“Nnukwu Ọrụ nke Onyenwe anyị na Nnukwu Ohere nke anyị,” Liahona, Julaị 2024.
Ozi Liahona Kwa ọnwa, Julaị 2024
Nnukwu Ọrụ nke Onyenwe anyị na Nnukwu Ohere nke anyị
Mgbe anyị na-ahụ naanya, kesaa, ma kpokuo, anyị na Onyenwe anyị na-arụkọ ọrụ ọnụ iji nyere mkpụrụ obi ọbụla aka bịakwute Ya.
Onye amụma ọbụla n’oge ọgbọ nke ikpeazu nke a, dị nnukwu akuziworo ndị otù Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ ikesa ozi ọma Jizọs Kraịst eweghachitere. Nime oge nke ndụ m, ọmụmatụ ole n’ole abịawo m n’uche:
Onyeisi Devid O. McKay (1873-1970), onye amụma nke ntoroọbịa m, kwupụtara, “Onye otù ọbụla bụ onye mgbasa ozi ọma.”
Onyeisi Spencer W. Kimball (1895-1985) kuziri, “Ụbọchị ahụ maka iburu ozi ọma ahụ ruo ọtụtụ ebe karịa ma ruo ndị mmadụ karịa bụ n’ebe a na ugbua,” ma “anyị kwesịrịrị imejupụta ike anyị” n’ikesa ozi ọma ahụ nye ndị ọzọ.
Onyeisi Gordon B. Hinckley (1910-2008) kwuru: “Nnukwu bụ ọrụ anyị, ịtụnaanya bụ oke na ọrụ anyị n’inye aka chọta ndị ahụ a ga-akuziri. Onyenwe anyị enyewo anyị ọrụ nke ikuziri ihe niile ekere eke ozi ọma ahụ. Nke a ga ewe mgbalị [anyị] ndị kacha.”
Ma Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo na: “Ọrụ mgbasa ozi ọma bụ akụkụ dị oke mkpa nke nnukwu mkpọkọta nke Israel. Mkpọkota nke ahụ bụ ọrụ kachasị mkpa na-eme n’ụwa taa. Enweghị ihe ọzọ na-atụnyere ya n’ịdị ukwuu. Enweghị ihe ọzọ na-atụnyere ya n’ịdị mkpa. Ndị mgbasa ozi ọma nke Onyenwe anyị—ndị na-eso ụzọ Ya—sonyere niime ịma aka mgba kachasị ukwuu, ihe kachasị ukwuu, ọrụ kachasị ukwuu n’ụwa taa.”
A bịara m mata nke a maka onwe m mgbe m bụ onye mgbasa ozi ọma nta n’ebe British Mission. A matara m ya ọbụna n’ezie taa. Dị ka Onye ozi nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, A na m agba akaebe na ohere niile juru ebe niile iji nyere ndị ọzọ aka bịakwute Kraịst site na-igosi ịhụnaanya anyị, ikesa nkwenye anyị niile, na ikpọku ha isonyere anyị nwete nhumiihe nke ọńụ nke ozi ọma Jizọs Kraịst.
Ọrụ ahụ N’aga Niihu
Enwetere m ohere isonye n’ọrụ nke Ngalaba Mgbasa ozi ọma nke Nzukọ nsọ mgbe ebipụtara Kwusaa Ozi ọma M nke mbụ n’afọ 2004, ma ọzọ mgbe ewepụtara nke abụọ ya n’afọ 2023. E kwere m na Kwusaa Ozi ọma M agọziwo ọru mgbasa ozi ọma n’ụzọ dị ukwuu.
Akwụkwọ Kwusaa Ozi ọma M nke ọhụrụ ahụ gụnyere ihe niile anyị mụtara kemgbe 2004, ntuziaka akpakere nke ndị otù Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ ọbụla, na mgbanwe niile emere maka ikesa ozi ọma n’oge dijitalụ. Ụfọdụ mgbanwe ndịa ebutewo ọganiihu ndị pụrụ iche.
