Liahona
Onye Nzọpụta nke Ihe Niile, Ozi ọma maka Ihe Niile
Maachị 2024


“Onye Nzọpụta nke Ihe Niile, Ozi ọma maka Ihe Niile,” Liahona, Maa. 2024.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Maachị 2024

Onye Nzọpụta nke Ihe niile, Ozi ọma maka Ihe niile

Ozi ọma ahụ, Aja mgbaghara mmehie, na Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraist na-agọzi ụmụ Chineke niile.

Kraịst na nwoke kpọnwụrụ akpọnwụ

Kraịst na Nwoke Ahụ Kpọnwụrụ akpọnwụ, site n’aka J. Kirk Richards, nke e nwere ike agaghị akọpị akọpị

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere bụ, nke mbụ, nke kachasị mkpa, ma ruo mgbe ebighị ebi, isi iyi nke ańụrị na-adịgide, ezi udo, na ọńụ nye onye ọbụla n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. Ngọzi niile na-asọpụta site na ozi ọma ma site n’obiọma nke Kraịst na-enweghị nsọtụ enweghị mgbe ebu n’obi na ọ bụ maka naanị mmadụ ole ma ole ahọpụtara n’oge ochie ma ọbụ n’oge ugbu a.

Agbanyeghị otu anyị nwere ike isi na-eche na anyị etozughị oke, ma na-agbenyeghị mmehie ndị nwere ike iwepụ anyị site n’ebe Ọ nọ ruo nwa oge nta, Onye Nzọpụta anyị na-amasi anyị obi ike na “ọ na-esetịpụ aka ya abụọ nye [anyị] ogologo ụbọchị niile” (Jekọb 6:4), na-akpọku anyị niile ịbịakwute Ya ma nwee mmetụta ịhụnaanya Ya.

Ngọzi niile nke Ozi ọma maka Ụwa Niile

“Eweghachitewo ozi ọma nke Jizọs Kraịst n’ụbọchị ikpeazụ ndị a iji gboo … mkpa nke mba niile, ala ụmụnna, asụsụ na ndị bi nelu ụwa.”1 Ozi ọma ahụ karịrị obodo na agba niile ebe ọ na-agafe usoro omenaala niile iji kuzie na “mmadụ niile yiri otu nye Chineke” (2 Nefi 26:33).2 Akwụkwọ nke Mọmọn guzoro dị ka ihe aka ebe pụtara ihe banyere eziokwu nke a.

Nnukwu ndekọihe nke a na-agba ama na Kraịst na-echeta mba niile (lee 2 Nefi 29:7) ma na-egosipụta “onwe ya nye ndị niile ahụ kwere na ya, … [ma rụọ] nnukwu ọrụ ebube, ihe iriba ama, na ihe ebube dị iche iche, n’etiti ụmụ mmadụ” (2 Nefi 26:13). N’etiti ọrụ ebube niile ndị a dị egwu, ihe ịrịba ama na ihe ebube dị iche iche bụ ịgbasa ozi ọma. Ya mere, anyị na-ezipụ ndị mgbasa ozi ọma na gburugburu ụwa niile ịgba ama gbasara ozi ọma ya. Anyị nakwa ekesa ozi ọma ahụ nye ndị nọ anyị nso. Ntinye n’ọrụ nke ọtụghe nke ọkwa nchụaja eweghachitere maka ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ na-ahụ na uju nke ozi ọma ga-adị n’ikpeazụ nye nwa nwoke na nwa nwanyị ọ bụla nke nne na nna nke eluigwe anyị—n’oge gara aga, oge ugbu a ma ọ bụ n’ọdịniihu.

Obi nke ozi ọma nke a—isi ozi nke onye amụma na onye ozi ọ bụla a kpọtụrụla n’ọrụ ahụ—bụ na Jizọs bụ Kraịst ahụ ma na ọ bịara ịgọzi onye ọ bụla. Dị ka ndị otù Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, anyị na-amaọkwa na aja mgbaghara mmehie Ya bụ maka mmadụ ihe bi n’ụwa.

