2016
Ikesa Ańụrị Ebighi-ebi
Ọgọọst 2016


Ntorobia

Ikesa Ańụrị Ebighi-ebi

Otu n’ime ihe kachasi nma gbasara ozi-ọma bụ ịmata maka atụmatụ nke nzọpụta. Anyị nwere ohere mara-nma anyị na ezi-na-ụlọ anyị ịnọkọta ọnụ ebighi-ebi. Ị mata nke na enyere anyị aka inwe olile-anya oge ọbụla ihe ụwa rikporo anyị. Onye Isi Nduzi Eyring kuziri, “Nna anyị nke Elu-igwe maara obi anyị niile. Ebum n’obi Ya bụ inye anyị ọńụ (lee 2 Nifaị 2:25). Ya mere Ọ nyere anyị onyinye nke Nwa Ya Nwoke iji mee ka ańụrị njikọrịta nke ezi-na-ụlọ na adịgịde ebighi-ebi. … Nke-a bụ ihe nrite nke nwa Chineke ọbụla nke biara nụ ụwa nwere ike inweta.”

Ngozi ndị-a nọkwara ndị niile nọ ugbua na ndị niile nwụrụ-anwụ—kama nani site na enye-m aka anyị. Ndị nna ochie anyị ha nọ na ụwa mụọ ugbua, na eche ka anyị kwado aha ha maka emume-nsọ tempụl ndị nke aga emechitere ha. Mana mgbe ụfọdụ ọ nwere ike ọgaghi adị mfe ịrụchitere ha ọrụ. Anyị nwere ike na eme ọtụtụ ihe, ma ọbụ anyị nwere ike ibi ebe dị anya site na tempụl nke na anyị enweghi ike ịga ugboro-ugboro.

Ka ihe na esi eme, enwere ọtụtụ ụzọ ndị anyị nwere ike iji nyere ndị nna-ochie anyị ha, site na ịrụ-ọrụ akụkọ ezi-na-ụlọ, ịdekọta ihe, ịnọgide nwantakịrị mgbe nne na nna anyị ha gara tempụl. Site na inye aka, anyị na ejere Onye-nwe ozi na iweta olile-anya nke ezi-na-ụlọ ebighi-ebi nye ndị niile nwụrụ-anwụ.

Bipụta