Anyị ahụtawo na ikesa ozi ọma ahụ n’ụzọ dị nkịtị, n’ụzọ dị mfe, na ụzọ niile nke okike site na ụkpụrụ niiile nke “ịhụnaanya, ikesa, ikpoku” na-agọzi alaeze n’ụzọ dị ukwuu. Jizọs Kraịst kesara ozi ọma ahụ otu a mgbe O biri n’elu ụwa. O kesara ndụ Ya na ịhụnaanya Ya ma kpọkuo onye niile ịbịakwute Ya (lee Matiu 11:28). Inwe ịhụnaanya, ikesa, na ikpoku dị ka O mere bụ ngọzi na oke na ọrụ pụrụ iche maka onye otù Nzukọ nsọ ọbụla.
Malite jiri Ịhụnaanya
Na Ubi nke Getsemane ma n’elu obe ahụ, Jizọs Kraịst wekwasịrị n’onwe Ya njọ niile nke ụwa ma taa ahụhụ iri uju niile na “mgbu niile na mkpagbu niile na ọnwụnwa niile n’ụdị ọbụla” (Alma7:11). Nke a “mere ka [Ya], … onye kachasị elu, ịma jijiji n’ihi mgbu, na ịgba ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:18.). Site na Aja mgbaghara mmehie na Mbilite n’ọnwụ Ya, Jizọs Kraịst emewo ka nzọpụta na mbuli elu kwee omume maka onye niile.
Ichighari n’ebe Onye Nzọpụta nọ ma tulee n’uche ihe niile O meworo maka anyị na-arọpụta niime anyị obi nke juputara n’ịhụnaanya maka Ya. Mgbe ahụ Ọ na-echigharị obi anyị niile n’ebe ndị ọzọ nọ ma nye anyị iwu ịhụ ha naanya (lee Jọn 13:34–35) na ikesara ha ozi ọma Ya (lee Matiu 28:19; Mak 16:15). Ọ bụrụ na ndị ahụ nọ anyị gburugburu ga-enwete mmetụta na anyị n’ezie nwere ịhụnaanya na nlekọta maka ha, ha nwere ike imeghe obi ha niile nye ozi anyị, dị ka Eze Lamoni meghere obi ya iji nata ozi ọma ahụ niihi ịhụnaanya na ije ozi nke Ammọn (lee Alma 17:19).
Mgbe anyị na-ekesa ozi ọma ahụ, ka anyị jiri ịhụnaanya malite. Dị ka anyị na-esetịpụrụ ndị ọzọ aka n’ịhunaanya—wee na-echeta na ha bụ ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na ụmụ ahụrụ naanya nke Nna anyị nke Eluigwe—ọtụtụ ohere ga-emeghe maka anyị ikesa ihe anyị maara bụ eziokwu.
Nọrọ N’oke Agụụ Ichuso na Ikesa
Enweghi onye kacha tinye obi n’ikesa ozi ọma ahụ karịa Onyeisi M. Russell Ballard (1928–2023). N’okwuchukwu ikpeazu ya nke ọgbakọ zuru ọha, ọ gbara akaebe sị, “Otu niime ihe ndị kacha dị ebube ma dị ịtụnaanya na onye ọbụla dị niime ụwa nke a nwere ike ịma [bụ] na Nna anyị nke Eluigwe na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ekpughewo Onwe Ha n’ụbọchi ikpeazụ nke a ma na eweliteworịị Joseph [Smith] iweghachite uju nke ozi ọma ebighị ebi nke Jizọs Kraịst.”
Gburugburu ndụ ya niile, ma ruo nsọtụ niile nke ụwa, Onyeisi Ballard anọrọwo n’oke agụụ ichuso na ikesara onye niile ozi nke a dị oke ọnụ ahịa. Ọ gbawo anyị niile ume ka anyị meekwa otu ahụ. Ọ kuziri na anyị na-ekesa ozi ọma ahụ “site na-ịbụ ezigbo ndị agbataobi na site n’ilekọta na igosi ịhụnaanya.” Site na ime otu a, anyị “egosipụta ozi ọma ahụ niime ndụ nke onwe anyị, ma … gosipụtara [ndị ọzọ] ngọzi niile nke ozi ọma ahụ nwere inye.” Anyị nakwa “agba ama maka ihe [anyị] maara ma kwere na ihe na-emetụta [anyị].” Onyeisi Ballard kuziri, “Ọgbụgba ama nke na-enweghi ntụpọ … ka enwere ike iburu site n’ike nke Mmụọ Nsọ buba niime obi niile nke ndị ọzọ ndị ghe oghe ịnabata ya.”
