Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
32. Nchegharị na Kansụl niile nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ


“32. Nchegharị na Kansụl niile nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ,” Akwụkwọ Ntụziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a (2020).

“32. Nchegharị na Kansụl niile nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ,” Akwụkwọ ntụziaka Izugbe.

Foto, oyiyi
ndịikom na-ekwu okwu

32.

Nchegharị na Kansụl niile nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ

32.0

Ndubata

Ọtụtụ nchegharị na-eme n’etiti otu onye, Chineke, na ndị ahụ nweteworo mmetụta site n’ọtụtụ mmehie nke otu onye. Kosiladị, mgbe ụfọdụ bishọp ma ọ bụ onyeisi stek kwesịrị inyere ndị otu Nzukọ nsọ niime mgbalị ha ichegharị.

Mgbe a na-enyere ndị otu aka maka nchegharị, ndị bishọp na ndịisi stek na-enwe ịhụnaanya ma nlekọta anya. Ha na-agbasoro ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta, onye kpọlitere ndị mmadụ ma nyere ha aka gbanyere mmehie azụ ma tụgharịa chee ihu na Chineke (lee Matiu 9:10–13; Jọn 8:3–11).

Dị ka edepụtara n’okpuru, nkeji akwụkwọ nke a ka ahaziri iji duzie ndị ndu site na isi mkpebi niile na emereme niile dị mkpa iji nyere otu onye aka chegharịa site mmehie jọrọ oke njọ na iji nye aka chekwaa ndị ọzọ.

  • Ọrụ nke Nzukọ nsọ n’Inyere otu Onye aka Chegharịa. Nkeji 32.1–32.4 kọwara ozizi nke nchegharị na mgbaghara mmehie nke Onyenwe anyị. Nkeji ndị a nakwa akọwa ụzọ ebumnuche atọ nke mmachi niile ma ọ bụ mwepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ Na mgbakwunye, ha na-akọwa ọrụ nke ndị bishọp na ndịisi stek n’inye aka maka nchegharị.

  • Ikpebi Ntọala maka Inyere otu Onye aka Chegharịa. Nkeji 32.5–32.7 na-ewete ntuziaka niile maka ime mkpebi ma ọ bụrụ na ịbụ onye otu kansụl ma ọ bụ ndụmọdụ nke onwe bụ ntọala kwesịrị ekwesị maka inyere otu onye aka chegharịa.

  • Inye Ndụmọdụ Nke Onwe. Nkeji 32.8 na-enye ntụziaka niile maka ndụmọdụ nke onwe site naka bishọp ma ọ bụ onyeisi stek. Ọ na-akọwakwa mmachi niile na-adịghị n’okpuru iwu nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ.

  • Ịchịkwa Kansụl niile nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ. Nkeji 32.9–32.14 na-akọwa onye nwere oke na ọrụ maka kansụl niile nke ịbụ onye otu, otu esi eme ha, na mkpebi ndị ga-ekwe omume. Nsonazụ niile nke mkpebi ndị ahụ ka akọwakwara.

  • Iweghachi Ihe ùgwù niile nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ. Nkeji 32.15–32.17 na-akọwa otu mmadụ nwere ike isi nwee ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ eweghachitere site na nchegharị.

Ọ gwụla ma ekwuru ya, ntụaka niile nye onyeisi stek dịkwaara ndịisi mishọn. Ntụaka niile nye ndị bishọp dịkwaara ndịisi ngalaba nta.

Otu Ndịisi Mbụ na-akọwapụta atụmatụ niile na usoro niile maka ichegharị site na mmehie jọrọ oke njọ. Otu Ndịisi Mbụ ka akwadoro site n’aka Ụlọ ọrụ Ndekọihe Nzuzo niile nke Nzukọ nsọ. Onyeisi stek ma ọ bụ bishọp nwere ike jiri ajụjụ nchịkwa ma ọ bụ atụmamtụ niile kpọtụrụ ụlọ ọrụ ahụ. Ụlọ ọrụ ahụ nwekwara ike wete ntuziaka niile n’ụzọ e si eziga arịrịọ niile n’aka Ụlọ ọrụ nke Otu Ndịisi Mbụ. Ozi mkpọtụrụ ka egosiri n’okpuru:

Ekwe ntị: 1-801-240-2053 ma ọ bụ 1-800-453-3860, mgbatị 2-2053

Toll free (GSD phone): 855-537-4357

Email: ConfidentialRecords@ChurchofJesusChrist.org


ỌRỤ NKE NZUKỌ NSỌ N’INYERE OTU ONYE AKA CHEGHARỊA


32.1

Nchegharị na Mgbaghara

Onyenwe anyị kwuru na “ọ dịghị ihe ọbụla ruru unyi pụrụ iketa alaeze nke eluigwe” (Alma 11:37; leekwa 3 Nifaị 27:19). Mmehie anyị na-eme anyị eruo unyi—etozughị oke inọ n’ihu Nna anyị nke Eluigwe. Ha nakwa ewetere anyị nhụjuanya n’ime ndụ nke a.

Iwu ikpe ziri ezi nke Chineke na-achọ nsonazụ mgbe anyị mehiere (lee Alma 42:14, 17-18). Kosiladị, nnukwu atụmatụ nke ebere Ya “pụrụ imetazu ọchichọ niile nke ikpe ziri ezi, ma gbakụọ [anyị] n’ogweaka nke nchekwa” (Alma 34:16; leekwa Mozaya 15:9).

Iwetazu atụmatụ nke ebere Ya, Nna nke Eluigwe zitere Ọkpara Ọ Mụrụ Naanị Ya, Jizọs Kraịst, ịchụ aja maka mmehie anyị (lee Alma 42:15). Jizọs nagidere ntaramahụhụ nke iwu ikpe ziri ezi chọrọ maka mmehie anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:15–19; leekwa Alma 42:24-25). Site na aja nke a, ma Nna na Ọkpara ahụ gosịrị ịhụnaanya Ha na-enweghị ọgwụgwụ maka anyị (lee Jọn 3:16).

Mgbe anyị na-enwe “okwukwe ruo nchegharị,” Nna nke Eluigwe na-agbaghara anyị, inye ebere site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst (Alma 34:15; leekwa Alma 42:13). Mgbe asapụrụ ma gbaghara anyị, anyị pụrụ ikete alaeze Chineke n’ikpeazụ (lee Aịzaya 1:18; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:42)

Nchegharị karịrị ịgbanwe agwa. Ọ bụ ịgbanyere mmehie azụ ma chee ihu na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist. Ọ na-eduba na mgbanwe nke obi na echiche (lee Mozaya 5:2; Alma 5:12-14; Helaman 15:7). Site na nchegharị, anyị na-abụ ndị ọhụrụ, kpeziri ha na Chineke (lee 2 Ndị Kọrịnt 5:17-18; Mozaya 27:25-26).

Ohere ichegharị bụ otu n’ime ngọzi ndị kachasị ukwuu nke Nna nke Eluigwe nyeworo anyị site na onyinye nke Ọkpara Ya.

32.2

Ebumnobi niile nke Mgbochi niile ma ọ bụ Mwepụ aha nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ

Mgbe otu onye mere baptizim, ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị na-abụzi akụkụ nke “ndị otu ezi na ụlọ Chineke” (Ndị Efesọs 2:19). Ọgbụgba ndụ nke baptizim gụnyere nkwa ịgbasi mbọ ike ibi ndụ dị ka otu nkuzi niile na iwu nsọ niile nke Kraịst sịrị dị. Mgbe otu onye jiehere, ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị na-enwe okwukwe na Jizọs Kraịst ma chegharịa, dabere na ebere Ya iji gbaa ume ma gbaghara.

Ọ bụrụ na otu onye otu e mee njọ dị egwu, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-enyere ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị aka chegharịa. Dị ka akụkụ usoro nke a, o nwere ike dị mkpa na o gbochiri ụfọdụ ihe ùgwù nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ na nwa oge. N’ọnọdụ ụfọdụ, o nwere ike dị mkpa iwepụ ịbụ onye otu nke mmadụ na nwa oge.

Igbochi ma ọ bụ iwepụ ịbụ onye otu nke mmadụ abụghị na-ebu n’obi ịta ahụhụ. Kama, emereme ndịa mgbe ụfọdụ dị mkpa iji nyere mmadụ aka chegharịa ma nwete nhumiihe mgbanwe nke obi. Ha nakwa enye mmadụ oge ikwado n’ime mmụọ iji megharịa ohụrụ ma debe ọgbụgba ndụ ya.

Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-ahụ maka mgbochi niile ma ọ bụ mwepụ aha nke ịbụ onye otu dị ka edepụtara n’ime 32.5–32.14. Emereme ndịa ka ọnọdụ niile nke nchegharị sonyere. Mgbe otu onye chegharịa n’ezie, ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ka enwere ike iweghachiri ihe ùgwù niile nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ

Mgbe mgbochi niile ma ọ bụ mwepụ aha ịbụ onye otu dị mkpa, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-agbasoro odudu nke Mmụọ Nsọ na ntụziaka niile dị n’isiakwụkwọ nke a. Ọ na-eme ihe na mmụọ nke ịhụnaanya (lee 32.3).

Mgbochi niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ bụ maka ndị ụka Kraịst, ọ bụghị nke obodo ma ọ bụ nke mmebi iwu. Ha na-emetụta naanị ọnọdụ mmadụ niime Nzukọ nsọ. (Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 134:10.)

Ebumnobi atọ nke mgbochi ịbụ onye otu ma ọ bụ iwepụ aha bụ ndị a sotere.

32.2.1

Na-enye aka Echekwa Ndị ọzọ

Ebumnobi nke mbụ bụ inye aka chekwaa ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ mmadụ na-eyi egwu nke anụ ahụ ma ọ bụ nke ime mmụọ. Akparam agwa nrugbu niile, mmerụ ahụ a hụrụ anya, mmetọ nwoke na nwanyị, mmebi ọgwụ, mpụ, na ngọnarị okwukwe bụ ụfọdụ ụzọ ndị nke a nwere ike i si mee. Site na mkpake mmụọ, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-eme ihe iji chekwaa ndị ọzọ mgbe mmadụ na-eyi egwu n’ụzọ ndị a na ndị ọzọ siri ike (lee Alma 5:59-60).

32.2.2

Na-enyere Mmadụ aka Inwete Ike Mgbapụta nke Jizọs Kraịst site na Nchegharị

Ebumnobi nke abụọ bụ inyere mmadụ aka nwete ike mgbapụta nke Jizọs Kraịst site na nchegharị. Site n’usoro nke a, ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị nwere ike ịdị ọcha ma tozuo oke ọzọ ịnata ngọzi niile nke Chineke.

Onye Nzọpụta kuziri na “obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị” bụ aja Ọ chọrọ maka mgbaghara mmehie (3 Nifaị 9:20). Nke a gụnyere ezi mwute maka njọ niile na nsọnazụ ha niile (lee 2 Ndị Kọrịnt 7:9-10).

Mgbe mmadụ mehiere n’ụzọ dị oke njọ, mgbochi niile ma ọ bụ mwepụ aha ịbụ onye otu nwere ike inye aka zulite obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị dị mkpa maka nchegharị, n’ezie wezuga njọ, ma ghọta nsonazụ niile nke mmehie. Nghọta nke a nwere ike inyere ndị mmadụ aka iji were ọgbụgba ndụ ha na Chineke kpọrọ ihe n’ụzọ kacha dị ukwuu ma chọọ idebe ọgbụgba ndụ ndị ahụ n’ọdịniihu.

32.2.3

Chekwaa Eziokwu nke Nzukọ nsọ

Ebumnobi nke ato bụ ichekwaa eziokwu nke Nzukọ nsọ. Igbochi na iwepụ aha mmadụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ nwere ike dị mkpa ma ọ bụrụ ma agwa ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị merụọ Nzukọ nsọ ahụ n’ebe ọ dị ukwuu (lee Alma 39:11). Iguzosi ike n’ezi ihe nke Nzukọ nsọ abụghị ihe a na-echekwa site n’ikpuchi ma ọ bụ ibelata mmehie niile dị oke njọ—kama site n’ilebara ha anya.

32.3

Orụ nke Ndị Ikpe na Izrel

Foto, oyiyi
bishọp na-agwa otu nwoke okwu

Ndị bishọp na ndịisi stek ka akpọrọ ma dopụ iche ịbụ ndị ikpe na Izrel (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:72-74). Ha ji ọtụghe niile iji nọchite anya Onyenwe anyị n’inyere ndị otu Nzukọ nsọ aka chegharịa (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13:1; 107:16–18).

Ọtụtụ mgbe ndị bishọp na ndịisi stek na-enye aka na ncheharị site n’inye ndụmọdụ nke onwe. Enyemaka nke a nwere ike gụnye igbochi na-edeghị n’akwụkwọ ụfọdụ ihe ùgwù nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ na nwa oge. (Lee 32.8.)

Maka ụfọdụ mmehie dị oke njọ, ndị ndu na-enye aka maka nchegharị site na-ime kansụl ịbụ onye otu (lee 32.6 na 32.9–32.14). Enyemaka nke a nwere ike gụnye igbochi n’okpuru iwu ụfọdụ ihe ùgwù nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ma ọ bụ iwepụ aha ịbụ onye otu nke mmadụ na nwa oge (lee 32.11.3 na 32.11.4).

Ndị bishọp na ndịisi stek na-enyere ndị otu Nzukọ nsọ aka ghọta na Chineke hụrụ ụmụ Ya naanya. Nihi na Ọ chọrọ ka ha nwee obi ụtọ ma nata ngọzi niile, Ọ nwekwara nnukwu ịhụnaanya banyere nrube isi na nchegharị ha.

Ndị bishọp na ndịisi stek dị ịhụnaanya ma nwee ịhụnaanya dị ka ha na-enyere ndị otu aka ichegharị. Nkwukọrịta okwu nke Onye Nzọpụta na nwanyị ahụ enwetere na ịkwa iko bụ ihe odudu (lee Jọn 8:3-11). Na-agbanyeghị na O kwughị na agbagharawo ya njọ niile, Ọ maghị ya ikpe. Kama, Ọ gwara ya “emekwala njọ ọzọ”—ichegharị ma gbanwee ndụ ya.

Ndị ndu ndị a na-akuzi na enwere “ọṅụ … n’eluigwe maka otu onye mmehie nke chegharịrị” (Luk 15:7). Ha na-enwe ndidi, na-akwado, ma nwee ezi uche. Ha na-akwalite olileanya. Ha na-akuzi ma na-agba ama na n’ihi aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, onye niile pụrụ ichegharị ma dịrị ọcha.

Ndị bishọp na ndịisi stek na-achọ odudu sitere na Mmụọ ịmata otu esi enyere mmadụ ọbụla aka chegharịa. Naanị maka mmehie ndị jọrọ oke njọ kachasị ka Nzukọ nsọ hiwaworo ọkọlọtọ maka ihe ndị ndu ya ga-eme (lee 32.6 na 32.11). Ọdịghị ọnọdụ abụọ yiri otu. Ndụmọdụ nke ndị ndu na-enye na usoro nke nchegharị ha na-akwado ka mmụọ ga-akpakerịrị ma nwere ike ịdị iche maka onye ọbụla.

Onyenwe anyị maara ọnọdụ niile, ike, na ntozu okè ime mmụọ nke onye ọbụla. Mmụọ Nsọ ga-enyere ndị ndu aka ịmara otu esi enyere ndị otu aka mee mgbanwe ndị dị mkpa ka ha nwee ike nwete ọgwụgwọ ma guzogide ọnwụnwa imegharị njọ ahụ.

Inyere mmadụ aka chegharịa, tụgharịa laghachi na Chineke, ma nwete ọgwụgwọ site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst bụ otu n’ime nhumiihe kachasị enye ọńụ mmadụ nwere ike inwe. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10-13 na-akọwa na:

“Cheta na uru mkpụrụ obi niile bara dị ukwuu n’anya Chineke;

“N’ihi na, lee, Onyenwe anyị Onye Mgbapụta gị tara ahụhụ ọnwụ n’anụ ahụ; ya mere ọ tara ahụhụ mgbu nke ụmụ mmadụ niile, ka ụmụ mmadụ niile nwee ike chegharịa ma bịakwute ya.

“Ma o biliwo ọzọ site na ndị nwụrụ anwụ, ka o wee nwee ike kpọta ụmụ mmadụ niile nye ya, n’ọnọdụ niile nke nchegharị.

“Ma lee ka ịdị ukwuu ọṅụ ya dị n’ime mkpụrụ obi ahụ nke chegharịrị!”

32.4

Nkwupụta njọ, Nzuzo, na Ikpesara Ndị ji ikike Gọvmentị

32.4.1

Nkwupụta njọ

Nchegharị na-achọ na a ga-ekwupụta njọ nye Nna nke Eluigwe. Jizọs Kraịst kwuru, “Site na nke a unu nwere ike ịmara ma nwoke a o chegharịwo na njọ ya niile—lee, ọ ga-ekwupụta ha ma hapụ ha” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:43; leekwa Mozaya 26:29).

Mgbe ndị otu Nzukọ nsọ mere mmehie dị oke njọ, nchegharị ha gụnyekwara ikwupụta nye bishọp ha ma ọ bụ onyeisi stek ha. Mgbe ahụ ka o nwere ike iji ọtụghe niile nke ozi ọma nke nchegharị rụọ ọrụ maka ha (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13:1; 84:26–27; 107:18, 20). Nke a na-enyere ha aka nwete ọgwụgwọ ma laghachi n’ụzọ nke ozi ọma site nike Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta.

Ebumnobi nke nkwupụta njọ bụ iji gbaa ndị otu ume ibupụ onwe ha ibu arọ ka ha nwee ike chọta n’uju enyemaka nke Onyenwe anyị n’ịgbanwe na n’ịgwọ. Ịkwalite “obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị” ka nkwupụta njọ na-enyere aka (2 Nifaị 2:7). Nkwupụta njọ n’aka onwe n’egosi na onye ahụ chọrọ ichegharị.

Mgbe otu onye otu kwupụtara njọ, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-agbasoro ntụziaka niile maka ndụmọdụ dị n’ime 32.8. Ọ na-achọ odudu site n’ekpere banyere ọnọdụ dabara adaba maka inyere onye otu ahụ aka chegharịa (lee 32.5). Ọ na-atụle ma kansụl ịbụ onye otu ọ ga-enye aka. Ọ bụrụ na atụmatụ Nzukọ nsọ ga-achọ kansụl nke ịbụ onye otu, ọ na-akọwa nke a (lee 32.6 na 32.10).

Mgbe ụfọdụ onye otu emejọwo di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ okenye ọzọ. Dị ka akụkụ nke nchegharị, ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị kwesịrị ikwupụta njọ nye onye ahụ ma rịọọ mgbaghara. Ntoroọbịa ọbụla onye mere njọ dị oke njọ ka a na-agbakarị ume inwe ndụmọdụ ya na nne ma ọ bụ nna ya.

32.4.2

Mmehie ndị Jọrọ Oke njọ Nke A Na-ekwupụtaghị ma ọ bụ Ndị agọnarịrị

Onye bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-amatakarị maka mmehie dị oke njọ site na nkwupụta njọ ma ọ bụ site n’aka onye ọzọ. O nwekwara ike nata mkpali niile banyere mmehie dị oke njọ e nwere ike ime site na Mmụọ Nsọ. Ọ bụrụ ma ya nwete mmetụta mkpali site na Mmụọ na enwere mmadụ ya na mmehie na-agba mgba, o nwere ike hazie oge ajụjụ ọnụ. N’oge ajụjụ ọnụ ahụ, ọ na-akọwa nchegbu ya n’ụzọ obi ọma, nwere nkwanye ùgwù. Ọ na-ezere ụdaolu ebubo ọbụla.

Ọ bụrụ na otu onye otu agọnarịa ime mmehie dị oke njọ nke bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ozi ikwado, kansụl ịbụ onye otu ka enwekwara ike ime. Kosiladi, naanị echiche nke ime mmụọ naanị ezughị oke iji mee kansụl (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:37). Onye ndu ahụ nwere ike nwetakwuo ozi ma ọ dị mkpa. Ọ na-agbasoro ntụziaka niile dị n’me 32.4.3 na 32.10.2.

32.4.3

Ịchịkọta Ozi

Tupu emee kansụl ịbụ onye otu, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek ahụ na-achịkọta ozi niile kwere dị ka o si dị ya mkpa. Ozi sitere na nkwupụta njọ nke onye otu na-ezu oke ọtụtụ mgbe. Ozi nwekwara ike bịa site n’aka onye otu ezi na ụlọ, onye ndu ọzọ nke Nzukọ nsọ, onye ihe metụrụ, ma ọ bụ onye soro mee njọ ahụ.

Mgbe a na-achịkọta ozi, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek ahụ kwesịrị iji naanị ụzọ ndị dabara adaba maka onye ndu ọkwa nchụaja. O kwesịghị ịdị na-eche ebe obibi nke onye ahụ nche ma ọ bụ rekọọdụọ ya na-ejighị ikike. Ọbụghị ma ọ ga-eji omume ọbụla ndị megidere iwu.

