2016
Mụta maka Mụ
Maachị 2016


Ozi nke Otu Ndị-Ịsi Ndụzi Mbụ, Onwa atọ 2016

“Mụta maka Mụ”

Na Nzukọ-nsọ nke Jịsọs Karịst nke Ndị Nsọ nke Ikpeazu, anyị niile bụ ndị nkuzi na ndị ọmụmụ-ihe. Nye anyị niile ka ọkpụkpọ-oku sitere na Onye nwe anyị: “Mụta maka m … ma unu ga-enweta ezumike nye mkpụrụ-obi unu niile1

A na m akpọku ndị otu ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazu ka ha tụgharịa uche n’ebe mgbalị ha ikuziri na imụta ma na-elekwasi Onye- Nzọpụta anya dịka Onye Ndu anyị mgbe anyị n’eme otu a. Anyị maara na onye “nkuzi nkea bịara sitere na Chineke”2 bụ onye karịri onye-nkuzi ọbụla. Ya onye nke kuziri anyị ijiri mkpụrụ-obi anyị, mmụọ anyị niile, ike anyị niile, na echiche anyị niile n’ahụ Onye-nwe-anyị Chineke n’anya na kwa n’ịhụ ndị agbata-obi anyị n’anya dịka Onwe anyị, bụ onye isi Nkuzi na onye Ọmụmatụ nke ndụ zuru-oke.

Ọ bụ Ya onye kwupụtara: “Bịa, soro mụ.”3 “Egọsiwo m ụnụ ihe ọmụmatụ.”4

Ma ọbụru na Ụnụ gbanweworii

Jisọs kuziri eziokwu nwere nghọta kama dịrị kwa omimi dịka edere n’ime Matiu. Mgbe Ya na ndị n’eso ụzọ Ya gbadataworo site n’elu ugwu nke nwogharị, ha kwụsịrị n’ebe Galili ma mgbe ahụ gaa n’ebe Kapanaum. Ebe ahụ, ndị n’eso ụzọ biakwutere Jisọs, n’ajụ:

“Kedụ onye nke kachasi-elu n’ime ala-eze nke elu-igwe?

“Ma Jisọs kpọrọ otu nwatakiri ka ọ biakute Ya, ma debe ya n’etiti ha.

“Ma na-asi, N’ezie asim ụnụ, Ọ bụrụ na ụnụ echegharighi, ma bịa dịka ụmụ-ntakiri, ụnụ agaghi aba n’ala-eze nke elu-igwe.”5

N’ime Nzuko-nsọ, ebumn, obi nkuzi nke ozi-ọma abụghị maka itinye ozi n’ime obi niile nke ụmụ Chineke, ma-ọbụ n’ebe obibi, n’ime klass, ma ọbụ n’ime ubi nke mgbasa-ozi. Ọbụghị igosipụta ihe ole nne na nna, onye nkuzi, ma ọbụ onye mgbasa-ozi ọma maara. Ka ọbụ nani ikwalite amamihe gbasara onye Nzọpụta na Nzukọ-nsọ Ya.

Ebum, btw nobi kachasi mkpa nke nkuzi ihe bụ inyere ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị nke Nna nke Elu-igwe aka ịlaghachi n’ihu Ya ma Ya na ha enwekọrịta ndụ ebighị-ebi. Na ime nkea, nkuzi nke ozi-ọma ga agbariri ha ume n’ụzọ nke iso ụzọ na ọgbụgba-ndụ niile dị nsọ, kwa ụbọchị. Ebụm btw nobi ahụ bụ ịkwalite mụọ onye ọbụla niile maka iche gbasara, inwe mmetụta gbasara, ma mgbe ahụ mee ihe gbasara ụkpụrụ niile nke ozi-ọma dị ndụ. Ebum’ btw nobi ahụ bụ ịmụpụta okwukwe n’ime Onye-nwe-anyị Jisọs Kraịst na ịbụ onye gbanweworo n’ime ozi-ọma Ya.

