Liahona
Jiri Ekpere Na-azụ Mkpụrụ obi Gị Ugboro Ugboro
Eprel 2024


“Jiri Ekpere Na-azụ Mkpụrụ obi Gị Ugboro Ugboro,” Liahona, Epr. 2024

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Eprel 2024

Jiri Ekpere Na-azụ Mkpụrụ obi Gị Ugboro Ugboro

Anyị chọrọ nri nke ime mmụọ nke iso Nna anyị nke Eluigwe na-ekwurịta okwu, otu ngọzi dịịrị anyị ebe niile na mgbe niile.

Ịnọs na-ekpe ekpere

Foto nke onye na-eme ihe nkiri na-egosi Ịnọs site n’aka Matt Reier

Anyị niile enweela mgbe agụụ gụrụ anyị . Agụrụ bụ ụzọ anụ ahụ si agwa anyị na ọ chọrọ nri. Ma mgbe agụụ gụrụ anyị, anyị maara ihe anyị kwesịrị ime—rie nri.

Mmụọ anyị nwekwara ụzọ ndị i si mee ka anyị mara mgbe nri nke ime mmụọ dị anyị mkpa. Ma ọ dị ka ọ na-adịkarị anyị mfe ileghara agụụ nke ime mmụọ anya karịa agụụ nke anụ ahụ.

Dị ka e nwere ọtụtụ ụdị nri dị iche iche anyị nwere ike iri mgbe agụụ gụrụ anyị, e nwere ihe ndị dị iche iche anyị nwere ike ime iji mejuo agụụ nke ime mmụọ anyị. Iji maatụ, anyị nwere ike “rie oriri n’elu okwu niile nke Kraịst” (2 Nefi 32:3) dị niime akwụkwọ nsọ ma site na okwu niile nke ndị amụma. Anyị nwere ike na-aga ụka oge niile ma na-eri oriri nsọ (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 59:9). Anyị nwere ike ijere Chineke na ụmụ Ya ozi (lee Mosaia 2:17).

Mana e nwere isi iyi ọzọ nke nri nke ime mmụọ dịịrị anyị oge niile, na mgbe ọbụla na ndụ anyị, na-agbanyeghị ọnọdụ anyị niile. Anyị nwere ike ị nọ mgbe niile na-ekwurịta anyị na Nna nke Eluigwe site na ekpere.

“Mkpụrụ obi M Nwere Agụụ”

Mgbe onye amụma Enos na-achụ nta anụọhịa niime oke ọhịa, o chere gbasara “okwu ndị ahụ nke [ọ] nụworo ugboro ugboro nna [ya] na ekwu gbasara ndụ ebighị ebi, na ọn̄ụ nke ndị nsọ.” Okwu ndị a “mikpuru nime obi [ya]” (Enọs 1:3).

Niihi na Enos nọ n’ọnọdụ uche nke ime mmụọ nke a, o nwere mkpa siri ike: “Mkpụrụ obi m nwere agụụ,” ka o kwuru (Enos 1:4; nkwusi ike agbakwunyere)

Gịnị ka Ịnos mere mgbe o nwere agụụ nke ime mmụọ nke a, mkpa nke a maka nri nke ime mmụọ? “E gburu m ikpere n’ala n’iru Onyemere m,” o kwuru, “ma m wee tikuo ya na nnukwu ekpere na nnukwu arịrịọ n’ihi mkpụrụ obi nke m” (Ịnọs 1:4).

Oke ịdị ukwuu ka agụụ nke ime mmụọ Enos dị nke mere na o kpere ekpere “ogologo ụbọchị niile … ma mgbe abalị bịara [ọ] ka welikwara olu [ya] elu nke mere na o ruru eluigwe niile” (Ịnọs 1:4). N’ikpeazụ, Chineke zara ekpere ya ma gbaghara ya mmehie ya niile. Ịnọs nwere mmetụta mkpochapụ ikpe ọmụma ya. Kama nri nke ime mmụọ ya akwụsịghị ebe ahụ.

Ọ mụtara banyere ike nke okwukwe niime Jizọs Kraịst, ma ọ wụpụtara mkpụrụ obi ya dum nihi ndị ya—ọbụna ndị iro ya. Ya na Onyenwe anyị gbara ndụ ma o nwetara nkwa niile n’aka Ya. Ma mgbe Ịnọs kpechara nnukwu ekpere ya, ọ gagharịrị n’etiti ndị ya na-ebu amụma ma na-agba ama maka ihe niile nke ọ nụworo ma hụkwa. (Lee Inọs 15:19.)

Ọ bụghị ekpere ọbụla ka a ga-aza n’ụzọ dị ịrịba ama otu a, kama ahụmihe anyị niile na ekpere ka nwere ike ịba uru ma gbanwee ndụ. Anyị nwere ike ịmụta ụfọdụ ihe ọmụmụ dị mkpa site n’nhụmihe Ịnos nwere n’ekpere. Iji maatụ:

  • Ịgbalị ibi ndụ oziọma n’uju nwere ike inyere anyị aka ịhụ agụụ nke ime mmụọ anyị.