Ebubo ụgha niile adịghị emekarị mana o nwere ike ime. Ndị ndu ọkwa nchụaja kwesịrị ịkpachara anya mgbe enwere ozi ole ma ole ewezuga okwu ọnụ nke onye ahụ. Iji maa atụ, onye otu eboro ebubo ịkwa iko nwere ike gọnarịa ebubo ahụ. Akwụkwọ nsọ na-akọwa na “okwu niile ka a ga-ehiwe megide ya site na ndị aka ebe abụọ nke nzukọ nsọ ahụ.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:80). “Ndị aka ebe abụọ” pụtara ụzọ abụọ esi enwete ozi. Nke a nwere ike gụnye ọmụma ihe nke onye na-eso eme ihe na ụzọ ndị ọzọ pụrụ ntụkwasị obi. Mgbe ụfọdụ onye ndu ọkwa nchụaja nwere ike chọọ ichere ime ihe tutu ruo mgbe e nwere ozi ndị ọzọ.

Mgbe onye ndu Nzukọ nsọ na-achịkọta ozi maka kansụl nke ịbụ onye otu, ọ ga-akwụsi n’egbughị oge ma ọ bụrụ na ọ mata na ndị omee iwu nọ n’ọrụ na-eme nchọpụta maka onye otu ahụ. Nke a ka a na-eme iji zere ihe ndị enwere ike ikwu na onye ndu ahụ dị ka o gbochiwo ikpe ziri ezi. Maka ndụmọdụ iwu banyere ọnọdụ ndịa na United States na Canada, onyeisi stek na-akpọtụrụ Ụlọọrụ Ndụmọdụ Zuruọha nke Nzukọ nsọ:

1-800-453-3860, mgbatị 2-6301

1-801-240-6301

N’ofe United States na Canada, onyeisi stek na-akpọtụrụ onye ndụmọdụ iwu mpaghara dị na ụlọọrụ mpaghara.

Okwesịrị na-agaghị eme kansụl ịbụ onye otu iji tulee agwa nke iwu ala ma ọ bụ ụlọ ikpe mnwale mpụ na-enyocha tutu ruo mgbe ụlọ ikpe ruru ikpe nke ikpeazụ. N’ọnọdụ ụfọdụ o nwekwara ike daba adaba igbu oge maka kansụl ịbụ onye otu tutu ruo mgbe arịrịọ iwu gafeworo ma ọ bụ na a jụwo arịrịọ ahụ.

32.4.4

Nzuzo

Ndị Bishọp, ndịisi stek, na ndị ndụmọdụ ha nwere ọrụ dị nsọ iji chekwaa ozi nzuzo niile ekwusaara ha. Ozi nke a nwere ike bịa na-ajụjụ ọnụ niile, ndụmọdụ, na nkwupụta njọ. Otu ụdị ọrụ nke nzuzo metụtara ndị niile na-eso na kansụl niile nke ịbụ onye otu. Nzuzo dị mkpa n’ihi na ndị otu nwere ike ghara ikwupụta njọ niile ma ọ bụ chọọ ntụziaka ma ọ bụrụ na ihe ha na-akọ abụghị nke a ga-edebe na nzuzo. Imebi ntụkwasị obi na-egbu ntụkwasị obi nke ndị otu ma mee ka ha hapụ ịtụkwasị obi na ndị ndu ha.

Ịnọgide n’ọrụ nke nzuzo ha, onye bishọp, onyeisi stek, ma ọ bụ ndị ndụmọdụ ha nwere ike kesaa ụdịrị ozi ahụ naanị dị ka ndị a na-esote:

  • Ha kwesịrị ịjụtụ onyeisi stek, onyeisi mishọn, ma ọ bụ bishọp nke onye otu ahụ banyere ime kansụl nke ịbụ onye otu ma ọ bụ ihe ndị ọzọ metụtara ya. Onyeisi stek nwekwara ike ịjụtụ onye Iri Asaa Mpaghara enyere ya. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, onye Iri Asaa Mpaghara ahụ na-agwa onyeisi stek ahụ ka ọ ga hụ Otu Ndịisi Mpaghara. Naanị onyeisi stek na-ekpebi ma a ga-enwe kansụl ma ọ bụ ihe ga-esi na ya apụta.

  • Onye ahụ na-agafe na ngalaba ukwu ọhụrụ (ma ọ bụ atọghapụ onye ndu ọkwa nchụaja ahụ) ebe emereme ịbụ onye otu ma ọ bụ nchegbu ndị ọzọ siri ike ka nọ na-eche. N’ime ọnọdụ ndịa, onye ndu na-akpọtụrụ bishọp ọhụrụ ahụ ma ọ bụ onyeisi stek banyere nchegbu niile ma ọ bụ emereme ndị nọ na-eche (lee 32.14.7). Ọ nakwa agwa onye ndu ahụ ma ọ bụrụ na onye otu ahụ nwere ike nọrọ dị ka ihe iyi egwu nye ndị ọzọ.

  • Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-amụta na onye otu Nzukọ nsọ onye bipụrụ na ngalaba ukwu ma ọ bụ stek ahụ nwere ike ịbụ na o tinyere aka na mmehie siri ike. N’oge dị otu ahụ, n’ụzọ nzuzo ọ na-akpọtụrụ bishọp nke onye otu ahụ.

  • Ọ dị mkpa ịgba ozi na-anwụ mgbe a na-eme kansụl ịbụ onye otu. Ozi niile achịkọtara ma kesaa dị ka akụkụ nke kansụl ịbụ onye otu dị nzuzo.

  • Onye otu na-ahọrọ inye ikike maka onye ndu ịgbasa ozi ya na ndị ahụ akpọrọ aha. Ndịa nwere ike gụnye ndi nne na nna, ndị ndu Nzukọ nsọ, ma ọ bụ ndị ọzọ bụ ndị nwere ike inye nkwado. Onye ndu anaghị agbasa ozi gafee ikike onye otu ahụ nyeworo.

  • O nwere ike dị mkpa ikesa ozi ebelatara ebelata banyere mkpebi nke kansụl ịbụ onye otu (lee 32.12.2).

N’ọnọdụ ọbụla ọzọ niile, onye ndu ga-arụ aka na 32.4.5. Ọnọdụ ndị a gụnyere mgbe iwu ga-achọ na mpụ, ụdị dị ka mmetọ ụmụaka, ka a ga-erepọọtụ nye ndị ji ikike gọvmentị.

Iji nyere ndị ndu aka n’ichekwa ndị ọzọ ma rube isi n’iwu, Nzukọ nsọ na-ewete enyemaka sitere na ndị ọkachamara a zụrụ azụ. Ịnata odudu nke a, ngwa ngwa ndị ndu na-akpọtụrụ ekwe ntị enyemaka maka mmetọ nke Nzukọ nsọ ebe enwere ya (lee 32.4.5 na 38.6.2.1). Ebe a na-enweghị ya, onyeisi stek na-akpọtụrụ onye ndụmọdụ iwu mpaghara dị na ụlọọrụ mpaghara.

Naanị n’otu ọnọdụ ka bishọp ma ọ bụ onyeisi stek kwesịrị ikpughe ozi nzuzo na-ebughị ụzọ chọọ ụdị odudu ahụ. Nke ahụ bụ mgbe ikpughe ihe dị mkpa iji gbochie ihe ọjọọ n’eyi ndụ egwu ma ọ bụ nnukwu mmerụ ahụ ma enweghị oge iji chọọ odudu. N’ụdị ọnọdụ ndị a, ọrụ ichekwa ndị ọzọ dịkarịrị mkpa karịa ọrụ nke nzuzo. Ndị ndu kwesịrị ịkpọtụrụ ndị ji ikike obodo ngwa ngwa.

Ọ bụrụ ma ndị ndu n’edetu ihe ma ọ bụ ezi ozikọrịta ozi n’ụzọ eletrọniki, ha na-echekwa ụzọ esi enwete ozi a. Ha nakwa ehicha ma ọ bụ mebie ozi ahụ mgbe ha n’enweghịkwa ihe ọzọ ha ji ya eme. Ha anaghị ekesa ozi nke onwe ma ọdịghị na mkpa.

Ndị ji ikike obodo nwere ike maa aka ịdị nzuzo nke achọrọ naka onye ndu ọkwa nchụaja. Ọ bụrụ na nke a mee na United States na Canada, onyeisi stek na-achọ ndụmọdụ nke iwu site na Ụlọọrụ Ndụmọdụ Zuruọha nke Nzukọ nsọ:

1-800-453-3860, mgbatị 2-6301

1-801-240-6301

N’ofe United States na Canada, onyeisi stek na-akpọtụrụ onye ndụmọdụ iwu mpaghara dị na ụlọọrụ mpaghara.

32.4.5

Irepọọtụrụ Ndị ji ikike Gọvmentị

Ụfọdụ ndị mmadụ na-echegharị emebiwo iwu ndị nke obodo ma ọbụ nke mpụ. N’ụfọdụ ọnọdụ, ndị ji ikike gọvmentị amaghị maka nke a. Ndị bishọp na ndịisi stek na-agba ndị otu ume ịgbasoro iwu ma repọọtụọ ụdị ihe ndịa mgbe o kwesịrị. Ndị ndu nakwa enye ndị otu ndụmọdụ inwete ndụmọdụ gbasara iwu bụ kpoo mgbe a na-enye repọọtụ. Atụmatụ nke Nzukọ nsọ bụ irube isi n’iwu.

N’ebe dị iche iche, ndị ndu ọkwa nchụaja ka achọrọ site n’iwu inye repọọtụ maka ụfọdụ agwa ndị megidere iwu nke ha ga-amara maka ya. Na-ịmaaatụ, ụfọdụ steeti na mba na-achọ ka enye repọọtụ maka mmetọ ụmụaka n’aka ndị ji ikike amanye iwu.

N’ụfọdụ obodo, Nzukọ nsọ ehiwewo akara ekwe ntị enyemaka nzuzo maka mmetọ ehiwere iji nyere ndị bishọp na ndịisi stek aka. Ndị ndu ndịa kwesịrị ngwa ngwa ịkpọtụrụ ekwe ntị enyemaka ahụ banyere ọnọdụ ọbụla nke enwere ike emetọwo mmadụ—ma ọ bụ ịnọ n’ọnọdụ dị egwu nke imetọ (lee 38.6.2.1). Ọ dị adị awa 24 n’ụbọchị, ụbọchị 7 n’otu izu ụka.

Na mba ndị n’enweghị ekwe ntị enyemaka, bishọp nke matara maka mmetọ ga-akpọtụrụ onyeisi stek ya, onye ga-achọ odudu site n’aka kansụl iwu nke mpaghara nọ na ụlọọrụ mpaghara.

Maka ozi ndị ọzọ banyere ime repọọtụ maka mmetọ, lee 38.6.2.1 na 38.6.2.7.


IKPEBI NTỌALA MAKA INYERE OTU ONYE AKA CHEGHARịA


32.5

Ntọala niile maka Inyere otu Onye aka Chegharịa

Mgbe amatachara na onye otu emewo mmehie siri ike, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-agba mbọ iji chekwaa ndị ọzọ. Ọ na-achọkwa odudu nke Mmụọ Nsọ n’ikpebi ntọala maka inyere mmadụ aka chegharịa ma bịaruo Onye Nzọpụta nso.

32.5.1

Nchịkọta nke Ntọala niile ahụ

Tebụl a na-esote depụtara ntọala atọ maka inyere otu onye aka chegharịa. Ọ nakwa achịkọta ụfọdụ ntule maka ndị ndu mgbe a na-eme mkpebi ntọala nke eji eme ihe.

Ntọala niile maka Inyere otu Onye aka Chegharịa

Ntọala

Ụfọdụ Ntule (leekwa 32.7)

Ntọala

Kansụl Ịbụ onye otu nke Stek

Ụfọdụ Ntule (leekwa 32.7)

  • Maka ndị otu ndị nataworo onyinye dị nsọ nke tempụl.

  • A chọrọ ya ma ọ bụrụ na otu nwoke ma ọ bụ nwanyị onye nataworo onyinye dị nsọ yiri ka a ga-ewepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ya n’ihi otu n’ime mmehie ndị a siri ike ma ọ bụ e kwuo maka emereme ndị akpọtụrụ na 32.6.1, 32.6.2, ma ọ bụ 32.6.3.

Ntọala

Kansụl Ịbụ onye otu nke Ngalaba ukwu

Ụfọdụ Ntule (leekwa 32.7)

  • Maka onye otu ọbụla.

  • A chọrọ maka mmehie ndị siri ike akpọtụrụ na 32.6.1.

  • O nwere ike ịdị mkpa maka mmehie ndị siri ike na emereme ndị ekwuru maka ya na 32.6.2 na 32.6.3.

  • Ozughị oke ma ọ bụrụ na otu nwoke ma ọ bụ nwanyị onye nataworo onyinye dị nsọ yiri ka a ga-ewepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ya n’ihi otu n’ime mmehie ndị a siri ike ma ọ bụ e kwuo maka emereme ndị ahụ na 32.6.1, 32.6.2, ma ọ bụ 32.6.3.

Ntọala

Ndụmọdụ Nke onwe (lee 32.8)

Ụfọdụ Ntule (leekwa 32.7)

  • Maka onye otu ọbụla.

  • Nwere ike gụnye mgbochi niile na-adịghị n’okpuru iwu nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ.

  • Nwere ike ghara izu ezu maka mmehie ndị siri ike ma ọ bụ emereme niile nke kansụl ịbụ onye otu ga-enye aka n’usoro nke nchegharị (lee 32.6.2 na 32.6.3).

  • O zughị oke maka mmehie ndị siri ike nke chọrọ kansụl ịbụ onye otu (lee 32.6.1).

  • Ozughị oke ma ọ bụrụ na otu nwoke ma ọ bụ nwanyị onye nataworo onyinye dị nsọ yiri ka a ga-ewepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ya n’ihi otu n’ime mmehie ndị a siri ike ma ọ bụ emereme ndị ahụ akpọtụrụ na 32.6.1, 32.6.2, ma ọ bụ 32.6.3.

Ndụmọdụ nke onwe na mgbochi niile na-adịghị n’okpuru iwu site n’aka bishọp ma ọ bụ onyeisi stek mgbe ụfọdụ anaghị ezu oke iji nyere mmadụ aka chegharịa site na mmehie siri ike. Onyenwe anyị ewetewo kansụl niile nke ịbụ onye otu iji nyere ọka ikpe na Izrel aka n’ọnọdụ ndị a. (Lee Ọpụpụ 18:12–27; Mozaya 26:29-36; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:80-83102.) Maka ụfọdụ mmehie siri ike, a na-achọ kansụl site n’atụmatụ nke Nzukọ nsọ (lee 32.6.1). Imebi ọgbụgba ndụ niile nke tempụl na-abawanye ike omume kansụl nke ịbụ onye otu ịdị mkpa (lee 32.7.4).

Na ngalaba ukwu, ndị ndụmọdụ nke bishọp na-enye aka na kansụl niile nke ịbụ onye otu. Na stek, ndị ndụmọdụ nke onyeisi stek na-enye aka. Nime ụfọdụ kansụl Ịbụ onye otu nke stek, kansụl dị elu nakwa eso niihe a na-eme (lee 32.9.2). Na kansụl ịbụ onye otu, ndị otu bishọp ma ọ bụ otu ndịisi stek na-ezute ha na onye ahụ na mmụọ nke ịhụnaanya.

32.5.2

Ikpebi Ntọala na Oge

Mgbe a na-ekpebi ntọala n’ime ndị a nke ga-akachasị mma inyere mmadụ aka chegharịa, ndị ndu na-achọ odudu nke Mmụọ Nsọ. Ha nakwa atule ihe ndị a sotere:

  • Oke ịdị njọ nke mmehie ahụ na atụmatụ Nzukọ nsọ banyere ma achọrọ kansụl (lee 32.6)

  • Ọnọdụ niile nke mmadụ (lee 32.7)

Bishọp na onyeisi stek na-adụkọrịta ọdụ banyere ọnọdụ ndị pụtara ihe. Ọ ga-anatarịrị nkwado site n’aka onyeisi stek tupu emewe kansụl ịbụ onye otu.

Maka ihe ndị siri ike, onyeisi stek nwere ike chọọ ndụmọdụ site n’aka Onye Iri Asaa Mpaghara enyere ya. Onyeisi stek ga-adụrịrị ọdụ ya na Otu Ndị isi Mpaghara maka ihe ndị edepụtara n’ime 32.6.3. Kosiladị, naanị onyeisi stek na-ekpebi ma a ga-enwe kansụl iji leba anya n’agwa ahụ. Ọ bụrụ ma enwee kansụl, onyeisi stek ma ọ bụ bishọp na-ekpebi ihe si na ya apụta.

Ọ bụrụ ma bishọp ma ọ bụ onyeisi stek ekpebie na ndụmọdụ nke onwe ezuwo, ọ na-esoro ntụziaka ndị dị n’ime 32.8. Ọ bụrụ ma o kpebie na kansụl ịbụ onye otu dị mkpa, ma ọ bụ ọ bụrụ na atụmatụ nke Nzukọ nsọ chọrọ kansụl, onye nke na-eduzi ya na-esoro usoro ndị dị n’ime 32.9–32.14.

Tupu emee kansụl ahụ, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike kpebie na mgbochi ịbụ onye otu na-anoghị n’okpuru iwu ga-akachasị mma na nwa oge. Ọ na-eme kansụl ahụ mgbe ọ ga-akachasị mma ịgba ezi nchegharị nke onye otu ahụ ume. Kosiladị, o kwesịghị igbu oge ime kansụl ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa iji chekwaa ndị ọzọ.

32.6

Ịdị oke njọ nke Mmehie na Atụmatụ Nzukọ nsọ

Ịdị oke njọ nke mmehie ọbụla bụ ntule dị mkpa n’ikpebi ntọala nke ga (1) enye aka chekwaa ndị ọzọ ma (2) nyere mmadụ aka chegharịa. Onyenwe anyị ekwuwo na O “nweghị ike ilekwasị mmehie anya jiri ogo nke ohere kachasị nta” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:31; leekwa Mozaya 26:29). Ụmụ odibo Ya ekwesịghị ileghara ihe aka ebe ọbụla nke mmehie siri ike anya.

Mmehie ndị siri ike bụ ọkpụrụkpụ njọ akpachapụrụ anya mee megidere iwu niile nke Chineke. katigori niile nke mmehie ndị siri ike ka edepụtara n’okpuru.

  • Omume ihe ọjọọ niile na mmetọ (lee 32.6.1.1 na 32.6.2.1)

  • Mmekọahụ rụrụ arụ (lee 32.6.1.2 na 32.6.2.2)

  • Omume aghụghọ niile (lee 32.6.1.3 na 32.6.2.3)

  • Mmebi niile gbasara ntụkwasị obi (lee 32.6.1.4 na 32.6.2.4)

  • Ụfọdụ omume ndị ọzọ (lee 32.6.1.5 na 32.6.2.5)

Nkeji ndị a sotere kọwara mgbe kansụl ịbụ onye otu dị mkpa, mgbe ọ nwere ike ịdị mkpa, na mgbe ọ na-agaghị adị mkpa.

32.6.1

Mgbe Kansụl Ịbụ onye otu Dị Mkpa

Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek ga-emerịrị kansụl ịbụ onye otu mgbe ozi na-egosi na enwere ike onye otu emewo otu nime mmehie ndị akọwara na nkeji nke a. Maka mmehie ndị a, kansụl dị mkpa na-agbanyeghị ogo ntozu oke nke ime mmụọ na nghọta nke ozi ọma nke onye otu ahụ.

Lee 32.11 maka mpụtara niile nwere ike ịdị nke kansụl ndị a kpọkọrọ n’ihi mmehie ndị e depụtara n’ime nkeji nke a. Mgbochi niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ na-adịghị nokpuru iwu abụghị nhọrọ maka kansụl ndị a.

32.6.1.1

Omume ndị Dị njọ na Mmetọ

Igbu mmadụ. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa ọ bụrụ ma onye otu gbuo mmadụ. Dị ka e kwuru ebe a, igbu mmadụ bụ ịkpachapụ anya were ndụ nke mmadụ nụzọ n’ezighị ezi. Iwepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ nke mmadụ dị mkpa.

Igbu mmadụ agụnyeghị omume niile nke ndị uwe ojii ma ọ bụ ndị agha n’ụzọ nke ọrụ. Ite ime apụtaghị igbu mmadụ n’ọnọdụ nke a. Ọ bụrụ ma ọnwụ bịara site na ihe mberede ma ọ bụ site na ịgbachitere onwe ma ọ bụ ndị ọzọ, iwere ndụ mmadụ nwere ike gaghị abụ ihe a ga-akọwa dị ka igbu mmadụ. Nke a nwekwara ike ị bụ eziokwu n’ọnọdụ ndị ọzọ, dị ka mgbe isi ezuchaghị mmadụ oke.

Idina mmadụ n’ike. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa maka idina mmadụ n’ike. Dị ka e dere ebe a, idina mmadụ n’ike bụ mmanye mmekọahụ ma ọ bụ mmekọrịta gị na otu onye nke na-agaghị enye nkwenye iwu kwadoro n’ihi enwechaghị uche ma ọ bụ ike nke anụ ahụ. Dị ka e dere ebe a, idina mmadụ n’ike agụnyeghị nkwenye mmekọahụ n’etiti ụmụaka abụọ ndị bụ ebiri.

