2016
Nna Anyị, Onye-ndụmọdụ Anyị
Juun 2016


Ozi nke Otu Ndị-Ịsi Nduzi Mbụ, Ọnwa Ịsịị 2016

Nna Anyị, Onye-ndụmọdụ Anyị

Onwela mgbe ị mepere igbe nke ngwo-ngwo nịịle, ma dọpụta akwụkwọ ntụzi-aka nịịle eji-arụkọta ha, ma chee, “Nke a enweghị isi cha-cha”?

Mgbe ụfọdụ, agbanyeghị ihe ọma nịịle anyị bu n’uche na ntụkwasị-obi anyị nwere, anyị n’adọpụta otu ngwa-ọrụ ma jụọ, “Gịnị ka eji nke a eme?” ma-ọbụ O lee otu nke a ji anọzi?”

I mee ka ọ ghara inwe-isi anyị n’abawanye dịka anyị na-ele igbe ahụ ma chọpụta ihe kwuru sị, “Achọrọ ịrụzi ya—afọ nịịle 8 na karịa.” Maka anyị amaghị ihe anyị ga-eme, nke a anaghị ebuli ntụkwasị-obi anyị ma-ọbụ oke-nsọpụrụ anyị nwere.

Mgbe-ụfọdụ anyị n’enwe ụdị uche enwetara n’onwe dị otu a na ozi-ọma ahụ. Dịka anyị na-ele ụfọdụ akụkụ nke ya, anyị nwere ike ịkọ-ọkọ n’isi anyị nịịle ma new iju-anya ihe eji akụkụ ahụ eme. Ma-ọbụ dịka anyị na-ele akụkụ ọzọ, anyị nwere ike chọpụta na agbanyeghị mgbali nịịle anyị ịhọta nke-ọma, anyị anaghị enwe ike ịchọpụta ihe mere eji tinye akụkụ ahụ.

Nna anyị nke Elu-igwe bụ Onye-ndụmọdụ anyị

Ịnwe-ihu-ọma, Nna anyị nke Elu-igwe enyela anyị ntuzi-aka dị egwu maka idozi ndụ anyị nịịle na ịwepụta onwe-anyị kachasị mma. Ntụzi-aka nịịle ndị a n’arụ-ọrụ agbanyeghị afọ ole anyị dị ma-ọbụ ọnọdụ anyị. O nyela anyị ozi-ọma ahụ na Nzukọ-nsọ nke Jisụs Kraịst. O nyela anyị atụmatụ nke mgbapụta, atụmatụ nke nzọpụta, ọbụnaghị atụmaụ nke ańụrị. Ọ hapụghị nanị anyị na amaghị ihe nịịle g’eme ma-ọbụ iche-aka-mgba nịịle nke ụwa, n’asị “Gaba nụ. Ịhu-ọma. Lekọta onwe gị.”

Ọ bụrụ nanị na anyị ga-enwe ndidi ma were obi umeala na obi sara-mbara lee ihe, anyị g’achọpụta na Chineke enyele anyị ọtụtụ ngwa-ọrụ iji họta nke-ọma ntuzi-aka Ya nịịle maka ańụrị anyị n’ụwa:

  • O nyela anyị onyinye enweghị ọnụ-ahia nke Mụọ-Nsọ, nke nwere ike ịbụ onye-nkuzi elu-igwe anyị, dịka anyị n’amụta okwu nke Chineke ma gbalie wete uche na omume anyị nịịle ka ọdaba na okwu Ya.

  • O nyela anyị ohere ịbịakwụte Ya mgbe-ọbụla site na ekpere nke okwukwe na arịrịo nịịle nke ezi-okwu.

  • O nyela anyị ndị-ozi na ndị-amụma ụbọchi taa, ndị na-ekpughe okwu nke Chineke n’ime ụbọchị anyị ma nwe ikike ịnyakọta ma-ọbụ ịrachi n’ụwa na elu-igwe.

  • O weghachitala Nzukọ-nsọ Ya-----nhazi nke ndị kwere-ekwe ndị n’arụkọta ọrụ iji nyere onwe ha aka dịka ha na-arụpụta nzọpụta ha na ụjọ, ịma-jijiji, na ọńụ enweghị atụ.1

  • O nyela anyị akwụkwọ-nsọ nịịle---okwu Ya edere-ede nye anyị.O nyela anyị ozi-ọma ahụ na Nzukọ-nsọ nke Jisụs Kraịst.

  • O nyela ọtụtụ ngwa-ọrụ nịịle nke teknụzụ mgbe ọhụrụ inyere anyị aka n’ime ije anyị nke iso-ụzọ.O nyela anyị atụmatụ nke mgbapụta, atụmatụ nke nzọpụta, ọbụnaghị atụmaụ nke ańụrị. E nwere ike inweta ọtụtụ ngwa-ọrụ nịịle ndị a na LDS.org.

