amụma; ma unu bụ nke ụlọ nke Israel; ma unu bụ ndi nke ọgbụgba ndụ ahụ nke Nna mere ya na ndi nna nna unu ha, na-asị Abraham: Ma nʼime mkpụrụ gị ka ebo niile nke ụwa ga-enwe ngọzi.

“Nna ebe o buworo ụzọ kulite m nye unu, ma zite m ịgọzi unu n’ịtụgharịpụta onye ọbụla n’ime unu site n’ajọọ omume [unu] niile; ma nke a n’ihi na unu bụ ụmụ nke ọgbụgba ndụ ahụ” (3 Nefi 20:25–26).

Ị na-ahụ mkpa ihe nke a dị? Ndị ahụ na-edebe ọgbụgba ndụ ha na Chineke ga-aghọ ụdị mkpụrụ obi guzogidere mmehie! Ndị ahụ na-edebe ọgbụgba ndụ ha ga-enwe ume iguzogide mmetụta nke ụwa na-anọgide.

nwoke na-eri oriri nsọ

Ndị ahụ na-edebe ọgbụgba ndụ ha na Chineke ga-abụ ụdị mkpụrụ obi ndi guzogidere mmehie! Ndị ahụ na-edebe ọgbụgba ndụ ha ga-enwe ume iguzogide mmetụta nke ụwa na-anọgide.

Ọrụ Mgbasa ozi ọma: Ikesa Ọgbụgba ndụ ahụ

Onyenwe anyị enyewo iwu na anyị ga-agbasa ozi ọma ahụ ma kesaa ọgbụgba ndụ ahụ. Nke ahụ bụ ihe mere anyị jiri nwee ndị mgbasa ozi ọma. Ọ na-achọ ka ụmụ Ya niile ọbụla inwe ohere ịhọrọ ozi ọma nke Onye Nzọpụta ma malite n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ ahụ. Chineke na-achọ ijikọta ndị mmadụ niile na ọgbụgba ndụ O mere mgbe gboo ya na Abraham.

Site otu a, ọrụ mgbasa ozi ọma bụ akụkụ dị oke mkpa nke nnukwu mkpọkọta nke Israel. Mkpọkota nke ahụ bụ ọrụ kachasị mkpa na-eme n’ụwa taa. Enweghị ihe ọzọ na-atụnyere ya n’ịdị ukwuu. Enweghị ihe ọzọ na-atụnyere ya n’ịdị mkpa. Ndị mgbasa ozi ọma nke Onyenwe anyị—ndị na-eso ụzọ Ya—ka etinyere na ịma aka mgba kachasị ukwuu, ihe kachasị ukwuu, ọrụ kachasị ukwuu nụwa taa.

Mana enwekwararịị ndị ọzọ—ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Enwere nnukwu mkpa ịgbasa ozi ọma nye ndị mmadụ nọ n’ofe akwa mgbochi ahụ. Chineke chọrọ ka onye niile, nọ n’aka abụọ nke akwa mgbochi, irite ngọzi niile nke ọgbụgba ndụ Ya. Ụzọ nke ọgbụgba ndụ ghere ọnụ nye onye niile. Anyị na-arịọ onye niile isoro anyị gaa ije n’ụzọ ahụ. Enweghị ọrụ ọzọ agụnyere nnọọ n’eluigwe na ụwa. Nihi na “Onyenwe anyị jupụtara n’obi ebere nye ndị niile chọrọ, nezi obi ha niile, kpọkụo aha nsọ ya” (Helaman 3:27).

N’ihi na eweghachitewo Ọkwa nchụaja Melkizedek, ụmụnwanyị na ụmụnwoke na-edebe ọgbụgba ndụ nwere ohere inwete “ngọzi niile ime mmụọ ” nke ozi ọma (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:18; okwu agbakwunyere).

