2016
Emume-nsọ nịịle na Ọgbụgba-ndụ nịịle nke Tempụl
Juun 2016


Ozi nke Nkuzị ndị nleta ụmụnwanyị, Ọnwa ịshịị 2016

Emume-nsọ nịịle na Ọgbụgba-ndụ nịịle nke Tempụl

Mụọakwụ kwọọzizasiten’ekperemachọpụtaiheịga-akuzi Olee otu ịghọta “Ezi-na-ụlọ ahụ: Ịmaa -ọkwa nye ndị Ụwa” bulie okwukwe gị n’ime Chineke ma gozie ndị ị na-elekọta site na nkuzi nleta? Maka ịnweta nkọwa ndị-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org.

Foto, oyiyi
Njiri-mara Otu Enye m aka

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

Emume-nsọ nịịle dị mkpa maka nzọpụta na mbuli-elu bụ ihe ọgbụgba-ndụ nịịle anyị na Chineke n’eso “Ịme na ịdobe ọgbụgba-ndụ nịịle pụtara ịhọrọ ịnyakọta onwe-anyị nye Nna anyị nke Elu-igwe na Jisụs Kraịst,” Linda K. Burton kwuru, Onye-isi-nduzi zuru-ọha Otu Enyem-aka.1

Okenye Neil L. Andersen nke Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Ndị-ozi Iri na Abụọ sịrị,” Onye-nwe-anyị sịrị, ‘N’ime emume-nsọ nịịle …ike nke ndụ iyi Chineke n’apụta ihé.’

“Enwere ngọzị pụrụ-iche si n’aka Chineke maka onye ọbụla tozuru-oke emere baptism, nabata Mụọ-Nsọ ahụ, ma n’erị oriri-nsọ mgbe-ọbụla.”2

“Mgbe ndị-nwoke na ndị-nwanyị n’aga tempụl,” Okenye M. Russell Ballard nke Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Ndị-ozi Iri na Abụọ kwuru, “a na-enye ha abụọ otu onyinye-dị-nsọ, nke bụ ike ọkwa-nchu-aja …

“… Nwoke ọbụla na nwanyị ọbụla nwere ike nke a maka enyem-aka n’ime ndụ ha nịịle. Ndị nịlle ha na Onye-nwe-anyị gbara-ndụ dị-nsọ ma n’edobe ọgbụgba-ndụ ndị ahụ tozuru inweta mkpughe nke-onwe, ịnata ngọzi site n’aka ije-ozi nke ndị-mụọ-ozi, ha na Chineke ịkparịta ụka, ịnata uju nke ozi-ọma, ma emecha, ga-esoro Jisụs Kraịst bụrụ ndị-nketa-ala-eze nke ihe nịịle Nna anyị nwere.”3

Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere

1 Nefaị 14:14; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nịịle 25:13; 97:8; 109:22

Akụkọ nịịle dị-ndụ

N’ime 2007, ụbọchị anọ ala-ọma-jijiji mechara n’ime obodo Peru, Okenye Marcus B. Nash nke Iri-asaa hụrụ onye-isi-nduzi ngalaba Wenceslao Conde na nwunye ya, Pamela. Okenye Nash jụrụ Nwanne-nwanyị Conde otu ụmụntakịrị ya dị. Iji ọchị, ọ sara na site na ịdị-mma nke Chineke ha dịcha mma. Ọ jụrụ maka ebe-obibi nke ezi-na-ụlọ Conde.

“O mebiwo, ó jiri nwayọ kwue.

“… ‘Ma agbanyeghị, ‘Okenye Nash sịrị, ị n’achịọchị dịka anyị n’ekwu-okwu.’

“Ee, ọ sịrị, ekpela m ekpere ma nwe udo. Anyị nwere ihe nịịle anyị chọrọ. Anyị nwe onwe-anyị, anyị nwe ụmụ anyị, arachiri anyị n’ime tempụl, anyị nwe Nzukọ-nsọ nke a n’atụ-n’anya, ma anyị nwe Onye-nwe-anyị. Anyị nwere ike ịrụ ụlọ ọzọ site na enyem-aka Onye-nwe-anyị. …

“Gịnị bụ maka ime na idobe ọgbụgba-ndụ nịịle anyị na Chineke nke n’enye anyị ike ịchị-ọchị mgbe ihe siri-ike, ịme ka ahụhụ bụrụ ihe-ọma… ?”

“O si n’ aka Chineke. Ka anyị si enweta ike ahụ bụ site na ọgbụgba-ndụ nịịle anyị na Ya.”4

Hụba-ama

  1. Linda K. Burton, “Ike, Ọńụ, na Ịhụn’anya nke idobe ọgbụgba-ndụ,” Liahona, Ọnwa iri na otu 2013, 111.

  2. Neil L. Andersen, “Ike n’ime Ọkwa-nchụ-aja,” Liahona, Ọnwa iri na otu 2013, 92.

  3. M. Russell Ballard, “Ndị-nwoke na ndị-nwanyị nime ọrụ nke Onye-nwe-anyị,” Liahona, Ọnwa anọ 2014,48–49.

  4. Lee D. Todd Christofferson, “Ike nke Ọgbụgba-ndụ nịịle,” Liahona, Ọnwa ise 2009, 19, 20-21.

Tuleeuchena Nkea

O lee otu emume-nsọ nịịle na ọgbụgba-ndụ nịịle nke tempụl si enye anyị mgbam-ume na ike?

Bipụta