2013
Ndabere-N’onwe
Septemba 2013


Ozi nke Nkuzi ndi nleta, Septemba 2013

Ndabere-N’onwe

Jiri ekpere gụọ ihe ngwa-ọrụ a ma, dika okwesiri, kpaa ya na nkata, gị na ndi ụmụnne nwanyị ndi ị na eleta. Were ajụjụ nile nyere onwe gi aka igba ndi ụmụnne gị nwanyi nile ume na ime ka Otu Enyem-aka bụrụ nke dị mkpa na ndụ gị. Maka inweta nkọwa ndi-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org.

Nwere-onwe bụ ikikere, mkpebị na igba-mbọ iji hụ maka ọdị mma nke onwe anyi ya nke ndi ezi-na-ụlọ anyi nile.1

Dika anyi na mata ma na etinye ụkpụrụ nke nwere-onwe na ụlọ na obodo anyi nile, anyi nwere ohere ilekọta ndi ụwa na tụ-nọ-ọnụ ya ndi ọzọ, inyere ha aka inwere-onwe ha, ka ha gbalahụ oge mkpagbu.

Anyi nwere ohere na ọrụ iwere onyinye chi nyere anyi ịbụ ndi nọọrọ onwe ha na mụọ na anụ-ahu. Na ikwu maka inwere-onwe nke mụọ ya na ndabere ebe Nna nke elu-igwe,Okenye Robert D Hales nke otu ndi ozị ụrụ na abụọ akuzie la : “Anyi na enwe mgbanwe ma na enwe nwere-onwe nke ime mụọ dika anyi na ebị ndụ ọgbụ-gba ndụ anyi nile na ịkpe-ekpere site na ịrị oriri-nsọ, ya ịbị ndụ kwesiri iduba na tempụl na iwepụta onwe anyi inyere ndi ọzọ aka.2

Okenye Hales dụrụ anyi ọdụ ka anyi nweta nwere-onwe nke anu-ahu, “ nke gunyere inweta aguma-akwukwọ nke secondrị ma ọbụ ihe-omụmụ ọrụ-aka, imụ-ọrụ, ya ibi ndụ otu mkpata anyi ha Site na igbalahụ ụgwọ, na idokwa ego ụgbua, anyi na akwado ije ozọ na nzukọ mgbe nile na afọ na abia-abia. Ebum nuche nwere-onwe nke anu-ahu na mụọ bụ iji bulite anyi elu ebe anyi nwere-ike ibelite ndi ọzọ nọ na mkpa.3

Site na Akwukwọ-nsọ nile

Matthew 25:1–; 1 Timothy 5:8; Alma 34:27–28 Doctrine and Covenants 44:6; 58:26–29; 88:118

Site na Akụkọ ochie anyi

Mgbe ndi nsọ nke Ikpe-azu gbakọ-chara na ebe mgbada-ugwu Salt Lake, ebe bụ ọzara-ikpa, Onye Isi nduzị Brigham Young chọrọ ka ha bawanye ma wulite ebe ahụ dika ebe ụlọ obịbị ha. Nke a pụtatara na ndi nsọ nile ga mụ aka-ọrụ di iche-iche nke ga enyere ha aka inweta nwere-onwe ha. Na igba mbọ nke, Onye Ịsi nduzi Young nwere ezigbo ntukwasị-obi n’ebe ọkụ nile, akara-aka nile, okwukwe nile na nmasi nke ndi ụmụnwanyi, ma ọ gbakwara ha ume nebe ụfọdụ ọrụ ha nwere. Mgbe ụfọdụ ọrụ ndi ụmụnwanyi Otu Enye m aka di ịche ụbọchị taa, ma ezi-okwu ya adịghị agbanwe:

  1. Mụta ihụ ịrụ-ọrụ n’anya ma gbaara inọ nkịtị ọsọ.

  2. Nweta mụọ nke ichụ-aja nke onwe

  3. Mabata ọrụ ndi kwesiri ga maka ike nke mụọ, ahụ-ike, nmụta akwukwọ, inweta-ọrụ, ego, ihe orịrị, na ihe ndi ọzọ na enyere ndụ aka.

  4. Kpe-ekpere maka okwukwe na agbam ume iji nagide iche aka mgba nile.

  5. kwagide ndi ọzọ ndi nke chọrọ enye m aka4

Lee-anya

  1. lee Handbook 2: Administering the Church (2010), 6.1.1.

  2. Robert D. Hales, “Coming to Ourselves: The Sacrament, the Temple, and Sacrifice in Service,” Liahona na Ensign, Onwa ịse 2012, 34

  3. Robert D. Hales, “Coming to Ourselves,” 36.

  4. lee Daughters in My Kingdom: Akwụkwọ Akụkọ na Ọrụ nke Otu Enye m aka (2011) 20–21.

Gịnị ka m nwere ike ime?

  1. Kedu otu m na esi enyere ndi ụmụnwanyi ndi m na elekọta gboo mkpa ime mụọ na ahụ-ahu ha nile?

  2. Ana m amụba mụọ nke nwere-onwe m site na ịkwado maka orịrị-nsọ na idi njikere inye-aka?

Bipụta