Liahona
A Na-akpọ Anyị Oku Ịme Ihe ọma
Jun 2024


“A Na-akpọ Anyị Oku Ịme Ihe ọma” Liahona, June 2024.

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Jun 2024

A Na-akpọ Anyị Oku Ịme Ihe ọma

Anyị na-ewulite alaeze nke Chineke dị ka anyị na-ejere ndị ọzọ ozi, welie ìhè anyị elu, ma kwado mnwere onwe nke okpukperechi.

Gideon matara ozizi ụgha mgbe ọ nụrụ ya. Ọ nụwo ya mbụ site n’aka Eze Noa na ndị nchụaja ya—ndị nchụaja ndị “buliri onwe ha elu na mpako nke obi ha” na ndị “a kwadoro niime ume ngwu ha, ma n’ife arụsị ha, na n’ịgba akwụnakwụna ha, site n’ụtụ niile nke eze Noa bokwasịworo ndị ya” (Mozaya 11:5–6).

Nke ka njọ bụ, Eze Noa gburu onye amụma Abinadaị ma chọọ ibibi Alma na ndị ya atọghatara (lee Mozaya 17; 18:33–34). Ị mee ka ụdị ajọ omume ahụ kwụsị, Gideon ṅụrụ iyi ị kwụsị eze ahụ, onye ọ hapụrụ naanị nihi mbuso agha nke ndị Laman (lee Mozaya 19:4–8).

Mgbe emesịrị, Gideon tara ndị nchụaja nke Noa ahụ ụta n’ụzọ ziri ezi maka ịtọrọ ụmụada ndị Laman ruru 24. Ọ chọpụtara na amụma nke Abinadaị buru megide ndị ahụ ka emezuworo niihi na ha jụrụ ichegharị. (Lee Mozaya 20:17–22.) O nyere aka ịnapụta ndị nke Limhi, ndị nọ na-agbara ndị Laman ohu (lee Mozaya 22:3–9).

Ugbua o metụworo okenye, Gideon busoro ma mpako ma ajọ ọmume agha ọzọ dị ka o guzooro niihu Nehọ, onye webatara nchụaja ụgha n’etiti ndị mmadụ. Nehọ nọ “na-eme omume mweda megide nzukọ nsọ ahụ” ma na-agbalịsi ike iduhie ndị mmadụ ahụ. (Lee Alma 1:3, 7, 12; lee kwa 2 Nefi 26:29.)

Ijiri mkpụrụ okwu nke Chineke dị ka ngwa ọgụ ya, Gideon onye dị ike n’ọrụ dụrụ Nehọ ndụmọdụ maka ajọ omume ya. N’iwe, Nehọ busoro Gideon agha ma jiri mma agha ya gbuo ya. (Lee Alma 1:7–9.) Otu ahụ ka ụbọchị niile nke “nwoke ezi omume” si gwụ onye “meworo nnukwu ihe ọma n’etiti ndị nke a” (Alma 1:13).

N’ụbọchị ikpeazụ niile nke anyị bi niime ya na-enye anyị ọtụtụ ohere iji ṅomie Gideon dị ka “ngwa ọrụ n’aka Chineke” (Alma 1:8) site “na-iba uru” (Mozaya 22:4) nye ndị ọzọ, na-akwado ezi omume, na iguzogide ihe iyi egwu niile nye mnwere onwe anyị iji fee ofufe na ijere Chineke ozi. Dị ka anyị na-esoro ọmụmaatụ kwesịrị ntụkwasị obi nke Gideon, anyị ga-enwekwa ike mee ihe ọma karịa.

Foto, oyiyi
otu nwanyị ji abadamba efere nri guzoro n’akụkụ otu nwanyị dinara n’elu akwa

Jikọta aka ọnụ N’ije ozi

“Dị ka ndị na-eso ụzọ [nke Onye Nzọpụta], anyị na-achọ ịhụ Chineke na ndị agbata obi anyị gburugburu ụwa naanya,” ka Otu Ndịisi Mbụ kwuru. “Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazu a nwere oke mmasị ịgọzi ndị ọzọ ma nyere ndị nọ na mkpa aka. A gọziri anyị inwe ikike, akụrụngwa niile, na njikọ dị ntụkwasi obi zuru ụwa ọnụ iji mejupụta oke na ọrụ nke a dị nsọ.”1