Mkpa Ọ dị maka Aja mgbaghara mmehi Na-enweghị nsọtụ ma dị Ebighị ebi

Ka m na-aga gburugburu ụwa, ana m eme ihe ịgba ajụjụ ọnụ mụ na ọtụtụ ndị otu Nzukọ nsọ dị iche iche. Ana m enwe mkpate mmụọ ịnụ otu ha si enwe mmetụta ngọzi niile nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst niime ndụ ha, ọbụna mgbe ha kwupụtara ụfọdụ mmehie ha merela oge gara aga. Lee ka o si bụrụ ihe magburu onwe ya na nsacha nkasi obi nke Aja mgbaghara mmehie Ya dịịrị anyị niile!

“A ga-enwerịrị aja mgbaghara mmehie a chụrụ,” Amulek kwupụtara, “ma ọ bụghị ya mmadụ niile ga-alarịrị n’iyi na-enweghị nzere.” Anyị ga-abụ ruo mgbe ebighị ebi “ndị dara ada ma … fuo efuo, … ma ọbụghị ma ọ bụ site na aja mgbaghara mmehie,” nke chọrọ “aja na enweghị nsọtu ma dị ebighị ebi.” Niihi na “ọ dịghị ihe ọbụla nke na-erughị aja mgbaghara mmehie na-enweghị nsọtụ nke ga-ezu maka mmehie niile nke ndị bi n’ụwa” (Alma 34:9, 10, 12).

Nnukwu onye amụma Jekọb kụzikwara na niihi na “ọnwụ agabigawo ụmụ mmadụ niile, … ọ ga-abụrịrị na aga enwe ike nke mbilite n’ọnwụ” iji kpọbata anyị n’ihu Chineke (2 Nefi 9:6).

E kwesịrị imeri mmehie na ọnwụ. Nke a bụụrụ ozi nke Onye Nzọpụta, nke O ji obi ike rụzuo maka ụmụ Chineke niile.

Kraịst niime Getsemane

Getsemane, site n’aka J. Kirk Richards, nke e nwere ike agaghị akọpị akọpị

Aja nke Onye Nzọpụta Anyị

Na abali ikpeazụ Ya na ndụ anụ ahụ, Jizọs Kraịst banyere na Ubi nke Gethsemane. Ebe ahụ, O gburu ikpere n’ala n’etiti osisi oliv wee malite ịrịda niime omimi nke nhụsianya nke mụ na gị enweghị ike ịmata.

Ebe ahụ, O bidoro ịbukwasị onwe Ya mmehie niile nke ụwa. O nwere mmetụta mgbu niile, obi mgbawa, na iru uju, ma Ọ nagidere nhụsianya na nhụjuanya niile nke gị, mụ, na mkpụrụ obi ọ bụla nke dịworo ndụ ma ọ bụ nke ga-adị ndụ. Nnukwu ahụhụ nke a na-enweghị nsọtụ “mere ka [Ya], … onye kachasị elu, ịma jijiji n’ihi mgbu, na ịgba ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:18.). Naanị Ya nwere ike mee nke a.

Enweghị onye ọzọ pụrụ ime ya

Ị kwụ ụgwọ nke mmehie.

Naanị Ya nwere ike mepee ọnụ ụzọ ama ahụ

Nke eluigwe ma kwe ka anyị bata.3

Mgbe ahụ a kpọgara Jizọs na Calvary, ma na oge kachasị njọ na-ezighị ezi n’agụgụala nke ụwa nke a, a kpọgidere Ya n’obe. O nweghị onye ọ bụla nwere ike ịnara Ya ndụ Ya. Dị ka Ọkpara A Mụrụ Naanị Ya nke Chineke, O nwere ike karịa ọnwụ nke anụ ahụ. O nwere ike kpee ekpere nye Nna Ya, ma ụsụụ ndị mmụọ ozi gaara abịa imeri ndị na-emegbu Ya ma gosipụta ike Ya n’elu ihe niile. “Ma olee otu e si emezu ihe e dere niime akwụkwọ nsọ,” Jizọs jụrụ mgbe a raara Ya nye, “na site otu a ka ọ ga-adịrịrị?” (Matiu 26:54).

