“Ọńụ Na-Adịgide site n’Ibi ndụ Ozi ọma,” Liahona, Febụwarị 2024.
Ozi Liahona Kwa ọnwa, Febụwarị 2024
Ọńụ Na-Adịgide site n’Ibi ndụ Ozi ọma
Ọńụ na-adịgide na-abịa site na-ịnọgide niime ozi ọma nke Jizọs Kraịst na inyere ndị ọzọ aka meekwa otu ahụ.
Ngosipụta banyere ebumnobi nke ndụ anyị ekwupụtara nke ọma ka e nwere ike ịhụ niime nkuzi niile si n’amụma nke Lehi gbasara mmalite nke ndụ mmadụ n’elu ụwa. N’Ubi nke Iden, Adam na Iv biiri ndụ n’ọnọdụ enweghị ụta. Ọ bụrụ na ha nọgidere n’ọnọdụ ahụ, ha “[agaraghị] enwe ọn̄ụ ọbụla, niihi na ha amaghị ahụhụ ọbụla, emeghị ihe ọma, n’ihi na ha amaghị mmehie ọbụla” (2 Nefi 2:23). Site otu a, dị ka Lehi siri kọwaa, “Adam dara ka ụmụ mmadụ wee dịrị; ma ụmụ mmadụ dị, ka ha wee nwee ọn̄ụ” (2 Nefi 2:25; leekwa Moses 5:10–11).
Dị ka anyị na-etolite n’ụwa daworo ada, anyị na-amụta ihe dị iche n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ site niihe a kuziiri anyị na site niihe anyị na-enweta na nhumiihe. Anyị “na-enweta ụtọ ilu, ka [anyị] wee mara ihe ihe ọma na-ada” (Moses 6:55). Ọńụ na-abịa mgbe anyị jụrụ ihe na-akị ilu ma na-abawanye anabata n’obi ma jigidesie aka ike niihe ahụ dị mma.
Ịchọta Ọńụ
Niihi ịhụnaanya na-enweghị ntụpọ O nwere maka anyị, Nna anyị nke Eluigwe nwere oke agụụ ikesa ọńụ Ya na-enweghị ntụpọ anyị na Ya, ma ugbua ma n’oge ebighị ebi. Nke ahụ abụrụworịị mbunuuche Ya niime ihe niile site na mmalite, tinyekwara atụmatụ ańụrị Ya dị ebube na ịchụ aja nke Ọkpara Ọ Mụrụ Naanị Ya iji gbapụta anyị.
Chineke anaghị anwa ibokwasị anyị ọńụ ma ọ bụ ańụrị, mana Ọ na-akuziri anyị otu esi achọta ya. Ọ nakwa agwa anyị ebe na-agaghị enweta ọńụ—“ajọọ omume [adịghị ma] nweghị mgbe ọ bụ ańụrị” (Alma 41:10). Ọ bụ site na iwu nsọ Ya niile ka Nna nke Eluigwe si na-ekpughere anyị ụzọ nke na-eduba n’ọńụ.
Onyeisi Russell M. Nelson kwuru ya n’ụzọ dị otu a:
“Ebe a ka ọkpụrụkpụ eziokwu dị: ebe ndị ụwa kwesịrị ike na ike, akụ na ụba ndị e nwere, iwu ewu, na ihe ndị na-amasị anụ ahụ na-eweta ọńụ, ha anaghị eme ya! Ha enweghị ike! Ihe ha na-emepụta enweghị ihe ọ bụ kama oghere na-anọchi anya maka “ịdị ngọzi na ọnọdụ an̄ụrị nke ndị ahụ [bụ ndị] na-edebe iwu nsọ niile nke Chineke’ [Mozaya 2:41].
“Nke bụ eziokwu bụ na ọ na-akacha agwụ ike ịchọ ọńụ ebe na ị na-enweghị ike achọta ya! Otu osila dị, mgbe i yokukọtara onwe gị na Jizọs Kraịst ma rụọ ọrụ nke ime mmụọ a chọrọ iji merie ụwa, Ya, na naanị Ya, nwere ike i buli gị bufee ihe niile na-adọtu mmadụ nke ụwa nke a.”1
Site otu a, a na-ahụta ọńụ na-adịgide n’idebe iwu nsọ niile nke Chineke, ma iwu nsọ niile nke Chineke ka a na-ahụ niime ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Mana ọ bụ nhọrọ anyị. Ọ bụrụ niime adịghị ike anyị anyị adaa nwa oge idobe iwu nsọ ahụ niile,anyị ka nwere ike ịtụgharị, jụ ihe ilu, ma otu ugboro ọzọ chụso ihe dị mma. Ịhụnaanya nke Chineke anaghị enye mmehie ohere—nke ahụ ga-abụ obi ebere na-apụnarị ikpe ziri ezi—mana site na Aja mgbaghara mmehie Ya, Jizọs Kraịst na-enye mgbapụta site na mmehie:
“Amulek … sịrị … na Onyenwe anyị ga-abịa nʼezie ịgbapụta ndị ya, mana ọ gaghị abịa ịgbapụta ha niime mmehie ha niile, kama ịgbapụta ha site na mmehie ha niile.