Ikpe ọmụma nke Mbuso agha Mmekọahụ. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa ọ bụrụ ma ikpe mbuso agha mmekọahụ maa onye otu.

Mmetọ Nwata ma ọ bụ Ntoroọbịa. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa ọ bụrụ ma mmadụ emetọọ nwata ma ọ bụ ntoroọbịa dị ka akọwara na 38.6.2.3.

Mmegbu nke Di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ Okenye Ọzọ. Enwere ịdị njọ dị iche iche dị na omume mmegbu. Lee 38.6.2.4 maka mgbe kansụl ịbụ onye otu dị mkpa maka mmegbu nke di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ okenye ọzọ.

Omume Nrigbu Dị ọjọọ. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa ọ bụrụ ma okenye na-emerụ ndị mmadụ ahụ ugboro ugboro site n’omume dị ọjọọ ma bụrụ ihe iyi egwu nye ndị ọzọ.

32.6.1.2

Mmekọahụ Rụrụ arụ

Ndina Ụgwa. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa maka ndina ụgwa dị ka akọwara na 38.6.10. Iwepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ nke mmadụ na-adịkarịsị mkpa.

Nziakwụna Nwata. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa ọ bụrụ ma mmadụ tinyere aka na nziakwụna nwata dị ka edepụtara na 38.6.6.

Ọtụtụ Alụmdi na nwunye. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa ọ bụrụ ma mmadụ mara ama banye n’ime ọtụtụ alụmdi na nwunye. Ụfọdụ ọtụtụ alụmdi na nwunye nwere ike mee na nzuzo, ebe di ma ọ bụ nwunye amaghị gbasara otu ma ọ bụ di ma ọ bụ nwunye ndị ọzọ. Iwepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ nke mmadụ dị mkpa ọ bụrụ ma mmadụ mara ama banye n’ime ọtụtụ alụmdi na nwunye.

Omume Nrigbu Mmekọahụ. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa ọ bụrụ ma okenye na-emerụ ndị mmadụ ahụ ugboro ugboro site n’omume mmekọahụ ma bụrụ ihe iyi egwu nye ndị ọzọ.

32.6.1.3

Omume Aghụghọ niile

Omume Nrigbu nke Ego. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa ọ bụrụ ma okenye nwere ndekọihe nke ịkpachapụ anya na-emerụ ndị mmadụ ahụ ugboro ugboro n’ihe gbasara ego ma bụrụ ihe iyi egwu nye ndị ọzọ (lee 38.6.2.4). Nke a gụnyere itinye ego aghụghọ na ihe omume niile dị ka ya. Nfunarị ego niile na-atụghị anya ya nihi ọnọdụ akụ na ụba niile abụghị ihe ahụtara dị ka aghụghọ. Ọ bụrụ na ọ gụnyere iwepụ okwu nụlọ ikpe, ndị ndu ọkwa nchụaja nwere ike kpebie ichere tutu ruo niihe ga-adapụta n’ikpeazụ. Lee 32.6.3.3 ọ bụrụ ma onye otu so na iwere ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ arịa n’ụzọ n’ezighị ezi maka mkpa onwe.

32.6.1.4

Imebi Ntụkwasị obi niile

Mmehie Siri ike Mgbe Eji Ọkwa Pụtara ìhè na Nzukọ nsọ. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa ọ bụrụ ma onye otu mee mmehie siri ike mgbe o ji ọkwa pụtara ihe. Ndị a gụnyere Ikike Zuruọha, Onye ọrụ Nzukọ nsọ Zuruọha, Iri Asaa Mpaghara, onyeisi ma ọ bụ matrọn tempụl, onyeisi mishọn ma ọ bụ onye nsiso ya, onyeisi stek, petrak, ma ọ bụ bishọp. Nke a agbasaghị ndịisi ngalaba nta. Kosiladị, ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ nke onyeisi ngalaba nta ka enwere ike igbochi ma ọ bụ wepụ dị ka ndị otu ndị ọzọ.

32.6.1.5

Ụfọdụ Omume Ndị ọzọ

Ikpe ọmụma Felọni. Kansụl ịbụ onye otu dị mkpa n’ọtụtụ ọnọdụ mgbe a mara onye otu ikpe maka mpụ.

32.6.2

Mgbe Kansụl Ịbụ onye otu Nwere ike Ịdị Mkpa

Kansụl Ịbụ onye otu nwere ike dị mkpa n’ọnọdụ ndị a sotere.

32.6.2.1

Omume Ọjọọ niile na Mmetọ

Onyenwe anyị nyere iwu, “Ị gaghị … egbu mmadụ, ọbụghị ma mee ihe ọbụla dị ka ya” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:6; italiks agbakwunyere). Omume ọjọọ niile na mmetọ nke kansụl ịbụ onye otu nwere ike isi dị mkpa gụnyere (mana ebelataghị ya na) ndị a edepụtara n’okpuru.

Mnwale Igbu mmadụ. Ịkpachara anya nwaa igbu mmadụ.

Mmegbu Mmekọahụ, Gụnyere Mbuso agha na Mmekpa ahụ. Mmegbu mmekọahụ gụnyere ọtụtụ ihe omume dị iche (lee 38.6.18). Kansụl ịbụ onye otu nwere ike ịdị mkpa maka mmadụ onye mekpaworo ma ọ bụ megbuo mmadụ n’ụzọ mmekọahụ. Kansụl yikarịrị ihe ga-adị mkpa iji nyere onye otu aka chegharịa ọ bụrụ na ya emebiwo ọgbụgba ndụ tempụl niile ma ọ bụ ọ bụrụ ma e mere mmehie ahụ ugboro ugboro. Lee 38.6.18.3 maka mgbe kansụl dị mkpa.

Mmegbu nke Di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ Okenye Ọzọ. Enwere ịdị njọ dị iche iche dị na omume mmegbu (lee 38.6.2.4). Kansụl ịbụ onye otu nwere ike ịdị mkpa maka onye megbuworo di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ okenye ọzọ. Kansụl yikarịrị ihe ga-adị mkpa iji nyere onye otu aka chegharịa ọ bụrụ ma ya emebiwo ọgbụgba ndụ tempụl niile ma ọ bụ ọ bụrụ ma e mere mmehie ahụ ugboro ugboro. Lee 38.6.2.4 maka mgbe kansụl dị mkpa.

32.6.2.2

Mmekọahụ Rụrụ arụ

Iwu ịdị ọcha mmekọrịta nke Onyenwe anyị bụ iwepụ aka na mmekọrịta mmekọahụ niile na-abụghị nke alụmdi n’okpuru iwu n’etiti otu nwoke na otu nwanyị (lee Ọpụpụ 20:14; Ozizi na ọgbụgba-ndụ niile 63:16). Kansụl ịbụ onye otu nwere ike ịdị mkpa maka mmekọahụ rụrụ arụ dị ka akọwara na 38.6.5. N’ime ọnọdụ ndị a, kansụl yikarịrị ihe ga-adị mkpa iji nyere onye otu aka chegharịa ọ bụrụ ma ya emebiwo ọgbụgba ndụ tempụl niile ma ọ bụ ọ bụrụ ma e mere mmehie ahụ ugboro ugboro. Lee 32.6.1.2 maka mgbe kansụl dị mkpa.

32.6.2.3

Omume Aghụghọ niile

Iwu nsọ Iri na-akuzi, “Gị ezula ohi” ma ọ bụ “gbaa ama ụgha” (Ọpụpụ 20:15-16). Kansụl ịbụ onye otu nwere ike ịdị mkpa maka omume niile dị ka mpụnarị, ohi nkụka ụlọ, izu ohi, iwere ego maka mkpa onwe n’ụzọ n’ekwesighị ekwesị, ịgba ama ụgha mgbe ańụchara iyi, na aghụghọ. Lee 38.8.2 maka mpụ mmekọ. N’ime ọnọdụ ndị a, kansụl yikarịrị ihe ga-adị mkpa iji nyere onye otu aka chegharịa ọ bụrụ ma ya emebiwo ọgbụgba ndụ tempụl niile ma ọ bụ ọ bụrụ ma e mere mmehie ahụ ugboro ugboro.

Lee 38.8.2 maka mpụ mmekọ. Lee 32.6.1.3 maka mgbe kansụl dị mkpa maka omume aghụghọ niile. Lee 32.6.3.3 ọ bụrụ ma onye otu so na iwere ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ arịa n’ụzọ n’ezighị ezi maka mkpa onwe.

32.6.2.4

Mmebi niile nke Ntụkwasị obi

Kansụl ịbụ onye otu nwere ike dị mkpa ọ bụrụ ma onye otu:

  • Mee mmehie siri ike mgbe o ji ọkwa nke ikikere ma ọ bụ ntụkwasị obi n’ime Nzukọ nsọ ma ọ bụ n’obodo.

  • Mee mmehie siri ike nke a maara ebe niile.

N’ime ọnọdụ ndị a, kansụl yikarịrị ihe ga-adị mkpa iji nyere onye otu aka chegharịa ọ bụrụ ma ya emebiwo ọgbụgba ndụ tempụl niile ma ọ bụ ọ bụrụ ma e mere mmehie ahụ ugboro ugboro.

Lee 32.6.1.4 maka mgbe kansụl dị mkpa. Lee 32.6.3.3 ọ bụrụ ma onye otu so na iwere ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ arịa n’ụzọ n’ezighị ezi maka mkpa onwe.

32.6.2.5

Omume Ụfọdụ Ndị ọzọ niile

Eze Benjamin kuziri, “Enweghị m ike ịgwa unu ihe niile ebe unu nwere ike isi mee njọ; n’ihi na enwere ọtụtụ ụzọ na ihe atụ dị iche iche, ọbụna ọtụtụ nke m na-agaghị agụli ha” (Mozaya 4:29). Kansụl nwere ike dị mkpa ọ bụrụ ma mmadụ:

  • Na-egosi usoro nke ime mmehie ndị siri ike (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:7).

  • Kpachaara anya hapụ oke na ọrụ niile nke ezi na ụlọ, tinyekọta akwụghị ụgwọ nkwado nke nwa na nchọnchọ ego a na-akwụ nwanyị agbara alụkwaghịm .

  • N’eyi egwu ime ihe ike nke anụ ahụ, ma ọ bụ na mmadụ ma ọ bụ na intanet (lee 32.2.1).

  • Na-ere ọgwụ niile ndị iwu megidere.

  • Mere omume mpụ ndị ọzọ dị iche iche.

N’ime ọnọdụ ndị a, kansụl yikarịrị ihe ga-adị mkpa iji nyere onye otu aka chegharịa ọ bụrụ ma ya emebiwo ọgbụgba ndụ tempụl niile ma ọ bụ ọ bụrụ ma e mere mmehie ahụ ugboro ugboro.

Kansụl ịbụ onye otu nwere ike ịdị mkpa ọ bụrụ ma onye otu enyefee onwe ya n’okpuru, mee ihe, tụpụta atụmatụ maka, kwụọ ụgwọ maka, ma ọ bụ kwagide ite ime. Lee 38.6.1 maka ntụziaka niile.

Mgbe Kansụl Ịbụ onye otu Dị Mkpa ma ọ bụ Nwere ike Ịdị Mkpa

Ụdị Mmehie

Kansụl Ịbụ onye otu Dị Mkpa (lee 32.6.1)

Kansụl Ịbụ onye otu Nwere ike Ịdị Mkpa (lee 32.6.2)

Ụdị Mmehie

Omume niile na Mmegbu Ọjọọ

Kansụl Ịbụ onye otu Dị Mkpa (lee 32.6.1)

  • Igbu mmadụ

  • Idina mmadụ n’ike

  • Ikpe ọmụma nke mbuso agha mmekọahụ

  • Mmetọ nwata ma ọ bụ ntoroọbịa

  • Omume nrigbu dị ọjọọ

Kansụl Ịbụ onye otu Nwere ike Ịdị Mkpa (lee 32.6.2)

  • Mnwale igbu mmadụ.

  • Mmegbu mmekọahụ, tinyekọta mbuso agha na mmekpa ahụ (lee 38.6.18 maka mgbe kansụl dị mkpa)

  • Mmegbu nke di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ okenye ọzọ (lee 38.6.2.4 maka mgbe kansụl dị mkpa)

Ụdị Mmehie

Mmekọahụ Rụrụ arụ

Kansụl Ịbụ onye otu Dị Mkpa (lee 32.6.1)

  • Ndina ụgwa

  • Nziakwụna nwata

  • Ọtụtụ alụmdi na nwunye

  • Omume nrigbu mmekọahụ

Kansụl Ịbụ onye otu Nwere ike Ịdị Mkpa (lee 32.6.2)

  • Akwam iko, akwam iko n’etiti ndị na-alụbeghị ọlụlụ, otu ụdị mmekọahụ niile, na mmekọrịta mmekọahụ niile ọbụla na-anọghị n’alụmdi nke dị n’okpuru iwu n’etiti otu nwoke na otu nwanyị tinyekọta nzute mmekọahụ niile dị n’intanet ma ọ bụ site n’ekwe ntị

  • Ibikọ ọnụ nwoke na nwanyị na-emeghị ọlụlụ, njikọ niile na nrụkọ ọrụ niile nke obodo kwadoro, na alụmdi otu ụdị mmekọahụ

  • Ịle nziakwụna n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ ma ọ bụ n’ụzọ mmanye nke kpataworo mmerụ ahụ pụtara ihe nye alụmdi ma ọ bụ ezi na ụlọ nke onye otu

Ụdị Mmehie

Omume Aghụghọ niile

Kansụl Ịbụ onye otu Dị Mkpa (lee 32.6.1)

  • Omume nrigbu ego, ụdị dị ka mpụ na ihe omume niile yiri ya (lee 32.6.3.3 ọ bụrụ ma onye otu so na iwere ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ arịa n’ụzọ n’ezighị ezi maka mkpa nke onwe)

Kansụl Ịbụ onye otu Nwere ike Ịdị Mkpa (lee 32.6.2)

  • Mpụnarị, ohi nkụka ụlọ, izu ohi, ma ọ bụ iwere ego n’ụzọ n’ezighị ezi maka mkpa nke onye (lee 32.6.3.3 ọ bụrụ ma onye otu so na iwere ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ arịa n’ụzọ n’ezighị ezi maka mkpa onwe)

  • Aka ebe ụgha

Ụdị Mmehie

Mmebi niile nke Ntụkwasị obi

Kansụl Ịbụ onye otu Dị Mkpa (lee 32.6.1)

  • Mmehie siri ike mgbe eji ọkwa pụtara ìhè na Nzukọ nsọ

Kansụl Ịbụ onye otu Nwere ike Ịdị Mkpa (lee 32.6.2)

  • Mmehie siri ike mgbe eji ọkwa nke ikikere ma ọ bụ ntụkwasị obi na Nzukọ nsọ ma ọ bụ n’obodo (lee 32.6.3.3 ọ bụrụ ma onye otu so na iwere ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ arịa n’ụzọ n’ezighị ezi maka mkpa onwe)

  • Mmehie siri ike nke a mazuru ebe niile

Ụdị Mmehie

Omume Ụfọdụ Ndị ọzọ niile

Kansụl Ịbụ onye otu Dị Mkpa (lee 32.6.1)

  • Ikpe ọmụma mpụ ndị kachasị

Kansụl Ịbụ onye otu Nwere ike Ịdị Mkpa (lee 32.6.2)

  • Ite ime (ọ gwụla ma e nwere ihe ewezugara nime 38.6.1 gụnyere)

  • Nsoro nke mmehie niile ndị siri ike

  • Ịkpachara anya hapụ oke na ọrụ niile nke ezi na ụlọ, tinyekọta akwụghị ụgwọ nkwado nke nwa na nchọ nchọ ego maka nwanyị agbara alụkwaghịm

  • Ire ọgwụ niile ndị iwu megidere

  • Omume mpụ niile ndị ọzọ siri ike

32.6.3

Mgbe Onyeisi Stek na Otu Ndịisi Mpaghara dụkọrịtara ọdụ gbasara Ma Kansụl Ịbụ onye otu ma ọ bụ Emereme Ndị Ọzọ Bụ ihe Dị Mkpa

Ụfọdụ ihe chọrọ uche na ntụziaka ọzọ. Ịmata otu esi enye aka karịsịa, onyeisi stek ga-adụrịrị ọdụ ya na Otu Ndịisi Mpaghara banyere ọnọdụ ndị dị n’ime nkeji nke a. Kosiladị, naanị onyeisi stek na-ekpebi ma a ga-enwe kansụl iji kwuzie agwa ahụ. Ọ bụrụ ma enwee kansụl, onyeisi stek ma ọ bụ bishọp na-ekpebi ihe mpụtara ya.

Ọ bụrụ na e mere kansụl ịbụ onye otu maka otu ihe edepụtara na nkeji nke a, mkpebi nke kansụl ahụ ga-abụrịrị “ịnọgide n’ọnọdụ dị mma,” “mgbochi ịbụ onye otu n’okpuru iwu niile,” ma ọ bụ “iwepụ ịbụ onye otu.” Nkwado Otu Ndịisi Mbụ ka achọrọ iji wepụ mgbochi niile dị n’okpuru iwu ma ọ bụ webata onye ahụ ọzọ n’ime Nzukọ nsọ (lee 32.16.1, ọnụọgụgụ nke 9).

32.6.3.1

Emereme Ndị ọzọ

Ọ bụrụ na emeghị kansụl ịbụ onye otu, emereme ndị ọzọ nwere ike ịgụnye:

  • Mgbochi niile nke ịbụ onye otu na-adịghị n’okpuru iwu (lee 32.8.3).

  • Nkọwa ndekọihe ịbụ onye otu (lee 32.14.5).

  • Mgbochi emume nsọ niile, nke gbochiri mmadụ site n’ịnata ma ọ bụ itinye n’ọrụ ọkwa nchụaja ma ọ bụ ịnata ma ọ bụ iji rekọmend tempụl eme ihe.

Onyeisi Stek na Otu Ndịisi Mpaghara na adụkọrịtara ọdụ tupu ewere otu nime emereme ndị a mee ihe.

32.6.3.2

Ngọnarị okwukwe

Okwu niile nke ngọnarị okwukwe mgbe ụfọdụ na-enwe mmetụta fere oke niile nke ngalaba ukwu na stek. Ọ dị mkpa na-ekwuziri ha ngwa ngwa iji chekwaa ndị ọzọ.

Bishọp na onyeisi stek na-adụkọrịta ọdụ ọ bụrụ ma ya chee na emereme nke onye otu nwere ike ịgụnye ngọnarị okwukwe. Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike tinye mgbochi ịbụ onye otu na-adịghị n’okpuru iwu n’isi onye otu ahụ (lee 32.8.3). Onyeisi stek ngwa ngwa na-adụkọrịta ọdụ ya na Otu Ndịisi Mpaghara. Kosiladị, naanị onyeisi stek na-ekpebi ma kansụl ịbụ onye otu ma ọ bụ ma ihe ndị ọzọ a na-eme ha dị mkpa.

Dị ka e kwuru ebe a, ngọnarị okwukwe na-arụ aka n’onye otu n’etinye aka nime otu n’ime ihe ndịa sotere:

  • Na-eme ihe ugboro ugboro n’ụzọ doro anya akpachapụrụ anya mee n’ihu ọha megide Nzukọ nsọ, ozizi ya niile, atụmatụ ya niile, ma ọ bụ ndị ndu ya.

  • Ịnọgide nikuzi nkuzi dị ka ozizi nke Nzukọ nsọ ihe na-abụghị ozizi nke Nzukọ nsọ mgbe bishọp ma ọ bụ onyeisi stek meziworo ya

  • Ịgosi usoro nke ịkpachapụanya na-eme ihe iji mee ka okwukwe na mgbasike n’ọrụ nke ndị otu Nzukọ nsọ daa mba

  • Ịganiihu na-eso nkuzi niile nke otu gọnarịrị okwukwe mgbe bishọp ma ọ bụ onyeisi stek gwara ya nke bụ eziokwu

  • Isonye nzukọ nsọ ọzọ nokpuru iwu ma na ibuli nkuzi ya niile (Kpamkpam adịghị ike nọrụ nime Nzukọ nsọ ma ọ bụ ịdị na-aga nzukọ nsọ ọzọ abụghị nnọọ ihe mejupụtara ngọnarị okwukwe. Kosiladị, ọ bụrụ ma onye otu nokpuru iwu sonye nzukọ nsọ ọzọ ma kwuchite nkuzi ya niile, iwepụ aha ịbụ onye otu ya nwere ike dị mkpa.)

Onye Nzọpụta kuziiri ndị Nifaị na ha kwesịrị ịganiihu na-eje ozi nye otu onye onye meworo njọ. “Mana ọ bụrụ na o chegharịghị agaghị agụ ya ọnụ n’etiti ndị m, ka ọ ghara ibibi ndị m” (3 Nifaị18:31).

32.6.3.3

Iri Ego Nzukọ nsọ.

Ọ bụrụ ma onye otu rie ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ zuo arịa bara uru nke Nzukọ nsọ, onyeisi stek na Otu Ndịisi Mpaghara na-adụkọrịta ọdụ banyere ma kansụl ịbụ onye otu ma ọ bụ ihe ọzọ nwere ike ịdị mkpa. Ndị ndu na-atule:

  • Ego ole e riri ma ọ bụ e zuru ezu.