Site na nrube isi zuru oke nye Nna Ya—na ịhụnaanya zuru oke maka anyị—Jizọs ji obi ya niile nye ndụ Ya ma mezuo aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị nsọtụ ma dị ebighị ebi, nke na-erute azụ n’oge niile ma gaaniihu ruo mgbe niile ebighị ebi.

Mmeri nke Onye Nzọpụta Anyị

Jizọs nyere Ndị ozi Ya iwu ka ha gaaniihu na-arụ ọrụ Ya mgbe Ọ nwụchara. Kedu ka ha ga-esi mee ya? Ọtụtụ niime ha bụ naanị ndị ọkụ azụ, ma ọ dịghịkwa onye a zụrụ azụ n’ụlọ nzukọ maka ozi ọma. Na oge ahụ, Nzukọ nsọ nke Kraịst dị ka ihe keere mmechi. Mana Ndị ozi ahụ nwetara ume iji kwado ọkpụkpọ ọkụ ha ma hazie agụgụala nke ụwa.

Gini mere ike si abịa site n’ụdị adịghị ike dị otu ahụ pụtara ihe? Onye ndu nke nzukọ nsọ ndị Anglica na ọka mmụta Frederic Farrar kwuru: “E nwere otu, ma naanị otu aziza dabara adaba—mbilite n’ọnwụ. Nnukwu mgbanwe a niile bụ n’ihi ike nke mbilite n’ọnwụ nke Kraịst.”4 Dị ka ndị aka ebe nke Onyenwe anyị bilitere n’ọnwụ, Ndị ozi maara na enweghị ihe pụrụ ịkwụsị ọrụ nke a site n’ịganiihu. Aka ebe ha bụụrụ isi iyi nke ike nkwado dị ka Nzukọ nsọ na mbido meriri ọdachi niile.

Na oge Ista nke a, dị ka otu niime ndị aka ebe Ya echiri echichi, ana m amaọkwa n’isi ụtụtụ otu ọmarịcha Sọnde, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bilitere n’ọnwụ iji gbaa anyị ume ma gbajie agbụ niile nke ọnwụ maka onye ọbụla. Jizọs Kraịst dị ndụ! Niihi Ya, ọnwụ abụghị nsọtụ anyị. Mbilite n’ọnwụ ahụ bụ onyinye efu zuru ụwa nke Kraịst nye mmadụ niile.

Kraịst na Meri Magdalene n’ebe ili

Kraịst na Meri n’ebe ili, site n’aka Josef Brickey

Bịakwutenu Kraịst

Ozi ọma ahụ na aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist bụ maka onye ọbụla—nke a bụ, onye ọbụla. Naanị ụzọ anyị ji enwe mmetụta ngọzi niile n’uju nke aja mgbghara mmehie nke Onye Nzọpụta bụ site na ịnabata ọkpụkpọ oku Ya n’otu n’otu: “Bịakwutenụ m” (Matiu 11:28).

Anyị na-abịakwute Kraịst dị ka anyị na-enwe okwukwe niime Ya ma chegharịa. Anyị na-abịakwute Ya dị ka anyị na-eme baptizim na aha Ya ma nata onyinye nke Mmụọ Nsọ. Anyị na abịakwute Ya dị ka anyị na-edobe iwu nsọ niile, nata emume nsọ niile, kwanyere ọgbụgba ndụ niile ugwu, nabata nhụmihe niile dị niime tempụl, ma bie ụdị ndụ nke ndị n’eso ụzọ nke Kraịst na-ebi.

