2013
Ndi-nsọ nile maka Oge Nile
Septemba 2013


Ozi nke Otu Ndi-isi Nduzi Mbụ, Septemba 2013

Ndi-nsọ n’Oge Nile

Foto, oyiyi
Onye Isi-Nduzi Dieter F. Uchtdorf

Enwere m ihe-ndi nccheta nke oge-ndi-ntakiri maka otu akụkụ ụwa nke nwere ike ije-ozi ihe-nkiri akwụkwọ-ozi gosipụta oge nile nke afọ na-agbanwe agbanwe. Ọnwa ọbụla na-agafe dịịrị inye-otuto ma di ebube. Na otu ụbọchị na oge ụgụrụ, mkpụrụ mmiri na-ada na ekpuchigidere ugwu nile na okporo-ụzọ nile nke obodo ahụ. Oge ngwụcha ọkọchị wetara mmiri-ozuzo nke mkpochasị na mbakasa nke ahịhịa ndụ. Ọnọdụ elu-igwe nile nke ọkọchị jere-ozi dịka akpụkpọ-ụkwụ na-enye obi-ụtọ na-acha ka ihu-elu-igwe maka mmụke nke anyanwu na-enye ihe. Ma oge dị n’etiti ọkọchị na ụgụrụ gbanwere ụdị-okike baa n’ime mkpuchide mmụke nile nke ụcha oroma, odo na uhie. Dịka nwata, ahụrụ m oge ọbụla n’anya, ma ruo n’ụbọchị nke a, ahụrụ m akparam-agwa na ịdị-iche nke ọbụla n’ime ha n’anya.

Anyị nwere oge nile n’ime ndụ anyị nile otu aka ahụ. Ụfọdụ na-ekpo-ọkụ ma new mmasị. Ndi nke ọzọ adịghị otu ahụ. Ụfọdụ ụbọchị nile n’ime ndụ anyị nile na-ama mma dịka ihe-nkiri e sere n’abadịba akwụkwọ na-egosi ụbọchị, ọnwa na afọ Ma e nwekwara ụbọchị nile na ọnọdụ nile nke na-akpata obi-mgbu ma new ike iwebata n’ime ndụ anyị mmetụta nile miri-emi nke ịda mba, iwe iwe, na obi ilu.

Odoro m anya na otu oge ma ọbụ nke ọzọ anyị nile echewo uche na ọ ga-adị mma ịchọta ụlọ obibi n’ala jupụtara nanị n’ụbọchị nile nke oge ihe zuru-oke ma zere oge nile na-anaghị enye mmasị n’etiti.

Mana nke a agaghị ekwe omume. Ọbụghị ma ọ bụ ihe a na-achọ achọ.

Dịka m na-elegharị ndụ nke onwe m, o doro anya na ọtụtụ oge nile nke nnukwu ito eto abịaworo m mgbe m na-agabiga oge ebili-mmiri nile.

Nna anyị nke Elu-igwe nwere amamihe nile matara na ka ụmụ Ya new ike itoru ihe nile dị, a kwadoro ka ha bụrụzie, ha ga-enwe mkpa inwe mmetụta oge nile nke mmekpa-ahụ n’oge nke ịbị dịka ọbịa na nke ụwa. Onye-amụma Akwụkwọ nke Mọmọn Lihaị kwuru na a na-enweghị mmegide, agaghị enwe ike iweta ezi-omume na mmezu” (2 Nephi 2:11) N’ezie, ọ bụ ihe ilu nke ndụ na-enye anyị ohere ịmata, ịtule, na igosi mmasị n’ịdị ụtọ ya (lee D&C 29:39; Moses 6:55).

Onye-isi-nduzi Brigham Young tinyere ya otu a: “Ndi nile dị adị nke e kpubere okpu nile nke otuto, anwụghị anwụ, na ndụ ebigh-ebi nile ga-agafe rịrị mmetụta mwute e debere maka ndi nwere uche ịgabiga, inwete otuto na mbuli-elu ha. Ọdachi ọbụla nke nwere ike ịbịakwasị ndi mmadụ dị ndụ ka a ga-ekwe… ka ọ kwado ha inwe ọńụ n’ihu nke Onye-nwe-anyị. … Mnwale ọbụla na mmetụta unu gabigara dị mkpa maka nzọpụta unu.”1