  • Ma ego ahụ e riri ọ bụ nke mere otu mgbe ma ọ bụ nke e megharịrị emegharị.

  • Ma e mewo nkwụghachi ụgwọ.

  • Ogo nchegharị nke onye ahụ.

  • Ọnọdụ onye otu ahụ ji (lee 32.6.1.4 maka ndị otu ji ọnọdụ Nzukọ nsọ pụtara ihe).

Onyeisi stek na-arịpọọtụ otu nime ndịa sotere niime Akụrụngwa niile nke Onye ndu na Odee akwụkwọ:

  • Nsonazụ niile nke kansụl ịbụ onye otu

  • Na ya na Otu Ndịisi Mpaghara dụkọrịtara ọdụ ma kpebie na kansụl ịbụ onye otu adịghị mkpa

Ọ bụrụ ma Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ kpebie na onye ndu ma ọ bụ onye ọrụ Nzukọ nsọ riri ego ma ọ bụ ihe onwunwe nke Nzukọ nsọ, Otu Ndịisi Mbụ nozuzu na-eduzi na rekọọdụ ịbụ onye otu ya ka a ga-akọwapụta. “Onye ndu” ka a na-akọwa dị ka onye ji ọkwa Nzukọ nsọ pụtara ihe, nakwa ndị ndụmọdụ, ndị odee akwụkwọ, na otu ndịisi ngalaba nta. Mgbe nchegharị zuru oke, onyeisi stek nwere ike tinye akwụkwọ maka iwepụ ihe nkọwapụta ahụ (lee 32.14.5 na 34.7.5). Ihe nkọwapụta apụtaghị na kansụl ịbụ onye otu ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ka emeworo.

32.6.3.4

Ndị Transgenda

Bishọp niile na ndịisi stek na-arụ ọrụ ha na ndị na-ahụta onwe ha dị ka transgenda kwesịrị isoro ntụziaka ndị dị n’ime 38.6.23.

32.6.4

Mgbe Kansụl Ịbụ onye otu Anaghị Adịkarị Mkpa

Kansụl Ịbụ onye otu anaghị adịkarị mkpa n’ọnọdụ niile a sotere.

32.6.4.1

Ọdịda Irube isi nye Ụfọdụ Ụkpụrụ nke Nzukọ nsọ

Kansụl ịbụ onye otu abụghị nke a na-eme maka emereme ndị edepụtara n’okpuru. Kosiladi, mata beluso dị nime ihe nke ikpeazụ.

  • Adịghị nkọ n’ọrụ na Nzukọ nsọ

  • Na-adịghị emejupụta ọrụ niile nke Nzukọ nsọ

  • Anaghị akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri

  • Njọ nke na-akpachghị anya

  • Mkpali anụ ahụ n’onwe

  • Adịghị ekwenye idebe Okwu nke Amamiihe

  • Ile nziakwụna, ewezuga ma ọ bụ nziakwụna ụmụntakịrị (dị ka e dere na 38.6.6) ma ọ bụ ile nziakwụna n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ ma ọ bụ na mmanye nke kpataworo mmerụ ahụ pụtara ihe nye alụmdi ma ọ bụ ezi na ụlọ nke onye otu (dị ka edere na 38.6.13).

32.6.4.2

Ọdịda Azụmahịa ma ọ bụ Adịghị akwụ Ụgwọ niile

Ndị ndu ekwesịghị iji kansụl ịbụ onye otu emezi nrụ ụka ndị dị n’azụmahịa. Ọdịda azụmahịa na adịghị akwụ ụgwọ niile abụghị ihe ga-akpata inwe kansụl ịbụ onye otu. Kosiladị, a ga-enwerịrị kansụl maka omume aghụghọ niile siri ike ma ọ bụ omume ego ndị ọzọ dị aghụghọ (lee 32.6.1.3).

32.6.4.3

Esemokwu Obodo

Anaghị eme kansụl ịbụ onye otu iji kpezie esemokwu obodo (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 134:11).

32.7

Ọnọdụ niile nke Onye ahụ

Onyenwe anyị kwuru, “Ogweaka ebere m ka esetipụrụ nihu gị, ma onye ọbụla nke ga-abịa, ya ka m ga-anabata; ma ngọzi na-adịrị ndị ahụ na-abịakwute m” (3 Nefi 9:14). Ọnọdụ niile nke mmadụ bụ ntule dị mkpa n’ime mkpebi:

  • Ntọala kwesịrị ekwesị maka inyere ya aka chegharịa site na mmehie ọjọọ (lee 32.5 na 32.6).

  • Mkpebi niile emere na ndụmọdụ nke onwe ma ọ bụ kansụl ịbụ onye otu (lee 32.8 na 32.11).

Ndị bishọp na ndịisi stek na-achọ echiche na uche nke Onyenwe anyị maka ọnọdụ ọbụla. Ha na-atule ihe niile sotere n’ikpebi ntọala nke a ga-eji eme ihe na ihe mpụtara ya ga-abụ. Ihe ndịa anaghị amanyere mkpebi nke ọbụla. Kama, ha bụ ihe inyeaka nye mkpebi nke ndị ndu ga-emerịrị n’ekpere na dị ka Mmụọ si duo.

32.7.1

Ọhara nke Mmehie

Isi ike nke mmehie ka a na-atụ site na ọhara ya. Nke a nwere ike gụnye ọnụọgụgụ na ugboro ugboro nke emere mmehie niile, ịdị njọ nke mmerụ ahụ sitere na ha, na ọnụọgụgụ nke ndị ha merụrụ ahụ.

32.7.2

Mmasị nke Onye Ihe Metụtara

Ndị ndu na-atule mmasị nke onye ihe metụtara na ndị ọzọ. Ndịa nwere ike gụnye di ma ọ bụ nwunye mmadụ na ndị otu ezi na ụlọ ọzọ. Ndị ndu nakwa atule ịdị njọ nke mmerụ ahụ ahụ.

32.7.3

Ihe akaebe nke Nchegharị

Odudu ime mmụọ dị mkpa maka ịghọta ma mmadụ echegharịwo n’ezie. Ụdị nchegharị nke a ka a na-egosi n’ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi site n’emereme ezi omume niile ka oge na-aga kama isite na mwute siri ike n’oge ajụjụ ọnụ nke otu onye. Ihe ndị a ga-atule gụnyere:

  • Ume nke okwukwe n’ime Jizọs Kraịst.

  • Ọdịdị nke nkwupụta njọ.

  • Omimi nke mwute n’ihi mmehie.

  • Nkwụghachi nye ndị emerụrụ ahụ.

  • Nrubeisi n’ihe niile iwu chọrọ.

  • Mmetazi n’ịhapụ mmehie.

  • Ikwesị ntụkwasị obi na nrubeisi nye iwu nsọ niile kemgbe mmehie ahụ.

  • Ịkwụwa aka ọtọ n’ebe ndị ndu Nzukọ nsọ na ndị ọzọ nọ.

  • Ịdị njikere isoro ndụmọdụ ndị ndu Nzukọ nsọ.

Foto, oyiyi
Nwanyị na-ekpe ekpere

32.7.4

Mmebi Ọgbụgba ndụ niile nke Tempụl

Onyenwe anyị mara ọkwa, “Nihi ya onye nke e nyere nnukwu nnukwu ihe ka achọrọ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:3). Onye nke nataworo onyinye dị nsọ nke tempụl emewo ọgbụgba ndụ niile iji bie ụkpụrụ dị elu karịa. Imebi ọgbụgba ndụ ndịa na-eme ịdị njọ nke mmehie ahụ a karịa. Ọ na-abawanye ohere ịdị mkpa nke kansụl ịbụ onye otu.

32.7.5

Ọkwa nke Ntụkwasị obi ma ọ bụ Ikikere

Ịdị njọ nke mmehie ahụ na-abawanye ọ bụrụ ma onye ahụ mere ya mgbe ọ nọ nọkwa nke ntụkwasị obi ma ọ bụ ikikere, dị ka nne ma ọ bụ nna, onye ndu, ma ọ bụ onye nkuzi.

32.7.6

Nkwugharị

Nsoro nke imegharị otu ụdị mmehie siri ike nwere ike gosi agwa gbara mgbọrọgwụ miri emi ma ọ bụ omume n’eri ahụ nke na-egbochi ọganiihu ruo n’ezi nchegharị. Na mgbakwunye nye mgbochi niile nke ịbụ onye otu nwere ike ịdị mkpa, atụmatụ mgbake niile nke omume n’eri ahụ na ọkachamara ndụmọdụ nwere ike inyeaka (lee 32.8.2).

32.7.7

Afọ ole, Ntozu oke, na Nhumiihe

Ndị ndu na-atule afọ ole, ntozu oke, na nhumiihe mgbe a na-enye onye otu ndụmọdụ ma ọ bụ ikpebi ihe mpụtara nke kansụl ịbụ onye otu. Ịdị nwayọọ na-adị mma ọtụtụ mgbe maka ndị n’etorubeghị n’ime ozi ọma. N’ịmaatụ, ịdị nwayọọ nwere ike ịdaba adaba nye ndị otu dị nta ndị n’etinye aka n’omume rụrụ arụ ma ọ bụrụ ma ha hapụ mmehie ahụ ma gosi ezigbo nchegharị. Kosiladị, omume siri ike karịa nwere ike ịdị mkpa ma ọ bụrụ ma ha nọgide n’ịkpa agwa ahụ.

32.7.8

Ike Iche Echiche

Ọrịa uche, mmara ahụ, ma ọ bụ isi ezuchaghị oke adịghị agụpụ onye mere mmehie siri ike. Kosiladị, ndị a bụ ihe ndị a ga-atule. Dị ka otu akụkụ inyere mmadụ aka chegharịa, ndị ndu na-achọ odudu nke Onyenwe anyị banyere nghọta onye ahụ nke ụkpụrụ niile nke ozi ọma na ogo nke ịza ajụjụ.

32.7.9

Nkwupụta njọ N’onwe

Nkwupụta njọ n’onwe na mwute si na chi maka emereme nke onwe n’egosi ọchịchọ ichegharị.

32.7.10

Oge dị n’etiti Mmehie na Nkwupụta njọ

Nkwupụta njọ bụ akụkụ nke nchegharị ma ekwesịghị igburu ya oge. Mgbe ụfọdụ ihe n’esote mmehie bụ ogologo oge nke nkwụghachi na ibi ndụ kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụrụ ma onye otu kwupụta mmehie ọbụla ma o megharịbeghị ya, nke ahụ nwere ike gosi na ọ hapụwo ya. N’ihe atụ ahụ, nkwupụta njọ nwere ike zuo ezuo karịa ịmalite usoro nke nchegharị.

32.7.11

Mmehie ndị Gụnyere Ndị otu Ndị Bi Na Ngalaba ukwu ma ọ bụ Stek ndị Dị iche iche

Mgbe ụfọdụ ndị otu mekọtara mmehie siri ike bi na ngalaba ukwu ma ọ bụ stek ndị dị iche iche. N’ọnọdụ nke a, ndịisi stek na-adụkọrịta ndụmọdụ banyere mkpa nke mgbochi niile ma ọ bụ kansụl niile nke ịbụ onye otu. Ha nakwa akparịta ụka ma enwere uru dị na mgbochi niile ma ọ bụ mkpebi kansụl niile ịbụ otu ụdị ma ọ bụ enwere ihe ndị ọzọ nke nwere ike igosi mkpa maka mpụtara dị iche iche.


INYE NDỤMỌDỤ NKE ONWE


32.8

Ndụmọdụ nke Onwe na Mgbochi Ịbụ onye otu Na-anọghị N’okpuru Iwu

Ndụmọdụ nke onwe na-ezukarị iji nye aka chekwaa ndị ọzọ ma nyere mmadụ aka nwete ike mgbapụta nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst site na nchegharị. Ụdị ndụmọdụ a nwekwara ike inyere ndị otu aka chekwaa megide mmehie ndị ọzọ niile kara sie ike. Na ndụmọdụ nke onwe, ndị ndu nwekwara ike inye mgbochi ịbụ onye otu ndị na-anọghị n’okpuru iwu iji nyere onye otu aka chegharịa site na ụfọdụ mmehie ndị siri ike (lee 32.8.3).

Ekwesịghị ime ebere n’ihe gbasara mmehie ndị siri ike (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:31). Imebi ọgbụgba ndụ niile nke tempụl na-abawanye ike omume kansụl nke ịbụ onye otu ịdị mkpa (lee 32.7.4).

Ntụziaka niile iji nyere ndị ndu aka mara mgbe ndụmọdụ na mgbochi niile na-anọghị n’okpuru iwu nwere ike izu ezu ka ededatara n’okpuru (leekwa 32.7).

  • Mmadụ emebeghị mmehie nke ga-achọ kansụl ịbụ onye otu (lee 32.6.1).

  • Mmadụ ekwupụtawo njọ n’onwe ya ma nwere ezigbo nchegharị.

  • Mmadụ na-echegharị site na mmehie siri ike nke ọ na-emebeghị mbụ.

  • Mmehie nke mmadụ emebibeghị ọgbụgba ndụ niile nke tempụl.

  • Mmadụ nwere ọnọdụ ndị ga-ebelata nke ọma.

32.8.1

Ndụmọdụ Nke Onwe

Ntụziaka ndị a sotere na-adị mgbe bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-enye onye otu ndụmọdụ iji nyere ya aka chegharịa.

  • Rịọ maka naanị ozi zuru ezu iji mata (1) agwa nke onye otu ahụ maka omume mmehie ahụ na (2) ọdịdị ya, ugboro ole ya, na oge omume ahụ nọruru. Ajụkwala maka nkọwa ndị karịrị ihe dị mkpa iji ghọta ọnọdụ ahụ Ajụkwala ajụjụ ndị na-amalite site na ọchịchọ ịmata ihe nke onwe.

  • Jụọ otu omume ahụ si metụta ndị ọzọ.

  • Lekwasị anya n’ọnọdụ ndị dị mma nke na-eme ka mgbanwe na ntụkwasị obi nke onye otu ahụ nye Onyenwe anyị dị omimi. Gbaa onye otu ahụ ume ime ihe kpọmkwem iji wete na mmezu mgbanwe nke omume na mgbanwe nke obi iji chegharịa. Kpọkuo ya ịbịarute Onye Nzọpụta nso, na-achọ ike Ya ma nwete mmetụta nke ịhụnaanya mgbapụta Ya.

  • Kwagide ihe omume ndị na-akwalite mmụọ dị ka ikpe ekpere, ịmụ akwụkwọ nsọ, na ịga nzukọ niile nke Nzukọ nsọ. Kuzie na agụgụala ezi na ụlọ na ọrụ tempụl pụrụ ibelata mmetụta nke onye iro ahụ. kwagide ijere ndị ọzọ ozi na ikwusa ozi ọma.

  • Gbaa ume ime nkwụghachi nye ndị ahụ mmehie ahụ merụrụ ahụ na ịrịọ maka mgbaghara

  • Gbaa ume ichigharị site na mmetụta niile jọrọ njọ. Nyere ndị otu aka ime ihe mgbochi iji guzogide ọnwụnwa niile ndị ama ama.

  • Mata na ị bụ onye ndu eklesịastik, n’abụghị onye ndụmọdụ ọkachamara. Na mgbakwunye nye ndụmọdụ i na-ewete, ụfọdụ ndị otu ga erite uru site na ndụmọdụ nke omume. Ụfọdụ na-ata ahụhụ site na ọrịa uche. Dị ka ọ dị mkpa, dụọ ndị otu ndụmọdụ ka ha chọọ enyemaka site naka ndị ọkachamara tozuru oke na ahụike nke ọgwụ na uche (lee 31.3.6).

  • Dị na-ekpe ekpere ma chọọ odudu site na Mmụọ ahụ tupu inye mgbochi niile nke ịbụ onye otu na-anọghị n’okpuru iwu. Ụfọdụ ndị otu nwere ike nwete uru site n’itinye ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ n’ọrụ karịa kama igbochi ha.

  • Sochie ya n’inye mgbam ume, wusie ike ime mmụọ ike, ma nyochaa ọganiihu.

Mgbe otu onye otu kwupụtaworo njọ nye bishọp ma ọ bụ onyeisi stek, ndụmọdụ nsochi nwere ike mee n’ụzọ ndị dị iche iche. Onye ndu ahụ nonwe ya nwere ike ime ya. Ma ọ bụ, site n’ikike nke onye otu, o nwere ike nye otu nime ndị ndụmọdụ ya ọrụ ime ya.

Site na nkwenye nke onye otu, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike kenye ndị otu nke kworum ndị okenye ma ọ bụ Otu Enyem aka ọrụ inye aka n’ụzọ niile ndị amaara ama. Maka ndị ntoroọbịa, o nwere ike kenye ndị ndụmọdụ NdịInyom Nta ma ọ bụ kworum Ọkwa nchụaja nke Erọn ọrụ inye aka. Ndị ahụ ekenyere ọrụ inye aka nwere ikike mkpake mmụọ iji mejupụta ọrụ ahụ enyere (lee 4.2.6).

Mgbe a na-ekenye mmadụ ọrụ inye aka jiri ndụmọdụ na-esote, onye ndu ahụ na-enye naanị ozi zuru ezu dị mkpa iji nyere onye otu ahụ aka. Onye ahụ ekenyere ọrụ ga-edeberịrị ihe niile na nzuzo. O na-agwakwa bishọp maka ọganiihu na mkpa niile nke onye otu ahụ.

Foto, oyiyi
nwanyị na-ekpe ekpere

32.8.2

Ịnyere Ndị Mmadụ nwere Mmara ahụ aka

Ndụmọdụ nke onwe mgbe ụfọdụ na-agụnye inyere ndị otu aka chegharịa site na mmehie niile metụtara na ma ọ bụ nke mmara ahụ kpatara. Mmara ahụ ndịa nwere ike ịgụnye ọgwụ ma ọ bụ omume niile ndị dịgasị iche iche. Mmara ahụ niile nwere ike imerụ ndị mmadụ, alụmdi niile, na ezi na ụlọ niile ahụ. Ndị bishọp nwere ike dụọ ndị otu ọdụ ịchọ enyemaka sitere na atụmatụ mgbake niile nke Nzukọ nsọ na site na ndị ọkachamara ahụike ọgwụ na uche tozuru oke.

Iji nziakwụna eme ihe na-abawanye ụba. Ojiji kpụ ọkụ n’ọnụ nwere ike bụrụ ihe mmanye ma ọ bụ, n’ọnọdụ ndị a na-adịghị ahụkarị, mmara ahụ. Ma ojiji nziakwụna ọ kpụ ọkụ n’ọnụ ma ọ bụ mgbe ụfọdụ, ọ na-emerụ ahụ. Ọ na-achụpụ Mmụọ ahụ. Ọ na-eme ikike iji dọrọ ike nke na-abịa site n’idebe ọgbụgba ndụ niile a daa mba. Ọ nakwa emerụ mmekọrịta niile mara mma ahụ.

Ndụmọdụ nke onwe na mgbochi niile nke ịbụ onye otu na-adịghị n’okpuru iwu na-ezukarị maka inyere mmadụ aka chegharịa site n’ojiji nziakwụna. Anaghị emekarị kansụl ndị nke ịbụ onye otu. Maka mwezuga niile, lee 38.6.6 na 38.6.13. Ndụmọdụ nke ọkachamara nwere ike nye aka.

Ndịisi stek na ndị bishọp na-akwado ndị otu ezi na ụlọ dị ka o si dị mkpa. Ndị nne na nna ka enwere ike ịgụnye mgbe a na-adụ ndị ntoroọbịa ọdụ banyere ojiji nziakwụna. Di ma ọ bụ nwunye ka enwere ike ịgụnye mgbe a na-adụ onye lụworo di na nwunye ọdụ.

Maka ozi banyere ịdụ ndị otu tinyere aka na nziakwụna ọdụ, lee 38.6.13.

32.8.3

Mgbochi niile nke Ịbụ onye otu N’adịghị n’okpuru iwu

Na mgbakwunye nye ịgba ume emereme niile ndị dị mma mgbe a na-enye ndụmọdụ, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike gbochie ụfọdụ ihe ùgwù ndị na-anọghị n’okpuru iwu nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ na nwa oge. Ime ya na-amamihe, mgbochi ndị a nwere ike inye aka na nchegharị na ọganiihu ime mmụọ. A na-ahụta ha dị ka na-adịghị n’okpuru iwu n’ihi na edeghị ha na ndekọihe nke ịbụ onye otu.

Mgbochi niile na-adịghị n’okpuru iwu nwere ike nọruo izu ole ma ole, ọtụtụ ọnwa, ma ọ bụ karịa ọ bụrụ na ọ dị mkpa maka onye ahụ ichegharị n’uju. N’ọnọdụ ndị pụrụ iche, oge ya nwere ike dị ogologo karịa otu afọ.

