2016
Ụmụ ndị nwanyị nke Nna anyị nke Ebigh-ebi
Eprel 2016


Ozi nke Nkuzi Nleta Ọnwa anọ 2016

Ụmụ ndị nwanyị nke Nna anyị nke Ebighi-ebi

Mụọ akwụkwọ ọzizi-a site n’ekpere ma chọpụta ihe ịga-akuzi Kedụ ka nhọta “Ezi-na-ụlọ: Ọkwa-amara nye Ụwa niile” ga-esi amụba okwukwe gị nime Chineke ma gọzie ndị ahụ ị na-elekọta site na nkuzi nleta? Maka imata ihe ndị ọzọ, ga na reliefsociety.lds.org.

Foto, oyiyi
Sil Otu Enyem-aka

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

Akwụkwọ nsọ ahụ n’akuziri anyị na “anyị bụ mkpụrụ-afọ nke Chineke”(Acts 17:29). Chineke gwara Emma Smit, nwunye nke Onye-amụma Josef Smit, dịka “nwam nwanyị” (O&O 25:1). Ọkwa-amara nye Ezi-na-Ụlọ na-akuziri anyị na onye ọbụla nime anyị bụ nwa nwanyị nke mụọ ahụrụ n’anya nke nne na nna nke eluigwe.”1

“N’ime [ndụ ahụ ana-adị tutu e nwee anụ arụ], anyị mụtara gbasara ọdịdị anyị dịka nwanyị,” ka Carole M. Stephens, onye ndụmọdụ mbụ n’ime otu ndị-isi-nduzi zuru ọha nke Otu Enyem aka.

“Njem anụ-ahụ anyị agbanwoghị ezi-okwu niile ndị ahụ.”2

“Nna gị bị n’Eluigwe maara aha gị ma mara ọnọdụ gị,” ka Okenye Jeffrey R. Holland nke Otu Kworum Ndị ozi Iri na Abụọ kwuru. “Ọ na-anụta ekpere anyị niile. Ọ maara olile anya gị niile na ọchịhọ gị niile, tinyekwara ụjọ gị niile na mkpagbu gị niile.”3

“Anyị n’otu n’otu sonyere ma bụrụkwa ndị achọrọ n’ime ezi na ụlọ nke Chineke,” ka Nwanne nwanyị Stephens kwuru. Ezi-na-ụlọ niile nke Eluwa dị iche iche. Ma dịka anyị na-agbalị ike anyị nwere karịa maka ikepụta ezi na ụlọ siri ike, ibụrụ onye otu n’ime ezi –na-ụlọ nke Chineke abụghị nanị maka ogo ọbụla – ogo alụmalụ, ogo dịka nne na nna, ogo ụba, ogo agbatobi, ma ọbụkwanụ ụdịrị ogo anyị n’ezipụ n’igwe media.”4

Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere

Jeremiah 1:5; Romans 8:16; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 76:23–24

Site na Akụkọ ihe mere mgbe ochie anyị

Nime nkọwasị nke ọhụ nke mbụ,5 Onye-amụma Josef Smit chọpụtara ọtụtụ ezi-okwu niile – tinyekwara na Nna anyị nke Eluigwe maara aha anyị.

Josef n’eto eto gbara lịka lịka ịmata nzukọ-nsọ nke ọ ga abanye ma chọtakwa enyem-aka n’ime akwụkwọ James 1:5. Josef kpebiri na ọ ga-ajụ Chineke ajụjụ.

Otu ụtụtụ mmalite udu mmiri nime afọ 1820, ọ gara nime ọzara ikpe-ekpere mana otu ntabi-anya ka ike nke ekwensu dakwasịrị ya ma jigide ya. Maka nke ka o dere:

“Ma dịka n’oge oke mkpu nkea, a hụrụ m ogologo ihé n’elu isi m, nke karịchara mmuke nke anyanwụ, nke jiri nwayọ gbadata tutu ọdakwasị m n’elu.

Ma o gbughị oge mgbe m chọpụtara na-azọpụtawom n’aka nke onye iro nke jigidere m ma kee m agbụ. Mgbe ihé ahụ dakwasịrị n’elu m ahụrụ m mmadụ abụọ, ndị mmuke ha na ebube ha kariri nkọwa niile, guzoro n’elu isi m. Otu n’ime ha gwara m okwu, n’akpọ m n’aha ma sị, n’atụ onye nke ọzọ aka--Nkea bụ Nwam nwoke M Hụrụ n’anya. Nụrụ nu olu Ya (Joseph Smith—History 1:16–17).

Huba-ama

  1. “Ezi-na-ụlọ: Ọkwa-amara nye ndị Ụwa niile,” Lihona Ọnwa Iri-na-otu 2010, 129.

  2. Carole M. Stephens, “Ezi-na-ụlọ Sitere na Chineke,” Liahona, May 2015,11.

  3. Jeffrey R. Holland, “Ịma-ọkwa nye Ụwa,” Liahona, Nov. 2005, 28.

  4. Carole M. Stephens, “Ezi-na-ụlọ ahụ bụ nke Chineke,” 11.

  5. Lee Isi-okwu niile nke Ozi-ọma, topics.lds.org.

Tulee Nkea

Kedụ otu ịmata na ị bụ nwa nwanyị nke Chineke ga-esi emetụ mkpebi gị niile?

Bipụta