Nkuzi nke na-agọzi ma na agbanwe ma zọpụta bụ nkuzi nke n’esoro ọmụmatụ nke Onye-nzọpụta. Ndị nkuzi n’eso ihe ọmụmatụ nke Onye-nzọpụta nwere ịhụnanya ma na-agara ndị ha na-akuziri ozi. Ha n’eji ihe ọmụmụ nke eziokwu dị nsọ na-akwalite mụọ nke ndị n’ege ha ntị. Ha na ebi ndụ kwesịrị.

Ịhụnanya na Ịje-ozi

Igbasa ozi-ọma niile nke Onye-nzọpụta gosipụtara ịhụnanya nke onye –agbata obi. N’ezie, ịhụnanya Ya na ije-ozi Ya abụworii nkuzi Ya oge ụfọdu. N’otu aka ahụ, ndị nkuzi niile m chetere nke ọma bụ ndị nkuzi maara, nwee ịhụnanya, ma nwee mmasị n’ebe ụmụ-akwụkwọ ha nọ. Ha chọtara atụrụ nke furu-efu. Ha kuziri nkuzi nke ndụ nke m ga n’echeta oge niile.

Otu ụdị onye-nkuzi a bụụrụ Lucy Gertsch. Ọ maara onye ọbụla n’ime ụmụ-akwụkwọ ya. Ọ haghị ịkpọtụrụ ndị ahụ niile n’enweghị ike ịbịa ụka ma ọ bụ ndị n’abịaghị cha-cha. Anyị maara na ọ nwere mmasị n’ebe anyị nọ. Enweghị onye n’ime anyị chefụworo ya ma ọbụ ihe ndị ọ kuziri.

Ọtụtụ afọ gachara, mgbe Lucy ruru oge ọnwụ ya, a gara M leta ya. Anyị chetara ma kọọ gbasara ụbọchi ndị ahụ tere aka tutu ya abụrụkwa onye nkuzi anyị. Anyị kwuru gbasara onye ọbụla n’ime klass anyị ma kparita ụka ihe onye ọbụla n’ime anyị nọ n’eme ụgbụa. Ịhụnanya ya na mmasị ya ka aga echeta na ndụ.

Enwere m ịhụnanya n’okwu nke Onye-nwe-anyị nke nọ na Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile:

Ma enyewom unu iwu-nsọ na unu ga-akuzi otu onye nye ibe ya ozizi ahụ nke ala-eze.

“Kuzisie ihe ike ma amara m ga-anọnyere gị.”6

Lucy Gertsch kuziri nke ọma n’ihi o nwere ịhụnanya oge niile.

Nyepu Olile-anya na Ezi-okwu

Onye-ozi Pọl dụrụ ọdụ, “Dịrị na njikere oge ọbụla inye asisa nye mmadụ ọbụla nke jụrụ gị ihe kpatara olile anya nke nọ n’ime gị.”7

Enwere-ike olile anya nke kacha nke onye nkuzi nwere ike inye bụ olile-anya nke aga ahụ n’ime eziokwu niile nke ozi-ọma nke Jisọs Kraịst.

“Ma-ọ bụ gịnị ka unu ga-enwe olile-anya ya?” Mọmọn jụrụ. “Lee asị m unu na unu ga-enwe olile-anya site nʼaja mgbaghara mmehie nke Kraịst na ike nke mbilite nʼọnwụ ịkpọlite unu ịdị ndụ ebighi-ebi, maka nke a, otu okwukwe unu na ya siri dị.”8

