2023
Nkuzi niile nke Jizọs Kraịst
Me 2023


Ozi Liahona Kwa ọnwa, Me 2023

Nkuzi niile nke Jizọs Kraịst

Mwepụta niile

Foto, oyiyi
akwụkwọmgbidi

Dị ka onye amụma Nefi siri kuziere anyị, anyị ga “na-eri oriri n’elu okwu niile nke Kraịst; niihi na lee, okwu niile nke Kraịst ga-agwa unu ihe niile nke unu ga-eme.”1 … Ozi m taa nwere niime ya nhọpụta nke sitere n’okwu niile nke Onye Nzọpụta anyị— ihe O kwuru. …

“[Iwu nsọ dị ukwuu dị niime iwu ahụ bụ nke a:] ị ga-ahụ Onyenwe anyị Chineke gị naanya jiri obi gị niile, jirikwa mkpụrụ obi gi niile, jirikwa uche gị niile.

“ Nke a bụ iwu nsọ dị ukwuu na nke mbụ.

“Ma nke abụọ dịkwa ka ya, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị naanya dị ka onwe gị.

“N’elu iwu nsọ abụọ ndị a ka iwu na ndị amụma niile bekwasịrị.”2 …

N’ezie, n’ezie, a sị m unu, unu ahaghị ịnọ na nche ma na-ekpe ekpere oge niile, ka aghara ị nwa unu ọnwụnwa site na ekwensu, ma e dupu unu na ndọkpụ n’agha site na ya.”3 …

“Ya mere, ihe ọbụla ọ bụ unu ga-eme, unu ga-eme ya n’aha m; ya mere unu ga-akpọ nzukọ nsọ ahụ n’aha m.”4 …

Ugbua nke a bụ iwu nsọ ahụ: Chegharịanụ, unu nsọtụ niile nke ụwa, ma bịakwutenụ m ma ka e mee unu baptizim n’aha m, ka e wee sachaa unu site na nnabata nke Mmụọ Nsọ, ka unu wee guzoro na-enweghị ntụpọ n’ihu m n’ụbọchị ikpeazụ.”5 …

Anyị kwere na Kraịst Ana m eji ihe O kwuru gbasara otu anyị ga-esi amata ma na-eso nkuzi Ya niile emechi:

“Mana Onye Nkasi obi, nke bụ Mmụọ Nsọ, onye nke Nna ga-ezite n’aha m, ọ ga-akuziri unu ihe niile, ma weta ihe niile na ncheta unu.”6

Bipụta