2023
Ịchọta Udo Nke Onwe
Me 2023


Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Me 2023

Ịchọta Udo Nke Onwe

Mwepụta niile

Foto, oyiyi
akwụkwọmgbidi

Taa aga m ekwu okwu banyere ihe m mụtara gbasara ọrụ ebube nke ịchọta udo nke onwe, na-agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ anyị. …

Amụtawo m opeka mpe eziokwu ise sitere na nkuzi [ahụ] nke Onye Nzọpụta.

Nke mbụ, onyinye nke udo ka a na-enye mgbe anyị nwesịrị okwukwe idebe iwu nsọ Ya niile. …

Nke abụọ, Mmụọ Nsọ ga-abịa binyere anyị. …

Nke atọ, Onye Nzọpụta na-ekwe nkwa na dị ka anyị na-edebe ọgbụgba ndụ anyị, anyị nwere ike nweta mmetụta ịhụnaanya nke Nna na Ọkpara ahụ maka onye na ibe ya na maka anyị. …

Nke anọ, idebe iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị chọrọ ihe karịrị nrube isi. Anyị ga-ahụ Chineke naanya jiri obi anyị niile, ike, uche, na obi anyị. …

Nke ise, o doro anya na Onyenwe anyị hụrụ anyị naanya nke ọma iji kwụọ ụgwọ maka mmehie anyị nke ga-eme ka anyị nwee ike—site n’okwukwe anyi na Ya, na nchegharị anyị, site na ndapụta niile nke Aja mgbaghara mmehie Ya—nwee onyinye nke udo ahụ nke “kachasị nghọta niile” [Ndị Filipaị 4:7], niime ndụ nke a na anyị na Ya ruo ebighị ebi. …

Ndị otu gburugburu Nzukọ nsọ niile enwetawo onyinye nke udo nke onwe nke Onyenwe anyị. Ọ na-agba onye ọbụla ume inyere ndị ọzọ aka nwete ohere niile ịbịakwute Ya ma tozuo oke maka otu udo ahụ kwa n’onwe ha. Ha, n’aka nke ọzọ, ga-ahọrọ ịchọ mkpatemmụọ ịmata otu ha ga-esi nyefee onyinye ahụ irute ndị ọzọ.

Ndudugandu na-eto eto ga-aghọ ndị na-azụ ndudugandu ga-esote. Mmụba si na ya ga-eweta ọrụ ebube. Ọ ga-agbasa ma too ka oge na-aga, ma alaeze nke Onyenwe anyị ga-enwe nkwado ma dị njikere ikele Ya jiri iti mkpu hozana. A ga-enwe udo n’elu ụwa.

Bipụta