Liahona
Gamentị nke Ọkwa nchụaja Dị Nsọ
Septemba 2024


“Gamentị nke Ọkwa nchụaja Dị Nsọ,” Liahona, Sept. 2024.

Ozi LiahonaKwa ọnwa, Septemba 2024

Gamentị nke Ọkwa nchụaja Dị Nsọ

Dị ka akụkụ nke onyinye dị nsọ nke tempụl, enyewo anyị ihe ncheta dị nsọ gbara ọkpụrụkpụ nke ọgbụgba ndụ anyị—ihe atụ nke Onye Nzọpụta N’onwe Ya.

Adam na Iv na-ejekọta ije ọnụ

Nkọwa sitere na Adam na Iv, site n’aka Douglas M. Fryer

Agbanyeghị nkwado na-enweghị obi abụọ enyere ha na mmesigharị obi ike niile ha gbalịrị icheta, ọ ghaghị ịbụ ihe ụjọ dị ịtụnaanya nye Adam na Iv ịhapụ Ogige nke Iden ha ahụ yiri ka paradaịs ma zọba ije niime ụwa dara ada.

Site na mmata ihe dị nro, ha matara ihe ọ pụtara ịgbanwe ndụ udo ha na-enweghị nchekasị, maka ụwa nke mmegide na ajịrịja, ogwu na mgbu—nke ihe akpọrọ ọnwụ n’ikpeazụ na-esote. Ha agaraghị enwe ike amata na mmalite ihe ihe ndị a niile pụtara, mana na-eteghị anya ha matara ụbọchị nke ọbụla nwere ike iwete mgbu ọhụrụ. N’ezie, ihe kachasị egbu mgbu niihe niile bụ mmata ihe na ha ga-ezute ihe a niile ka ekewapụrụ ha site nebe Nna ha bi n’Eluigwe nọ—“achụpụrụ site niihu ya,” Moses mesịrị dekọọ.

Itule nkewapụ na owu ọmụma nke a niime ụwa jụrụ oyi, dị egwu, ọ ga-abụrịrị ihe nkasị obi nye Adam na Iv icheta otu ihe: na ekwewo nkwa—ihe dị nsọ na dị ebighị ebi akpọrọ ọgbụgba ndụ niile. Ha ekwewo nkwa na ha ga-erubere Nna isi ụbọchị ndụ ha niile, ma O kwewo nkwa inye Onye Nzọpụta, onye ga-ebelata mwute na mgbu ha, gbaa aja maka njehie ha niile, ma kpọtaghachi ha n’udo niihu Ya.

Mana kedụ otu ndị a pụrụ ịnwụ anwụ si echeta ihe ha kweworo na nkwa? Kedụ otu ha ga-esi anọgide ịmata ọnọdụ ha dị egwu—mara oge niile, ehihie na abalị?!

Ihe Ncheta nke Ọgbụgba ndụ Ha niile

Maka ụdị ihe ncheta a O nyere ha “kootụ nke akpụkpa.” Lee ụdị onyinye nke a bụ na mgbe o ji bịa. Mgbe ha richara mkpụrụ osisi amachibidoro, ọ fọrọ nke nta Adam na Iv amata ozugbo na ha gba ọtọ. Na mbụ, ha gbalịrị iji akwụkwọ fig ji kpuchie ọtọ ha. Emesịa, na-ịtụ egwu na nke ahụ ezughị, ha nwara izotu site niihu Onyenwe anyị. (Ụdị mbọ nzuzu a bụ ihe aka ebe na ndụ anụ ahụ na amalite!) Site n’oge ahụ ruo ugbu a, Nna dị ịhụnaanya akpọkuwo ụmụ Ya isi n’ebe nzuzo, pụta, bịakwute Ya. Ma dị ka kootụ nke akpụkpa mgbe ahụ na ihe uwe oyiyi niile dị iche iche kemgbe ahụ, Ya na ebere Ya ahapụbeghị k’anyị gbara ọtọ mana eyiwewo ndị nwere nrube isi na “uwe mwụda nke eziomume,” ihe ncheta nke nkwa na ọgbụgba ndụ anyị niile. “Gamentị niile nke nzọpụta” ndị a na-abụ ihe atụ onyinye kachasị ihe niile, Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.

