2022
Ịhụnaanya Sinachi niime Atụmatụ nke Nna
Me 2022


“Ịhụnaanya Sinachi niime Atụmatụ nke Nna,” Liahona, Me 2022.

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Me 2022

Ịhụnaanya Sinachi niime Atụmatụ nke Nna

Ụfọdụ ihe ndị e kwuru

Foto, oyiyi
Ugwu ukwu niile na-ebili site na igwe ojii

N’ime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraist nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a eweghachitere, anyị nwere nghọta pụrụ iche nke atụmatụ nke Nna anyị nke Eluigwe. Nke a na-enye anyị ụzọ dị iche iche iji ghọta ebumnuche nke ndụ anụ ahụ, ikpe sinachi nke na-eso ya, na akaraka dị ebube kachasị elu nke ụmụ nke Chineke niile. …

… Ozizi nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst ekpughere na-akuzi na ụmụ Chineke niile—ebe ihe ndị ewepụrụ pere mpe nke ukwuu itule ebe a—ga-emecha kwụsị n’alaeze nke otuto. …

Nke kachasị elu niime ndị a bụ mbuli elu niime alaeze seletial, niime ya anyị nwere ike dịrịzie ka Nna anyị na Ọkpara Ya, Jizọs Kraist. …

… Ozi nke Nzukọ nsọ eweghachitere bụ inyere ụmụ Chineke niile aka tozuo maka ihe Chineke chọrọ dị ka akaraka ha kachasị elu. …

Nke kachasị mkpa nye anyị bụ mkpughe nke Chineke na a ga-enwete mbuli elu naanị site na ikwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ niile nke alụmdi dị ebighị ebi n’etiti otu nwoke na otu nwanyị. Ozizi sinachi ahụ bụ ihe kpatara anyị ji akuzi na “okike bụ ejirimara dị mkpa nke ndụ tupu ndụ anụ ahụ, ndụ anụ ahụ onye ọbụla, na njirimara na ebumnuche ebighị ebi” [“Ezi na ụlọ: Ọkwa a mara nye Ụwa,” ChurchofJesusChrist.org]. …

… Anyị kwere na ọkwa a mara nye ezi na ụlọ, ehiwere n’elu ozizi n’enweghị mgbanwe, na-akọwa ụdị mmekọrịta ezi na ụlọ ebe akụkụ kachasị mkpa nke uto ebighị ebi anyị nwere ike ime. …

… Anyị garịrị achọ ikesa eziokwu ebighị ebi ndị a nye ndị ọzọ. Mana jiri ịhụnaanya anyị ji ụgwọ ya nye ndị agbata obi anyị niile, anyị na-anabatakarị mkpebi ha. Dị ka onye amụma Akwụkwọ nke Mọmọn kuziri, anyị garịrị na-aga niihu, na-enwe “ịhụnaanya nke Chineke na nke ụmụ mmadụ niile”[2 Nifaị 31:20].

Bipụta