Ndị ndu na-achọ odudu nke Mmụọ banyere mgbochi ndị nke ga-enyere mmadụ aka chegharịa karịsịa. Ndị a nwere ike gụnye (mana ebelataghị ha na) ịkwụsịtụ ihe ùgwù nke ije ozi n’ọkpụkpọ oku Nzukọ nsọ, n’etinye ọkwa nchụaja n’ọrụ, ma ọ bụ ịbanye tempụl. Onye ndu nwekwara ike gbochie onye ahụ site n’ikwu okwu na nzukọ, ikuzi ihe, ma ọ bụ ikpe ekpere na ntọala Nzukọ nsọ niile. Ọ bụrụ ma onye ndu kwụsịtụ oke ruru ya ịbanye tempụl, ọ na-akagbu rekọmend tempụl na Akụrụngwa niile nke Onye ndu na Odee akwụkwọ (LCR).

Iri oriri nsọ bụ akụkụ dị mkpa nke nchegharị. Ọ kwesịghị ịbụ mgbochi nke mbụ aga enye onye n’echegharị onye nwere obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị. Kosiladị, ọ bụrụ ma mmadụ emewo mmehie ndị siri ike, onye ndu nwere ike kwụsịtụ ihe ùgwù nke a nwa oge.

Ndị ndu anaghị agwakarị onye ọbụla ọzọ ihe gbasara mgbochi ndị na-adịghị n’okpuru iwu ọ gwụla ma enwere ihe kpatara e ji ama (lee 32.12.2).

Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike wepụ mgbochi ndị na-adịghị n’okpuru iwu dị ka Mmụọ si duo mgbe onye ahụ nwere ọganiihu a hụrụ anya n’ezi nchegharị. Ọ bụrụ ma onye otu ahụ gaaniihu n’ụkpụrụ nke mmehie, o nwere ike inye aka ma ọ bụ dị mkpa ime kansụl ịbụ onye otu.


INYE KANSỤL NIILE NKE ỊBỤ ONYE OTU NZUKỌ NSỌ


Kansụl niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ka a na-eme mgbe bishọp ma ọ bụ onyeisi stek kpebiri na ha ga-enyeaka ma ọ bụ mgbe a chọrọ ha site n’ụkpụrụ Nzukọ nsọ (lee 32.6). A na-eme ha n’ogo ngalaba ukwu, stek, ngalaba nta, distrit, ma ọ bụ mishọn. Nkeji nke a na-ewete ozi gbasara otu esi eme ha.

32.9

Nsonye na Ọrụ

Tebụl a sotere negosi onye na-esokarị eme ihe na kansụl niile nke ịbụ onye otu.

Ndị nsonye na Kansụl niile nke Ịbụ onye otu

Kansụl Ịbụ onye otu nke Ngalaba ukwu

Ndị nsonye na Kansụl niile nke Ịbụ onye otu

  • Onye nke eji maka ya nwee kansụl

  • Bishọp na ndị ndụmọdụ ya

  • Odee akwụkwọ ngalaba ukwu

  • Onyeisi kworum okenye ma ọ bụ Otu Enyem aka (kenhọrọ; lee 32.10.1)

Kansụl Ịbụ onye otu nke Stek

Ndị nsonye na Kansụl niile nke Ịbụ onye otu

  • Onye nke eji maka ya nwee kansụl

  • Onyeisi stek na ndị ndụmọdụ ya

  • Odee akwụkwọ stek

  • Ndị kansụl dị elu (nọnọdụ ebelatara ebelata dị ka akọwara na 32.9.2)

  • Bishọp onye nke eji maka ya enwe kansụl (kenhọrọ; lee 32.9.3)

  • Onyeisi kworum okenye ma ọ bụ Otu Enyem aka (kenhọrọ; lee 32.10.1)

32.9.1

Onyeisi Stek

Onyeisi stek ahụ:

  • Nwere ikike nisi kansụl niile nke ịbụ onye otu nime stek; kosiladị, ọtụtụ nime kansụl ndịa ka ndị bishọp na-eme.

  • Ga-enyerịrị nkwado tupu bishọp enwee ike mee kansụl ịbụ onye otu.

  • Na-eme kansụl ịbụ onye otu stek ọ bụrụ ma nwoke ma ọ bụ nwanyị onye nataworo onyinye dị nsọ tempụl ka enwere ike iwepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ya.

  • Nwere ike ime kansụl ọ bụrụ ma onye otu rịọ arịrịọ maka mkpebi nke kansụl ịbụ onye otu ngalaba ukwu.

  • Ga-enyerịrị nkwado tupu nkwanye nke kansụl ịbụ onye otu nke ngalaba ukwu iji wepụ aha ịbụ onye otu ngalaba ukwu nke onye na-anatabeghị onyinye dị nsọ agwụchaa.

32.9.2

Kansụl Dị elu

Ndị otu kansụl dị elu anaghị esokarị eme ihe na kansụl niile nke ịbụ onye otu stek. Kosiladị, kansụl dị elu nwere ike isonye n’ọnọdụ ndị siri ike (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 102:2). N’ịmaatụ, otu ndịisi stek nwere ike kpọkuo kansụl dị elu isonye mgbe:

  • Enwere eziokwu ndị a na-azọ.

  • Ha ga-agbakwunye uru na ndabere.

  • Onye otu rịọrọ maka nsonye ha.

  • Onye otu ndịisi stek ma ọ bụ na ezi na ụlọ ya so na ya (lee 32.9.7).

32.9.3

Bishọp (ma ọ bụ Onyeisi Ngalaba nta dị n’ime Stek)

Bishọp ahu:

  • Nwere ikike na kansụl niile nke ịbụ onye otu ngalaba ukwu.

  • Na-agwa onyeisi stek ma nata nkwado ya tupu ime kansụl.

  • Nwere ike ọgaghị eme kansụl ma ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwanyị onye nataworo onyinye dị nsọ tempụl ka enwere ike iwepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ya. Kansụl ịbụ onye otu nke stek ka a ga-enyerịrị n’ọnọdụ ndị ahụ.

  • Ka enwere ike ịkpọku ịbịa kansụl ịbụ onye otu stek maka onye otu ngalaba ukwu onye ịbụ onye otu ya ka a na-elebara anya. Ọbịbịa ya ka onyeisi stek na onye ahụ ga-akwadorịrị.

Kansụl ịbụ onye otu ngalaba ukwu ma ọ bụ ngalaba nta nwere ike kwadoo iwepụ aha ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ma ọ bụrụ na onye ahụ anatabeghị onyinye dị nsọ. Kosiladị, nkwado nke onyeisi stek ka achọrọ tupu mkpebi ahụ abịa na ngwụcha.

Mgbe ụfọdụ a na-eme kansụl ịbụ onye otu ngalaba ukwu maka onye otu nataworo onyinye dị nsọ ma usoro niile na-egosi na enwere ike iwepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ya. N’ọnọdụ ndị a, bishọp na-ewegara okwu ahụ nye onyeisi stek.

32.9.4

Onyeisi Mishọn

Onyeisi mishọn ahụ:

  • Nwere ikike n’ebe kansụl niile nke ịbụ onye otu n’ime ngalaba nta niile na distrit niile dị na mishọn.

  • Ga-enyerịrị nkwado tupu onyeisi distrit ma ọ bụ ngalaba nta enwee ike mee kansụl ịbụ onye otu.

  • Na-eme kansụl ịbụ onye otu ọ bụrụ ma nwoke ma ọ bụ nwanyị onye nataworo onyinye dị nsọ tempụl ka enwere ike iwepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ya. Ọ bụrụ ma oge ma ọ bụ ntọanya gbochie nkea, o nwere ike nye otu n’ime ndị ndụmọdụ ya iduzi na kansụl ahụ. Ọ na-ahọpụta ndị ji Ọkwa nchụaja Melkizedek abụọ isonye.

  • Mgbe o kwere omume, na-eme kansụl niile nke ịbụ onye otu maka ndị ahụ na-anatabeghị onyinye dị nsọ. Ọ bụrụ ma oge ma ọ bụ ntọanya gbochie nkea, o nwere ike nye mmadụ atọ ndị ji Ọkwa nchụaja Melkizedek ikike ime ya. N’ọnọdụ nke a, onyeisi distrit ma ọ bụ onyeisi ngalaba nta nke onye otu ahụ na-emekarị kansụl ahụ.

  • Nwere ike ime kansụl ọ bụrụ ma onye otu rịọ arịrịọ maka mkpebi nke kansụl ịbụ onye otu distrit ma ọ bụ ngalaba nta.

  • Jiri nkwado nke onye Ji Ikike Zuru ọha sitere na Ngalaba Ndị Mgbasa Ozi ọma, na-eme kansụl ịbụ onye otu ọbụrụ ma onye mgbasa ozi ọma mee mmehie siri ike n’ogige mishọn (lee 32.9.8). Ọ nakwa enyocha okwu ahụ ya na onye otu nke otu Ndịisi Mpaghara ma dụọ ndụmọdụ ya na onyeisi stek nke stek obodo onye mgbasa ozi ọma ahụ.

  • Ga-enyerịrị nkwado tupu nkwanye nke kansụl ịbụ onye otu ngalaba nta ma ọ bụ distrit iji wepụ ịbụ onye otu nke na-anatabeghị onyinye dị nsọ bụ ngwụcha.

Ọ bụrụ ma onye mgbasa ozi ọma ekwupụta mmehie siri ike nke o mere tupu ije mishọn, onyeisi mishọn na-akpọtụrụ onye nnọchianya n’ubi ya dị n’ime Ngalaba Mgbasa ozi ọma maka ntụziaka.

Mgbe onyeisi mishọn na-eme kansụl ịbụ onye otu, ọ na-ahọpụta ndị ji Ọkwa nchụaja Melkizedek abụọ inyere ya aka. Naanị n’ọnọdụ pụrụ iche ka o kwesịrị ịhọpụta ndị mgbasa ozi ọma nta inye aka. Ọ na-esoro otu ụdị usoro ndị ahụ dị ka na kansụl ịbụ onye otu nke stek (lee 32.10). Kosiladị, onye kansụl dị elu ma ọ bụ kansụl distrit anaghị esonye.

32.9.5

Onyeisi Ngalaba nta ma ọ bụ Distrit dị n’ime Mishọn

Otu onyeisi distrit ma ọ bụ ngalaba nta dị n’ime mishọn nwere ike ime kansụl ịbụ onye otu mgbe enwetere ikike site n’aka onyeisi mishọn. Kansụl distrit anaghị esonye.

Kansụl ịbụ onye otu distrit ma ọ bụ ngalaba nta nwere ike kwadoo iwepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ nke mmadụ ọ bụrụ ma ọ natabeghị onyinye dị nsọ nke tempụl. Kosiladị, nkwado nke onyeisi mishọn ka achọrọ tupu mkpebi ahụ abịa na ngwụcha.

32.9.6

Odee akwụkwọ Stek ma ọ bụ Ngalaba ukwu

Odee akwụkwọ stek ma ọ bụ ngalaba ukwu ahụ:

  • Na-edebe edereede niile nke kansụl naanị ruo dị ka o si dị mkpa inyefe Repọọtụ Kansụl nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ.

  • Na-akwodebe fọm ọ bụrụ ma onye ndu ahụ duziri kansụl rịọ.

  • Anaghị esonye na mkparịta ụka ma ọ bụ mkpebi nke kansụl.

32.9.7

Nsonye n’Ọnọdụ ndị Pụrụ iche

Ọ bụrụ ma onye ndụmọdụ n’ime otu ndịisi stek enweghị ike isonye na kansụl ịbụ onye otu, onyeisi stek na-arịọ otu onye kansụl dị elu ma ọ bụ onye ọkwa nchụaja dị elu iwere ọnọdụ ya. Ọ bụrụ ma onyeisi stek enweghị ike isonye, otu Ndịisi Mbụ nwere ike inye otu nime ndị ndụmọdụ ya ikike iduzi n’ọnọdụ ya.

Ọ bụrụ ma onye ndụmọdụ n’ime otu bishọp enweghị ike isonye na kansụl ịbụ onye otu, bishọp nwere ike ịrịọ otu onye kansụl dị elu iwere ọnọdụ ya. Ọ bụrụ ma bishọp enweghị ike isonye, ọ na-ewegara okwu ahụ nye onyeisi stek, onye ga-akpọkọ kansụl ịbụ onye otu stek. Bishọp agaghị enwe ike ekenye onye ndụmọdụ ịkpọkọta kansụl ịbụ onye otu.

Ọ bụrụ na kansụl ịbụ onye otu ka a na-eme maka onye otu ezi na ụlọ nke bishọp ma ọ bụ otu n’ime ndị ndụmọdụ ya, a na-eme ya n’ọkwa stek. Ọ bụrụ na a na-eme ya maka onye otu ezi na ụlọ nke otu nime ndị ndụmọdụ nke onyeisi stek, onyeisi stek na-ekenye otu onye nchụaja dị elu iwere ọnọdụ nke onye ndụmọdụ ahụ. Ọ bụrụ na kansụl ịbụ onye otu ka a na-eme maka onye otu ezi na ụlọ nke onyeisi stek, ọ na-ajụta Ụlọọrụ nke Otu Ndịisi Mbụ.

Ọ bụrụ ma onye otu jụ maka nsonye nke bishọp ma ọ bụ ndị ndụmọdụ ya, a na-eme kansụl ịbụ onye otu n’ọkwa stek. Ọ bụrụ ma onye otu jụ maka nsonye otu nime ndị ndụmọdụ nke onyeisi stek, onyeisi stek na-ekenye otu onye nchụaja dị elu ọzọ iwere ọnọdụ nke onye ndụmọdụ ahụ. Ọ bụrụ ma onye otu jụ maka nsonye nke onyeisi stek, ma ọ bụ ọ bụrụ ma onyeisi stek enwee mmetụta na o nweghị ike ịkpa ókè, ọ na-ajụta Ụlọọrụ nke Otu Ndịisi Mbụ.

32.9.8

Ikpebi Onye ndu Ga-eme Kansụl n’Ọnọdụ niile ndị Pụrụ iche

Kansụl ịbụ onye otu niile ka a na-emekarị mgbe niile n’ụlọ ụka dị n’ala obodo ahụ nwere ndekọihe ịbụ onye otu nke onye ahụ.

Mgbe ụfọdụ kansụl ịbụ onye otu dị mkpa maka onye na-agagharị agagharị. Ọ bụrụ ma ngagharị ahụ bụrụ n’ime otu stek ahụ, onyeisi stek n’ekwurịta ya na ndị bishọp ngalaba ukwu abụọ ahụ ma kpebie ebe e kwesịrị ime ya.

Ọ bụrụ ma onye otu ahụ puo n’ofe stek ahụ, ndịisi stek nke stek abụọ ahụ n’ekwurịta ma kpebie ebe e kwesịrị ime ya. Ọ bụrụ ma ha kpebie na ekwesịrị ime ya na ngalaba ukwu ma ọ bụ stek nke mbụ, ndekọihe ịbụ onye otu ka a na-edebe na ngalaba ukwu ahụ tutu ruo mgbe kansụl ahụ zuru. Ma ọbụghị ya, ndekọihe ahụ ka a ga-ebufe na ngalaba ukwu ọhụrụ ahụ. Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-obisike na-agwa bishọp ma ọ bụ onyeisi stek onye otu ahụ nke ugbua banyere ihe mere kansụl ji dị mkpa.

Mgbe ụfọdụ kansụl ịbụ onye otu dị mkpa maka onye otu bipụrụ n’ebe obibi nwa oge. N’ịmaatụ, kansụl nwere ike dị maka nwa akwụkwọ ma ọ bụ onye otu nọ n’otu ndị agha. Bishọp ebe onye otu bi nwa oge nwere ike nye ndụmọdụ na nkwado. Kosiladị, o kwesịghị ime kansụl ịbụ onye otu ewezuga ma ndekọihe ịbụ onye otu nọ na ngalaba ya na bishọp nke ngalaba ukwu obodo ya adụwo ọdụ.

Mgbe ụfọdụ onye mgbasa ozi ọma na-eme mmehie siri ike n’ogige mishọn nke agaghị ekpughe tutu ruo mgbe atọghapụrụ ya. Bishọp na onyeisi stek na-ekwurịta banyere onye n’ime ha ga-eme kansụl ịbụ onye otu ahụ. Otu n’ime ha na-ekwurịtara onyeisi mishọn ya mbụ tupu ha eme ya.

32.10

Usoro niile maka Kansụl niile nke Ịbụ onye otu

32.10.1

Maa Ọkwa ma Kwadebe maka Kansụl ahụ

Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-enye onye otu ọkwa ederede maka kansụl ịbụ onye otu nke a ga-eme n’aha ya. Ọ na-abịanye aka n’akwụkwọ ozi ahụ. Ọ gụnyere ozi ndị sotere:

“Ndị [otu bishọp ma ọ bụ otu ndịisi stek] na-eme kansụl ịbụ onye otu n’aha gị. A ga-eme kansụl ahụ na [ụbọchi na oge] na [ebe].

“Kansụl nke a ga-atụle [chịkọta omume ọjọọ ahụ n’okwu izugbe, mana enyekwala nkọwa ma ọ bụ ihe akaebe].

“A na-akpọku gị ịbịa kansụl ahụ inye azịza gị. I nwere ike wete ederede nke edere site n’aka ndị nwere ike inye ozi bara uru. I nwere ike kpọkuo ụdị ndị ahụ ịgwa kansụl ahụ okwu n’aha gị ọ bụrụ ma enye nkwado tupu ebido site n’aka onyeisi stek ma ọ bụ bishọp. I nwekwara ike kpọkuo [onyeisi Otu Enyem aka ngalaba ukwu ma ọ bụ onyeisi kworum ndị okenye] ịnọ ma nye nkwado.

“Onye ọbụla na-abịa ga-adịrịrị na njikere irube isi nye ọdịdị nkwanye ugwu nke kansụl, gụnyere usoro ya na ịdị nzuzo ya niile. Onye ndụmọdụ iwu na ndị nkwado gafee ndị ahụ arụtụrụ aka nelu agaghị anọ ebe ahụ.”

Nkeji edemede nke ikpeazụ nwere ike gụnye ngosipụta nke ịhụnaanya, olile anya, na mmetụta.

Ntụziaka niile banyere onye onye ahụ nwere ike ịkpọku ịgwa kansụl okwu ka enyere na 32.10.3, ọnụọgụgụ 4.

Ọ bụrụ ma agaghị enwe ike iwega akwụkwọ ozi ahụ na mmadụ, enwere ike iziga ya site n’ụlọọrụ nzipụ ozi akwadoro, ebe a natara akwụkwọ ngwa ahịa.

Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-ahazi kansụl ịbụ onye otu n’oge ga-adabara onye ahụ. Ọ nakwa ahụta na enweworịị oge iji nwete ederede site n’aka ndị omume ọjọọ ahụ metụrụ ọ bụrụ ma ha chọọ iwete ha (lee 32.10.2).

Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-akwadebe onye otu maka kansụl ahụ site n’ịkọwa nzube na usoro ya niile. Ọ nakwa akọwa mkpebi niile kansụl ahụ nwere ike ime na mpụta ya niile. Ọ bụrụ ma onye otu ekwupụtawo njọ, onye ndu na-akọwa na nkwupụta njọ ahụ ka a ga-achọ iji mee ihe na kansụl ịbụ onye otu.

32.10.2

Nata Ederede niile site naka Ndị ihe metụrụ

Mgbe onye otu Nzukọ nsọ bụ onye ihe metụrụ (ụdị dị ka ndina ụgwa, mmetọ nwata, mmetọ di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ wayo), bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-akpọtụrụ bishọp ma ọ bụ onyeisi stek ugbua nke onye ahụ. Ndị ndu ndịa na-ekpebi ma ọ ga-enye aka inye onye ihe metụrụ ohere iwete ihe ederede banyere omume ọjọọ na nsonazụ ya niile. Ihe ederede ndịa ka enwere ike ịgụ na kansụl ịbụ onye otu (lee 32.10. 3, ọnụọgụgụ nke 3). Ndị ndu Nzukọ nsọ enweghị ikike ibido mmekọ ha na ndị ihe metụrụ ndị na-abụghị ndị otu Nzukọ nsọ.

Nzikọrịta ozi ọbụla na onye ihe metụrụ maka nzube nke a ka emere site n’aka bishọp ma ọ bụ onyeisi stek ya ugbua. Ọ bụrụ ma onye ihe metụrụ wete ihe ederede, onye ndu nke a na-enye ya bishọp ma ọ bụ onyeisi stek onye na-eme kansụl ịbụ onye otu. Ndị ndu garịrị akpachapụ anya nke ọma izere nkụja n’ihu. Lee 32.4.3 maka ịdọ aka ná ntị ndị ọzọ.

Ajụjụ ọbụla banyere onye ihe metụrụ onye n’erubeghị afọ 18 ka a na-eme site n’aka ndị nne na nna nwa ahụ ma ọ bụ ndị nlekọta n’okpuru iwu, ọ gwụla ma ime otu ahụ nwere ike tinye onye ahụ ihe metụrụ na ihe ize ndụ.

Maka ozi banyere ndị bishọp na ndịisi stek na-anata odudu n’okwu niile nke mmetọ, lee 32.4.5 na 38.6.2.1.

32.10.3

Duzie Kansụl ahụ

Ozugbo tupu kansụl amalite, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-agwa ndị nsonye niile kansụl bụ maka ya na omume ọjọọ nke a kọrọ na ya. Ọ bụrụ ma ọ dị mkpa, ọ na-akọwa usoro niile nke kansụl ahụ.

