2022
Ihe nketa nke Agbamume—Mpempe edemede niile
Nọvemba 2022


Ozi Liahona Kwa ọnwa, Nọvemba 2022

Ihe nketa nke Agbamume

Mpempe edemede niile

Foto, oyiyi
akwụkwọ ụgbọ elu nwere onyinyo ụgbọ elu

Dị ka nne m gwara m mgbe m nyere mkpesa maka otu ihe siri sie ike, “Oo, Hal, eziokwu o siri ike. O kwesịrị ịdị. Ndụ bụ ihe mnwale.”

O nwere ike jiri nwayọ kwuo nke ahụ, ọbụna niihu ọchị, niihi na ọ maara ụzọ ihe abụọ. Na-agbanyeghị nsogbu ahụ, ihe kachasị mkpa ga-abụ ịlọrute n’ebe obibi ịnọ ya na Nna ya nke Eluigwe. Ma ọ maara na o nwere ike ime ya site n’okwukwe niime Onye Nzọpụta ya. …

Ihe nketa nke Agbamume nke ọ hapụụrụ anyị ka akachasị kọwaa na Moronaị 7, ebe Mọmọn gbara nwa ya nwoke Moronaị na ndị ya ume. …

O dowere Jizọs Kraịst niihu, dị ka ndị niile nwetere uru na-ịgba ndị na-agba mbọ agbago elu n’okporo ụzọ gawara ebe obibi nke eluigwe ha ume. …

Mọmọn hụtara ịdị nwayọ n’obi dị ka ihe aka ebe nke ike dị n’okwukwe ha. …

Mọmọn oge ahụ gbara ha ume site na-ịgba ama na ha nọ n’ụzọ ịnata onyinye nke obi ha ijuputara n’ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ. …

Na-ichela azụ, ugbua ana m ahụ otu onyinye afọ ọma ahụ—ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ—siri kwagide, duzie, kwado, ma gbanwee nne m na mbọ ya ịla n’ebe obibi. …

… Onye Nzọpụta maara maka nsogbu gị niile n’uju Ọ maara maka nnukwu ike dị niime gị iji too na okwukwe, olileanya na afọ ọma.

Iwu nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile ọ na-enye gị abụghị ihe mnwale iji jikwata gị. Ha bụ onyinye iji bulie gị chuwa ihu na-ịnata onyinye niile nke Chineke na ịlọta n’ebe obibi gakwuru Nna gị nke Eluigwe na Onyenwe anyị, ndị hụrụ gị naanya.

Bipụta