2016
Ekepụtara site n’Ọyịyị nke Chineke
Maachị 2016


Ozi nke Nkuzi ndi nleta ụmụnwanyị,Ọnwa atọ 2016

Ekepụtara site n’Ọyịyị nke Chineke

Mụọ akwụkwọ ọziza site n’ekpere ma chọpụta ihe ịga-akuzi. Kedụ ka ịhọta “Ezi-na-ụlọ Ahụ: Ịma-Ọkwa ahụ Nye Ụwa” ga-eji amụba okwukwe gị n’ime Chineke ma gọzie ndị ahụ ị na-eleta site na nkuzi nleta nke ụmụ nwanyị? Maka inweta nkọwa ndi-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org.

Foto, oyiyi
Sil Otu Enyem-aka

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

“Ma Chineke kwuru, Ka anyị kee mmadụ site n’ọyịyị nke anyị, na ụdị nke masiri anyị. …

“Ya mere Chineke ekee mmadụ site n’ọyịyị nke onwe Ya, n’ime ọdịdị nke Chineke ka o kere ya; nwoke na nwanyị ka o kere ha” (Genesis 1:26–27).

Chineke bụ Nna anyị nke Elu-igwe, ma O kere anyị site n’ ọyịyị Ya. Maka ezi-okwu nkea, Onye-isi-nduzi Thomas S. Monson kwuru: “Chineke Nna anyị nwere ntị nke Ọ na-eji anụ ekpere anyị. O nwere anya nke Ọ n’eji ahụ ihe niile anyị n’eme. O nwere ọnụ nke Ọ na-eji agwa anyị okwu. O nwere obi nke Ọ na-eji enwe mmetụta ịhụnanya na obi-ebere. A na ahụ Ya anya. Ọ dị ndụ. Anyị bụ ụmụ ya emere site n’ ọyịyị ya. Anyị yiri ya ma ya eyie anyị.”1

“Ndị-nsọ Ụbọchi Ikpe-azu a n’ahụ mmadụ niile dịka ụmụ nke Chineke na ezi uche; ha na-ahụta idi-nsọ onye ọbụla site na mbụ, okike, na ihe ha ga-abụ.”2 Onye ọbụla “bụ nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwanyị mụọ ahụrụ n’anya nke nne na nna dị n’igwe.”3

“[Onye-amụma] Josef Smit mụtakwara na Chineke chọrọ ka ụmụ Ya nweta ụdị mbuli-elu nke Ọ n’erite.”4 Dịka Chineke kwuru, “N’ihi na, nke a bụ ọrụ m na ebube m— iwete anwụghị-anwụ na ndụ ebighị-ebi nke mmadụ” (Moses 1:39)

Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere

Genesis 1:26–27; 1 Ndị Kọrịnt nke mbụ 3:17; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:1

Site na Akwụkwọ-nsọ

Nwanne nke Jared n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn chọgharịrị ụzọ otu o ji ewebata ihé n’ime ụgbọ-mmiri barge asatọ ahụ nke arụrụ iji buru ndị jared gafee mmiri niile ahụ gaa n’ala nke ekwere na nkwa. Ọ kpụpụtara “site na nnukwu nkume obere okwute iri na isii” ma kpee ekpere na Chineke ga-eji mkpisiri-aka Ya “emetu okwute ndị ahụ” “ka ha wee nye ihé n’ime ọchịchịrị.” Ma Chineke “setipuru aka Ya ma metụ okwute ndị ahụ n’otu n’otu.” Akwa mgbochi ka ewepuru site n’anya nke nwanne nwoke Jared, ma “ọ hụrụ mkpịsrị-aka nke Onye-nwe-anyị; ma ọ dịkwa ka mkpịsịrị-aka nke mmadụ. …

“Ma Onye-nwe gwara ya si: Ikwenyere n’okwu niile ndịa nke m kwuru?

Ma ọ zara: E, Onye-nwe”

Ma “Onye-nwe-anyị gosiri onwe Ya nye [nwanne nwoke nke Jared]” ma na-asi, “ịhụtakwara na ekepụtara gị site n’ọyịyị nke onwe m? E, ọbụ mmadụ niile ka ekere na mmalite nʼoyiyi nkem. Lee Ether 3:1-17

Hụba-ama

  1. Thọmas S. Monson, “A mam na Onye-Mgbapụta m dị Ndụ,” n’ime okwu niile nke Ogbakọ, Onwa anọ. 1966,63.

  2. Isi-okwu niile nke Ozi-ọma, “Ịdị dịka Chineke,” topics.lds.org; lee kwa Moses 7:31-37.

  3. Ezi na ụlọ Ịma-ọkwa nye Ụwa,” Liahona, Ọnwa iri na otu. 2010, 129.

  4. Isi-okwu niile nke Ozi-ọma, “Ịdị dịka Chineke,” topics.lds.org; lee kwa Nkuzi niile nke Ndi-isi-nduzi nke Nzuko-nsọ a: Josef Smit (2007), 221.

TuleeuchenaNkea

Kedu otu mmata na onye ọbụla ka ekepụtara site n’ọyịyị nke Chineke ga esi enyere anyị aka na mmekọ anyị na ndị ọzọ?.

Bipụta