Na nranye nke Tempụl Kirtland n’afọ 1836, na-okpuru ntụzi aka nke Onyenwe anyị, Elijah pụtara. Nzube ya? Ịtụgharị … ụmụ nye ndị nna nna ha” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:15). Elias pụtakwara. Nzube ya? Inyefe Josef Smith na Oliver Cowdery “ọgbọ nke ozi ọma nke Abraham, na-asị na n’ime anyị na na mkpụrụ anyị, ndudugandu niile ga-esochi anyị ga-adị ngọzi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:12). Site otu a, Nna ukwu ahụ nyefere Josef Smith na Oliver Cowdery ikike ọkwa nchụaja na ike nke inyefe ngọzi niile pụrụ iche nke ọgbụgba ndụ nke Abraham n’aka ndị ọzọ.9

N’ime Nzukọ nsọ, anyị na-eje ije n’ụzọ ọgbụgba ndụ ma n’otu otu ma na njikọta aka. Dị ka alumdi na nwunye niile na ezi na ụlọ niile na-enwekọrịta njikọ si na mbụ pụrụ iche nke na-ekewpụta ịhụnaanya pụrụ iche, otu ahụkwa ka mmekọrịta ọhụrụ a malitere mgbe anyị na-ejikọ onwe anyị site na ọgbụgba ndụ kwụ ọtọ nye Chineke anyị!

Nke a nwere ike bụrụ ihe Nefi bu nuuche mgbe o kwuru na Chineke “hụrụ ndị ahụ ga-enwere ya ịbụ Chineke ha naanya” (1 Nefi 17:40). Nke a bụ kpọm kwem ihe kpatara, dị ka akụkụ nke ọgbụgba ndụ ahụ, ebere na ịhụnaanya pụrụ iche—ma ọ bụ hesed—dịịrị adị nye ndị niile ga-abanye na mmekọrịta njikọ nke a miri emi ha na Chineke, ọbụna “ruo na puku kwuru puku ndudugandu” (Diteronomi 7:9).

Ime ọgbụgba ndụ anyị na Chineke na-agbnwe mmekọrịta anyị na Ya ruo ebighị ebi. Ọ na-agọzi anyị jiri atụ nke ịhụnaanya na ebere ọzọ fere oke.10 Ọ na-emetụta onye anyị bụ na otu Chineke ga-esi enyere anyị aka bụrụ ihe anyị nwere ike ịbụ. E kwere anyị nkwa na anyị, kwa, nwere ike bụrụ “ihe onwunwe pụrụ iche” nye Ya (Abụ ọma 135:4).

Nkwa na Ohere ọma niile

Ndị ahụ na-eme ọgbụgba ndụ ndị dị nsọ ma na-edebe ha ka e kwere nkwa ndụ ebighị ebi na mbuli elu, “nke kachasị na onyinye niile nke Chineke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 14:7). Jizọs Kraịst bụ onye nkwado nke ọgbụgba ndụ ndị ahụ (lee Ndị Hibru 7:22; 8:6). Ndị na-edebe ọgbụgba ndụ hụrụ Chineke naanya ma na-ekwe Ya imeri n’ihe niile n’ime ndụ ha na-eme Ya mmetụta kachasị ike n’ime ndụ ha.

N’ime ụbọchi anyị anyị nwere ohere ọma ịnata ngọzi niile nke onye petrak ma mụta maka njiko anyị na ndị petrak mgbe gboo. Ngọzi ndị ahụ nakwa ewete nyo anya n’ime ihe dị niihu.

Jizọs na Pita na-ekwu okwu

N’ihi ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, Ọ gaghị ada mba ma ọlị n’ime mbọ ya inyere anyị aka, ma anyị agaghị ma ọlị ewerecha ndidi obi ebere Ya n’ebe anyị nọ.