Enwere m obi ekele maka ije ozi na ije ozi nlekọta achọghị ọdịmma onwe onye naanị nke ndị otu Nzukọ nsọ na-enye niime tempụl anyị niile na niime ngalaba ukwu niile, ngalaba nta niile, na stek ha niile. E nwekwara m obi ekele na ndị otu Nzukọ nsọ na-eje ozi niime ọtụtụ otu dị na obodo, nke agụmakwụkwọ, na nke obi ọma nakwa na ha na-etinye aka niime ọtụtụ ọrụ ruru puku kwuru puku maka ọdịmma ụmụ mmadụ kwa afọ, na-enye n’efu awa ha ruru nde kwuru nde niime obodo na mpaghara ọfọrọ ntakịrị ka ọ ruo 200.2

Otu ụzọ Nzukọ nsọ si abawanye ohere ije ozi niime ọtụtụ obodo bụ site na JustServe.org. Ọ bụ Nzukọ nsọ na-akwado ya mana ọ dị adị maka onye ọbụla chọrọ ịgọzi ndị ọzọ, JustServe.org “na-ejikọta mkpa niile obodo nwere ya na ndị ọrụ afọ ofufo” ndị “na-emelite ọnọdụ ndụ niime ọbodo.”3

Nzukọ nsọ na ndị otu ya nakwa abịakọta ọnụ ha na otu ije ozi ndị ọzọ gburugburu ụwa. Nzukọ nsọ, ekele dịịrị ndị otu ya, buburu “onye kacha kwado Red Cross na-inwete ọbara na 2022.” Na mgbakwunye, Nzukọ nsọ na nso nso a nyere Red Cross onyinye ego ruru nde $8.7.4

Nzukọ nsọ nakwa esonye ọtụtụ otù n’iwete mmiri dị ọcha na ọrụ niile ịdị ọcha ruo mpaghara dị iche iche gburugburu ụwa. Na 2022, Nzukọ nsọ sonyere niime ọrụ niile ruru 156 dị otu ahụ.5 Anyị nakwa emekọta ma na-enye ọtụtụ otù ndị ọzọ onyinye ego ndị na-enwete enyemaka nye ụmụ Chineke na-ata ahụhụ.6

“Mgbe anyị jikọtara aka na-ijere ndị nọ na mkpa ozi,” ka Onyeisi Henry B. Eyring, Onye ndụmọdụ nke Abụọ niime Otu Ndịisi Mbụ kwuru, “Onyenwe anyị na-eme ka obi anyị niile dịrị n’otu.”7

Foto, oyiyi
aka niile emere n’ụdị iko ya na ihé nke anyanwụ

Welie Ihé Gị Elu

Dị ka ndị na-eso ụzọ Onye Nzọpụta, anyị nakwa agọzi ndị agbata obi anyị dị ka anyị na-edebe ọgbụgba ndụ anyị ma na-ebi ndụ yiri nke Kraịst. Akwụkwọ nke Mọmọn na-akuzi na “ndị mmadụ nke nzukọ nsọ” ekwesịghị ịhọrọ naanị ezi omume mana kwesịkwara ime ka a nụ olu ezi omume ha ma ọ bụrụ ma ha chọọ ka Onyenwe anyị chekwaa ma mụbaa ha (lee Alma 2:3–7; leekwa Mozaya 29:27). Onyenwe anyị chọrọ ka anyị kesaa okwukwe na nkwenye anyị niile ma welie ihè anyị elu. “Lee A bụ m ìhè ahụ nke unu ga-eweli elu” (3 Nifaị 18:24).

“Anyị adịghị ejere Onye Nzọpụta anyị ozi nke ọma ma ọ bụrụ na anyị tụọ mmadụ egwu karịa Chineke,” ka Onyeisi Dallin H. Oaks, Onye ndụmọdụ Mbụ niime Otù Ndịisi Mbụ kwuru. Ọ gbakwụnyere, “Akpọrọ anyị ọku ihiwe ọkọlọtọ nke Onyenwe anyị, ọbụghị isoro nke ụwa.”8

Ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ụlọ ọrụ, ma ọ bụ n’ebe egwuruegwu, na njem ezumike, ma na-ime enyi nwoke na nwanyị, na intanetị, ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị anaghị eme “ihere iwekwasị onwe ha aha nke Kraịst” (Alma 46:21). Site n’okwu ọnụ anyị na ọrụ anyị, anyị na-agba akaebe na Chineke dị ndụ ma na anyị na-eso Ọkpara Ya.