Gamentị Bụ Ihe atụ nke Onye Nzọpụta

N’ezie, echiche nke a niile banyere Adam na Iv na ọgbụgba ndụ niile na uwe oyiyi bụ, n’ezie, ihe karịrị nnọọ mmega ahụ nke uche. Ọ raghị ahụ iche otu o si emetụta Adam na Iv, niihi na anyị nwakwa na-ezute nsogbu niile niime ụwa nke a dara ada. Anyị nwakwa ka ekewapụrụ site niihu Chineke, ma anyị na-aganiihu ewepụ onwe anyị n’ebe dị anya mgbe ọbụla anyị jehiere. Dị ka Adam na Iv, enyewo anyị otu ụdị Onye Nzọpụta ahụ, Jizọs Kraịst nke Nazareth, Alfa na Omega, Ọkpara nke Chineke dị ndụ. Dị ka Adam na Iv, anyị agbawo ọgbụgba ndụ anyị na Chineke. Ma, dị ka akụkụ nke onyinye dị nsọ nke tempụl, enyewo anyị ihe ncheta dị nsọ gbara ọkpụrụkpụ nke ọgbụgba ndụ ndị ahụ—ihe atụ nke Onye Nzọpụta N’onwe Ya. Niime ọgbọ anyị ana akpọ ya gamentị nke ọkwa nchụaja dị nsọ.

eserese nke Jizọs Kraịst

Nkọwa sitere na Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, site n’aka Harry Anderson

Anyị na-eyi gamentị nke a n’okpuru uwe ahụ anyị. Oke na ọrụ nke ọbụla m nwere, ọrụ niile ọbụla m na-arụ niime ndụ, ọrụ ọbụla nke ibi ndụ kwa ụbọchị na-achọ, n’okpuru ha niile bụ ọgbụgba ndụ m niile—mgbe niile na ruo ebighị ebi. N’okpuru ya niile bụ nkwa niile ndị ahụ dị nsọ nke m na-ejidesi ike. Gamentị abụghị ihe a na-ewepụta ihe ma ọ bụ gosi niihu ụwa, ọbụghị ma ọ bụ ọgbụgba ndụ m niile. Mana ana m edebe ha abụọ na nso nso m—nso nso dị ka m pụrụ ime. Ha bụ maka nke onwe ma kachasị dị nsọ.

Na icheta ọgbụgba ndụ ndị ahụ niile, nkwa aka abụọ ndị ahụ niile, anyị na-eyi gamentị gburugburu ndụ anyị. Omume nke a na-egosipụta ọchịchọ anyị maka Onye Nzọpụta ịbụ ike mmetụta na-adịkarị mgbe niile niime ndụ anyị. Ihe atụ ndị ọzọ na-eme kwa mgbe kwa mgbe. Ana eme anyị baptizim otu ugboro niime ndụ anyị. Anyị na-eri oriri nsọ otu ugboro notu izu ụka. Anyị na-eje tempụl dị ka ọnọdụ kwere. Mana gamentị nke ọkwa nchụaja dị nsọ dị iche: ihe atụ nke a k’anyị na-asọpụrụ ehihie na abalị niile.

Ma otu ahụ ka ọgbụgba ndụ niile dị—na-abụghị na-edebere ya iche maka ndịrịmfe ma ọ bụ akpachapụghị anya ma na-emezighị ya ka ọ dabara nka niile na ejiji niile nke obodo. Na ndụ nke onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, ụzọ niile nke ụwa ka ahaghị imezi ịdaba n’ọgbụgba ndụ anyị niile, na-abụghị n’ụzọ ọzọ.

Mgbe anyị na-eyi gamentị, anyị bụ, dị ka Otu Ndịisi Mbụ kuziworo, iyinye ihe atụ dị nsọ nke Jizọs Kraịst. Ya mere, kedụ ihe mere anyị ga-eji ele anya maka ngụpụ iji yipụ ihe atụ ahụ? Kedụ ihe mere anyị ga-eji anaghara onwe anyị nkwa niile nke ike, nchekwa, na ebere nke gamentị ahụ na-anọchite? Na mmegide, oge ọbụla ọ dị ezigbo mkpa iyipụ gamentị nwa oge, anyị kwesịrị inwe ịnụ ọkụ n’obi iyinyeghachi ya, ngwa ngwa o kwere omume, niihi na anyị na-echeta ma nkwa niile na ihe egwu niile na-enye ọgbụgba ndụ anyị uru. Karịa ihe niile, anyị na-echeta obe ahụ na ili nke Kraịst ghe oghe.

Ụfọdụ nwere ike kwuo, “E nwere m ụzọ ndị ọzọ iji cheta Jizọs.” Ma aga m azaghachi, nke ahụ dị ịtụnaanya. Ọ dịrị karịa ya, ọ ka mma. Ka anyị niile chee maka ka ha ra bụ ụzọ niile anyị nwere ike iji debe mkpebi anyị iji “na-echeta ya mgbe niile.” Mana site na-ime otu a, ọ ga-abụ ekweghiekwe ịmara ama leghara ihe ncheta Onyenwe anyị N’onwe Ya nyere ndị nataworo onyinye dị nsọ anya, gamentị nke ọkwa nchụaja dị nsọ.

Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya bụ ihe niile nye m. Olileanya m niile na ọchịchọ m niile dị ebighị ebi, ihe niile m jidesiri ike, tụkwasịrị na Ya. Ọ bụ “oke nkume nke nzọpụta,” m ụzọ oghere m nwere ruo Nna nke Eluigwe m, naanị ụzọ m mwere iji laghachi niihe m nweburu ma ugbu a na-achọ inwete ọzọ, ya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ karịa. Onyinye Ya nye anyị bụ nke kachasị mmesapụ aka m nataworo, nke kachasị mmesapụ aka enyeworo—azụtara dị ka ọ dị na ntaram ahụhụ na-enweghị ọgwụgwụ, esetipụrụ ruo na ọnụọgụgụ na-adịghị agwụ agwụ, atụkwasịrị ịhụnaanya na-enweghị ọgwụgwụ. Ogwu niile na ihe ogwu ogwu niile, mgbu na nhuju anya, mwute na mmehie nke ụwa nke a dara ada ka “elobara niime Kraịst” kpamkpam.

Ya mere eyiriwo m gamentị nke ọkwa nchụaja dị nsọ—ụbọchị niile na abalị niile dị ka ọ dabara adaba kemgbe m natara onyinye dị nsọ afọ 64 gara aga, mgbe m gbara afọ 19—niihi na a hụrụ m Ya naanya na niihi na enwere m mkpa nkwa niile ọ nọchitere.

Ajụjụ niile banyere Iyi Gamentị?

Ụfọdụ niime unu nwere ike na-agụ ederede nke a na-atụ anya na m ga-aza ajụjụ akpọrọ aha banyere gamentị. I nwere ike na-atụ anya maka “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru”—ma ọ bụ ọbụna “Otu a ka ndị odibo Ya kwuru”—maka okwu metụtara gị n’obi. Ajụjụ gị nwere ike na-apụta site n’ọnọdụ nke onwe metụtara ịnwete ọrụ, egwuregwu, ịdị ọcha, ihu eluigwe, ịdị ọcha n’omume, ụlọ ịdị ọcha niile, ma ọ bụ ọnọdụ ahụike.

Ụfọdụ azịza niile nye ụdị ajụjụ ndị a ka enwere ike ịchọta na temples.ChurchofJesusChrist.org na niime nkeji 38.5 nke Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe. Ndị otù ezi na ụlọ na ndị ndu kwesịrị ntụkwasị obi ka enwere ike ịkpọtụrụ banyere okwu nke onwe. Enwere, kosiladị, ntuziaka doro anya enyere niime emume nsọ nkwado niile, ma enwere site n’ebighị ebi ruo n’ebighị ebi Nna gị bi N’eluigwe, onye maara gị ma hụ gị naanya ma na-aghọta ihe niile banyere ọnọdụ gị niile. Obi ga-atọ Ya ụtọ gị ịjụ Ya ajụjụ ndị a n’onwe gị.

spire nke St. George Utah Tempụl

Foto nke spire nke St. George Utah Tempụl

Biko enwekwala nghọtahie. Dị ka ị na-akpọtụrụ maka odudu sinachi, Mmụọ agaghị akpalite gị ime ntakịrị karịa isoro nkuzi anatara niime tempụl na ndụmọdụ nke onye amụma nyere site naka Otù Ndịisi Mbụ n’ahịrịokwu ha na nso nso a. Nna dị ịhụnaanya agaghị enyere gị aka chebaara ime ntakịrị karịa i nwere ike iji idozi ụkpụrụ Ya niile nke nraranye na ịdị ọcha nomume nke ga-agọzi gị ugbu a na mgbe niile. Mana Ọ na-aghọta ajụjụ gị niile, ma Ọ ga-enyere gị aka nata ngọzi niile nke ịkwanyere gamentị ugwu na idebe ọgbụgba ndụ gị niile? Ee! I kwesịkwara ịkpọtụrụ ọkacha mmụta ọgwụ na ahụike maara ihe mgbe achọrọ ya? Ọ bụ eziokwu! I kwesịrị ileghara uche ziri ezi ma ọ bụ lefuo anya gafee okè ahụ? Ekpere m bụ na ịgaghị eme otu a.

E nweghị m ike ịza ajụjụ niile i nwere. E nwedịghị m ike ịza ajụjụ niile m nwere. Mana enwere m ike, dị ka Onye Ozi nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, kwee nkwa enyemaka nke Chineke dị ịhụnaanya, onye na-achọ ọdịmma na ngọzi gị niile, n’ụzọ ndị ị na-enweghị ike ugbu a aghọta ma ọ bụ mata, dị ka i na-edebe ọgbụgba ndụ niile i meworo gị na Ya.