  • Agụụ nke ime mmụọ anyị nwere ike ma kwesịrị iwedata anyị n’ikpere anyị ikpe ekpere anyị ịchọ enyem aka nke Nna nke Eluigwe.

  • Ikpe ekpere nye Nna nke Eluigwe nwere ike inye aka mejuo agụụ nke ime mmụọ anyị—ma emesịa ụfọdụ.

  • Anyị nwere ike kpee ekpere ebe ọbụla, mgbe ọbụla.

  • Ekpere nwere ike inyere anyị aka chegharị.

  • Ekpere nwere ike ịgba okwukwe anyị ume nime Jizọs Kraịst.

  • Anyị nwere ike ịnata ama nke onwe na Nna anyị nke Eluigwe na-anụ olu anyị ma maara maka anyị.

  • Ama na ume anyị na-anata site n’ekpere nwere ike inyere anyị aka ije ndị ozi ma gbaa ndị ọzọ ume.

Okenye Soares dị ka nwata nwoke

Nhụmiihe m n’Ike nke Ekpere

Dịka Ịnos, A mụtara m ụfọdụ nime otu ụdị ihe ọmụmụ ndị a site na nhụmiihe nke onwe m. Nne na nna m banyere Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a mgbe m bụ nwata nwoke, ma mee baptizim mgbe m gbara afọ asatọ. Ana m enwe mmetụta dị mma, na-anụ ọkụ n’obi m mgbe niile gbasara Nna m nke Eluigwe, na gbasara Jizọs Kraịst, ozi ọma Ya eweghachitere, na Nzukọ nsọ Ya. Kama ọ bụghị mgbe ọ fọrọ obere ka m gbaa afọ iri na isii ka m bidoro kpee ekpere banyere eziokwu nke ihe ndị a.

Bishọp m nwere mkpatemmụọ gwara m ka m kuzie klas Ụlọ akwụkwọ Sọnde ndị ntoroọbịa. E kwesịrị m ịkuzi nkuzi gbasara otu anyị nwere ike isi nweta ama nke oziọma site na ekpere. Ọrụ a enyere sitere n’aka bishọp m kpatara m icheba echiche ime banyere ama nke onwe m. E jiwo m oge mụọ Akwụkwọ nke Mọmọn ma na-eche mgbe niile na Nzukọ nsọ ahụ bụ eziokwu. Ana m ekwere mgbe niile na Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst, kama ọ dịtụghị mgbe m tinyere n’obi nkwa nke Moronaị a hụrụ nime Moronaị 10:4-5. Ọ dịtụbeghị mgbe m kpere ekpere banyere ịbụ eziokwu nke oziọma ahụ.

E chetara m mmetụta niime obi m na ọ bụrụ na m ga-akuziri ndị ntoroọbịa ndị a ka ha ga-esi nweta akaebe site n’ekpere, e kwesịrị m ikpe ekpere maka akaebe nke onwe m. Agụụ gụụrụ mkpụrụ obi m—eleghị anya n’ụzọ dị iche na nke Ịnọs, mana otu o sila dị e nwere m mkpa nke ime mmụọ.

Ka m na-akwado ihe ọmụmụ ahu, egburu m ikpere nye Nna M nke Eluigwe ọchịchọ nke obi m iji kwadoo eziokwu ahụ m nwere mmetụta ya niime m. Anaraghị m atụ anya ihe ngosipụta dị ukwuu. Ma mgbe m jụrụ Onyenwe anyị ma oziọma ahụ bụ eziokwu, o nwere mmetụta dị oke ụtọ batara m n’obi—olu ahụ dị jụụ, dị nta na-akwado m na ọ bụ eziokwu nakwa na m ga-anọgide na-eme ihe m na-eme.

Mmetụta ahụ siri ike nke mere na enweghị m ike ileghara azịza ahụ anya wee sị na amaghị m. Eji m ụbọchị ahụ dum nwee obi ụtọ. Uche m nọ na eluigwe na-atụgharị uche na ọmarịcha mmetụta ahụ dị nime obi m.

Na Sọnde sochiri, m guzoro n’ihu ụmụ akwụkwọ ibe m atọ ma ọbụ anọ, bụ ndị nke m tọrọ. A gbaara m ha ama na Nna nke Eluigwe ga-aza ekpere ha ma ọbụrụ na ha nwere okwukwe.

Okenye Soares

Ekpere azara nke Okenye Soares natara dị ka nwa okoroọbịa ekwewo ka ọ gbaa ama—dị ka onye mgbasa ozi ọma (n’elu), nna na di, na Onye ozi—na Nna nke Eluigwe na-aza ekpere ekpere n’okwukwe.