“Okwukwe anyị abụghị nke ekebiri ekebi, ma ọ bụ na o kwesịghị ịdị otu ahụ. Okwukwe abụghị naanị maka nzukọ nsọ, ọ bụghị naanị maka ebe obibi, ọ bụghị naanị maka ebe [ụlọ akwụkwọ],” ka Paul Lambert, Onye nsọ Ụbọchị ikpeazụ onye okachamara nke ọtụtụ okpukperechi kwuru. “Ọ bụ maka ihe niile nke ị na-eme.”9

Anyị amaghị mmetụta ịgba ama anyị, ezigbo ọmụmaatụ anyị, na ezigbọ ọrụ anyị nwere ike na ndụ ndị ọzọ. Mana dị ka anyị guzooro maka ihe ziri ezi ma welie ihè nke Onye Nzọpụta elu, ndị mmadụ ga-ahụ anyị ma eluigwe ga-akwado anyị.

Foto, oyiyi
nwanyị guzooro n’ezi tempụl

Guzoro maka Mnwere onwe nke Okpukperechi

Nchụaja ụgha nke taa, tinyere mbawanye ọha mmadụ na-akparị ndị nke okwukwe, adịghị nnọọ iche dị ka n’oge Akwụkwọ nke Mọmọn. Olu ndị ahụ na-emegide ọrụ dị mkpa nke okpukperechi na-arụ n’okwu banyere ọha na eze na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-abawanye n’oke olu. Ndị nkwado iwepụ okpukperechi na ndị ọchịchị, gụnyere ọtụtụ ụlọ akwụkwọ na mahadum, na-amanye omume na ikwusa ozi omume rụrụ arụ, ekweghị na chi, na ime omume dị ka onye si chọọ.

Agha a na-ebuso mnwere onwe nke okpukperechi ga-enwe mmeri ma ọ bụrụ na anyị eguzosighị ike maka ikike niile okpukperechi anyị. “Dị ka nzukọ nsọ,” a kuziri m na nso nso a, “anyị jikọtara aka anyị na ndị okpukperechi ndị ọzọ iji chekwaa ndị okwukwe na nkwenye niile na ikike ha nwere iji kwupụta nkwenye ha niile.”10

Agha alụrụ n’eluigwe bụ maka ezi ohere nhọrọ—mnwere onwe anyị nwere iji mee nhọrọ. Iji chekwaa ohere nhọrọ anyị pụtara na-anyị ga-anọgidesike na-ichekwa mnwere onwe nke okpukperechi.

Okwukwe okpukperechi siri ike na-agba ume nye ma na-echekwa ezi na ụlọ, obodo niile na mba niile. Ọ na-arọpụta nrube isi nye iwu, nkwanye ugwu maka ndụ na ihe onwunwe, ma na-akuzi afọ ọma, nkwụwa aka ọtọ, na omume ọma—agwa ọma achọrọ achọ maka iji hiwe obodo ziri ezi, nweere onwe, na mkparịta ziri ezi. Anyị ekwesịghị ma ọlị ịrịọ mgbaghara maka okwukwe anyị.

Mbọ niile mgbasa ozi ọma anyị na-agba, ọrụ nnochite anya anyị niime tempụl niile, mbọ anyị na-agba iji wuo alaeze nke Chineke, na obi ụtọ anyị kpọmkwem na-achọ ka anyị guzoro kwem maka okwukwe na mnwere onwe nke okpukperechi. Anyị agaghị atufu mnwere onwe ahụ na-atụfụghi mnwere onwe ndị ọzọ.