Ị Hụrụ M N’anya Karịa Ihe Ndịa? Site naka Devid Lindsley

Ọkpụkpọ oku anyị dị ka Israel gbara ndụ bụ ịgba mbọ hụ na onye otu Nzukọ nsọ ọbụla matara ọńụ na ohere ọma so na ime ọgbụgba ndụ ya na Chineke. Ọ bụ oku ịgba nwoke na nwanyị ọbụla, nwata nwoke na nwata nwanyị ọbụla, na-edebe ọgbụgba ndụ ume, ikesa ozi ọma ha na ndị ahụ na-abịa netiti ogige mmetụta ha. Ọ bụkwa oku ịkwado ma gbaa ndị mgbasa ozi ọma anyị ume, ndị e jiri ntụziaka ziga ime baptizim ma nye aka ikpokọta Israel, ka enwee ike n’otu bụrụ ndị nke Chineke ma Ya a bụrụ Chineke anyị (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 42:9).

Onye ikom na onye inyom niile ndị na-eso na emume nsọ ọkwa nchụaja niile na ndị na-eme ma debe ọgbụgba ndụ ha na Chineke nwere ohere inwete ike nke Chineke. Anyị na-ewekwasị onwe anyị aha nke Onyenwe anyị n’otu n’otu. Anyị na-ewekwasịkwa onwe anyị aha Ya dị ka ndị dị iche iche. Inwe mmasị banyere iji aha ziri ezi nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazụ a bụ ụzọ dị mkpa nke anyị dị ka ndị dị iche iche na-ewekwasị onwe anyị aha Ya. N’ezie, omume obi ebere niile nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazụ a na ndị otu ya bụ ngosipụta hesed nke Chineke.

Gịnị mere e jiri kposasịa Israel? N’ihi na ndị ahụ mebiri iwu nsọ niile ma tụọ ndị amụma okwute. Onye Nna nwere ịhụnaanya mana na-eru uju zaghachiri site na-ikposasị Israel ebe dị anya ma saa mbara.11

Kosiladị, Ọ kposasịrị ha na-ekwe nkwa na otu ụbọchi a ga-ekpokọta Israel ọzọ n’ime ogige Ya.

Ebo nke Juda ka enyere oke na ọrụ ịkwado ụwa maka ọbịbịa mbụ nke Onyenwe anyị. Site na ebo ahụ, akpọkuru Meri ịbụ nne nke Ọkpara Chineke.

Ebo nke Josef, site na ya na nwa nwoke nke Asenath, Ifrem na Manasse (lee Jenesis 41:50–52; 46:20), ka enyere oke na ọrụ idu na mkpọkọta nke Israel, ịkwado ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị.

N’ime ụdị mmekọrịta hesed n’enweghị oge, ọ bụ naani ihe eke na Chineke chọrọ ikpọkọta Israel. Ọ bụ Nna anyị nke Eluigwe! Ọ chọrọ ka ụmụ Ya ọbụla—nọ nofe abụọ nke akwa mgbochi—ịnụ ozi nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere.

Ụzọ nke Ịhụnaanya

Ụzọ ọgbụgba ndụ bụ ụzọ nke ịhụnaanya—hesed ahụ dị ịtụnaanya, nlekọta obi ebere ahụ na irute ibe. Inwe mmetụta ịhụnaanya ahụ na-atọghapụ ma na-ebuli elu. Ọńụ kachasị nke ị ga-enwete mgbe niile bụ mgbe ịhụnaanya maka Chineke na ụmụ Ya jupụtara gị n’ime.

Ịhụ Chineke naanya karịa onye ọbụla ma ọ bụ ihe ọbụla ọzọ bụ ọnọdụ nke na-ewete ezi udo, ezi nkasị obi, ezi obisike, na ezi ọńụ.

Ụzọ ọgbụgba ndụ bụ naanị banyere mmekọrịta anyị na Chineke—mmekọrịta hesed anyị na Ya. Mgbe anyị banyere na ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, anyị na Ya emewo ọgbụgba ndụ onye ga-edebe okwu Ya mgbe niile. Ọ ga-eme ihe niile O nwere ike ime, na-emebighị ohere nhọrọ anyị, inyere anyị aka debe nke anyị.