Ajụjụ ahụ abụghị ma anyị ga-enwe mmetụta oge nile nke mmekpa-ahụ kama otu anyị ga-esi gafee ebili-mmiri nile ahụ. Nnukwu ohere ọma anyị n’oge nile nke ndụ ahụ na-agbanwe mgbe nile bụ ijidesi ike n’okwukwe nke Chineke ahụ, nihi na ndụmọdụ Ya ka a kwadoro ọbụghị nanị inyere anyị aka ịgafe ebili-mmiri nile nke ndu ahụ kama na kwa iduru anyị gafe ha. Nna Anyị nke Elu-igwe enyewo okwu Ya site n’ọnụ ndi amụma Ya (em) ọmụma-ihe dị oke-ọnụ ahịa a kwadoro idu anyị gafe aka-mgba nile nke oge ihe isi-ike nile che-ihụ n’ańụrị a na-agaghị enwe ike ikwupụta na ihe na-amụke amuke nke ndụ-ebigh-ebi. Ọ bụ otu akụkụ dị mkpa nke ihe mmụta anyị nke ụwa ịzụlite ume, mgbam-ume, na nkwusike n’ọmumeziri-ezi, ijidesi ezi-okwu ike na eziọmume na-agbanyeghị ụdị ọdachi anyị nwere ike inwe mmetụta ya.

Ndi nke banyeworo n’ime mmiri nile nke baptism ma natawo onyinye nke Mụọ Nsọ azọbanyela ụkwụ ha n’ụzọ nke ịbụ ndi-na-eso-ụzọ ma e nyere ha iwu isoro esepụghị-aka ma n’okwukwe na nzọ-ụkwụ nile nke Onye-nzọpụta anyị.

Onye-nzọpụta ahụ kuziri na anyanwụ na-awakwasị onye-ọjọọ na onye-ọma, ma…mmiri-ozuzo (na-ezokwasị) onye-ezi-omume na onye ajọọ-omume” (Matthew 5:45). Mgbe ụfọdụ anyị enweghị ike ịghọta ihe kpatara ihe-isi ike, ọbụna ihe na-ezighị-ezi, ihe nile na-eme na ndụ. Mana dịka ndi na-eso Kraịst, anyị tụkwasịrị obi na ọbụrụ na anyị “chosie ike, na-ekpe ekpere oge nile, ma na-ekwere, … ihe nile ga-arụkọta ọrụ ọnụ maka ọdịmma (anyị), ma ọbụrụ na [anyị] na-agazi ije nke ọma” (D&C 90:24; mmesi-okwu ike ka a gbakwunyere).

Dika ndi-otu nke Nzukọ-nsọ Ya, dịka Ndi-nsọ, anyị na-eje-ozi n’ańụrị na ịnọ na njikere n’ụdị ihu elu-igwe nile ma n’oge nile. Ma dịka anyị na-eme otu ahụ, obi anyị nile na-ejupụtazi n’okwukwe dị nsọ, olile-anya ọgwụgwọ, na afọ-ọma nke elu-igwe.

Otu o sila dị, anyị ga-agafe rịrị oge nile (em) ma nke na-enye mmasị ma nke na-egbu mgbu. Mana na-agbanyeghị oge ọ bụ, dịka ndi na-eso Jisus bụ Kraịst ahụ, anyị ga-atụkwasị olile-anya anyị na Ya dịka anyị na-aga ije chee ihu n’ihe Ya.

Na nke nke, anyị bụ Ndi-nsọ nke Chineke, kpebịrị ịmụta ihe banyere Ya, na ịhụ ndị mmadụ ibe anyị n’anya. Anyị bụ ndi-ije n’ụzọ ahụ a gọziri-agọzi nke ịbụ ndi na-eso ụzọ, ma anyị ga-aga ije na-eleghị anya n’azụ chee ihu n’ebum n’uche nke elu-igwe anyị.

Ya mere, ka anyị bụrụ Ndi-nsọ na mmalite udummiri, n’ọkọchị, na ngwucha ọkọchị, na ụgụrụ. Ka anyị bụrụ Ndi-nsọ maka oge nile.

Lee anya

  1. Nkuzi nile nke Ndi-Isi-nduzi nile nke Nzukọ-nsọ: Brigham Young (1997), 261–62..

Nkuzi si n’ozi a.

Ndi-isi-nduzi mbụ akụziwo, “Ụfọdụ n’ime okwu-chukwu nile kachasị ka a na-ekwu site n’ibụ abụ nile” Abụ nile, ix). Dịka Ị na-akparịta-ụka n’ozi a, tulee ịbụ-abụ gị na ndi Ị na-akuziri ihe otu n’ime abụ ile ndi a ma ọbụ abụ ọzọ gbasara ịnagide ọdachi: “How Firm a Foundation” (no. 85); “The Lord Is My Shepherd” (no. 108); or “Let Us All Press On” (no. 243). Ọbụrụ na Ị new mmetụta mkpalite nke mụọ, kekọrịta otu oge mgbe oge ebili-mmiri na ndụ gị tụgharịrị bụrụ ngọzi.

Bipụta