Liahona
Ìhè Anyị niime Alaịkpa ahụ
Jenụwarị 2024


“Ìhè Anyị niime Alaịkpa ahụ,” Liahona, Jen. 2024.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Jenụwarị 2024

Ìhè Anyị niime Alaịkpaahụ

Ndị ahụ ji obi ha niile na-agụ Akwụkwọ nke Mọmọn, na-ebi ndụ site n’usoro iwu ya, ma na-ekpe ekpere gbasara ịbụ eziokwu ya ga-enweta mmetụta nke Mmụọ Nsọ ma mụbaa okwukwe ha niime, na ama nke, Onye Nzọpụta.

nwanne nwoke nke Jared ji okwute na-amuke amuke

Oyiyi nke nwanne nwoke nke Jared ji okwute na-amuke amuke site n’aka Normandy Poulter

Ọbụna dị ka nwata nwoke, e nwere m rịị ama banyere Akwụkwọ nke Mọmọn. E nwere m mmetụta pụrụ iche nye akụkọ ahụ banyere akụkọ nke nwanne nwoke nke Jared na ndị ya niime njem ha ruo “n’ala e kwere na nkwa” (Eta 2:9).

Mgbe e nwere olileanya ime njem n’ụgbọ na-enweghị ọkụ a mụnyere na ya, nwanne nwoke nke Jared jụrụ, “Lee, O Onyenwe anyị, ị ga-ekwe ka anyị gafee nnukwu mmiri nke a nʼọchịchịrị?” Na-azịza, Onyenwe anyị sịrị, “Gịnị ka ị ga-achọ ka M mee ka i wee nwee ìhè nʼụgbọ mmiri unu niile?” (Eta 2:22, 23).

Nwanne nwoke nke Jared maara na Onyenwe anyị jiiri ike niile. Ọ maara na Onyenwe anyị bụụrụ isi nke ìhè niile. Ọ maara na Onyenwe anyị enyewo ndị ya iwu ịkpọku Ya nʼoge mkpa. Ya mere, itinye okwukwe niime Onyenwe anyị, nwanne nwoke nke Jared kwadoro ụmụ obere okwute 16. Ị ga-echeta na o mechara rịọ Onyenwe anyị ka o metụ okwute ndị ahụ mkpịsị aka Ya, “ka ha wee nye ìhè nʼọchịchịrị” (Eta 3:4).

Oyiyi nke Onyenwe anyị imetụ okwute ndị ahụ aka abụrụwo ihe akanyere nʼobi m kemgbe m buru ụzọ gụọ akụkọ ahụ. E nwere m ike ịhụ nkiri ahụ dị ka aga asị na ọ na-eme ihu anya m. Ikekwe nke ahụ bụ niihi oyiyi nke ọchịchịrị nke ìhè ahụ chụsasịrị dị ire nye m.

Mgbe m na anaghị enwe mmetụta Mmụọ Nsọ, mgbem na-enwechaghị Mmụọ nke Onyenwe anyị, ọ na-adị m ka ọchịchịrị. Ugbua mgbe m na-agụ Akwụkwọ nke Mọmọn, ìhè ahụ na-alọghachi. Akwụkwọ nke Mọmọn abụrụwo nye m ihe dị ka okwute na-amụke amụke nke Onyenwe anyị metụrụ aka. O nyewo ìhè na njem nke ndụ m.

Ihè Ruo Mgbe ebighị ebi

Dị ka ndị ahụ akpọtara site n’aka nke Onyenwe anyị ruo na Amerịka mgbe ochie, anyị niile na-ezute ebili mmiri niile na ajọọ ụbọchị niile nʼoge njem anyị ruo nʼala nke mbuli elu e kwere na nkwa. Mana Onyenwe anyị ga-emere anyị ihe O meere ndị Jared na ndị Nefi. Ọ ga-eduzi anyị ma nye ìhè n’ụzọ anyị—ma ọ bụrụ ma anyị rubere Ya isi, tinye okwukwe na Ya, ma rịọ maka enyem aka Ya.

