2016
Ibu-amụma na Mkpughe nke Ọnwe.
Eprel 2016


Ozi nke otu Ndị-Isi-Nduzi Mbụ Ọnwa Anọ 2016

Ibu Amụma na Mkpughe nke Ọnwe

Nzukọ-nsọ nke Jisọs Kraịst nke ezi-okwu ka eweghachiteworo, ma nọrọkwa na elu ụwa taa. Nzukọ-nsọ nke Jisọs Kraịst nke ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazu oge niile, ka eduworo site n’aka ndị amụma na ndị ozi dị ndụ, ndị na anata ntụzi-aka sitere n’elui-gwe oge niile.

Usoro nke ahụ dị nsọ bụkwaara ezi-okwu na gboo. Anyị na-amụta n’ime Akwụkwọ-nsọ “Nezie Onye-nwe-anyị Chineke agaghị-eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị-oru Ya, bụ ndị-amụma Ya” (Emọs 3:7).

Chineke ekwuwokwa ọzọ n’ime oge nke anyị, site n’aka Onye Amụma Josef Smit. O kpughere site n’aka Onye-amụma Josef ozi-ọma nke Jisọs Kraịst n’uju ya. O weghachitere ọkwa-nchu-aja Ya dị nsọ nakwa ọtụghe ya niile nakwa nkwesi niile ruru ya, ike niile, na ọrụ niile nke ike nke ọkwa-nchu-aja dị nsọ.

N’ime ụbọchị anyị, ndị amụma na ndị ozi dị ndụ ka enyeworo ikikere ikwu, ikuzi, na idu site na ikikere si na Chineke Nna na Onye-nwe-anyị Jisọs Kraịst. Ihe m bụ Onye-nwe kwuru ekwuwom ma anaghịm ewezuga onwe m; ma asị-na elu-igwe niile na ụwa gabiga, okwu m agaghị agabiga, ma na ha nile ga-emezurịrị, ma-ọ bụ site n’olu nke m ma-ọ bụ site n’olu ụmụodibo m ọ bụ otu ihe ahụ. (O&O 1:38).

N’ọgbakọ ozuru ọha ugboro abụọ n’afọ, anyị ka agọziri site n’inwete ohere nụ okwu nke Onye-nwe maka anyị nke sitere na ndị odibo Ya. Nke ahụ bụ ohere ọma kariri ego. Kama uru nke ohere ahụ dabere ma-ọbụrụ n’anyị anata okwu niile ndị ahụ site na-ike-nke-na-arụ ọrụ nke Mmụọ ahụ nke esitere na ya nye ndi odibo (lee O&O 50:19–22). Dịka ha si anata odudu site n’eluigwe, otu ahụ ka anyị kwesịrị. Ma nke ahụ ga-achọ n’aka anyị ụdịrị mgbali ime mmụọ ahụ kwa.

Rụọ Ọrụ nke ịga Arụ na Ụlọ

Afọ ole gara aga otu n’ime ndị otu kworum nke Ndị Ozi iri na Abụọ gwara m ka m gụọ edemede nke ọgbakọ nke ọ nọ na-ahazi n’ihi ọgbakọ ọzuru ọha. A bụụrụ onye otu nta nke kworum ahụ. Obisike ya na m nwere ike inyere ya aka chọta mkpụrụ okwu niile nke Onye-nwe ga-achọ ka o kwuo bụụrụ m nnukwu ugwu. O ji ihu ọchị gwam, “O, nke a bụ ndepụta okwu nke ugboro 22.”

Echeterem ndụmọdụ otu Onye-isi nduzi Harold B. Lee (1899-1973) nwere ihụnanya ma nwee obi ebere nyeworo m n’oge mbụ nke nwere nnukwu nkwupụta: “Hal, ọbụrụ na ichọrọ inweta mkpughe, mee ọrụ nke gị.”

Agụrụm, tụgharịa uche, ma kpee ekpere gbasara ndepụta nke ugboro 22 ahụ. A mụrụ m dịka ike m niile nwere ike ịmụ site n’ike nke n’arụ ọrụ n’ime nke Mmụọ Nsọ ahụ. Mgbe onye otu kworum ahụ nyechara okwu ya, emewom ọrụ nke m. Odoghi m anya ma m nyere aka, kama ama m na-agbanworom mgbe m getara okwu nke ahụ ekwu-sara. Ozi niile biaara m karịa mkpụrụ okwu niile nke m guworo na kwa nke o kwuru. Mkpụrụ okwu ndị ahụ nwere nkọwa dị elu karịa ndị nke m gụworo n’ime ndepụta ahụ. Ma ozi ahụ dịka ọbụ maka m, nke gbasara mkpa m niile.

Ndị ozi niile nke Chineke n’ebu-ọnụ ma n’ekpe ekpere inata ozi nke O nwere maka ha inye ndị niile nwere mkpa mkpughe na mkwalite nke mmụọ. Ihe m mụtara site na ahụmihe ahụ, nakwa ọtụtụ ahụmihe ndị ọzọ dịkwa ka ya, bụkwa n’irite uru enwere dị ukwuu site n’ịnụru ndị amụma na ndị ozi dị ndụ, anyị ga-akwurịrị ụgwọ inata mkpughe ahụ n’onwe anyị.

Onye-nwe-anyị hụrụ onye ọbụla n’anya ndị nke nwere ike ịnụta ozi Ya, ma O maara obi onye ọbụla na ọnọdụ onye ọbụla nime anyị n’otu. Ọ maara nhazi olu nke aga enye, mgbam ume nke aga enye, nakwa eziokwu nke ozi-ọma nke ga akachasi enyere onye ọbụla aka n’otu n’otu ịhọrọ ụzọ nke onwe ya gaa n’ụzọ nke ndụ ebigh ebi.

Anyị ndị n’egere ma n’elekwa ozi niile nke ọgbakọ ọzuru ọha mgbe ụfọdụ n’eche mgbe emesia,” Gịnị kam n’echeta ọfụma karịa?” Olile anya nke Onye-nwe-anyị n’ebe onye ọbụla n’ime anyị bụ ka aziza anyị bụrụ: “Enweghịm ike ichefu obere oge ndị ahụ m nwetere mmetụta nke olu nke Mụọ ahụ n’ime obi m na obi igwam ihe m nwere ike mee ka obi tọọ Nna nke Elu-igwe na Onye-Nzọpụta ụtọ.”

Anyị nwere ike nata mkpughe ahụ nke onwe mgbe anyị na-anụ ndị amụma niile na ndị ozi niile ma dịka anyị n’eji okwukwe n’arụ ọrụ inata ya, dịka nọọ Onye-isi-nduzi Lee kwuru na anyị nwere ike. Ama m na ọbụ eziokwu site na ahụmihe nakwa site aka-ebe nke Mụọ ahụ.

Nkuzi si na-ozia

Tụlee ịgụpụta akụkọ Onye-isi-nduzi Eyring kọrọ gbasara ihe ọmụmụ nke ndepụta okwu nke ọgbakọ ahụ nke onye-otu kworum ya ahụ. I nwere ike jụọ, “Kedụ ihe bụ ụgwọ maka inata mkpughe?” Mgbe ịtụlechara, inwere ike ịkpọkuo ndị ịna eleta ka ha tụlee ma tinye n’ọrụ atụmatụ eji anata ozi niile nke ọgbakọ ọzụrụ ọha “n’okpuru n’ike n’arụ ọrụ nke Mụọ ahụ nke esitere na ya nye ndị odibo niile nke [Chineke].”