2013
Enwere m Ike Ikwe ka Mwute M Gaa
Septemba 2013


Ntorobia

Enwere M Ike Ikwe ka Mwute M Gaa

Onye dere ya si na Taịwan.

Mgbe e mere Nwanne Nwoke enyi m Chen na nwunye ya baptism ịbata na ngalaba-ukwu anyị, enwere m ańụrị karịa. Otu afọ ka e mechara ha baptism, a rachikọtara ha n’ime temple, ma nwa ha nwoke nke nwụrụ-anwụ tutu ha abata Nzukọ-nsọ ahụ ka rachikọtara ya nye ha. Ọdịịrị ebube ịhụ ndi ụlọ Chen ka ha na-eto n’ime ozi-ọma ahụ.

Mgbe ahụ egburu Nwanne nwoke Chen n’ihe mberede nke ụgbọ-ala n’afọ nke na-eso. Na nsote ihe mberede ahụ, ọnwụ ya dịịrị ka ọ nọ n’echiche m oge nile, ma ugboro ugboro na-achụ m nta na nrọ m nile. Etetara m n’anya mmiri ma jụọ kwa-mgbe kwa-mgbe, “Gịnị mere? Gịnị mere Onye-nwe-anyị jiri nye ohere ka ụdị ihe dị egwu nke a mee? Gịnị mere ụdị ihe a jiri mee n’ezi-na-ụlọ oma nke a ?” Otu ụbọchị, mgbe m nọọrọ na echegbu onwe maka ajụjụ nile ndịa, ewelitere m akwụkwọ-ihe-ọmụmụ ma gụọ okwu nile ndịa sitere n’aka Onye-isi-nduzi Spencer W. Kimball (1895–1985):

“Ọbụrụ na anyị na-ele ndụ nke ụwa a dịka ịbị-ndụ nile, mgbe ahụ mgbu, mwute, ọdịda, na ndụ mkpụmkpụ ga-abụ oke ọdachi. Mana ọbụrụ na anyị na-elekwasị ndụ anya dịka ihe na-adị ebigh-ebi na-esetipụ n’ime oge gara aga tutu a bịa n’ụwa ma gaba n’ime ebigh-ebi nke ọdịn’ihu nke mgbe ọnwụ gasịrị, mgbe ahụ ihe nile na-eme ka e nwere ike idebe n’ọnọdụ dabara adaba otu e diri hụta ya. …

“Ọbụ anaghị eghebe anyị oghe nye ọnwụnwa nile iji nwale une anyị, ọrịa ka anyị new ike mụta ndidi; ọnwụ ka anyị nwe ike nwe anwụghị-anwụ ma new otutọ?”1

Na nwa oge ahụ, ekpebiri m ikwe ka mwute m gaa ma leba anya n’ime ihe ahụ e kwere na nkwa na ịkwe-omume nke odi n’ihu. Ahụrụ m n’ime anya nke echiche m Nwanne nwoke Chen ka ya na ezi na ụlọ ya biakọtakwara n’obi-ụtọ n’ụdị n’otu . Ihe ahụ m hụrụ wetara m udọ. Ama m na Nna nke Elu-igwe ga-enye anyị amamihe na mgbamume iji chee mmekpa-ahụ nile ihu.

Lee anya

  1. Nkuzi nile nke Ndị-isi-ndzi nile nke Nzukọ-nsọ ahụ: Spencer W. Kimball (2006), 15.

Bipụta