Akwụkwọ nke Mọmọn ji nrụtụ aka n’ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke a na-ebido ma na-akwụsị. Site nihu aha akwụkwọ ya ruo na ama mmechi niile nke Mọmọn na Moronaị, Akwukwọ nke Mọmọn na-arụtụ aka na ọgbụgba ndụ ahụ (lee Mọmọn 5:20; 9:37). “Ọbịbịa nke Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ihe iriba ama nye ụwa dum na Onyenwe anyị amalitewo ikpọkọta Israel ma mezuo ọgbụgba ndụ niile O meere Abraham, Aịzik, na Jekọb.”12

Ezi ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, akpọwo anyị n’isi oge nke a n’agụgụala nke ụwa ikuziri ụwa ihe banyere ịma mma na ike nke ọgbụgba ndụ dị ebighị ebi. Nna anyị nke Eluigwe tụkwasịrị obi na anyị n’ezoghị ọnụ ịrụ oke ọrụ nke a.

Ozi nke a ka enyekwara na nzukọ ndị ndu ọgbakọ zuru ọha na Maachị 31, 2022.

Hụba ama

  1. Lee Russell M. Nelson, “Ụmụ nke Ọgbụgba ndụ,” Ensign, Me 1995, 34.

  2. Ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị ebigbị ebi bụ uju nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ọ gụnyere emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile dị mkpa maka nzọpụta anyị (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 66:2). Ọ dị “ọhụrụ” mgbe ọbụla Onyenwe anyị megharịrị ya ọhụrụ ma ọ bụ weghachite ya, ma ọ dị “ebighị ebi” n’ihi na ọ naghị agbanwe agbanwe.

  3. Mkparịta ụka dị ukwuu gbasara hesed na ọgbụgba ndụ dị ebighị ebi ka a ga-ahụ na Kerry Muhlestein, Chineke Ga-Emeri: Ọgbụgba ndụ Mgbe Gboo, Ngọzi Ndi Oge Ugbua, na Mkpọkọta nke Israel (2021).

  4. Russell M. Nelson, n’ime “Ndị Aka ebe nke Kraịst Pụrụ iche,” Liahona, Apr. 2001, 7.

  5. Okwu Hibru ahụ Ishmel pụtara “Chineke na-anụ” (Ọkọwa okwu Baịbụl, “Ishmel”).

  6. “Sitekwa na okwukwe Sara n’onwe ya natara mgbam ume ịtụrụ ime, ma mụọ nwa mgbe ọ gafere afọ ịmụ nwa, n’ihi na ọ tukwasiri ya obi onye nke kwere nkwa” (Ndị Hibru 11:11).

  7. Ọkọwa okwu Baịbụl, “Israel.”

  8. Lee Ọkọwa okwu Baịbụl, “Peculiar”; “Ọkọwa okwu Hebrew na Chaldee,” Strong’s Exhaustive Concordance of the Bible (1984), 82, word 5459.

  9. Lee Russell M. Nelson, “Imeela maka Ọgbụgba ndụ ahụ” (Brigham Young University devotional, Nov. 22, 1988), 4, speeches.byu.edu.

  10. Ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke mere bụ ohere ịbịaru ya nso. Nye onye ọbụla na-atụgharị uche nwa mgbe nta niihe ha nweteworo mmetụta ya banyere ịhụnaanya nke Chineke, inwe njikọ ahu e mere sie ike karịa na mmekọrịta ahụ dikwuo nso bụ onyinye a na-enweghị ike ịjụ ajụ” (Henry B. Eyring, “Making Covenants with God” [Brigham Young University fireside, Sept. 8, 1996], 3, speeches.byu.edu).

  11. “Onyenwe anyị jikwara mkposasị nke a nke ndị Ya a họrọ ahọro n’etiti mba niile nke ụwa ịgọzi mba ndị ahụ” (Guide to the Scriptures, “Israel,” scriptures.ChurchofJesusChrist.org; lee kwa Jacob 5:1-8, 20).

  12. Russell M. Nelson, “Ọdịniihu nke Nzukọ nsọ ahụ: Ịkwado Ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta,” Liahona, Epr. 2020, 9.