2022
Mụta banyere Jizọs Kraist ma Nwete Ike Ya
Septemba 2022


“Mụta banyere Jizọs Kraist ma Nwete Ike Ya,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Sept. 2022.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Septemba 2022

Mụta banyere Jizọs Kraist ma Nwete Ike Ya

Sitere na Eprel 2017 ozi ọgbakọ zuru ọha.

Ọ ga-amasị m ikekọrịta otu anyị nwere ike isi dọbata niime ndụ anyị ike nke Onyenwe anyị na Nna anyị ukwu, Jizọs Kraist.

Anyị na-amalite site nịmụta banyere Ya.1 “Ọ gaghị ekwe omume maka [anyị] inwe nzọpụta na amaghị ama” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 131:6). Ka anyị na-aghọtazi ozizi nke Onye Nzọpụta na ihe O meere anyị, ka anyị na amata karịa na O nwere ike nyee anyị ike ahụ anyị chọrọ maka ndụ anyị niile.

Dị ka Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, anyị na-akpọ ozi Ya dị ka Aja mgbaghara mmehie ahụ nke Jizọs Kraist, nke mere mbilite n’ọnwụ eziokwu nye onye niile ma mee ndụ ebighị ebi kwe omume maka ndị ahụ chegharịrị site na njọ ha ma nata ma debe emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ ndị dị mkpa.

N’okpuru nnukwu atụmatụ ebighị ebi nke Nna, ọ bụ Onye Nzọpụta tara ahụhụ. Ọ bụ Onye Nzọpụta gbajiri agbụ niile nke ọnwụ. Ọ bụ Onye Nzọpụta kwụrụ ụgwọ nke mmehie na njehie anyị niile ma na-ehichapụ ha na ọnọdụ nke nchegharị anyị. Ọ bụ Onye Nzọpụta na-anapụta anyị site na ọnwụ nke anụ ahụ na nke ime mmụọ.

Okwu nsọ ụdị dị ka Aja mgbaghara mmehie na Mbilite n’ọnwụ na-akọwa ihe Onye Nzọpụta mere, dị ka otu atụmatụ nke Nna siri dị, ka anyị wee nwee ike bie ndụ n’olileanya niime ndụ nkea ma rite ndụ ebighị ebi niime ụwa nke na-abịa.

Bipụta