Ikesa ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere bụ ọchịchọ obi kacha ibe ya dị n’obi Onyeisi Ballard. Anyị pụrụ ịnọrọ n’oke agụụ ichuso—dị ka ọ nọọrọ—n’ikesa ozi ọma ahụ n’okwu na n’omume. Anyị amaghị ma ọlị onye nọ n’etiti anyị onye were ike ị na-achọ maka ìhè nke ozi ọma mana ọ maghị ebe a ga-achọta ya (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 123:12).
Nyeruo Okù Sitere n’obi
N’inyere ndị ọzọ aka bịakwute Kraịst, anyị na-akpọku ha inwete ọńụ nke Onye Nzọpụta na ozi ọma Ya na-ewete. Anyị nwere ike mee otu a site na-ịkpọku ha ịbịa otu emume, ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn, ma ọ bụ zute ndị mgbasa ozi ọma. Anyị nwere ike nye ha okù sitere n’obi ka ha soro anyị bịa nzukọ oriri nsọ.
Anyị na-eje nzukọ oriri nsọ izu ụka ọbụla iji “fee Chineke ofufe ma rie oriri nsọ iji cheta Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya.” Nke a bụ oge ohere maka ndị mmadụ inwete mmetụta Mmụọ ahụ, bịaruo Onye Nzọpụta nso, ma gbaa okwukwe ha nwere na Ya ume.
Dị ka anyị na-achọ ụzọ iji hụ naanya, kesaa, ma kpọkuo, atụmatụ na mgbalị anyị niile kwesịrị ịgụnye inyere ndị mmadụ aka ịbịa nzukọ oriri nsọ. Ọ bụrụ na ha ga-anabata okù anyị ma bịa nzukọ oriri nsọ, ọ ga aka adịrị ha mfe ịganiihu n’okporo ụzọ nke baptizim na mgbanwe. Ejiri m obi m niile kwere na ọganihu dị ukwuu ga-abịa dị ka anyị na-akpọku ndị ọzọ ị bịa nzukọ oriri nsọ ma nyere ha aka mata ngọzị niile ha pụrụ ịnata site na-ime otu ahụ.
Onyenwe anyị Ga-edu Anyị
Anyị agaghị ama ọganiihu na ịma aka niile anyị ga-enwe dị ka anyị na-ahụ naanya, na-ekesa, ma na-akpọkụ. Ụmụ ndị nwoke Mozaya “gagharịrị site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, na site notu ụlọ ofufe ruo ọzọ, … n’etiti ndị Leman, ikwusa ozi ọma na ikuzi okwu nke Chineke n’etiti ha; ma otu a ha malitere inwe nnukwu ime nke ọma.” Site na mbọ ha niile, “puku kwuru puku ka a kpọtara n’ọmụma nke Onyenwe anyị,” ma ọtụtụ ka “agbanwere … [ma] enweghị mgbe ha dapụrụ ọzọ.” (Alma 23:4–6).
Na-agbanyeghị na nke a agaghị abụ nhụmiihe gị mgbe niile, Onyenwe anyị ekwewo nkwa na Ọ ga-esoro anyị rụọ ọrụ niihi na mkpụrụ obi ọbụla dị oke ọnụ ahịa nye Ya. Dị ka anyị na-atụkwasị obi na Onyenwe anyị ma tinye aka na-ije ozi Ya, Ọ ga-edu anyị otu anyị si ekesara ndị ọzọ ozi Ya site na ịhụ ha naanya, ikesa ndụ anyị na ọgbụgba ama anyị niile nye ha, na ikpọku ha isonyere anyị n’isoro Ya.
“Ịdị ukwuu ka ọn̄ụ [anyị] ga-adị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:15) mgbe anyị weere ohere niile nọ anyị gburugburu iji nyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst aka nime nnukwu ọrụ Ya nke ịkpọta mkpụrụ obi niile n’ebe Ọ nọ.
© 2024 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Julaị 2024. Igbo. 19293 593