Mgbe ụfọdụ, ị ga-ahụ nkụda mmụọ na ndakpọ olileanya Obi gị nwere ike ịgbawa maka onwe gị ma ọ bụ onye ị hụrụ n’anya. Ị nwere ike buru ibu site na mmehie nke ndị ọzọ. Mmejọ niile ị meworo—nwere ike bụrụ ndị siri ike—nwere ike itinye gị ụjọ na udo na ańụrị ahapụwo gị ruo mgbe ebighị ebi. Na oge ndị dị otu a, cheta na Onye Nzọpụta abụghị naanị na ọ na-ebupụ ibu nke mmehie kama na kwa “[ata] ahụhụ mgbu niile na mkpagbu niile na ọnwụnwa niile n’ụdị ọbụla” (Alma 7:11), gụnyere nke gị! N’ihi ihe ọ gabigara maka gị, Ọ mara na onwe Ya ka ọ ga-esi nyere gị aka dị ka ị na-anabata ọkpụkpọ ọku Ya na-agbaanwe ndụ: “Bịakwutenụ m.”

Anabatara Ihe Niile

Jizọs Kraịst emewo ka o doo anya na ụmụ niile nke Nna nke Eluigwe nwere nketa ha otu na ngọzi niile nke ozi ọma na Aja mgbaghara mmehie Ya. Ọ na-echetara anyị na mmadụ niile “nwere ohere otu onye dị ka ibe ya, ma ọdịghị onye ọ na-egbochi” (2 Nefi 26:28).

“Ọ na-akpọku ha niile ka ha bịakwute ya ma keta oke n’ịdị mma ya; ma ọdịghị onye ọ na-ajụ bụ onye na-abịakwute ya, ndị ojii na ndị ọcha, ndị oru na ndị nwe onwe ha, nwoke na nwanyị” (2 Nefi 26:33).

“Ọ na-akpọku ha niile”—nke a pụtara anyị niile! Anyị ekwesịghị ịtụkwasị onwe anyị ma ọ bụ ndị ọzọ akara elu na ihe dị iche iche. Anyị ekwesịghị itinye ihe mgbochi ọbụla nye ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta ma ọ bụ buru n’uche na anyị ma ọ bụ ndị ọzọ agaghị erute Ya. Dị ka m kwuru na mbụ, “Ọ gaghị ekwe omume na [onye ọbụla] ga-agbada karịa inweta ihe enweghị nsọtụ nke Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst na-egbuke.”5

Kama, dị ka Mụ na Nwanne nwanyị Holland kuziri naanị ọnwa ole ma ole tupu ya nwụọ, e nyere anyị iwu ka anyị “nwee afọ ọma, nke afọ ọma bụ ịhụnaanya” (2 Nefi 26:30).6 Nke a bụ ịhụnaanya ahụ Onye Nzọpụta na-egosi anyị, maka “Ọ naghị eme ihe ọbụla ma ọbụghị na ọ ga-abara ụwa uru; n’ihi na ọ hụrụ ụwa n’anya, ọbụna na ọ tọgbọrọ ndụ ya ka o wee kpọta ụmụ mmadụ niile n’ebe ọ nọ” (2 Nifaị 26:24).

Ana m agba-ama na Ozi ọma ahụ na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist bụ maka ndị mmadụ niile. Ana m ekpe ekpere ka unu were ọńụ nabata ngọzi niile Ọ na-eweta.

Hụba ama

  1. Howard W. Hunter, “Ozi ọma ahụ—Okwukwe Zuru Ụwa,” Ensign, Nov. 1991, 18.

  2. Lee Howard W. Hunter, “Mmadụ Niile Yiri Otu Nye Chineke” (Brigham Young University fireside, Feb. 4, 1979), 1–5, speeches.byu.edu.

  3. Enwere Ugwu Ndụndụ Dị Anya,” Abụ, no. 194

  4. Frederic W. Farrar, Ndụ nke Kraịst (1994), 656.

  5. Jeffrey R. Holland, “Ndị ọrụ nọ niime Ubi vaịn,” Liahona, Me 2012, 33.

  6. Lee Jeffrey R. Na Patricia T. Holland, “Ọdịniihu Jupụtara na Olileanya” (worldwide devotional for young adults, Jan. 8, 2023), broadcasts.ChurchofJesusChrist.org.