Onye ahụ, ọ bụrụ na ọnọ, ka a na-anabata nime ọnụ ụlọ mgbe ahụ. Ọ bụrụ na akpọkuwo bishọp ịbịa kansụl ịbụ onye otu stek, a na-akpọbatakwa ya n’ime ọnụ ụlọ ahụ n’oge nke a. Ọ bụrụ ma onye ahụ kpọkuru onyeisi Otu Enyem aka nke ngalaba ukwu ma ọ bụ onyeisi kworum ndị okenye ịnọ ma nye nkwado, a na-anabatakwa ya n’ime ọnụ ụlọ ahụ.

Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-eduzi kansụl ahụ na mmụọ nke ịhụnaanya, dị ka edepụtara n’okpuru.

  1. Ọ na-akpọku otu onye inye ekpere mmepe.

  2. Ọ na-agụpụta omume ọjọọ nke a kọrọ. Ọ na-enye onye ahụ (ọ bụrụ ma ọ nọrọ ya) ohere ikwete, ịgọnarịa, ma ọ bụ mee ka ederede ahụ doo anya.

  3. Ọ bụrụ na onye otu ahụ kwete omume ọjọọ ahụ, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-aganiihu ruo n’ọnụọgụgụ nke 5 dị n’okpuru. Ọ bụrụ na onye otu ahụ gọnarịa ya, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-ewepụta ozi banyere ya. Nke a nwere ike gụnye iwete akwụkwọ niile ndị a pụrụ ịdabere na ya ma na-agụpụta n’olu dara ụda ihe ederede niile sitere n’aka onye ihe metụrụ (lee 32.10.2). Ọ bụrụ na ọ gụpụta ụdị ederede nke a, ọ na-echekwa njirimara nke onye ihe metụrụ.

  4. Ọ bụrụ na onye otu ahụ gọnarịa ya, o nwere ike iwepụta ozi nye kansụl ahụ. Enwere ike ide nke a ede. Ma ọ bụ onye otu ahụ nwere ike jụọ ndị nwere ike iwete ozi dị mkpa ka ha kwuoro kansụl okwu, otu n’otu oge. Ụdị ndị a kwesịrị ịbụ ndị otu Nzukọ nsọ ọ gwụla ma bishọp ma ọ bụ onyeisi stek ebuwo ụzọ kpebie na onye na-abụghị onye otu nwere ike ịbịa. Ha na-eche nime ọnụ ụlọ dị iche tutu ruo mgbe a ga-akpọ ha ikwu okwu. Onye ọbụla na-apụ n’ọnụ ụlọ kansụl mgbe o mesịrị. Ha ga-adịrịrị njikere irube isi nye ọdịdị nkwanye ugwu nke kansụl, gụnyere usoro ya na ịdị nzuzo ya niile. Ndị otu agaghị enwe ike enwe onye ndụmọdụ iwu ga-abịa. Ọbụghị ma ha ga-enwe ndị nkwado niile karịa ndị ahụ arụtụrụ aka na nkeji edemede dị na nkeji nke a.

  5. Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike jụọ ajụjụ niile maka onye otu n’ụzọ nkwanye ùgwù. O nwere ike jụọkwa ajụjụ niile maka ndị mmadụ ọzọ onye otu ahụ rịọworo iwete ozi. Ndị ndụmọdụ nime otu ndị bishọp ma ọ bụ otu ndịisi stek nwere ike jụọ ajụjụ niile. Ajụjụ ọbụla kwesịrị ịdị nkenke ma ebelata ya ruo niihe ndị dị mkpa.

  6. Mgbe ewepụtasịworo ozi niile dị mkpa, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-asị ka onye otu site nime ọnụ ụlọ ahụ pụọ. A na-asịkwa ka odee akwụkwọ pụọ, ọ gwụla ma kansụl dị elu esonyewo mee ihe na kansụl ịbụ onye otu stek. Ọ bụrụ ma bishọp onye otu ahụ nọ ugbua maka kansụl stek ịbụ onye otu, a na-asị ya pụọ. Ọ bụrụ ma onyeisi Otu Enyem aka ma ọ bụ onyeisi kworum ndị okenye bịara inye nkwado, a na-asịkwa ya pụọ.

  7. Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-arịọ maka nkọwa ma ọ bụ nghọta site n’aka ndị ndụmọdụ ya. Ọ bụrụ ma kansụl dị elu esonyewo na kansụl stek ịbụ onye otu, ọ na-arịọ maka nkọwa na nghọta ha.

  8. Ya na ndị ndụmọdụ ya, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek site n’ekpere na-achọ ihe bụ uche Onyenwe anyị banyere ihe ahụ. Naanị onyeisi stek na ndị ndụmọdụ ya ma ọ bụ bishọp na ndị ndụmọdụ ya kwesịrị ịnọ nime ọnụ ụlọ ahụ n’oge a. Ọ bụrụ ma kansụl ịbụ onye otu gụnyere kansụl dị elu, otu ndịisi stek na-agakarị n’ime ụlọọrụ nke onyeisi stek.

  9. Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-agwa ndị ndụmọdụ ya maka mkpebi ya ma rịọ ka ha kwadoo ya. Ọ bụrụ ma kansụl ịbụ onye otu gụnyere kansụl dị elu, otu ndịisi stek na-alaghachi n’ime ọnụ ụlọ ahụ ma rịọ kansụl dị elu ịkwado ya. Ọ bụrụ ma onye ndụmọdụ ma ọ bụ onye kansụl dị elu nwere echiche dị iche, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek e gee ntị ma chọọ imezi ndịiche ahụ. Oke na ọrụ maka mkpebi ahụ dabeere na onyeisi nọ n’ọrụ.

  10. Ọ na-akpọghachi onye ahụ azụ n’ime ọnụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ ma odee akwụkwọ ka achụpụrụ, a nakwa akpọghachi ya nime ọnụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ ma bishọp nke onye otu ahụ nọ ugbua maka kansụl stek ịbụ onye otu, a na-akpọbatakwa ya n’ime ọnụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ ma onyeisi Otu Enyem aka ma ọ bụ onyeisi kworum ndị okenye bịara inye nkwado, a na-anabatakwa ya ọzọ.

  11. Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-ekwupụta mkpebi nke kansụl na mmụọ nke ịhụnaanya. Ọ bụrụ na mkpebi ahụ bụ igbochi n’akwụkwọ ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ma wepụ aha ịbụ onye otu, ọ na-akọwa ọnọdụ niile (lee 32.11.3 na 32.11.4). Ọ na-akọwakwa otu esi emeri mgbochi niile ma na-enye ntụziaka na ndụmọdụ ndị ọzọ. Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike kwụsị kansụl na nwa oge ịchọ odudu ọzọ ma ọ bụ ozi tupu ime mkpebi. Ọ bụrụ otu ahụ, ọ na-akọwa nke a.

  12. Ọ na-akọwa ikike onye ahụ maka ikpe mkpegharị (lee 32.13).

  13. Ọ na-akpọku otu onye inye ekpere mmechi.

Ma onye ahụ ọ nọ nebe ahụ ma ọ nọghị, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-agwa ya maka mkpebi ahụ dị ka akọwara na 32.12.1.

Ọ dịghị onye so mee ihe na kansụl ịbụ onye otu ka a na- ekwe ime rekọọdụ ọdio, vidiio, ma ọ bụ nke e dere ede. Odee akwụkwọ nwere ike detuo ihe maka ebumnobi nke ikwadebe Repọọtụ Kansụl nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ. Kosiladị, ụdị nootu ndị ahụ abụghị ndekọihe ma ọ bụ ndepụta okwu ruo n’okwu. Mgbe akwadosịrị repọọtụ ahụ, ngwa ngwa ọ na-emebi ihe edere ede niile ọbụla.

32.11

Mkpebi ndị sitere na Kansụl niile nke Ịbụ onye otu

Mkpebi ndị ahụ sitere na kansụl ịbụ onye otu kwesịrị ka Mmụọ na-eduzi ha. Ha kwesịrị ịtụgharị uche ịhụnaanya na olileanya Onye Nzọpụta nyere ndị ahụ chegharịrị. Mkpebi ndị kwere omume ka akọwara n’okpuru. Mgbe a na-eme mkpebi ndịa, ndị ndu na-atule ọnọdụ niile nke edepụtara na 32.7.

Mgbe kansụl ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ọbụla gasịrị, Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek n’egbughị oge na-enyefe Repọọtụ nke fọm Kansụl Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ site na LCR (lee 32.14.1).

Mkpebi niile sitere na kansụl ịbụ onye otu ka edepụtara na nkeji ndịa sotere.

32.11.1

Na-anọgide na Ọnọdụ Dị mma

N’oge ụfọdụ, aka mmadụ nwere ike dị ọcha ma na-anọgide na ọnọdụ dị mma. N’oge ọnọdụ ụfọdụ, mmadụ nwere ike mewo mmehie, nwee ezi nchegharị, ma na-anọgide na ọnọdụ dị mma. Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike nye ndụmọdụ ma dọọ aka na ntị banyere emereme ọdịniihu niile. Mgbe kansụl gasịrị, ọ na-aganiihu na-enye nkwado dị ka a chọrọ.

Foto, oyiyi
di na nwunye nọdụkọtara ọnụ

32.11.2

Ndụmọdụ Nke onwe na Bishọp ma ọ bụ Onyeisi stek

Na kansụl ịbụ onye otu ụfọdụ, ndị ndu nwere ike kpebie na onye otu ahụ anọghị nọnọdụ dị mma—mana mgbochi ịbụ onye otu n’ụkpụrụ iwu ndị ahụ ekwesịghị. N’oge ndịa, kansụl nwere ike kpebie na onye ahụ kwesịrị ịnata ndụmọdụ na mgbazi nke onwe site n’aka bishọp ma ọ bụ onyeisi stek. Ndụmọdụ nke a nwere ike gụnye mgbochi niile na-adịghị n’okpuru iwu dị ka edepụtara n’ime 32.8.3.

Ndụmọdụ nke onwe na mgbochi ịbụ onye otu na-adịghị n’okpuru iwu abụghị nke nhọrọ mgbe e mere kansụl maka njọ ndị e depụtara na 32.6.1.

32.11.3

Mgbochi niile nke Ịbụ onye otu N’okpuru iwu

N’ụfọdụ kansụl ịbụ onye otu, ndị ndu nwere ike kpebie na ọ ka mma igbochi n’okpuru iwu ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu nke Nzukọ nsọ nke mmadụ na nwa oge. Mgbochi niile n’okpuru iwu nwere ike dị mma maka ihe niile kama mmehie niile ma ọ bụ ọnọdụ ndị kachasị dị njọ, maka nke ịbụ onye otu ka enwere ike iwepụ aha na ya (lee 32.11.4).

Ndị ahụ nwere mgbochi ịbụ onye otu n’ụkpụrụ iwu ka bụkwa ndị otu Nzukọ nsọ. Kosiladị, ihe ùgwù ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ha niile ka egbochiri dị ka ndị a sotere:

  • Ha nwere ike ghara ịbanye na tempụl. Kosiladi, ha nwere ike gaaniihu na-eyi gament tempụl ọ bụrụ na ha anatawo onyinye dị nsọ. Ọ bụrụ na onye otu nwere rekọmend tempụl, onye ndu na-akagbu ya nime LCR.

  • Ha nwere ike ghara itinye ọkwa nchụaja n’ọrụ.

  • Ha nwere ike ghara iri oriri nsọ ma ọ bụ soro mee ihe n’ịkwado ndị ọrụ Nzukọ nsọ.

  • Ha nwere ike ghara ikwu okwu, ikuzi ihe, ma ọ bụ ikpe ekpere na ntọ Nzukọ nsọ niile. Ọbụghị ma ha nwere ike ije ozi na ọkpụkpọ oku Nzukọ nsọ.

A na-agba ha ume ịbịa nzukọ niile na ihe omume niile nke Nzukọ nsọ ọ bụrụ ma ha hazie omume ha. A na-agbakwa ha ume ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye niile.

Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike gbakwunye ọnọdụ ndị ọzọ, dị ka ịnọpụ iche site na akụrụngwa niile nke nziakwụna na mmetụta niile ihe ọjọọ ndị ọzọ. Ọ na-agbakwunyekarị ọnọdụ niile ndị dị mma. Ndị a nwere ike gụnye ịbịa Nzukọ nsọ mgbe niile, ikpe ekpere mgbe niile, na ịgụ akwụkwọ nsọ na akụrụngwa niile ndị ọzọ nke Nzukọ nsọ.

Ọ bụrụ na ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ mmadụ ka egbochiri n’okpuru iwu, a ga-ede ya na rekọọdụ ịbụ onye otu.

Oge nke mgbochi dị n’okpuru iwu na-anọkarị opekampe otu afọ ma nwere ike karịa. Mgbe onye otu ahụ na-enwe ọganiihu a kpọrọ aha na ezigbo nchegharị, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-eme kansụl ọzọ iji tulee iwepụ mgbochi niile ahụ (lee 32.16.1). Ọ bụrụ ma onye otu gaaniihu n’ụkpụrụ nke mmehie, onye ndu ahụ nwere ike mee kansụl ọzọ iji tulee usoro niile ndị ọzọ.

32.11.4

Mwepụ aha nke Ịbụ onye otu

N’ụfọdụ kansụl ịbụ onye otu, ndị ndu nwere ike kpebie na ọ ka mma iwepụ aha ịbụ onye otu Nzukọ nsọ nke mmadụ na nwa oge (lee Mozaya 26:36; Alma 6:3; Moronaị 6:7; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:83).

Iwepụ aha ịbụ onye otu Nzukọ nsọ nke mmadụ dị mkpa maka igbu mmadụ (dị ka akọwara nime 32.6.1.1) na ịlụ ọtụtụ nwanyị (dị ka akọwara nime 32.6.1.2). Ọ bụ ihe a na-achọkarị mgbe niile maka ndina ugwa dị ka akọwara nime 32.6.1.2 na 38.6.10.

Dị ka Mmụọ si tụzie aka, iwepụ aha ịbụ onye otu nke mmadụ nwekwara ike ịdị mkpa na ndịa sotere:

  • Maka ndị ahụ omume ha na-eme ha aghọọ oke ihe iyi egwu nye ndị ọzọ.

  • Maka ndị ahụ kachasị mee mmehie ndị siri ike.

  • Maka ndị ahụ na-anaghị egosi nchegharị site na mmehie ndị siri ike (lee ntule niile na 32.7).

  • Maka ndị ahụ na-eme mmehie ndị siri ike na-emerụ Nzukọ nsọ ahụ.

Kansụl ịbụ onye otu ngalaba ukwu, ngalaba nta, ma ọ bụ nke distrit nwere ike kwadoo iwepụ aha ịbụ onye otu Nzukọ nsọ site na onye na-anatabeghị onyinye dị nsọ. Kosiladị, nkwado nke onyeisi stek ma ọ bụ mishọn dị mkpa tupu mkpebi ahụ abịa na ngwụcha.

Ndị ahụ ewepụrụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ha enweghị ike enwe ọńụ ọbụla site na ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu.

  • Ha nwere ike ghara ịbanye na tempụl ma ọ bụ na-eyi gament tempụl. Ọ bụrụ na onye ahụ nwere rekọmend tempụl, onye ndu na-akagbu ya nime LCR.

  • Ha nwere ike ghara itinye ọkwa nchụaja n’ọrụ.

  • Ha nwere ike ghara iri oriri nsọ ma ọ bụ soro mee ihe n’ịkwado ndị ọrụ Nzukọ nsọ.

  • Ha nwere ike ghara ikwu okwu, ikuzi ihe, ma ọ bụ ikpe ekpere na ntọ Nzukọ nsọ niile ma ọ bụ duo na ihe omume ọbụla nime Nzukọ nsọ. Ọbụghị ma ha nwere ike ije ozi niime ọkpụkpọ oku Nzukọ nsọ.

  • Ha nwere ike ghara ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye niile.

A na-agba ha ume ịbịa nzukọ niile na ihe omume niile nke Nzukọ nsọ ọ bụrụ ma ha hazie omume ha.

Ndị ahụ ewepụrụ ịbụ ndị otu Nzukọ nsọ ha ka enwere ike itule maka nnabatagharị site na baptizim na ime onye otu. Mgbe dum, ọ dị mkpa na ha gosiri na mbụ ezigbo nchegharị ihe ga-eru opekampe otu afọ. Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-eme kansụl ịbụ onye otu ọzọ iji tulee nnabatagharị (lee 32.16.1).

Mkpebi niile na Nsonazụ niile nke Kansụl Ịbụ onye otu

Mkpebi

Nsonazụ niile

Mkpebi

Na-anọgide na Ọnọdụ Dị mma (lee 32.11.1)

Nsonazụ niile

  • Onweghị

Mkpebi

Ndụmọdụ nke Onwe na Bishọp ma ọ bụ Onyeisi Stek (lee 32.11.2)

Nsonazụ niile

  • Nwere ike inwe ụfọdụ ihe ùgwù nke ịbụ onye otu egbochiri na-anọghị n’okpuru iwu.

  • Mgbochi niile anaghị erucha karịa otu afọ; n’ọnọdụ ndị pụrụ iche, ha nwere ike karịa.

  • Mgbochi niile na-anọghị n’okpuru iwu ka a na-ewepụ mgbe enwetechara ezigbo nchegharị.

  • Enweghị ihe a na-ede nime rekọọdụ ịbụ onye otu.

Mkpebi

Mgbochi niile nke Ịbụ onye otu N’okpuru iwu (lee 32.11.3)

Nsonazụ niile

  • Ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu ka egbochiri n’okpuru iwu.

  • Mgbochi na-anọkarị opekampe otu afọ ma nwere ike karịa.

  • A ga-ede ihe n’ime rekọọdụ ịbụ onye otu.

  • Mgbochi nokpuru iwu ka a na-ewepụ mgbe enwetechasịrị ezi nchegharị, kansụl ịbụ onye otu, ma, ọ bụrụ ma ọ dị mkpa, nkwado nke Otu Ndịisi Mbụ.

  • Ihe ngosi rekọọdụ ịbụ onye otu ka a na-ewepụ ọ bụrụ ma ewepụ mgbochi niile mgbe kansụl ịbụ onye otu gasịrị (ewezuga ihenkọwa ndị dị mkpa; lee 32.14.5).

Mkpebi

Iwepụ aha Ịbụ onye otu (lee 32.11.4)

Nsonazụ niile

  • Emume nsọ niile ka akagburu.

  • Ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu ka ewepụrụ, na-abụkarị ihe ga-eru opekampe otu afọ.

  • Mmadụ na-etozu maka nnabataghachi site na baptizim na ime onye otu naanị mgbe emechara ezi nchegharị, kansụl ịbụ onye otu, ma, ọ bụrụ ma ọ dị mkpa, nkwado nke Otu Ndịisi Mbụ (lee 32.16).

  • Onye nweteburu onyinye dị nsọ tozuru ịnata mweghachite nke ngọzi niile naanị site na nkwado nke Otu Ndịisi Mbụ na mgbe opekampe otu afọ zuru site na nnabatagharị (lee 32.17.2).

  • Maka onye nweteburu onyinye dị nsọ, “Mweghachite nke Ngọzi niile Ka Achọrọ” ihe ngosị ka a na-ewepụ site na rekọọdụ ịbụ onye otu naanị mgbe emesịrị emume nsọ ahụ (ihe nkọwa niile a chọrọ ga-anọ; lee 32.14.5).

32.11.5

Ajụjụ niile banyere Ikpebi Ihe ndị Siri ike

Bishọp niile na-ewega ajụjụ niile banyere ntụziaka niile dị na handbook maka kansụl ịbụ onye otu n’aka onyeisi stek.

Maka okwu ndị siri ike, onyeisi stek nwere ike chọọ ndụmọdụ site naka onye Iri Asaa Mpaghara enyere ya. Onyeisi stek ga-adụrịrị ọdụ ya na Otu Ndị isi Mpaghara maka ihe ndị edepụtara n’ime 32.6.3. Kosiladị, onyeisi stek ekwesịghị ịjụ onye Iri Asaa Mpaghara ma ọ bụ Onye Ji Ikike Zuru ọha ajụjụ otu esi ekpebi okwu ndị siri ike. Onyeisi stek na-ekpebi ma a ga-enwe kansụl iji kwuzie agwa ahụ. Ọ bụrụ ma enwee kansụl, onyeisi stek ma ọ bụ bishọp na-ekpebi ihe mpụta ya.

32.11.6

Otu Ndịisi Mbụ Ji Ikike

Otu Ndịisi Mbụ nwere ikike ikpeazụ niihe gbasara mgbochi niile na mwepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ.

32.12

Ngosi niile na Ọkwa niile

Mkpebi nke kansụl ịbụ onye otu ka a na-agwa onye ahụ—ma ndị ọzọ dị ka ọ dị mkpa—dị ka akọwara n’okpuru.

32.12.1

Ịgwa Mmadụ maka Mkpebi

Bishọp ahụ na onyeisi stek na-agwakarị onye ahụ ihe mpụta nke kansụl ahụ bụ mgbe e kwubiri ya. Kosiladị, o nwere ike kwụsị kansụl na nwa oge ịchọ odudu ọzọ ma ọ bụ ozi tupu ime mkpebi.