Onye amụma Josef Smit kuziri, “Ọ bụ ịhụnnanya nke mnwere onwe nke na-akpali mkpụrụ obi m—mnwere onwe nke omume na nke okpukperechi maka agbụrụ ụmụ mmadụ niile.”11 Mnwere onwe nke okpukperechi gakwa akpali mkpụrụ obi anyị dị ka anyị na-esoro ndụmọdụ sitere n’aka ndị ndu Nzukọ nsọ:

  • “Nọgidenụ na mmata ihe maka ihe ndị dị mkpa metụtara ọha na eze, ma mgbe ahụ kwuo okwu n’obi ike na n’ụzọ nwere nkwanye ugwu.”12

  • Ghọta na mbuze nke mnwere onwe okpukperechi ga-emetụta n’ụzọ dị ukwuu ohere anyị itolite n’ike na n’ọmụma ihe nke ozi ọma, ịnata ngọzi site na emume nsọ ndị dị nsọ, na ịdabere na Onyenwe anyị iduzi Nzukọ nsọ ​​Ya.”13

  • “Bilie ma kwupụta okwu iji kwupụta na Chineke dị adị nakwa na e nwere ezi okwu zuru oke nke iwu nsọ Ya niile na-ehiwe.”14

  • “Megide iwu ndị ga-emebi mnwere onwe anyị ime okpukperechi anyị niile.”15

  • “Gaa n’ụwa ime ihe ọma, iwulite okwukwe niime Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, na inye aka kpọta ndị ọzọ n’ebe a ruo obi ụtọ karịrị akarị.”16

  • Mụọ akụrụngwa niile na religiousfreedom.ChurchofJesusChrist.org nakwa na religiousfreedomlibrary.org/documents.

Anyị na-ewulite alaeze nke Chineke dị ka anyị na-eje ozi, welie ìhè anyị elu, ma kwado mnwere onwe nke okpukperechi. Ka Onyenwe anyị gozie anyị na mbọ anyị na-agba ime “oke ihe ọma” n’etiti ezi na ụlọ anyị, obodo anyị na mba anyị niile.

Hụba ama

  1. Ozi si n’aka Otu Ndịisi Mbụ,” niime Nlekọta nke Ndị nọ na Mkpa: Nkọwa omenaafọ nke 2022 nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, 3, ChurchofJesusChrist.org.

  2. Lee Nlekọta nke Ndị nọ na Mkpa: Nkọwa omenaafọ nke 2022, 4, ChurchofJesusChrist.org.

  3. Justserve.org/about. JustServe dị ugbua niime obodo 17. A na-agọzi ọtụtụ puku kwuru puku mmadụ na òtù dị iche iche site na atụmatụ nke a.

  4. Lee Kaitlyn Bancroft, “Nzukọ nsọ Nyere onyinye ego Nde $8.7 dị ka akụkụ nke Njikọta aka ha na Red Cross,” Church News, Apr. 22, 2023, 23.

  5. Lee Mary Richards, “Nzukọ nsọ ​​na ọtụtụ Otu dị gburugburu Ụwa Jikọtara aka ọnụ Iji nweta Onyinye nke Mmiri,” Church News, May 27, 2023, 12.

  6. Lee Dallin H. Oaks, “Inyere Ndị Ogbenye Na Ndị nọ na Mkpagbu aka,” LiahonaNov. 2022, 6–8.

  7. Henry B. Eyring, “Ohere ọma niile Ime Ihe ọma,” Liahona, Me 2011, 25.

  8. Dallin H. Oaks, “Ije ozi Achọghị ọdịmma naanị onwe,” Liahona, Me 2009, 94–95.

  9. Paul Lambert, niime Rachel Sterzer Gibson, “Gịnị Kpatara ejiri nwee Mkpa Okwukwe n’ebe Ọrụ?” Church News, Apr. 22, 2023, 16.

  10. Ronald A. Rasband, “Ị Gwọ Ụwa,” Liahona, Me 2022, 92.

  11. Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Josef Smith (2011), 345.

  12. D. Todd Christofferson, “Mnwere onwe nke Okpukperechi—Ihe Nketa Aga Echebe” (ozi enyere n’ebe Freedom Festival Patriotic Service, Provo, Utah, June 26, 2016), 5–6, speeches.byu.edu.

  13. Ronald A. Rasband, “Mnwere onwe ịme Nhọrọ” (Brigham Young University devotional, Jan. 21, 2020), 3, speeches.byu.edu.

  14. Dallin H. Oaks, “Eziokwu na Ndidi” (Brigham Young University devotional, Sept. 11, 2011), 2, speeches.byu.edu.

  15. Dallin H. Oaks, “Eziokwu na ndidi,” 4.

  16. Ronald A. Rasband, “Mnwere onwe ime Nhọrọ,” 5, speeches.byu.edu.

Bipụta