2022
Ikwusi ike n’Oké ifufe niile
Me 2022


“Ikwusi ike n’Oké ifufe niile,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Me 2022.

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Me 2022

Ikwusi ike n’Oké ifufe niile

Edemede

Foto, oyiyi
ụlọ ọkụ

Maka ndị niime anyị ndị nwere nchegbu maka onwe anyị na maka ndị ahụ anyị hụrụ naanya, enwere olileanya nime nkwa Chineke meworo maka ebe nchekwa n’oké ifufe niile dị niihu. …

Okwu amụma niile nke Eze Benjamin dabaara anyị n’ụbọchị anyị. …

Ọ kpọkuru anyị na ndị ya iwu n’elu naanị ezi oke nkume nke nchekwa, onye bụ Onye Nzọpụta. O mere ka o doo anya na anyị nwere mnwere onwe ịhọrọ n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ ma na anyị enweghị ike izere ihe ndị si na nhọrọ anyị pụta. …

Eke anyị na-agbanwe ịhọ dị ka obere nwa, na-erube isi nye Chineke na ndị ọzọ dị ndụ. Mgbanwe ahụ ga-eme anyị etozuo irite onyinye niile na-abịa site na Mmụọ Nsọ. Inwe mkpakọrịta nke Mmụọ ga-akasị anyị obi, duo anyị, ma gbaa anyị ume. …

Mgbe oke ifufe niile dị niime ndụ ga-abịa, i nwere ike ikwusi ike n’ihi na i guzooro n’elu nkume nke okwukwe gị n’ime Jizọs Kraist. Okwukwe ahụ ga-eduba gị na nchegharị kwa ụbọchị na idebe ọgbụgba ndụ mgbe niile mgbe niile. Mgbe ahụ ị ga na-echeta Ya mgbe niile. Ma site n’oke ifufe niile nke ịkpọ asị na inwe obi ọjọọ, ị ga-enwe mmetụta nkwusi ike na olileanya. …

… Dị ka nwa obi nwayọọ nwere ịhụnaanya, nabata enyemaka Ya. Mee ma debe ọgbụgba ndụ niile Ọ na-enye n’ime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a. Ha ga-agba gị ume. Onye Nzọpụta maara oké ifufe niile na ebe nchekwa niile n’ụzọ ụlọ rute Ya ma rute Nna nke Eluigwe. Ọ maara ụzọ ahụ. Ọ bụ Ụzọ ahụ.

Bipụta