Onyenwe anyị gwara Nefi, “Aga m abụkwa ìhè unu n’ime alaịkpa ahụ; ma aga m akwado ụzọ n’ihu unu, ma ọ bụrụ na unu ga-edebe iwu nsọ m niile; ya mere, ọ bụrụ raa na unu ga-edebe iwu nsọ m niile a ga-edu unu chee ihu n’ala e kwere na nkwa; ma unu ga-ama na ọ bụ site nʼaka m ka esi na-edu unu” (1 Nefi 17:13).

Onyenwe anyị gwara Jekọb nwanne nwoke nke Nefi, aga m abụ ìhè nye ha ruo ebighị ebi, ndị nke na-anụ okwu m” (2 Nefi 10:14).

Banyere Onye Nzọpụta, onye amụma Abinadaị gbara aka ebe, “Ọ bụ ìhè na ndụ nke ụwa; ee, ìhè nke na-enweghị nsọtụ, nke na-enweghị ike ịgba ọchịchịrị” (Mozaya 16:9).

Banyere Ya Onwe Ya, Onye Nzọpụta gbara ama, “Abụ M ìhè na ndụ nke ụwa. Ọ gbakwụnyere, “ Lee abụ m ìhè ahụ; e doziwo m ihe imaatụ nye unu” (3 Nefii 9:18; 18:16).

Onyeisi Russell M. Nelson na-eje ije

Na-enwete mmetụta ìhè ahụ

A hụrụ m onye amụma anyị, Onyeisi Russell M. Nelson naanya. E nwere m ngọzi nke ije ozi nʼakụkụ ya. Mgbe ọ batara niime otu ọnụ ụlọ, ọnụ ụlọ ahụ na-enwe ìhè karịa. Ọ na-ebu Ihè nke Kraịst nʼahụ ya.

Ihè nke Kraịst dị iré. Ọ “bụ ume, ike si na chi, ma ọ bụ mmetụta nke na-esi n’aka Chineke abịa site na Kraịst ma na-enye ihe niile ndụ na ìhè.” Ọ bụ onyinye nke ime mmụọ anabatara nʼobi ụtọ nke nwere ike iduba ụmụ Chineke nʼebe Mmụọ Nsọ na ozi ọma nke Jizọs Kraịst nọ.1 Ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn na-enye Ihè ahụ ike.

Mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị ịtụgharị uche na ndụ anyị icheta otu esiworo nyere anyị aka na njem anyị. Dị ka anyị na-atụgharị uche, anyị nwere ike nweta mmetụta nke Onye Nzọpụta ọzọ. Mgbe akwụkwọ nsọ na-asị, “Chetanụ, Chetanụ” (Helaman 5:12), e chere m na ha na-asị anyị, “Echetala nnọọ ihe Ị mabuuru otu mgbe ma ọ bụ nwee mmetụta; kama nwee mmetụta ìhè ahụ ọzọ.”

Nʼebe ụfọdụ nọ, inwe mmetụta ìhè nke ime mmụọ na-abịa nʼụzọ dị mfe. Nʼebe ndị ọzọ nọ, ìhè nke ime mmụọ nwere ike ịra ahụ inweta mmetụta niihi ihe ịra ahụ nke onwe ma ọ bụ ihe mmeri anya nke ụwa. Mana ọ bụrụ na anyị kwesị ntụkwasị obi, ìhè ga-abịa—mgbe ụfọdụ nʼụzọ ndị anyị na-atụghị anya.

Onyeisi Nelson, onye na-enyewo anyị ndụmọdụ iji ekpere mụọ Akwụkwọ nke Mọmọn ụbọchị niile,”2 ekwupụtawo ọtụtụ ụzọ Akwụkwọ nke Mọmọn nwere ike i si kpọta anyị nso nʼebe Onye Nzọpụta nọ ma nyere anyị aka nweta ìhè ozi ọma, jidesie eziokwu niile nke ozi ọma aka ike, ma bie ndụ nkuzi niile nke ozi ọma.