Ọ bụ maka Ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụ maka Ọ hụrụ anyị n’anya. Na maka, dịka O kwuru na onwe Ya,”Nke a bụ ọrụ m na ebube nke m—ịweta na mmezu anwụgh-anwụ na ndụ ebighi-ebi nke mmadụ.”2

N’ime asụsụ ọzọ, Nna nke Elu-igwe bụ Chineke anyị, ma Chineke bụ onye-ndụmọdụ nye anyị.

Nna anyị nke Elu-igwe mara mkpa nịịle nke ụmụ Ya karịa onye-ọzọ ọbụla. Ọ bụ ọrụ na ebube Ya inyere anyị aka mgbe ọbụla, ịnye anyị ngwo-ngwo-enyem-aka nịịle nke anụ-arụ na mụọ inyere anyị aka n’ụzọ anyị ịlaghachi na ihu Ya.

Nna ọbụla bụ Onye-ndụmọdụ

N’ime akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ndị-ezi-na-ụlọ nịịle na ndị mmadụ n’akwanyere ndị nna nnukwu-ugwu n’ime ọnwa nke isii. Ọ dị mma mgbe-ọbụla ịkwanye nnukwu-ugwu ma sọpụrụ ndị nne na nna anyị nịịle. Ndị nna nịịle n’emere ezi-na-ụlọ ha nịịle ọtụtụ ihe ọma ma nwe ọtụtụ ihe nńomi. Ihe abụọ kachasị mkpa ndị nna nwere n’ime ndụ nịịle nke ụmụ ha bụ nke ịbụ ezi ihe ịma-atụ na onye-ndụmọdụ. Ndị nna n’eme karịa ịgwa ụmụ ha ihe dị mma ma-ọbụ jọrọ-njọ; ha n’eme karịa ịtụpụrụ ha akwụkwọ ntụzi-aka ma tụọ-anya na ha ga-elekọta onwe ha.

Ndị nna n’adụ ụmụ ha dị mkpa ọdụ ma gosi site na-ezi omume ha ụzọ eji ebi ndụ ezi-okwu. Ndị nna anaghị ahapụ ụmụ ha nanị ha kama ha na-agba-ọsọ enyere ha aka, n’enyere ha aka ịguzo mgbe ọbụla ha dara-ada. Ma mgbe-ụfọdụ mgbe amamihe gosiri, ndị nna n’ahapụ ka ụmụ ha gbaa mbọ, n’achọpụta na otu a nwere ike ịbụ ụzọ kachasị mma maka ha ịmụta ihe.

Anyị nịịle bụ Ndị-ndụmọdụ.

Dịka ndị nna nke ụwa n’eme ihe a maka ụmụ ha, mụọ nke ndụmọdụ bụ ihe anyị kwesiri inye ụmụ nịịle nke Chineke, agbanyeghị afọ ole ha gbara, ebe ha nọ, ma-ọbụ ọnọdụ ha. Cheta, ụmụ nke Chineke bụ ụmụnne anyị nwoke na ụmụnne anyị nwanyị; anyị nịịle bụ otu ezi-na-ụlọ ebigh-ebi.

Na ụdị a, ka anyị nịịle bụrụ ndị ndụmọdụ—ịnọ na njikere isetịpụ aka ma nyere onwe anyị aka ịbụ ezi ndị mmadụ. Maka na anyị bụ ụmụ Chineke, anyị nwere ike ịdị ka Ya. Ịhụ Chineke na mmadụ ibe anyị n’anya,ịdobe iwu-nsọ nịịle nke Chineke, na isoro ihe ịma-atụ nke Kraịst bụ ụzọ dị wara-wara ma dị kwa mkpafa ịgaghachi n’ihu nke ndị nne na nna anyị nke elu-igwe.

Ọ bụrụ na Chineke ahụ nke elu-ụwa n’eche maka anyị nke ukwuu mere O ji bụrụ onye-ndụmọdụ nye anyị, enwere ike anyị esetịpụ aka inyere ndị ọzọ aka, agbanyeghị ụcha ha, ebe ha si, ọnọdụ ha nịịle, asụsụ, ma-ọbụ okpukpe-chi. Ka anyị bụrụ ndị ndụmọdụ nkwalite mụọ ma gọzie ndụ nịịle ndị ọzọ—ọbụghị nanị ụmụ nke anyị kama ụmụ nịịle nke Chineke n’ụwa nịịle.

Ịkuzi ihe site n’Ozi A

Ị nwere ike ịchọ ibido site na ịjụ ndị ị n’akuzi ajụjụ ka ha chee-echiche nke mgbe Nna nke Elu-igwe nyere ha ndụmọdụ. Ị nwere ike mbge-ahụ jụọ ha ka ha chee-echiche nke ihe nịịle dịka ibeya n’etiti oge ahụ na oge mgbe ha nwetara ndụmọdụ site n’aka nna nke ụwa ha. Kpọọ ha ka ha detuo ihe nịịle dịka ibeya n’ime otu esiri nye ha ndụmọdụ. Ị nwere ike chee ha aka-mgba ka ha gbalia ime ihe ha deturu n’akwụkwọ na ịbụ ihe-ịma-atụ ka mma nye ndị-ọzọ.

Bipụta