Ozi Liahona Kwa ọnwa, Me 2023
Nkuzi niile nke Jizọs Kraịst
Mwepụta niile
Dị ka onye amụma Nefi siri kuziere anyị, anyị ga “na-eri oriri n’elu okwu niile nke Kraịst; niihi na lee, okwu niile nke Kraịst ga-agwa unu ihe niile nke unu ga-eme.”1 … Ozi m taa nwere niime ya nhọpụta nke sitere n’okwu niile nke Onye Nzọpụta anyị— ihe O kwuru. …
“[Iwu nsọ dị ukwuu dị niime iwu ahụ bụ nke a:] ị ga-ahụ Onyenwe anyị Chineke gị naanya jiri obi gị niile, jirikwa mkpụrụ obi gi niile, jirikwa uche gị niile.
“ Nke a bụ iwu nsọ dị ukwuu na nke mbụ.
“Ma nke abụọ dịkwa ka ya, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị naanya dị ka onwe gị.
“N’elu iwu nsọ abụọ ndị a ka iwu na ndị amụma niile bekwasịrị.”2 …
N’ezie, n’ezie, a sị m unu, unu ahaghị ịnọ na nche ma na-ekpe ekpere oge niile, ka aghara ị nwa unu ọnwụnwa site na ekwensu, ma e dupu unu na ndọkpụ n’agha site na ya.”3 …
“Ya mere, ihe ọbụla ọ bụ unu ga-eme, unu ga-eme ya n’aha m; ya mere unu ga-akpọ nzukọ nsọ ahụ n’aha m.”4 …
Ugbua nke a bụ iwu nsọ ahụ: Chegharịanụ, unu nsọtụ niile nke ụwa, ma bịakwutenụ m ma ka e mee unu baptizim n’aha m, ka e wee sachaa unu site na nnabata nke Mmụọ Nsọ, ka unu wee guzoro na-enweghị ntụpọ n’ihu m n’ụbọchị ikpeazụ.”5 …
Anyị kwere na Kraịst Ana m eji ihe O kwuru gbasara otu anyị ga-esi amata ma na-eso nkuzi Ya niile emechi:
“Mana Onye Nkasi obi, nke bụ Mmụọ Nsọ, onye nke Nna ga-ezite n’aha m, ọ ga-akuziri unu ihe niile, ma weta ihe niile na ncheta unu.”6
© 2023 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Me 2023. Language. 19025 593