Dị ka anyị na-agụ Akwụkwọ nke Mọmọn, Onyeisi Nelson sịrị, nghọta anyị banyere, na obi ekele anyị maka, Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst ga-eto eto.

Anyị ga-enwe ọchịchọ ịbụ ndị “a mụrụ ọzọ” (Mozaya 27:25) dị ka akwụkwọ ahụ na-enyere anyị aka enweta mgbanwe nke obi (lee Mozaya 5:2).

Dị ka anyị na-agụ ma na-amụ nkuzi niile nke Akwụkwọ nke Mọmọn banyere mkpokọta nke Israel, anyị ga-enwe ọchịchọ bara ụbara ịchọpụta ndị nke anyị nwụrụ anwụ ma mee emume nsọ nzọpụta na mbuli elu maka ha niime tempụl.

Anyị ga-adị gara gara dị ka anyị na-anata azịza nye ajụjụ anyị, ntuzi aka na ime mkpebi, na ume ichegharị ma guzogide ajọọ ihe.

Mgbe anyị na-agụ eziokwu ndị a hụtara niime Akwụkwọ nke Mọmọn, anyị ga-enwe mmetụta ọgwụgwọ, nkasi obi, mweghachite, enyem aka, ume, ngụgụ obi, ma na-eweta ekele na mkpụrụ obi anyị.3

“O mgbe ahụ, nke a ọ bụghị ihe dị ire?” Alma jụrụ ajụjụ gbasara mkpụrụ osisi nke eziokwu, ọmụma ihe, na ama na-eko eko, na-epulite epulite. “A sị m unu, Ee, n’ihi na ọ bụ ìhè; ma ihe ọbụla bụ ìhè, dị mma, n’ihi na a na-ahụzi ya nke ọma, ya mere unu ahaghị ịmata na ọ dị mma” (Alma 32:35).

foto nke Jizọs Kraịst

Oyiyi nke Kraịst, site n’aka Heinrich Hofmann

Chọta Onye Nzọpụta niime Ọchịchịrị

Mgbe enyi m Kamryn gbara afọ 10, ọ dabara nọrịa anya na-anaghị adịkama mana nweghị ngwọta nke metụtara anya ojii nke anya aka nri ya.4 Mgbe ụfọdụ, mgbe mgbu na-eso ya bịara ghọọ nke na-adịgide ma kweghị odidi, Kamryn enweghị ike edi ihe ọbụla. Nne na nna ya, na nchekasị ahụ na o nwere ike kpuo isi, ga-eme ka mpio ime ụlọ ụra ya gbaa itiri iji gbaa mbọ hụ na ọ dị mma. Nne Kamryn, Janna, chetara:

“Ihe dị ka ọnwa anọ emechara nchọpụta ọrịa ya, a gaara m banye niime ụlọ ya gbara itiri. Ka anya m bịara daba n’ọnọdụ ebe ahụ, e nwere m ike hụ Kamryn ka ọ gbakụrụ n’ọnọdụ nwa ebu n’afọ n’elu akwa ya. Ọ nọọrọ n’ezigbote mgbu nke mere na ọ tụgharịghị ma ọ bụ bee akwa mgbe ọ nụrụ ka m batara. O dinaara nnọọ ebe ahụ n’anya ya abụọ zachiri azachi.

“E gbisara ikpere m n’akụkụ akwa ya, were aka ya tinye na nke m, ma hịọọ ya aka ugboro atọ—kodu nzuzo anyị maka ‘A hụrụ m gị naanya.’ Otu o kwesịrị ọ gaara ahịọghachi aka ugboro anọ maka ‘A hụrụ m gị naanya karịa,’ mana ọ zaghachighị. Ọ nọọrọ n’oke mgbu. Na anya mmiri akwa na-asọda na nti m, e lere m nwa m gbara afọ 10 naara awụ garagara hikọrọ ka bọl. Obi gbawara m.”