“Ma o nwere ike e nyere ya site na Nna ahụ ịgbapụta ha site na mmehie ha n’ihi nchegharị; ya mere o zigawo ndị mmụọ ozi ya ịma ọkwa ozi ọma niile ahụ banyere ọnọdụ niile nke nchegharị, nke na-eweta ike nke Onye Mgbapụta, ruo na nzọpụta nke mkpụrụ obi ha” (Helaman 5:10–11; nkwusi ike agbakwunyere).
Jizọs kwuru:
“Ọ bụrụ na unu dobe iwu nsọ m niile, unu ga-anọgide nʼịhụnaanya m; ọbụna dị ka M debeworo iwu nsọ niile nke Nna m, ma nọgide nʼịhụnaanya ya.
“Ihe ndịa ka M kwuworo nye unu, ka Ọńụ m wee nọgide niime unu, ma ka ọńụ unu wee ju eju” (Jọn 15:10–11).
Nke a bụ ihe Lehi nwere mmetụta ya niime nrọ ya dị ka o detụrụ mkpụrụ osisi nke ndụ ahụ ọnụ—nke nọchiri anya ịhụnaanya nke Chineke. Ọ sịrị, “Mgbe m na-aracha mkpụrụ osisi si na ya o mejupụtara mkpụrụ obi m n’oke ọn̄ụ dị ukwuu” (1 Nefi 8:12; leekwa 11:21–23).
Lehi kpughekwara ụzọ nke abụọ anyị nwere ike i si eweta ọńụ niime ndụ anyị mgbe ọ sịrị, “Ya mere, a militere m ịchọsi ike na ezi na ụlọ m ga-eso riekwa site na [mkpụrụ ahụ]” (1 Nefi 8:12).
Inyere ndị ọzọ aka Chọta Ọńụ
Dị ka ndị nke Eze Benjamin, anyị “na-ejupụta nʼọńụ” mgbe anyị natara mgbaghara nke mmehie anyị ma nweta mmetụta “udo nke mmụọ” (Mozaya 4:3). Ọ na-emetụkwa anyị ọzọ mgbe anyị lepụrụ anya na-ezi ma chọọ inyere ndị otu ezi na ụlọ na ndị ọzọ aka natakwa otu ụdị ọńụ na udo ahụ.
Dị ka nwata nwoke, Alma chọrọ ańụrị niime ihe niile megidere ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Mgbe otu mmụọ ozi bachaara ya mba, o nyere ezigbo aka ya ịgbanwe site “niihe ilu ahụ” ruo “niihe dị mma” site na nchegharị “ruo nso n’ọnwụ” (Mozaya 27:28) na uju amara nke Onye Nzọpụta. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Alma n’oke ọńụ mara ọkwa nye nwa ya nwoke Helaman:
“Ma o, ụdị ọn̄ụ dị otu a, ma lee ìhè dị ịtụnaanya m hụrụ; ee, mkpụrụ obi m jupụtara n’ọn̄ụ dị ukwuu dị ka mgbu m siri dị ukwuu! …
“Ee, ma site n’oge ahụ ọbụna tutu ruo ugbua, arụwo m ọrụ na-esepụghị aka, ka m wee weta mkpụrụ obi niile na nchegharị; ka m wee weta ha idetụ ire site n’ọn̄ụ dị ukwuu nke m detụrụ ire. …
“Ee, ma ugbua lee, O nwa m nwoke, Onyenwe anyị na-enye m oke ọn̄ụ dị ukwuu nʼụgwọ ọrụ m niile.
“Maka na niihi okwu ahụ [ozi ọma nke Jizọs Kraịst] nke o nyeworo m, lee, amụwo ọtụtụ ndị site na Chineke, ma ha edetụwo ire dị ka m detụworo” (Alma 36:20, 24–26).
Noge ọzọ, Alma gbara ama:
“Nke a bụ ebube m, na eleghị anya aga m abụ ngwa ọrụ n’aka Chineke iweta ụfọdụ mkpụrụ obi na nchegharị; ma nke a bụ ọńụ m.