Ndị-nkuzi niile, welite nụ olu unu ma gbaa-ama maka odidi nke Chukwu. Kwupụta ịgba-ama gị gbasara Akwụkwọ nke Mọmọn. Zipụ ezi-okwu nke dị ebube ma maa mma nọ n’ime atụmatụ nke nzọpụta. Were ngwa-ọrụ niile nke Nzukọ-nsọ kwadoro, kachasi nke akwụkwọ-nsọ niile, ji kuzie ezi-okwu niile nke ozi-ọma nke Jisọs Kraịst eweghachitere, na ezi asụsụ na ịdị nma ya Chetakwa nkwado nke Onye-nzọpụta sị “chọgharị akwụkwọ-nsọ niile; n’ihi na n’ime ha, ụnụ ga-enweta ndụ ebighi-ebi: ma ọ bụ ha bụ-ihe-ndị- na-agba-ama maka m.”9

Nyere ụmụ Chineke aka ịhọta ihe nke bụ ezi-okwu ma dị mkpa n’ime ndụ nke-a. Nyere ha aka inweta ike ịhọrọ ụzọ niile nke ga-echekwa- ha, ha-garuo n’udo na ndụ ebighị-ebi.

Kuzie ezi-okwu, ma Mụọ-nsọ ahụ ga-enyere gị aka.

“Mụta maka Mụ”

N’ihi na Jisọs Kraịst nwere nrube-isi zuru-oke ma kwenyere-na Nna Ya, Ọ “mụbara na-amamihe na ogo, ma na mmasị n’iru Chineke na mmadụ.”10 Anyị o nwere ụdị mkpebi ahụ ime dịka otu a? Dịka Jisọs “natara ọtụtụ amara,”11 anyị ga-enweriri ndidi ma chọsie ihé na amamihe ike nke sitere na Chineke n’ime mbọ anyị ịmụta ozi-ọma ahụ.

Ige-ntị bụ otu ihe eji eme ihe dị oke mkpa nke mmụta. Mgbe I na akwado ka akuziere gị, anyị na-eji ekpere n’achọ nkwalite mụọ na ịgba-ama nke Mụọ Nsọ ahụ. Anyị na-atụgharị uche, anyị n’ekpe ekpere, anyị n’etinye ihe ọmụmụ niile nke ozi-ọma n’ọrụ,ma n’achọ uche nke Nna maka anyị.12

Jisọs “kuziri … ọtụtụ ihe site na okwu-ilu13 nke ekwesiri iji nti wee nụ, anya iji hụ, na obi eji ahọta. Dịka anyị n’ebi ndụ ntozu-oke, anyị nwere ike ịnụta ntaka ụka nke Mụọ Nsọ, nke nwere ike “ikuziri [anyị] ihe niile, ma weta ihe niile nye ncheta [anyị].”14

Mgbe anyị na-asa ọkpụkpọ oku dị nwayo nke Onye-nwe-anyị, “Mụta maka mụ,” anyị n’abụ ndị nrita nke ike ya dị nsọ. Ka anyị, otu ahụ, gaa n’ihu n’ime mụọ nke nrube-isi, n’esote Onye-ọmụmatụ anyị site na nkuzi, dịka Ọ ga-achọ ka anyị kuzie ma na-amụta dịka Ọ ga-achọ ka anyị mụta.

Nkuzi si na ozi-a

Onye-isi-nduzi Monson n’akpọku any ka-anyị “ịtụgharị-uche n’ime mgbali [anyị] ikuzi na imụta na ilekwasi Onye-nzọpụta anya dịka Onye-ndu anyị mgbe anyị na-eme nke a” I nwere ike tụlee ịchọgharị akwụkwọ-nsọ niile gị na ndị ị n’eleta ichọta mmata niile n’ime ụzọ niile nke Jisọs Kraịst siri kuzie ihe ma mụtakwa ihe. Inwere ike site n’ụfọdụ akwụkwọ nsọ niile Onye-isi-nduzi Monson ziri anyị bido, dịka Matiu 11:29, Jọn 5:30, na Mak 4:2. Inwere ike ikparita ụka otu ihe ịmụtaworo gbasara Kraịst nwere ike inyere gị aka “ịbụ ndị nrịta nke ike Ya dị nsọ.”

Bipụta