Kansụl ịbụ onye otu ngalaba ukwu, ngalaba nta, ma ọ bụ nke distrit nwere ike kwadoo iwepụ aha ịbụ onye otu Nzukọ nsọ site na onye na-anatabeghị onyinye dị nsọ. Kosiladị, nkwado nke onyeisi stek ma ọ bụ mishọn dị mkpa tupu mkpebi ahụ abịa na ngwụcha.

Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-akọwa mmetụta niile nke mkpebi ahụ dị ka edepụtara n’ime 32.11. Ọ na-enyekarị ndụmọdụ n’ọnọdụ niile nke nchegharị ya mere mgbochi niile ka enwere ike iwepụ ma ọ bụ enwere ike ịnabatagharị onye ahụ niime Nzukọ nsọ.

Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-enye onye ahụ ọkwa ederede n’oge maka mkpebi na ihe mmetụta ya. Ọkwa nke a mejupụtara ederede zuruọha na emereme ahụ ka emere na nzaghachi nye omume megidere iwu niile na usoro iwu nke Nzukọ nsọ. O nwekwara ike gụnye kansụl banyere iwepụ mgbochi niile nke ịbụ onye otu ma ọ bụ ịnabatagharị n’ime Nzukọ nsọ. O kwesịrị ime ka onye ahụ mara na ya nwere ike tinye arịrịọ mkpegharị mkpebi ahụ (lee 32.13).

Ọ bụrụ ma onye ahụ abịaghị kansụl ahụ, ọkwa ederede nwere ike zuo oke iji zie ya maka mkpebi ahụ. Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwekwara ike izute onye ahụ.

Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek anaghị enye onye ahụ kọpị akwụkwọ Repọọtụ Kansụl nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ.

32.12.2

Ịgwa Ndị ọzọ banyere Mkpebi

Ọ bụrụ na bishọp ma ọ bụ onyeisi stek gbochie na-abụghị n’okpuru iwu ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu nke mmadụ na ndụmọdụ nke onwe, ọ naghị agwa onye ọbụla ọzọ (lee 32.8.3). Kosiladị, ndị ndu ndịa na-agwa ibe ha okwu banyere mgbochi na-anọghị n’okpuru iwu dị ka ha na-enyere ndị otu aka.

Ọ bụrụ ma ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu ka egbochiri n’okpuru iwu ma ọ bụ wepụ na kansụl ịbụ onye otu, bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-agwa mkpebi ahụ naanị nye ndị ahụ kwesịrị ịma. Ntụziaka ndị a sotere na-emetụta.

  • Ọ na-atụle mkpa niile nke ndị ihe metụrụ na ndị ihe nwere ike imetụta na mmetụta niile nke ezi na ụlọ onye ahụ.

  • Ọ naghị ekwu mkpebi ahụ ọ bụrụ ma onye ahụ na-arịọ mkpegharị maka ya. Kosiladị, o nwere ike zie ozi na a na-etinye arịrịọ mkpegharị maka ya ọ bụrụ ma o chee na ọ dị mkpa ichekwa ndị ihe nwere ike imetụta. O nwekwara ike zie ya iji kwadoo ọgwụgwọ nke ndị ihe metụrụ (agbanyeghị ọ naghị enye aha ndị ihe metụrụ) ma ọ bụ chekwaa ezi aha Nzukọ nsọ.

  • Dị ka a chọrọ, bishọp ahụ na-ekwu mkpebi ahụ na ntụkwasị obi nye ndị otu kansụl ngalaba ukwu. Nke a bụ ịgwa ndị ndu ndị nwere ike ịhụta onye ahụ ịdị adị maka ọkpụkpọ oku niile, ikuzi ihe ọmụmụ niile, ma ọ bụ ikpe ekpere ma ọ bụ ikwu okwu. Ọ bụkwa iji gbaa ndị ndu ume ilebara onye otu ahụ anya ma kwadoo ezi na ụlọ ya.

  • Site na nkwado sitere n’aka onyeisi stek, bishọp ahụ nwere ike kwuo maka mkpebi ahụ na nzukọ niile nke kworum ndị okenye na Otu Enyem aka nke ngalaba ukwu ya ọ bụrụ ma ọnọdụ ahụ metụtara:

    • Agwa nrigbu niile nke nwere ike ịmaja ndị ọzọ.

    • Ikuzi ozizi ụgha ma ọ bụ ụdị ngọnarị okwukwe ọzọ niile.

    • Mmehie ndị pụtara ihe dị ka ịlụ ọtụtụ nwanyị ma ọ bụ iji nkuzi otu nzuzo niile na-adọta ihe a na-esote.

    • Imegide n’ihu ọha emereme niile ma ọ bụ nkuzi niile nke ndị ndu Nzukọ nsọ zuruọha ma ọ bụ nke obodo.

  • N’ọnọdụ ndị dị otu a, ọ dị mkpa na onyeisi stek nwekwara ike kwadoo nzipụ ozi nye ndị otu ngalaba ukwu ndị ọzọ dị n’ime stek ahụ.

  • N’ọnọdụ ụfọdụ, bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike chee na ọ ga-enye aka ịgwa ụfọdụ ma ọ bụ ndị niile ihe metụrụ na ndị ezi na ụlọ ha na emewo kansụl ịbụ onye otu maka onye ahụ. Ọ na-eme nke a site n’aka bishọp ma ọ bụ onyeisi stek ha.

  • Ọ bụrụ ma agwa nrigbu niile nke onye ahụ n’etinye ndị ọzọ n’ize ndụ, bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike nye ịdọ aka na ntị niile iji nye aka chekwaa ndị ọzọ. Ọ naghị ekpughe ozi nzuzo ma ọ naghị ama amụma.

  • N’ọnọdụ ndị ọzọ, bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek n’ewedata nzipụ ozi ọbụla ruo na ederede izugbe. Ọ na-ekwu naanị na egbochiworịị ma ọ bụ wepụworịị ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ n’ihi omume nke megidere iwu niile na usoro iwu nke Nzukọ nsọ. Ọ na-arịọ ndị nọ oge ahụ ịghara ịkparịta ụka banyere ya. Ọ naghị ajụ ma ha kwadoro ma ọ bụ megide emereme ahụ.

  • Ọ bụrụ ma onye otu nọ nọnọdụ dị mma mgbe kansụl ịbụ onye otu gasịrị (lee 32.11.1), bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike izipu ozi ahụ iji chụpụ asịrị niile.

32.12.3

Izipụ ozi Ịgba Arụkwaghịm nke Ịbụ onye otu

N’ọnọdụ ụfọdụ, bishọp nwere ike kwesị izipụ ozi na mmadụ agbaala arụkwaghịm n’ịbụ onye otu ya n’ime Nzukọ nsọ (lee 32.14.9). Bishọp ahụ anaghị enye nkọwa ọzọ ọbụla.

32.13

Arịrịọ mkpegharị maka Mkpebi

Onye otu nwere ike rịọ mkpegharị maka mkpebi nke kansụl ịbụ onye otu nke ngalaba ukwu n’aka onyeisi stek n’ime ụbọchi 30. Onyeisi stek na-eme kansụl ịbụ onye otu stek iji tulee arịrịọ ahụ. O nwekwara ike rịọ bishọp ịkpọkọ kansụl ma tụlegharịa mkpebi emere, kachasị ọ bụrụ ma enwere ozi ọhụrụ.

Onye otu nwere ike rịọ mkpegharị maka mkpebi nke kansụl ịbụ onye otu stek site n’idegara Otu Ndịisi Mbụ ozi n’ime ụbọchi 30. Onye otu ahụ na-enye onyeisi stek ahụ leta inyefe n’aka Otu Ndịisi Mbụ.

Na mishọn, onye otu nwere ike rịọ mkpegharị maka mkpebi nke kansụl ịbụ onye otu nke ngalaba nta ma ọ bụ distrit n’aka onyeisi mishọn n’ime ụbọchi 30. Onyeisi mishọn na-eme kansụl ịbụ onye otu iji tulee arịrịọ ahụ. Ọ bụrụ ma oge ma ọ bụ ntọanya gbochie ya site na-ime nke a, ọ na-esoro ntụziaka ndị dị n’ime 32.9.4.

Ọ bụrụ ma onyeisi mishọn tụziri aka na kansụl ahụ, onye otu nwere ike rịọ maka mkpebi ahụ site n’idegara Otu Ndịisi Mbụ leta n’ime ụbọchi 30. Onye otu ahụ na-enye onyeisi mishọn leta ahụ inyefe n’aka Otu Ndịisi Mbụ.

Onye ọbụla rịọrọ mkpegharị mkpebi na-akọwapụta n’odide mmejọ niile ma ọ bụ ezighị ezi ndị eboro ya n’usoro ma ọ bụ mkpebi ahụ.

Ọ bụrụ ma e mere kansụl iji tulee arịrịọ mkpegharị ọbụla, otu mkpebi ma ọ bụ abụọ ga-ekwe omume:

  • Kwe ka mkpebi emere n’isi mbụ guzoro.

  • Belata mkpebi nke isi mbụ.

Mkpebi niile nke Otu Ndịisi Mbụ bụ o kwuchaa ọ gwụ ma enweghị ike ịrịọ mkpegharị ya ọzọ.

32.14

Repọọtụ niile na Ndekọihe niile nke Ịbụ onye otu

32.14.1

Repọọtụ nke Kansụl Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ

Mgbe kansụl ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ọbụla gasịrị, Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-egbughị oge na-enyefe Repọọtụ nke Kansụl Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ site na LCR. O nwere ike rịọ odee akwụkwọ ikwado repọọtụ ahụ. Ọ na-ahụ na enweghị kọpị fọm nke e dere ede ma ọ bụ nke dị na kọmputa edebere na mpaghara. Ọ nakwa ahụ na nootu ọbụla eji kwadobe repọọtụ ahụ ka a na-ebibi ngwa ngwa.

32.14.2

Mgbochi niile nke Ịbụ onye otu N’okpuru iwu

Mgbochi niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ka a na-ede na ndekọihe ịbụ onye otu nke onye ahụ. Isi ụlọọrụ nke Nzukọ nsọ na-eme ndetu nke a mgbe a natachara Repọọtụ Kansụl nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ. Mgbe onye otu ahụ chegharịworo, onye ndu ga-emerịrị kansụl ọzọ iji tulee iwepụ mgbochi ndị a (lee 32.16.1).

32.14.3

Ndekọihe niile mgbe Ewepụsịrị Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ nke Mmadụ.

Ọ bụrụ ma ewepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ mmadụ, isi ụlọọrụ nke Nzukọ nsọ na-ewepụ ndekọihe nke ịbụ onye otu mgbe a natachara Repọọtụ Kansụl nke Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ. Ọ bụrụ ma onye ahụ chọọ, ndị ndu enyere ya aka kwadobe ka anabataghachi ya na Nzukọ nsọ site na baptizim na ime onye otu (lee 32.16.1).

32.14.4

Ndekọihe niile mgbe Anabataghachiri na Nzukọ nsọ

Mgbe anabataghachiri mmadụ na Nzukọ nsọ, bishọp ahụ na-enyefe Repọọtụ nke fọm Kansụl Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ. Anaghị emepụta Asambodo Baptizim na Ime onye otu. Kama, a na-edetu baptizim na ime onye otu nime Repọọtụ fọm nke Kansụl Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ.

Ọ bụrụ ma enyeghị onye otu onyinye dị nsọ, isi ụlọọrụ Nzukọ nsọ na-ekenye ndekọihe ịbụ onye otu nke n’egosi agụgụ ụbọchi niile nke baptizim na emume nsọ mbụ ndị ọzọ ya. Ndekọihe ahụ anaghị enwe nrụaka nye nfụnarị nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ.

Ọ bụrụ ma onye otu anatawo onyinye dị nsọ, isi ụlọọrụ Nzukọ nsọ na-emelite ndekọihe nke ịbụ onye otu iji gosi agụgụ ụbọchi niile nke baptizim na ime onye otu ọhụrụ ahụ. Ndekọihe nke a gụnyere ozi “ Mweghachite nke Ngọzi niile Achọrọ” Mgbe eweghachiteworo ngọzi niile nke onye otu ahụ (lee 32.17.2), a na-emelite ndekọihe nke ịbụ onye otu iji gosi agụgụ ụbọchi niile nke baptizim na emume nsọ mbụ ndị ọzọ. Ọ naghị enwe nrụaka nye nfụnarị nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ.

32.14.5

Ndekọihe niile nke Ịbụ onye otu nwere Nkọwa niile

Dị ka Otu Ndịisi Mbụ si nye ikike, isi ụlọọrụ Nzukọ nsọ na-akọwa ndekọihe ịbụ onye otu nke mmadụ n’ọnọdụ ọbụla ndị edepụtara n’okpuru.

  1. Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-enyefe Repọọtụ fọm nke Kansụl Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ na-egosi na ịbụ onye otu nke onye ahụ ka egbochiri ma ọ bụ wepụ n’okpuru iwu n’ihi omume ọbụla n’ime ndịa sotere:

    1. Ndina ụgwa

    2. Mmetọ mmekọahụ nke nwata ma ọ bụ ntoroọbịa, nrigbu mmekọahụ nke nwata ma ọ bụ ntoroọbịa, ma ọ bụ mmegbu siri ike nke anụ ahụ ma ọ bụ nke echiche nke nwata ma ọ bụ ntoroọbịa

    3. Itinye aka na nziakwụna nwata dị ka edepụtara na 38.6.6

    4. Ịlụ Ọtụtụ nwanyị

    5. Omume nrigbu mmekọahụ nke okenye

    6. Ntụgharị okike—omume niile iji tụgharịa ruo na okike nke na-abụghị nke e jiri mụọ onye ahụ (lee 38.6.23).

    7. Iri Ego Nzukọ nsọ ma ọ bụ izu arịa nke Nzukọ nsọ (lee 32.6.3.3)

    8. Mmetọ ọdịmma nke Nzukọ nsọ

    9. Omume iyi egwu (dị ka nke mmekọahụ, nke ime ihe siri ike, ma ọ bụ nke ego) ma ọ bụ omume nke na-emerụ Nzukọ nsọ ahụ

  2. Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-enyefe ozi edere ede nke onye ahụ:

    1. Ekwetewo na ma ọ bụ amawo ikpe maka mmebi iwu gụnyere otu n’ime emereme ndị edepụtara n’elu.

    2. Ka a chọpụtara na ikpe mara n’emereme iwu nke mpụ na omume ndị ọzọ iwu megidere gụnyere otu n’ime emereme ndị edepụtara n’elu.

Mgbe bishọp natara ndekọihe nke ịbụ onye otu nwere nkọwa, ọ na-esoro ntụziaka ndị dị n’ime nkọwa ahụ.

Naanị Otu Ndịisi Mbụ nwere ike inye ikike iwepụ nkọwa site na ndekọihe nke ịbụ onye otu. Ọ bụrụ ma onyeisi stek kwadoo iwepụ otu nkọwa, ọ na-eji LCR (lee 6.2.3). Ụlọọrụ nke Otu Ndịisi Mbụ na-agwa ya ọ bụrụ ma akwadowo nkwado ahụ ma ọ bụ na akwadoghị ya.

32.14.6

Inye Repọọtụ Ohi Ego niile nke Nzukọ nsọ

Ọ bụrụ ma egbochie ịbụ onye otu nke mmadụ ma ọ bụ wepụ aha maka iri ego Nzukọ nsọ, bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-enye repọọtụ ya dị ka edepụtara na 34.7.5.

32.14.7

Mbuga Mgbochi niile na Ndekọihe niile nke Ịbụ onye otu

Mgbe ụfọdụ onye otu Nzukọ nsọ na-akwapụ ebe emereme ịbụ onye otu ma ọ bụ nchegbu ndị ọzọ siri ike ka na-eche. Mgbe ụfọdụ ọ dị mkpa na bishọp ga-ezigara bishọp ọhụrụ ahụ ozi tupu iwefe ndekọihe ịbụ onye otu na ngalaba ọhụrụ ahụ. N’ọnọdụ ndịa, bishọp ahụ (ma ọ bụ odee akwụkwọ ọ bụrụ ma enye ya ikikere) nwere ike tinye mgbochi mbufe na ndekọihe ịbụ onye otu ahụ. Ndekọihe na-anọ na ngalaba ahụ tutu ruo mgbe bishọp ahụ (ma ọ bụ odee akwụkwọ ọ bụrụ ma enye ikikere) na-ewepụ mgbochi ahụ. Nke a na-enye ohere maka bishọp ahụ izipụ ozi nchekasị niile na ozi.

32.14.8

Ndekọihe niile nke Ndị ahụ Akpọchiri akpọchi

Ụfọdụ ndị otu ka a mara ikpe maka mmebi iwu ma akpọchiwo ha. Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek nke ngalaba ahụ ebe onye ahụ biiri mgbe mpụ ahụ mere na-aganiihu jiri emereme ọbụla dị mkpa maka mgbochi niile ma ọ bụ mwepụ aha ịbụ onye otu n’okpuru iwu. Ọ bụrụ ma egbochie ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu, onye ndu ahụ (ma ọ bụ odee akwụkwọ ọ bụrụ ma enye ikikere) n’eziga ndekọihe nke ịbụ onye otu na ngalaba nke ọ dị n’aka maka ebe akpọchiri onye ahụ. Ọ bụrụ na ewepụrụ ịbụ onye otu, bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-akpọtụrụ onye ndu nke ngalaba ahụ. (Lee 32.15.)

32.14.9

Arịrịọ niile iji Kwụsị Ịbụ onye otu

Ọ bụrụ ma onye otu rịọ ka akwụsị ịbụ onye otu ya na Nzukọ nsọ, bishọp ahụ na-agaru ịhụ ma o dị njikere ịkparịta ụka banyere nchegbu niile ahụ ma nwaa idozi ha. Bishọp ahụ na onye otu nwekwara ike ịdụkọrịta ọdụ ha na onyeisi stek. Onye ndu ahụ na-ahụ na onye otu ghọtara nsonazụ ndị sotere ịkwụsị ịbụ onye otu Nzukọ nsọ:

  • Ọ na-akagbu emume nsọ niile.

  • Ọ na-ewepụ ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu.

  • Nnabataghachi site na baptizim na ime onye otu nwere ike ime naanị mgbe agbasịrị ajụjụ ọnụ nke ọma na, n’ọtụtụ ọnọdụ, kansụl ịbụ onye otu (lee 32.16. 32.16).

  • Onye nweteburu onyinye dị nsọ tozuru oke ịnata mweghachite nke ngọzi niile nke ọkwa nchụaja na tempụl naanị site na nkwado Otu Ndịisi Mbụ na mgbe opekampe otu afọ zuru oke site na nnabatagharị (lee 32.17.2).

Ọ bụrụ ma onye otu ka chọrọ ịkwụsị ịbụ onye otu Nzukọ nsọ, ọ na-enye bishọp ahụ arịrịọ edere ede, abịanyere aka na ya. Bishọp ahụ na-enyefe arịrịọ ahụ n’aka onyeisi stek site na LCR. Onyeisi stek mgbe ahụ na-enyochagharị ma nyefee arịrịọ ahụ site na sistem ahụ. Ndị ndu kwesịrị ime ihe maka arịrọ niile ngwa ngwa.

Mmadụ nwekwara ike kwụsị ịbụ onye otu site n’iziga arịrịọ abịanyere aka nke onye nwere ikike kwadoro nye isi ụlọọrụ Nzukọ nsọ.

Nwantakịrị chọrọ ịkwụsị ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ya na-esoro otu ụdị usoro ahụ dị ka okenye, ewezuga otu ihe: nwantakịrị ahụ kwesịrị ịbịanye aka (ọ bụrụ na ọ gafeela afọ 8) na site n’aka (ndị) nne na nna ma ọ bụ (ndị) nlekọta ndị nwere ikike nlekọta iwu kwadoro.

Ọ bụrụ ma onye otu na-akwụsị ịbụ onye otu n’eyi egwu emereme nke iwu megide Nzukọ nsọ ma ọ bụ ndị ndu ya, onyeisi stek na-esoro ntụziaka niile dị na 38.8.23.

Arịrịọ iji kwụsị ịbụ onye otu kwesịrị ka emee ihe na ya ọbụna ọ bụrụ ma ndị ndu ọkwa nchụaja nwere ozi banyere mmehie siri ike. Ozi ọbụla banyere mmehie a na-edozighị ka a na-edetu mgbe ezigara arịrịọ ahụ site na LCR. Nke a na-ekwe ndị ndu ọkwa nchụaja idozi ụdị okwu ndịa n’ọdịniihu ọ bụrụ ma onye ahụ tinye akwụkwọ maka nnabataghachi n’ime Nzukọ nsọ (lee 32.16.2).

Onye ndu ọkwa nchụaja ekwesịghị ịkwado nkwụsị ịbụ onye otu Nzukọ nsọ iji nwee ike zere ime kansụl ịbụ onye otu.

Ndị ndu na-aganiihu ije ozi nlekọta nye ndị ahụ kwụsịrị ịbụ onye otu ọ gwụla ma ha rịọrọ ka aghara ịkpọtụrụ ha.


IWEGHACHI IHE ÙGWÙ NIILE NKE ỊBỤ ONYE OTU NZUKỌ NSỌ


Ọ bụrụ ma ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ka egbochiworo ma ọ bụ wepụ, ndị ndu na-emere ya enyi, nye ndụmọdụ, ma kwadoo onye ahụ dị ka o siri kwe. Nkeji nke a na-akọwa otu enwere ike isi weghachi ihe ùgwù ndịa.