Janna jiri nwayọọ, kpee ekpere riri obi.

“A gwara m Nna nke Eluigwe na amaraa m na Ọ maara nke kachasị mma, mana a rịọrọ m, ‘Biko nyere ya aka.’ Ka m gbisara ebe ahụ na-ekpe ekpere, ikuku nke obi ụtọ zuru m ahụ. Obi m dajụrụ dị ka echiche gbasara Jizọs Kraịst batara m nuuche: ‘Ọ bụ ya bụ ìhè ahụ. Chọta Ya niime itiri ahụ.’”

Janna welitere isi ya ma takanye na ntị Kamryn: “Ị ga-ahụ na ị chọtara Onye Nzọpụta niime itiri ahụ.”

Mgbe e mesịrị, Kamryn dabara n’ụra na-ege ntị n’ukwe na akwụkwọ nsọ ndị dị na app ọba akwụkwọ Nzukọ nsọ.

nwata nwanyị yi ihe eji nyachie anya

Mgbe ọrịa anya ya bịara ka njọ, Kamryn na-achọta Onye Nzọpụta niime itiri.

Foto sitere n’aka ezi na ụlọ nke Kamryn

Ọrịa Kamryn nọọrọ na-agaghị ihu na agaghị azụ ọtụtụ oge, mana mgbe anya ya zajuru, Janna na di ya, Darrin, na-akasi ya obi ma ọzọkwa were ọtụtụ blanket kpuchie ọnụ mpio ụlọ ụra ya niile. N’oge ihe mgbu ndị ahụ, Kamryn na-asị, “Ana m achọta nnọọ Onye Nzọpụta niime itiri.”5

Mgbe ndụ yiri ihe dị ka “alaịkpa gbara itiri ma na-atụ egwu” (1 Nefi 8:4), anyị nwekwara ike nwee mkpa ịchọta Onye Nzọpụta niime itiri. Ana m agba ama na Akwụkwọ nke Mọmọn, na aka ebe ya, “na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Chineke dị Ebighị ebi,”6 ga-eduba anyị n’ebe Ọ nọ. A maara m na ndị ahụ ji obi ha niile na-agụ Akwụkwọ nke Mọmọn, na-ebi ndụ site n’usoro iwu ya niile, ma na-ekpe ekpere gbasara ịbụ eziokwu ya ga-enweta mmetụta nke Mmụọ Nsọ ma mụbaa okwukwe ha niime, na ama nke, Onye Nzọpụta.

Ka anyị gosị obi ekele maka akwụkwọ nke a “kachasị zie ezie”7 site n’ịdị na-agụ ya, na-eji ya akpọrọ ihe, ma na-eji ya iji na-agba okwukwe anyị na okwukwe ndị ọzọ ume niime Ihè nke Ụwa ahụ.

Hụba ama

  1. Lee Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ihè nke Kraịst,” topics.ChurchofJesusChrist.org.

  2. Russell M. Nelson, “Akwụkwọ nke Mọmọn: Gịnị Ka Ndụ Gị Ga-adị ka ya Ma Ewezuga Ya?,” Liahona, Nov. 2017, 62.

  3. Lee Russell M. Nelson, “Akwụkwọ nke Mọmọn: Gịnị Ka Ndụ Gị-adị ka ya Ma Ewezuga Ya?,” 62, 63.

  4. Herpes simplex virus keratitis.

  5. Ana m ekele Janna Cannon na nwa ya nwanyị Kamryn maka ịkọ akụkọ ha.

  6. Ihu Aha Akwụkwọ nke Mọmọn.

  7. Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Joseph Smith (2007), 64.