2022
Na-enyere Ndị ogbenye na Ndị nọ na nnukwu nsogbu aka—Mpempe edemede niile
Nọvemba 2022


Ozi Liahona Kwa ọnwa, Nọvemba 2022

Inyere Ndị ogbenye na Ndị nọ na nnukwu nsogbu aka

Mpempe edemede niile

Foto, oyiyi
Nńomi nke Oaks ebipụtara

Nnukwu ije ozi ọdịmma na nke enyem aka n’ebe mmadụ ibe anyị nọ bụ ihe a na-akuzi ma na-eme site n’aka Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazụ a nakwa site n’aka anyị dị ka ndị otu ya. Na-ịmaatụ, anyị na-ebu ọnụ na nke mbụ kwa ọnwa ma tụọ ụtụ opekampe ego ruru nri ndị ahụ a na-erighị iji nyere ndị ahụ nọ na mkpa aka niime ọgbakọ niile nke anyị onwe anyị. Nzukọ nsọ nakwa atụnye ụtụ dị ukwu maka inyere ndị mmadụ aka nakwa ozi ndị ọzọ na gburugburu ụwa.

Na-agbanyeghị ihe niile Nzukọ nsọ anyị na-eme kpọmkwem, ọtụtụ ozi enyem aka mmadụ nye ụmụ nke Chineke na gburugburu ụwa bụ nke ndị mmadụ ma ọ bụ otu dị iche iche na-enweghị njikọ n’okpuru iwu ya na Nzukọ nsọ anyị na-eme. …

Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst dị na njikere ijere ndị ahụ nọ na mkpa ozi, ma ọ dịkwa na njikere ịrụkọ ọrụ ya na ndị ọzọ na mbọ ahụ.…

Mkpughe oge ugbua na-akuzi na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, bụ “ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ niile na-abịa n’ime ụwa ìhè” [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:2]. Site na nke a, ụmụ Chineke niile ka a na-akuziri ijere Ya na onye na ibe ya ozi dị ka otu ha kachasị mara na ike ha. …

… Ọtụtụ niime anyị kwesịrị ịdị na-amata iheoma ndị ọzọ mere ma na-akwado ya dị ka anyị nwere oge na ụzọ isi mee otu ahụ. …

Ana m agba ama banyere Jizọs Kraịst, onye ìhè na Mmụọ ya na-edu ụmụ Chineke niile n’inyere ndị ogbenye na ndị nọ na nnukwu nsogbu aka na gburugburu ụwa.

Bipụta