2023
Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja
Maachị 2023


“Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja” Liahona,, Maachị 2023.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Maachị 2023

Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja

Foto, oyiyi
Kraịst dị ka ọ na-echi ndị Ozi Iri na Abụọ echichi

Kraịst dị ka ọ Na-echi ndị Ozi Iri na Abụọ echichi, site n’aka Harry Anderson

Ngọzị nke ọkwa nchụaja ka a n’enye site na mkpake mmụọ site n’aka onye ji Ọkwa nchụaja Melkizedek. Ngọzi niile nke ọkwa nchụaja n’ekwe ka ụmụ Chineke niile nata ike, ọgwụgwọ, nkasị obi, ma odudu Ya.

Ọkwa Nchụaja ahụ

Ọkwa nchụaja bụ ike na ikike nke Chineke. Ndị nwoke tozuru oke ndị ji Ọkwa nchụaja Melkizedek na-arụ ọrụ n’aha Jizọs Kraịst mgbe ha n’enye ngọzi niile nke ọkwa nchụaja. Dị ka ha n’enye ngọzi ndịa, ha n’esoro ọmụmatụ nke Onye Nzọpụta n’igọzi ndị ọzọ.

Foto, oyiyi
aka ndị atụkwasịrị n’elu otu isi

Foto site n’aka David Winters

Otu esi Enye Ngọzi niile

Ngọzi niile nke ọkwa nchụaja ka a na-enye site nʼibikwasị aka niile nʼisi. Onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek n’edobe aka ya niile n’elu isi nke onye ahụ na-anata ngọzị ahụ. Mgbe ahụ ọ na-enye ngọzị dị ka Mmụọ si duzie ya. Ndị ahụ n’enye ngọzị ndị ahụ na ndị ahụ na-anata ha n’egosipụta okwukwe ha na Chineke ma na-atụkwasị obi n’uche na n’oge Ya.

Ịgụ aha na Ịgọzi Ụmụaka

Mgbe amụsịrị nwata, otu onye ji ọkwa nchuaja na-agụ nwata ahụ aha ma na-enye ya ngọzị (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 20:70.). A na-emekarị nke a nime ọgbakọ nke ibu ọnụ na ịgba ama. A na-ebute ụzọ gụọ nwata ahụ aha. Emesịa ọnye ahụ ji ọkwa nchụaja enye nwata ahụ ngọzị.

Foto, oyiyi
nwata na-arịa ọrịa na-anata ngọzị nke ọkwa nchụaja

Foto site n’aka Welden C. Andersen

Ngọzị niile maka Ndị nrịa nrịa

Ndị ji Ọkwa nchụaja Melkizedek nwere ike inye ndị nọ n’ọrịa ngọzị niile. Ụdị ngọzị nke a nwere akụkụ abụọ: otite mmanụ site n’iji mmanụ na nrachi nke otite mmanụ ahụ. Nke mbụ, onye ji ọkwa nchụaja na-atasa otu kpọm mmanụ olive nke edoworo nsọ, ma ọ bụ gọzie, n’elu isi nke onye ahụ ma kpee ekpere dị nkenke. Mgbe ahụ, onye ọzọ ji ọkwa nchụaja arachie otitte mmanụ ahụ ma nyekwa onye ahụ ngọzị dị ka Mmụọ Nsọ siri duo ya.

Ngọzị niile nke Nkasị obi na nke Ndụmọdụ

Ndị ji ọkwa nchụaja Melkizedek nwere ike nye ndị otu ezi na ụlọ ha ngọzị niile nke nkasị obi na nke ndụmọdụ na ndị ọzọ chọrọ ha. Onye nna ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike nye ụmụ ya ngọzị niile nke nna. Ndị a nwere ike baa uru nke ka nke n’oge ụmụaka na-agabiga aka mgba ndị pụrụ iche.

Idopụ Iche Ndị otu N’eje ozi niime Ọkpukpọ okù dị iche iche.

Mgbe ndị otu Nzukọ nsọ natara ọkpụkpọ okù, a na-enye ha ngọzi mgbe edopụrụ ha iche maka ije ozi. Onye ndu ọkwa nchụaja n’agọzi ha inwete ikike iji rụọ ọrụ n’ọkpụkpọ okù ahụ. Onye ndu ọkwa nchụaja n’enyekwa ha ngọzi iji nyere ha aka nime ije ozi ha.

Foto, oyiyi
nwanyị na-agụ ngọzi nke onye petrak ya

Foto site n’aka Shauna Stephenson

Ngọzị niile nke Onye Petrak

Onye otù ọbụla tozuru oke nwere ike ị nata ngọzị nke onye petrak. Ngọzị ahụ n’enye ndụmọdụ nke onwe nke sitere n’aka Onyenwe anyị. Ọ na-arọpụta odudu na nkasi obi ruo ogologo ndụ mmadụ ahụ. Ọ na-ekwpụtakwa agbụrụ mmadụ ahụ nʼime ụlọ Izrel. Naanị onye petrak echiri echichi nwere ike inye ụdị ngọzị nke a.

Bipụta