Ime ka a Mata
Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa bụ nhọta nke ihe nile dị mmasị metụtara ọtụtụ ngalaba pụtara ìhè nke okwukwe na ozizi nke Nzukọ nke Jisụs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a. Ihe ndị a nile ka Onye-amụma Joseph Smith wepụtara ma e bipụtara ha n’akwụkwọ akụkọ na-apụta n’oge n’oge nke Nzukọ nsọ nke ụbọchị nke ya.
Nchịkọta ngwá-ngwá nile nke mbụ nke na-ebu isi okwu ahụ Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa ka e mere na 1851 site n’aka onye Okenye Franklin D. Richards, onye bụ onye otu Kansụl nke Iri na Abụọ mgbe ahụ, na onye-isi nduzi Mission nke Britain. Nzube ya bụ ka ọ na-erute aka bụ ụfọdụ ngwá-ngwá nile ndị dị mkpa nke mgbasa ha dịkwa nkenke n’oge nke Joseph Smith. Dịka ndị otu Nzukọ nsọ na-aba ụba n’ime Europe nile na Amerika, e nwere mkpa ime ka ihe ndị a dị nso na-nnweta. Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa nwetara iji ya mee ihe ebe ọ dị mbara, ma o mesịrị ghọọ ọkọlọtọ ọrụ nke Nzukọ nsọ site n’omume nke Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ na ọgbakọ ntụgharịkọta uche ọha na Salt Lake City na 10 Ọktoba 1880.
Ọtụtụ nlebagharị anya ka e meworo n’ime ihe nile dị n’ime ya dịka mkpa nke Nzukọ nsọ chọworo. Na 1878, mpaghara nile nke Akwụkwọ nke Moses ndị na-adibughị n’ime mbipụta nke mbụ ka e tinyere na ya. Na 1902 mpaghara ụfọdụ nke Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa ndị mere ka e nwee ejima na ngwá-ngwá ndị e bipụtaworo n’ime Ozizi na-Ọgbụgba-ndụ nile ka a hapụrụ. Ndozi ya n’Isi nile na Ama okwu nile, ya na ndedata nke úkwù akwụkwọ ka e mere na 1902. Mbipụta nke mbụ nke e mere abụọ, abụọ n’ime ibe akwụkwọ nile, ya na Isi okwu nile dị n’akwụkwọ, bụ na 1921. O nweghị mgbanwe ọzọ e mere tutu Epril 1976, mgbe e tinyere mkpụrụ ihe abụọ nke mkpughe na ya. Na 1979, e wezugara ihe abụọ ndị a site na Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa ma tinye ha na Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile, ebe e gosipụtara ha dịka nkeji 137 na 138. N’ime mbipụta nke ugbụ a e mewo ụfọdụ mgbanwe iji weta akwụkwọ ahụ na-nkwekọrịta ya na akwụkwọ ndị ọzọ nile ndị bu ụzọ.
Nke na-esochi bụ nkenke okwu mmalite nye ihe nile dị n’ime nke ugbụ a.
-
Nhọta nile sitere na Akwụkwọ Moses. Nke a bụ ihe odide e wetara site na akwụkwọ Jenesis nke ntụgharị asụsụ Joseph Smith mere site na Bible nke o bidoro na Jun 1830 (History of the Church [Akụkọ nke Nzukọ-nsọ] 1:98–101, 131–139).
-
Akwụkwọ nke Abraham. Nke a bụ ntụgharị asụsụ sitere na (papirọs) akwụkwọ edemede ndị Ijipt nke batara n’aka Joseph Smith na 1835, nke ihe di n’ime ya bụ edemede nile nke onye isi ezi-n’ụlọ Abraham. Ntụgharị asụsụ a ka e bipụtara n’usoro n’ime akwụkwọ Times and Seasons malite na 1 Maach 1842, na Nauvoo Illinois (History of the Church 4:5119–534).
-
Joseph Smith—Matiu. Nke a bụ ịhe odide e wetara site n’igba-ama nke Matiu dị n’ime ntụgharị asụsụ nke Bible nke Joseph Smith (hụ Ozizi na Ọgbụgba ndu nile 45:60–61 n’ihi iwu nke Chineke nyere ka o bido ịtụgharị asụsụ nke Testament Ọhụrụ).
-
Akụkọ—Joseph Smith. Nke a bụ nhọrọ nile sitere na ọgbụgba ama ụlọ ọrụ na akụkọ Joseph Smith nke ọ kwadobere na 1838 ma e bipụtara ya n’usoro n’ime akwụkwọ Times and Seasons dị na Nauvoo Illinois, malite na 15 Mach 1842 (History of the Church 1:1–44).
-
Ndepụta nke Okwukwe nke Nzukọ nke Jisụs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a. Nke a bụ nkwupụta nke Joseph Smith bipụtara na akwụkwọ Times and Seasons 1 Mach 1842, nke ya na obere akụkọ nke Nzukọ nsọ so, nke njiri mara ya bụ Wentworth Letter (History of the Church 4:535–541).