32.15

Gaaniihu N’eje ozi nlekọta

Ọrụ nke bishọp ma ọ bụ onyeisi stek dị ka onye ikpe izugbe anaghị akwụsị mgbe onye otu natara mgbochi niile nke ịbụ onye otu ma ọ bụ ewepụwo ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ya. Ọ na-aganiihu ije ozi nlekọta, dị ka onye ahụ siri kwe, ya mere o nwere ike ọzọ inwe ańụrị na ngọzi niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ. Bishọp ahụ na onye ahụ n’ezutekarị ma, mgbe ọ ga-enye aka ma kwe omume, di ma ọ bụ nwunye ya. Onye Nzọpụta kuziiri ndị Nifaị:

“Unu agaghị achụpụ ya site … n’ebe ofufe unu niile, n’ihi na nye ụdị ndị ahụ ka unu ga-aganiihu na-ezi ozi ọma; n’ihi na unu amaghị ma ha ga-alaghachi ma chegharịa, ma jiri nzube nke obi zuru oke, ma aga m agwọ ha; ma unu ga-abụ ụzọ esi eweta nzọpụta nye ha” (3 Nephi 18:32).

Oge ahụ nnọọ mgbe mgbochi ma ọ bụ iwepụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ nke mmadụ gasịrị ọ na-ara ahụ ma dị egwu nye ezi na ụlọ ya. Ndị ndu kwesịrị inwe mmetụta uche nye mkpa ndịa ma gbaa ume ma nyere ndị otu ezi na ụlọ aka.

Bishọp ahụ na-ahụ na ndị otu nwere obi ilekọta ka a ga-ekenye ije ozi nlekọta nye onye egbochiri ma ọ bụ ewepụrụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ya, dị ka onye ahụ kwere. Ha nakwa eje ozi nlekọta nye ndị otu ọzọ nke ezi na ụlọ ahụ. Ndị mmadụ nọ n’okpuru mgbochi niile nke ịbụ onye otu nwere ike irite site na nsonye na-ime indexing (lee 25.4.3).

Ọ bụrụ ma onye ahụ site na ngalaba ukwu pụọ, bishọp ahụ na-agwa bishọp ọhụrụ ahụ ma kọwaa ihe ndị ka dịkwa mkpa ime tupu ewepụ mgbochi niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ. Ọ bụrụ ma ewepụrụ ịbụ onye otu nke onye ahụ site na Nzukọ nsọ ma ọ bụ na akwụsịrị ịbụ onye otu nke onye ahụ, bishọp ahụ na-eme otu ụdị mmekọrịta ahụ ma ọ bụrụ ma onye ahụ ekwere ka enyere ya aka site n’aka ndị ndu Nzukọ nsọ.

32.16

Iwepụ Mgbochi niile dị N’okpuru iwu ma ọ bụ Ịnabatagharị Ya na Nzukọ nsọ

32.16.1

Kansụl niile nke Ịbụ onye otu iji Wepụ Mgbochi niile dị Nokpuru iwu ma ọ bụ Ịnabatagharị Mmadụ

Mgbe egbochiri ma ọ bụ wepụ ihe ùgwù niile nke ịbụ onye otu na kansụl ịbụ onye otu, a na-ehiwe kansụl ọzọ iji tulee iwepụ mgbochi niile ma ọ bụ ịnabatagharị onye ahụ na Nzukọ nsọ. Kansụl nke a kwesịkwara inwe otu ụdị ogo ikikere (ma ọ bụ karịa) dị ka kansụl nke mbụ. N’ịmaatụ, ọ bụrụ na onyeisi stek ma ọ bụ onyeisi mishọn tụziri aka na kansụl nke mbụ, onyeisi stek ma ọ bụ onyeisi mishọn ga-atụziaka na kansụl ahụ iji tulee iwepụ mgbochi niile ma ọ bụ ịnabatagharị onye ahụ.

Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek nke ugbua na-eme kansụl ahụ. Na mbụ ọ na-ahụ na onye ahụ echegharịwo ma dịrị njikere ma tozuo oke irite ngọzi niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ.

Ndị ahụ egbochiworo ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ha n’okpuru iwu kwesịrị ịdị na-egosikarị ezigbo nchegharị n’ihe ga-eru opekampe otu afọ tupu echee echiche iji wepụ mgbochi niile ahụ. Ndị ahụ ewepụrụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ha dị ka ha kwesịrị ịdị na-egosikarị ezigbo nchegharị n’ihe ga-eru opekampe otu afọ tupu elee anya maka ịnabatagharị ha. Maka onye otu onye jiiri ọkwa Nzukọ nsọ pụtara ihe n’oge nke mmehie ahụ siri ike, oge ya na-adịkarị ogologo karịa (lee 32.6.1.4).

Kansụl iji chebara echiche iwepụ mgbochi niile ma ọ bụ ịnabatagharị mmadụ na Nzukọ nsọ na-esoro otu ụdị ntụziaka ndị ahụ dị ka kansụl niile ndị ọzọ nke ịbụ onye otu. Bishọp kwesịrị ịnata nkwado site n’aka onyeisi stek iji mee kansụl ahụ. Na mishọn, onyeisi ngalaba nta ma ọ bụ onyeisi distrit kwesịrị ịnata nkwado site n’aka onyeisi mishọn.

Ntụziaka niile sotere na-emetụta mgbe a na-eme kansụl ịbụ onye otu iji tulee iwepụ mgbochi niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ma ọ bụ ịnabatagharị mmadụ na Nzukọ nsọ. Ọbụghị ntụziaka ndịa niile nwere ike ịdaba n’ime ọnọdụ ọbụla.

  1. Nnyocha kansụl mbụ nke ịbụ onye otu. Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-enyocha Repọọtụ nke fọm Kansụl Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ. Ọ na-arịọ maka otu kọpị site na LCR. Mgbe enyochara fọm ahụ, o nwere ike kpọtụrụ bishọp ma ọ bụ onyeisi stek ebe emere kansụl mbụ iji chọọ nkọwa.

  2. Jụọ onye ahụ ajụjụ ọnụ. Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-agba onye ahụ ajụjụ ọnụ nke ọma iji mata ike nke okwukwe ya n’ime Jịzọs Kraịst na ebe nchegharị ya ruru. Ọ nakwa ekpebi ma onye ahụ o mezuwo ọnọdụ niile edepụtara na emereme nke mbụ.

  3. Kpebie ọnọdụ nke emereme ụlọ ikpe mpụ ma ọ bụ nke obodo. Mgbe ụfọdụ mmadụ ekwetewo na ma ọ bụ na ikpe mpụ amawo ya. Mgbe ụfọdụ ejidewo mmadụ dara iwu n’emereme obodo maka aghụghọ ma ọ bụ omume ndị ọzọ iwu megidere. N’ọnọdụ ndịa, onye ndu ahụ niime ihe niile adịghị eme kansụl tutu ruo mgbe onye ahụ mejupụtara ọnọdụ niile nke ikpe ọbụla, iwu, ma ọ bụ ikpe ekpere site n’aka ndị ji ikike nke iwu. Ọnọdụ ndị a nwere ike ịgụnye ịtụ mkpọrọ, mnwale, nkwa onye nga, na nra niile ma ọ bụ nkwụghachi. Mwezuga niile na-achọ nkwado site n’aka Otu Ndịisi Mbụ tupu e mee kansụl ịbụ onye otu. Mwezuga ndị a nwere ike ịgụnye onye mezuworo ihe niile iwu chọrọ ma gosiwo ezigbo nchegharị mana ọ nọ na mnwale ogologo ndụ ma ọ bụ nwere nra dị ukwuu.

  4. Kpọtụrụ ndị ndu ọkwa nchụaja nke onye ihe metụrụ. Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-akpọtụrụ bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nke ugbua nke onye ọbụla ihe metụrụ (lee 32.10.2).

  5. Maa ọkwa maka Kansụl ahụ. Ọ na-agwa onye ahụ maka agụgụ ụbọchi, oge, na ebe a ga-eme kansụl.

  6. Duzie kansụl ahụ. Ọ na-eduzi kansụl ahụ dị ka otu ntụziaka niile dị n’ime 32.10.3. Ọ na-ajụ onye ahụ ihe o meworo iji chegharịa. Ọ na-ajụkwa banyere nkwa ya nye Jizọs Kraịst na Nzukọ nsọ. Mgbe enyechara okwu niile bara uru, ọ na-asị ka onye otu puo. Ya na ndị ndụmọdụ ya, ọ na-ekpe kpere ekpere iji chee emereme ọ ga-eme. Mkpebi atọ ndị ga-ekwe omume bụ:

    1. Gawaniihu na mgbochi niile ma ọ bụ mwepụ aha ịbụ onye otu.

    2. Wepụ mgbochi niile ma ọ bụ nye ikike ịnabataghachi.

    3. Kwanyere Otu Ndịisi Mbụ ka ewepụ mgbochi niile ma ọ bụ nye ikike nnabataghachi (ọ bụrụ ma ọ dị mkpa dị ka otu “Tinye akwụkwọ maka nkwado Otu Ndịisi Mbụ” n’okpuru).

  7. Kesaa mkpebi ahụ. Mgbe kansụl mesịrị mkpebi, onye ọrụ na-eduzi na-akọsara ya onye ahụ. Ọ bụrụ ma nkwado sitere n’aka Otu Ndịisi Mbụ dị mkpa, ọ na-akọwa na mkpebi ahụ bụ nkwanye enyere Otu Ndịisi Mbụ.

  8. Nyefee repọọtụ. Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-enyefe Repọọtụ nke fọm Kansụl Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ site na LCR. O nwere ike rịọ odee akwụkwọ ikwadobe repọọtụ nke a. Ọ na-ahụ na enweghị kọpị fọm nke e dere ede ma ọ bụ nke dị na kọmputa edebere n’obodo. Ọ nakwa ahụ na nootu niile eji kwadobe repọọtụ ka a na-ebibi ngwa ngwa.

  9. Tinye akwụkwọ maka nkwado nke Otu Ndịisi Mbụ (ọ bụrụ ma ọ dị mkpa). N’ọnọdụ niile sotere, nkwado nke Otu Ndịisi Mbụ dị mkpa iji wepụ mgbochi niile nke ịbụ onye otu dị n’okpuru iwu ma ọ bụ ịnabatagharị onye ahụ na Nzukọ nsọ. Nkwado nke a dị mkpa ọbụna ọ bụrụ ma omume ahụ mere mgbe mgbochi ịbụ onye otu Nzukọ nsọ n’okpuru iwu ma ọ bụ wepụ aha gasịrị.

    Onyeisi stek na-enyefe akwụkwọ ntinye nye Otu Ndịisi Mbụ naanị ma ọ bụrụ na ya kwanye nkwado (lee 6.2.3).

    1. Igbu mmadụ

    2. Ndina ụgwa

    3. Mmetọ mmekọahụ nke nwata ma ọ bụ ntoroọbịa, nrigbu mmekọahụ nke nwata ma ọ bụ ntoroọbịa, ma ọ bụ mmegbu siri ike nke anụ ahụ ma ọ bụ nke echiche nke nwata ma ọ bụ ntoroọbịa site n’aka otu okenye ma ọ bụ site n’aka otu ntoroọbịa onye ji ọtụtụ afọ tọ ya.

    4. Ntinye aka na nziakwụna nwata mgbe enwere ọmụma ikpe nke iwu

    5. Ngọnarị okwukwe

    6. Ịlụ ọtụtụ nwanyị

    7. Ime mmehie siri ike mgbe eji ọkwa pụtara ìhè na Nzukọ nsọ

    8. Ntụgharị okike—omume niile iji tụgharịa ruo na okike e jiri mụọ onye ahụ (lee 38.6.23).

    9. Iri ego ma ọ bụ arịa Nzukọ nsọ

  10. Maa ọkwa edereede maka mkpebi ahụ. Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-ahụ na onye ahụ natara ọkwa edereede nke mkpebi na ihe mmetụta ya niile n’oge.

  11. Mee baptizim ma mee onye otu Ọ bụrụ na ewepụrụ ịbụ onye otu Nzukọ nsọ na kansụl nke mbụ, a ga-emerịrị ya baptizim ma mee ya onye otu ọzọ. Ọ bụrụ na nkwado nke Otu Ndịisi Mbụ dị mkpa, emume nsọ ndịa ka enwere ike ime naanị mgbe anatasịrị nkwado nke a. Anaghị emepụta Asambodo Baptizim na Ime onye otu (lee 32.14.4).

32.16.2

Ịnabataghachi Gị mgbe Nkwụsị Ịbụ onye otu Nzukọ nsọ gasịrị

Ọ bụrụ ma mmadụ kwụsị n’okpuru iwu ịbụ onye otu Nzukọ nsọ, a ga-emerịrị ya baptizim ma mee ya onye otu iji nabataghachi ya n’ime Nzukọ nsọ. Maka ndị okenye, nnabataghachi anaghị abụkarị ihe echere echiche tutu ruo opekampe otu afọ mgbe akwụsịchara ịbụ onye otu.

Mgbe mmadụ rịọrọ nnabataghachi, bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek na-enweta otu kọpị nke fọm Repọọtụ nke Emereme Nchịkwa nke na-eso arịrịọ maka nkwụsị. Ọ nwere ike inweta nke a site na LCR.

Bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek mgbe ahụ na-agba ajụjụ ọnụ nke ọma. Ọ na-ajụ banyere ihe kpatara maka arịrịọ nke isimbụ na ọchịchọ maka nnabataghachi. Na mmụọ nke ịhụnaanya, ọ na-ajụ banyere mmehie ndị siri ike onye ahụ nwere ike meworịị ma ọ bụ tupu ma ọ bụ mgbe emesịrị nkwụsị ịbụ onye otu. Onye ndu anaghị aganiihu na nnabataghachi tutu ruo mgbe o doro ya anya na onye ahụ echegharịwo ma dịrị njikere ma tozuo oke inwe ọńụ na ngọzi niile nke ịbụ onye otu Nzukọ nsọ.

Ntụziaka niile maka nnabataghachi mgbe nkwụsị gasịrị soro:

  • Kansụl ịbụ onye otu ka a na-eme ọ bụrụ ma egbochiri n’okpuru iwu ịbụ onye otu nke onye ahụ n’oge nkwụsị.

  • Kansụl ịbụ onye otu ka a na-eme ọ bụrụ ma onye ahụ mere mmehie siri ike, tinyekọta ngọnarị okwukwe, tupu ịkwụsị ịbụ onye otu.

N’ọnọdụ ndị ọzọ, anaghị eme kansụl ịbụ onye otu ọ gwụla ma bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek kpebiri na ọ ga-adị mkpa.

Mgbe kansụl ịbụ onye otu dị mkpa maka onye nataworo onyinye dị nsọ tempụl, onyeisi stek na-eme ya. Mgbe kansụl ịbụ onye otu dị mkpa maka onye na-anatabeghị onyinye dị nsọ, bishọp ahụ na-eme ya, jiri nkwado sitere n’aka onyeisi stek.

Ọ bụrụ ma onye ahụ tinyere aka n’omume ọbụla dị nime 32.16.1, ọnụọgụgụ 9, ma ọ bụ tupu ma ọ bụ mgbe omesịrị nkwụsị ịbụ onye otu Nzukọ nsọ, nkwado nke Otu Ndịisi Mbụ dị mkpa maka nnabataghachi. Ọ bụrụ ma onye ahụ tinyere aka n’omume ọbụla dị nime 32.14.5, ọnụọgụgụ 1, ma ọ bụ tupu ma ọ bụ mgbe emesịrị nkwụsị ịbụ onye otu, a ga-etinye nkọwa nime ndekọihe ịbụ onye otu.

Onye ọbụla rịọrọ nnabataghachi ga eru otu ụdị ntọzu oke ahụ niile dị ka ndị ọzọ mere baptizim. Mgbe bishọp ahụ ma ọ bụ onyeisi stek ka o doro anya na onye ahụ tozuru oke ma dị eziokwu n’ịchọ ka anabataghachi ya, enwere ike ime onye ahụ baptizim na imee onye otu. Anaghị emepụta Asambodo Baptizim na Ime onye otu (lee 32.14.4).

Foto, oyiyi
nwoke na-eri oriri nsọ

32.17

Ihe omume Nzukọ nsọ, Ichi echichi, na Mweghachite nke Ngọzi niile mgbe emesịrị Nnabataghachi

32.17.1

Ihe omume Nzukọ nsọ na Ichi echichi

Chaatị sotere na-egosi ogo dabara adaba nke ihe omume Nzukọ nsọ maka onye anabataghachiri site na baptizim na ime onye otu.

Anataghị Onyinye dị nsọ Oge gara aga

Anatawo Onyinye dị nsọ Oge gara aga

Ndị ji Ikike Ọkwa nchụaja Oge gara aga

Anataghị Onyinye dị nsọ Oge gara aga

  • Ngwa ngwa emesịrị baptizim na ime onye otu, enwere ike inyefe ha ọkwa nchụaja ma chie ha echichi na ọkwa ọrụ ọkwa nchụaja ha ji mgbe ewepụrụ ma ọ bụ akwụsịrị ịbụ onye otu Nzukọ nsọ ha. Anaghị egosipụta ha maka nkwado.

  • Enwere ike nye rekọmend tempụl maka baptizim niile na ime onye otu nnọchịanya niile.

Anatawo Onyinye dị nsọ Oge gara aga

  • Enwere ike agaghị echi echichi nọkwa ọrụ ọbụla nke ọkwa nchụaja. Mgbe eweghachitere ngọzi niile nke ọkwa nchụaja ha na tempụl, ọkwa ọrụ ọkwa nchụaja ha oge gara aga ka a ga-eweghachite dị ka edepụtara na 32.17.2. Ha nwere ike ghara ime emume nsọ niile tutu ruo oge ahụ.

  • Nwere ike sonye na ihe omume ọbụla nke Nzukọ nsọ nke kwere omume maka onye otu na-anatabeghị onyinye dị nsọ onye na-ejighị ọkwa nchụaja.

  • Nwere ike ghara iyi gament tempụl ma ọ bụ nata ụdị rekọmend tempụl ọbụla tutu ruo mgbe eweghachitere ngọzi ha niile.

Ndị ọtu Ndị ọzọ

Anataghị Onyinye dị nsọ Oge gara aga

  • Nwere ike sonye n’ihe omume Nzukọ nsọ dị ka otu onye atọghatara ọhụrụ ga-eme.

  • Enwere ike nye rekọmend tempụl maka baptizim niile na ime onye otu nnọchịanya niile.

Anatawo Onyinye dị nsọ Oge gara aga

  • Nwere ike sonye na ihe omume ọbụla nke Nzukọ nsọ nke kwere omume maka onye otu na-anatabeghị onyinye dị nsọ onye na-ejighị ọkwa nchụaja.

  • Nwere ike ghara iyi gament tempụl ma ọ bụ nata ụdị rekọmend tempụl ọbụla tutu ruo mgbe eweghachitere ngọzi ha niile (lee 32.17.2).

32.17.2

Mweghachi nke Ngọzi niile

Ndị mmadụ nataworo onyinye dị nsọ nke tempụl oge gara aga ma anabataghachi ha site na baptizim na ime onye otu nwere ike ịnata ọkwa nchụaja na ngọzi niile nke tempụl ha naanị site na emume nsọ nke mweghachi ngọzi niile (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:21). Echighị ha echichi n’ọkwa ọrụ niile nke ọkwa nchụaja ma ọ bụ nye onyinye dị nsọ ọzọ. Eweghachitere ngọzi ndị a site na emume nsọ ahụ. Ụmụnne ndị nwoke ka a na-eweghachite n’ọkwa ọrụ ọkwa nchụaja mbụ ha, ewezuga ọkwa ọrụ nke Iri Asaa, bishọp, ma ọ bụ petrak.

Naanị Otu Ndịisi Mbụ nwere ike ịkwado arụmọrụ nke emume nsọ nke mweghachi ngọzi niile. Ha agaghị atule akwụkwọ ntụnye maka emume nsọ nke a nsonso karịa otu afọ mgbe anabataghachiri onye ahụ site na baptizim na ime onye otu.

Bishọp na onyeisi stek na-agba onye ahụ ajụjụ ọnụ iji mata ntozu oke na ịdị njikere ya. Mgbe o metụtara onyeisi stek na onye ahụ ejikerewo, ọ na-etinye akwụkwọ maka mweghachite nke ngọzi niile jiri LCR. Lee 6.2.3 banyere oke na ọrụ nke onyeisi stek mgbe ọ na-enyefe akwụkwọ ndị etinyere n’aka Otu Ndịisi Mbụ.

Ọ bụrụ na Otu Ndịisi Mbụ kwadoo mweghachite nke ngọzi niile, ha na-enye otu onye Ji Ikike Zuru ọha ma ọ bụ onyeisi stek ọrụ ịjụ onye ahụ ajụjụ ọnụ. Ọ bụrụ ma onye ahụ tozuo oke, onye ndụ a na-eme emume nsọ ahụ iji weghachite ngọzi niile nke onye ahụ.

Maka ozi banyere ndekọihe nke ịbụ onye otu na mweghachite nke ngọzi niile, lee 32.14.4.

Bipụta