“Ma lee, mgbe m na-ahụ ọtụtụ niime ụmụnne m ndị nwoke chegharịrị n’eziokwu, ma na-abịakwute Onyenwe anyị Chineke ha, mgbe ahụ ka mkpụrụ obi m jupụtara na ọn̄ụ” (Alma 29:9–10).
Alma garaniihu ịma ọkwa ọńụ dị omimi metụtara ya mgbe ndị ọzọ nwetere mmeri n’ịkpọta ọtụtụ mkpụrụ obi nye Kraịst:
“Mana anaghị m enwe ọn̄ụ na mmeri nke naanị onwe m, kama ọn̄ụ m kara juo eju niihi mmeri nke ụmụnne m ndị nwoke [ụmụ Mozaya ndị nwoke], ndị garuworo n’ala nke Nefi.
“Lee, ha arụwo ọrụ nke ukwuu, ma amịpụtawo nnukwu mkpụrụ; ma lee ka ụgwọ ọrụ ha ga-esi adị ukwuu!
“Ugbua, mgbe m na-eche maka mmeri nke ụmụnne m ndị nwoke ndị a mkpụrụ obi m ka ana-ebupụ, ọbụna ruo n’ikewapụ ya site n’ahụ, dị ka o siri dị, otu a ka ọn̄ụ m siri dị ukwuu” (Alma 29:14–16).
Anyị nwekwara ike chọta otu ụdịrị ọńụ ahụ dị ka anyị na-enwe ịhụnaanya nebe ndị ọzọ nọ jiri “ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ” (Moronaị 7:47; leekwa amaokwu nke 48), kọọ eziokwu nke eweghachitere gị na, ma kpọkuo ha ịgbakọta ha na ndị gbara ndụ.
Ọńụ N’Etiti Mkpagbu
Anyị ekwesịghị ịtụ egwu na mnwale niile na aka mgba niile anyị na-ahaghị izute na ndụ anụ ahụ ga-egbochi ma ọ bụ ga-ala ọńụ anyị niiyi. Alma bụ otu onye nke ozi achọghị ọdịmma onwe naanị o jere maka ndị ọzọ wepụrụ ya nnukwu ihe n’ahụ. Ọ tara ahụhụ ịga mkpọrọ, mgbatị oge banyere agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, iti ihe otiti niile, iyi ndụ ya egwu, na mkparị mgbe na mgbe, na ọjụjụ. Ma otu ọ dị, ha niile ka “elobara niime ọńụ nke Kraịst” (Alma 31:38). Ikekwe ntaram ahụhụ nke Alma mere ka ọńụ nke sotere ya ọbụna dị ukwuu karịa.
Onyeisi Nelson na-echetara anyị na ọńụ rụrụ ọrụ na ntaram ahụhụ nke Onye Nzọpụta—“niihi ọńụ ahụ nke edobere niihu ya [O] diri ihere nke obe” (Ndị Hibru 12:2).
Chee echiche banyere nke ahụ! Iji hụ na O diri nhụmiihe kachasị egbu mgbu ediworo n’elu ụwa, Onye Nzọpụta anyị lekwasịrị anya n’ọńụ!
“Ma gịnị bụ ọńụ ahụ edobere niihu Ya? N’ezie ọ gụnyere ọńụ nke nsacha, ọgwụgwọ, na ịgba anyị ume; ọńụ nke ịkwụ ụgwọ maka mmehie nke ndị niile ga-echegharị; ọńụ nke ga-ekwe ka okwe omume maka mụ na gị ịlọghachi n’ebe obibi—dị ọcha ma tozuo oke—ibi anyị na Nne na Nna anyị nke Eluigwe na ndị ezi na ụlọ.
“Ọ bụrụ na anyị atụkwasị uche nelu ọnụ ahụ nke ga-abịakwute anyị, ma ọ bụ na ndị ahụ anyị hụrụ naanya, gịnị ka anyị pụrụ idi nke yiri ugbua ka ọ na-anyịgbu anyị, egbu oke mgbu, atụ egwu, na-ezighị ezi, ma ọ bụ dị nnọọ ka ihe na-ekweghị omume?”2
Ọńụ na-adịgide na-abịa site na-ịnọgide niime ozi ọma nke Jizọs Kraịst na inyere ndị ọzọ aka meekwa otu ahụ. Ọńụ na-adịgide na-abịa mgbe anyị na-anọgide niime ịhụnaanya nke Chineke, na-erube isi niwu nsọ Ya niile ma na-anata amara nke Onye Nzọpụta. N’ụzọ nke ozi ọma, e nwere ọńụ na njem ahụ tinyekwara ọńụ na ngwụcha ya. Ozi ọma nke Jisọs Kraịst bụ ụzọ nke ọńụ kwa ụbọchị.
© 2024 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa ọnwa, Febụwarị 2024. Language. 19276 593