Site mgbe ahụ gaaniihu, ọgbụgba ama nke a nọgidere niime m. O nyerela m aka ime mkpebi niile, karịchaa n’oge ndị m zutere ihe aka mgba niile. Ekpere ahụ n’ụbọchị ahụ, ya na ndị akaebe ọzọ m nataworo nime afọ niile, enyela m ohere ịgbara ndị mmadụ ama, inwe nkwenye, na ha nwere ike nweta azịza site n’aka Nna nke Eluigwe ma ọ bụrụ na ha ekpe ekpere n’okwukwe. Nke a bụworịị eziokwu dị ka m gbara ama dị ka onye mgbasa ozi ọma, dị ka onye ndu Nzukọ nsọ, dị ka nna na di, ma ọbụna taa dị ka Onye ozi.

Oge ahụ na Gịnị nke Ekpere

N’ezie, ọ bụghị naanị mgbe anyị nwere mkpa nke ime mmụọ dị ike ka anyị na-ekpe ekpere. Ya mere, olee mgbe anyị kwesịrị ikpe ekpere? Ma gịnị ka anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ya? Azịza dị mkpirisi bụ oge ọbụla na maka ihe ọbụla.

Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe. Ị mara nke a na-agbanwe otu anyị si ekpe ekpere. Onye amụma Josef Smit kuziri: “Ị mata ihe banyere Chineke, anyị na-amalite ịma otu anyị ga-esi na-agakwuru Ya, na otu esi na-arịọkwa ka anyị nweta azịza. … Mgbe anyị jikeere ịbịakwute Ya, Ọ na-adị njikere ịbịakwute anyị.”1

Nna anyị nke Eluigwe dị njikere mgbe ọbụla ige anyị ntị ma chọọ ka anyị kpee ekpere nye Ya na-esepụghị aka na ugboro ugboro. Anyị kwesịrị “ịnata ndụmọdụ naka Onyenwe anyị nihe niile [anyị] na-eme” (Alma 37:37) ma kpee ekpere ụtụtụ, etiti ehihie, na abalị. Anyị kwesịrị ikpe ekpere na ebe obibi, na ụlọ ọrụ, na ụlọ akwụkwọ—ebe ọbụla anyị nọ ma gbasara ihe omume anyị niile ọbụla (lee Alma 34:17-26).

Anyị kwesịrị ikpe ekpere n’ezi na ụlọ anyị niile (lee 3 Nifaị 18:21). Anyị kwesịrị ikpe ekpere “n’olu anyị na n’obi [anyị], n’iru ụwa ma na nzuzo” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81:3). Ma “mgbe [anyị] na-anaghị etiku Onyenwe anyị, [anyị kwesịrị] ikwe ka obi [anyị] juputa, ruo n’ikpe ekpere nye ya esepụghị aka maka ọdịmma [anyị], nakwa maka ọdịmma nke ndị ahụ gbara [anyị] gburugburu” (Alma 34:27). Ma anyị ahaghị ikpe ekpere mgbe niile nye Nna n’aha Jizọs Kraist (see 3 Nefi 18:19–20).

Josef Smit dị ka nwata nwoke

Ihe ngosipụta nke Josef Smit si n’aka Walter Rane, nke e nwere ike agaghị akọpị akọpị

Ịbịakwute Nna anyị nke Eluigwe

Nna anyị nke Eluigwe chọrọ ịgọzi anyị. Ma Ọ ga-eme—ọbụrụ na anyị rịọ. Onye amụma Josef Smit kuziri, “Chetakwa na ị nweghị ike nata ihe ọbụla ma ọbụrụ na ị rịọghị; ya mere rịọ n’okwukwe, ma ị ga-anata ụdị ngọzi niile dịka Chineke hụrụ na ọ dịmma inye gị.”2

Ekpere anyị mgbe niile na ekpere anyị ugboro ugboro bụcha akụkụ dị oke mkpa nke nri nke ime mmụọ ziri ezi nye mkpụrụ obi anyị agụụ na-agụ. Ị kwuru Nna nke Eluigwe okwu site n’ekpere dị adị ma dị nnabata ebe ọbụla na mgbe niile.

Otu nime akwụkwọ nsọ na-amasị m na-kuzi otu anyị kwesịrị iji gakwuru Nna anyị nke Eluigwe mgbe anyị gburu ikpere ikpe ekpere: “Ka ịdịrị umeala; ma Onyenwe anyị Chineke gị ga-ejide gị n’aka edu gị, ma nye gị aziza na ekpere gị nile.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:10.). Mgbe anyị dị umeala ma na-erube isi, Nna nke Eluigwe ga-anọnyere anyị. Ọ ga-edu anyị n’aka. Ọ ga-akpate mmụọ anyị site n’ebe anyị ga-aga na ihe anyị ga-eme. Ọ ga aza ekpere anyị dị ka otu n’uche Ya, ụzọ Ya, oge Ya siri dị, na ọmụma ihe zuru oke nke ihe dị mma nye anyị.

Anyị kwesịrị icheta nke a ma nwee ọńụ na ohere niile iji garuo n’oche eze nke Chineke ma nata ngọzi niile dị n’aka Ya.

Hụba ama

  1. Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Josef Smit (2011), 40, 41.

  2. Nkuzi niile: Josef Smit, 131.